Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa nke Ise Siga Riri Ahụ

Ụwa nke Ise Siga Riri Ahụ

Ụwa nke Ise Siga Riri Ahụ

BILL bụ nwoke nwere obiọma, nwoke nwere ọgụgụ isi, nwoke gbasiri ike. Ọ hụrụ ezinụlọ ya n’anya. Otú ọ dị, ọ malitere ise siga mgbe ọ dị na nwata. Ọ kpọrọ àgwà ahụ asị mgbe o mere okenye. Ọbụna ka ọ na-ese siga, ọ na-adụsi ụmụ ya ọdụ ike ka ha ghara ise siga, na-ekwu na ọ bụ ihe nzuzu. Ọ dị mgbe ụfọdụ ọ na-eji aka ya siri ike egwepịa otu mkpọ siga ma tufuo ya n’ezi, na-aṅụ iyi na ya agakwaghị ese siga ọzọ. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ọ ga-amalitekwa ise siga ọzọ—na mbụ ọ ga-ese ya na nzuzo, e mesịa ọ gaghịzi ezo ya ezo.

Afọ 15 gara aga, Bill nwụrụ n’ọrịa cancer ka ọnwa ise nke oké ihe mgbu gasịrị. A sị na ọ dịghị ese siga, ma eleghị anya ọ gaara adị ndụ taa. Nwunye ya ka gaara enwe di; ụmụ ya ka gaara enwe nna.

Ọ bụ ezie na ọnwụ Bill bụụrụ ezinụlọ ya ọdachi, ọ bụghị nke mbụ. Dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) si kwuo, ọrịa ndị ise siga na-akpata na-egbu ihe dị ka nde mmadụ anọ kwa afọ, ma ọ bụ otu onye kwa sekọnd asatọ. Ise ụtaba bụ ihe bụ́ isi a pụrụ igbochi egbochi nke na-akpata ọrịa n’ụwa nile. Ọ bụrụ na ọnọdụ dị ugbu a adịgide na-aga n’ihu, n’ime afọ 20 na-abịanụ ise siga ga-abụ ihe kasị akpata ọnwụ na nkwarụ n’ụwa nile, na-egbu mmadụ karịa ọrịa AIDS, ụkwara nta, ịmụ nwa, ihe ọghọm ụgbọala, igbu onwe onye na igbu ọchụ ma a gụkọta ha nile.

Siga na-egbu mmadụ. Ma, ndị na-ese ya jupụtara ebe nile. N’ụwa nile, ọ dịkarịa ala 1.1 ijeri mmadụ na-ese siga, ka òtù WHO na-ekwu. Ya bụ ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị toruworo ogo mmadụ n’ụwa.

Ndị na-eme nnyocha mere atụmatụ na ọ bụ ezie na ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ụtaba na-akwụ ọtụtụ narị nde dollar n’ihi akwụkwọ ndị a na-agba ha n’ụlọikpe, ego a enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ọtụtụ ijeri dollar bụ́ uru ndị ha na-enweta. Na United States nanị, a na-emepụta ihe dị ka 1.5 ijeri siga kwa ụbọchị n’ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ụtaba. N’ụwa nile, ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ụtaba na ụlọ ahịa ndị gọọmenti nyere ikike ire ụtaba na-ere ihe karịrị otu puku ijeri siga kwa afọ!

N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji ejigide àgwà a na-egbu egbu? Ọ bụrụ na ị bụ onye na-ese siga, olee otú ị pụrụ isi kwụsị ya? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu ndị na-esonụ.