Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Si n’Ihe I Mejọrọ Mụta Ihe

Si n’Ihe I Mejọrọ Mụta Ihe

Were Ya:

  1. 1. Ị nọ n’echegbuo-nwe gị

    N’ihe i mejọrọ.

    Biko, cheta na

    Anyị niile n’emejọkwa.

    Ọ bụrụ n’i mejọọ,

    Biko, gbalịa k’i cheta

    Si na ya mụta ihe.

    Kwekwa ka Jehova n’eduzi gị.

    (UKWE)

    I mejọọ, jisi’ike

    Si na ya mụt’ihe.

    Gakwuru Jehova

    K’o nyere gị aka.

    N’arịọ ya kw’ụbọchị

    K’ọ n’ezi gị ụzọ ya.

    Ị ga n’esikwui-ke

    M’ọ bụrụ n’i jisi’ike

    Si na ya mụt’ihe.

  2. 2. Obi gị mawa g’ikpe,

    N’echeta na Jehova

    Chọrọ k’uche gị dịrị

    N’ihen-dị dị n’ihu.

    Hapụi-he gar’aga.

    N’agụkw’Okwu Jehova.

    O ji ya n’eduzi gị.

    Ọ g’eme ka ị n’em’ihe dịm-ma.

    (UKWE)

    I mejọọ, jisi’ike

    Si na ya mụt’ihe.

    Gakwuru Jehova

    K’o nyere gị aka.

    N’arịọ ya kw’ụbọchị

    K’ọ n’ezi gị ụzọ ya.

    Ị ga n’esikwui-ke

    M’ị gbalịa n’amụt’ihe.

    (AHỊRỊ ỌZỌ)

    Ka Jehova medaa gịo-bi.

    Kwe k’Okwu ya chetara gị

    N’ịhụnanya ya karịrị

    Ihe niile.

    N’echeta ya.

    (UKWE)

    I mejọọ, jisi’ike

    Si na ya mụt’ihe.

    Gakwuru Jehova

    K’o nyere gị aka.

    N’arịọ ya kw’ụbọchị

    K’ọ n’ezi gị ụzọ ya.

    Ị ga n’esikwui-ke

    M’ọ bụrụ n’i jisi’ike

    Si na ya mụt’ihe.

    Si na ya mụt’ihe.