Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọ Bụghị Unu Nwe Agha nke A, Kama Ọ Bụ Chineke”

“Ọ Bụghị Unu Nwe Agha nke A, Kama Ọ Bụ Chineke”

“Ọ Bụghị Unu Nwe Agha nke A, Kama Ọ Bụ Chineke”

DỊ KA W. GLEN HOW SI KỌỌ

N’iri afọ isii gara aga, Ndịàmà Jehova ewerewo ọtụtụ okwu gaa ụlọikpe na Canada. Ndị ọkà n’okwu ikpe ahụwokwa mmeri ha nwere. N’ihi òkè m keere n’ụfọdụ n’ime okwu ikpe ndị a, Òtù Ndị Ọkàiwu Na-anwale Okwu Ikpe nke America nyere m Ihe Nrite Maka Nkwado Obi Ike. N’oge ememe inye ihe nrite ahụ, e kwuru na okwu ikpe ndị metụtara Ndịàmà Jehova “ghọrọ ihe nchebe dị mkpa megide imebiga ihe oké nke ọchịchị . . . , n’ihi na okwu ikpe ndị ahụ mere ka e nwee ihe a pụrụ iwere dị ka iwu maka ihe ndị ruuru mmadụ nke ụlọikpe kwadoro, bụ́ nke nakweere ma chebe nnwere onwe nke ndị Canada nile.” Ka m kọrọ gị banyere ụfọdụ okwu ikpe ndị a n’ụzọ zuru ezu na otú m si tinye aka n’okwu iwu na otú m si mata Ndịàmà Jehova.

NA 1924, George Rix, Onye Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, letara ndị mụrụ m na Toronto, Canada. Mama m, bụ́ Bessie How, bụ́ nwanyị dị gịrịgịrị, kpọbatara ya n’ụlọ maka nkwurịta okwu. Adị m afọ ise, nwanne m nwoke bụ́ Joe dịkwa afọ atọ.

N’oge na-adịghị anya, mama m malitere ịga nzukọ Ndị Mmụta Bible na Toronto. Na 1929 ọ ghọrọ onye ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye ozi oge nile, ma nọgide n’ọrụ ahụ ruo 1969, mgbe o jesịrị ozi elu ala ya. Mkpebisi ike ya na ozi o jere n’enweghị ike ọgwụgwụ bụụrụ anyị ezi ihe nlereanya ma nyere ọtụtụ ndị aka inweta ihe ọmụma nke eziokwu Bible.

Papa m, bụ́ Frank How, bụ nwoke dị nwayọọ, onye megidere okpukpe mama m ná mmalite. Otú ọ dị, mama m jiri amamihe kpọọ ndị ozi na-ejegharị ejegharị òkù, dị ka George Young, ileta na ịgwa ya okwu. Ka oge na-aga omume papa m dịwanyere nro. Ka ọ na-ahụ mmetụta bara uru nke eziokwu Bible na-enwe n’ezinụlọ ya, ọ malitere nnọọ inye nkwado, ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe ọ ghọrọ Onyeàmà.

Ime Mkpebi Ijere Chineke Ozi

Na 1936, agụsịrị m akwụkwọ na kọleji. Enwechaghị m mmasị n’ihe ime mmụọ mgbe m nọ n’afọ iri na ụma. Anyị nọ n’oge Oké Ndakpọ Akụ̀ na Ụba, o sikwara ike inweta ọrụ. N’ihi ya, ejere m Mahadum nke Toronto. Na 1940, ekpebiri m ịga ụlọ akwụkwọ ndị ọkàiwu. Mkpebi a ejughị mama m anya. Mgbe m bụ nwata, ọ na-ekwukarị n’iwe, sị: “Nwa aghara ahụ ga-arụ ụka n’ihe ọ bụla! Ikekwe ọ ga-aghọ ọkàiwu!”

Na July 4, 1940, tupu m malite ịga ụlọ akwụkwọ ndị ọkàiwu, ọchịchị ndị Canada machibidoro Ndịàmà Jehova iwu na mberede. Nke a bụ oge mgbanwe dị mkpa ná ndụ m. Mgbe ndị ọchịchị n’ozuzu lekwasịrị anya n’imegide ntakịrị òtù a nke ndị aka ha dị ọcha, na ndị dị obi umeala, o mere ka m kweta na Ndịàmà Jehova bụ ezi ụmụazụ Jisọs. Dị nnọọ ka o buru n’amụma, ha bụ ndị ‘mba nile kpọrọ asị n’ihi aha ya.’ (Matiu 24:9) Ekpebiri m ijere Chineke ahụ Dị Ike na-akwado òtù a ozi. Na February 10, 1941, egosiri m nrara m raara onwe m nye Jehova Chineke site na baptism ime mmiri.

Achọrọ m ịbanye n’ọrụ ọsụ ụzọ ozugbo. Otú ọ dị, Jack Nathan, bụ́ onye na-eduzi ọrụ nkwusa ahụ na Canada mgbe ahụ, gbara m ume ịnaracha ọzụzụ m na nkà iwu. Otú ahụkwa ka m mere, agụsịkwara m akwụkwọ na May 1943, malitezie ịsụ ụzọ. N’August, a kpọrọ m ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Toronto na inye aka n’okwu ikpe dị iche iche Ndịàmà Jehova nwere. N’ọnwa sochiri ya, a nabatara m n’òtù ndị ọkàiwu n’Ontario, Canada.

Ịgọpụrụ Oziọma ahụ n’Ụzọ Iwu

Agha Ụwa nke Abụọ na-akpọtụ, a ka machibidoro Ndịàmà iwu na Canada. A na-atụ ma ndị ikom ma ndị inyom mkpọrọ nanị n’ihi na ha bụ Ndịàmà Jehova. A na-achụpụ ụmụaka n’ụlọ akwụkwọ, ọbụna tinye ụfọdụ n’ebe obibi nkuchi. Nke a bụ n’ihi na ha jụrụ ikere òkè n’ụdị ofufe mba, dị ka ikele ọkọlọtọ ma ọ bụ ikwe ukwe e ji eto mba. Prọfesọ William Kaplan, bụ́ onye dere akwụkwọ aha ya bụ State and Salvation: The Jehovah’s Witnesses and Their Fight for Civil Rights, kwuru na “e kwutọrọ Ndịàmà n’ihu ọha, ha nwetakwara mmegide ma n’ihu ọha ma na nzuzo site n’aka ọchịchị na-adịghị ekwenye ekwenye na ụmụ amaala nwere obi ọjọọ bụ́ ndị ịnụ ọkụ n’obi na ịhụ mba n’anya nke oge agha na-akpali.”

Ndịàmà anọwo na-achọ ka e wepụ mmachibido iwu ahụ, n’enweghị ihe ịga nke ọma. Na mberede, n’October 14, 1943, e wepụrụ ya. Ma, Ndịàmà ka nọ n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ọrụ mmanye, a ka na-egbochi ụmụaka ịgụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ọha na eze, mmachibido iwu ahụ ka ji Watch Tower Bible and Tract Society na International Bible Students Association, bụ́ òtù ji akwụkwọ ikike nke ụlọ alaka anyị dị na Toronto.

Ná ngwụsị afọ 1943, mụ na Percy Chapman, onye bụ́ ohu alaka nke Canada, gara New York ịkpọtụrụ Nathan Knorr, bụ́ onyeisi oche nke Watch Tower Society mgbe ahụ, na Hayden Covington bụ́ osote onyeisi oche na ọkàiwu Society. Nwanna Covington nwere ahụmahụ dị ukwuu n’ihe banyere okwu ikpe. O mesịrị nwee mmeri dị ịtụnanya ná mkpegharị ikpe 36 n’ime 45 n’Ụlọikpe Kasị Elu nke United States.

Ihe malitere ịdịrị Ndịàmà nọ na Canada mfe nke nta nke nta. Na 1944 e nyeghachiri anyị ụlọ alaka ahụ dị na Toronto, ndị nọworo na-eje ozi ebe ahụ tupu mmachibido iwu ahụ laghachitere. Na 1945 ụlọikpe kachasị elu nke ógbè Ontario kwuru na a gaghị amanye ụmụaka ikere òkè n’ihe omume ndị ha jụrụ n’ihi akọ na uche ha. O nyere iwu ka a kpọbataghachi ụmụaka ndị ahụ a chụpụrụ n’ụlọ akwụkwọ. N’ikpeazụ, na 1946 ọchịchị ndị Canada tọhapụrụ Ndịàmà nile nọ n’ogige ọrụ mmanye. N’okpuru nduzi nke Nwanna Covington, amụtara m iji obi ike na mkpebisi ike na-agba mgba n’okwu ndị a, ma n’ihe nile, na-adabere na Jehova.

Mgba nke Quebec

Ọ bụ ezie na a na-akwanyere nnwere onwe okpukpe nke Ndịàmà Jehova ùgwù n’ọtụtụ ebe na Canada, e nwere ebe dị iche—ógbè Quebec nke ndị Katọlik na-asụ French. Chọọchị Roman Katọlik anọwo nnọọ na-achịkwa ógbè a ruo ihe karịrị afọ 300. Ọ bụ onye ụkọchukwu ga-eduzi ma ọ bụ chịkwaa ụlọ akwụkwọ, ụlọ ọgwụ, na ụlọ ọrụ ọha na eze. E nwere ọbụna oche ndị bishọp dịịrị kadinal ndị Katọlik n’akụkụ oche onyeisi òtù ndị ome iwu nke Quebec!

Praịm minista na ọkaikpe ukwu nke Quebec, bụ́ Maurice Duplessis, bụ onye ọchịchị aka ike, bụrụkwa onye, dị ka onye Quebec na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Gérard Pelletier si kọọ, “jiri okwu ụgha, ikpe na-ezighị ezi na nrụrụ aka, iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, iji ndị mmadụ na-enwechaghị ihe ọmụma na-achị na njupụta nke ihe nzuzu, chịa ógbè ahụ ruo iri afọ abụọ.” Duplessis mere ka ikike ọchịchị ya sie ike site n’isoro Kadinal Villeneuve nke Roman Katọlik na-arụkọ ọrụ.

Ka ọ na-erule mmalite nke afọ ndị 1940, e nwere Ndịàmà 300 na Quebec. Ọtụtụ n’ime ha, tinyere nwanne m nwoke bụ́ Joe, bụ ndị ọsụ ụzọ sitere n’akụkụ ndị ọzọ nke Canada. Ka ọrụ nkwusa ahụ mụbara na Quebec, n’ihi nrụgide sitere n’aka ndị ụkọchukwu, ndị uwe ojii nke ógbè ahụ majara Ndịàmà site n’ijide ha ugboro ugboro na iji iwu ógbè ahụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi megide ọrụ okpukpe anyị.

Ana m eme njem ọtụtụ mgbe site na Toronto gaa Quebec nke na e mesịrị ziga m Quebec inyere ndị ọkàiwu na-abụghị Ndịàmà aka bụ́ ndị na-ekpechitere ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst ọnụ ha. Kwa ụbọchị ọrụ mbụ m na-arụ bụ ịchọpụta mmadụ ole e jidere ụnyaahụ ya ma jiri ọsọ gaa n’ụlọikpe ógbè ahụ iji mee ndokwa ịgbapụta ha. N’ịbụ ndị nwere ihe ndabara ọma, otu Onyeàmà bụ́ aka ji akụ̀, bụ́ Frank Roncarelli, kwụrụ ụgwọ mgbapụta anyị n’ọtụtụ okwu ikpe ndị a.

Site na 1944 ruo 1946, ọnụ ọgụgụ akwụkwọ a gbara anyị n’ihi ebubo ịda iwu obodo rịrị elu site na 40 ruo 800! Ọ bụghị nanị na ọchịchị obodo nọgidere na-ejide ma na-amaja Ndịàmà, kamakwa ìgwè ndị na-akpata ọgba aghara ndị ụkọchukwu Katọlik kwaliri, nọkwa na-awakpo ha.

Na November 2 na 3, 1946, e nwere nzukọ pụrụ iche na Montreal ikwu maka ọgba aghara a. Nwanna Knorr kwuru okwu ikpeazụ, nke isiokwu ya bụ, “Gịnị Ka Anyị Ga-eme?” Ndị nile bịaranụ nwere obi ụtọ ịnụ azịza ya—ọ gụpụtara n’olu dara ụda site n’akwụkwọ ahụ mere ihe akụkọ ugbu a bụ́ Quebec’s Burning Hate for God and Christ and Freedom Is the Shame of All Canada. Ọ bụ traktị nwere peji anọ nke na-awụ akpata oyi n’ahụ—nkọwa zuru ezu nke aha, akara ụbọchị, na ebe ndị e ji ọgba aghara ndị ụkọchukwu kpaliri, mmeso obi ọjọọ nke ndị uwe ojii, njide, na ìgwè na-eme ihe ike mee ihe megide Ndịàmà Jehova nọ na Quebec. A malitere ikesa ya gburugburu Canada nanị ụbọchị 12 ka e mesịrị.

N’ụbọchị ole na ole, Duplessis kpọsara “agha ebere na-adịghị na ya” n’ihu ọha megide Ndịàmà Jehova. Ma n’amaghị ama, ọ rụrụ ọrụ maka ọdịmma anyị. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’inye ntụziaka ka e kwuo na onye ọ bụla na-ekesa Quebec’s Burning Hate na-ada iwu ịgba ọchịchị mgba okpuru—bụ́ mpụ siri ike nke pụrụ isi n’ụlọikpe Quebec kpọga anyị n’Ụlọikpe Kasị Elu nke Canada. N’oké iwe, Duplessis ji elezighị anya leghara ihe pụrụ isi na ya pụta anya. Mgbe ahụ, o ji aka ya nye iwu ka a kagbuo ikike Frank Roncarelli nwere ire mmanya, bụ́ onye na-akwụ ụgwọ mgbapụta anyị. N’enweghị mmanya, e mechiri ọmarịcha ụlọ nri Nwanna Roncarelli dị na Montreal mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, ọ dakwara n’ụzọ ego.

Njide rịrị elu. Kama ịbụ ndị a gbara akwụkwọ ugboro 800, n’oge na-adịghị anya akwụkwọ a gbara anyị ruru 1,600. Ọtụtụ ndị ọkàiwu na ndị ọkàikpe mere mkpesa na okwu ikpe ndị a metụtara Ndịàmà Jehova karịrị akarị n’ụlọikpe ndị dị na Quebec. Ná nzaghachi, anyị tụrụ aro ihe dị mfe a ga-eme: Ka ndị uwe ojii na-ejide ndị omempụ kama ijide ndị Kraịst. Nke ahụ ga-agwọta nsogbu ahụ!

Ndị ọkàiwu abụọ nwere obi ike, bụ́ ndị Juu, bụ́ A. L. Stein si Montreal na Sam S. Bard si Obodo Quebec, nyere aka site n’ikpechitere anyị n’ọtụtụ okwu ikpe, karịsịa tupu a nabata m n’òtù ndị ọkàiwu nke Quebec na 1949. Pierre Elliott Trudeau, onye mesịrị bụrụ praịm minista nke Canada, dere na Ndịàmà Jehova nọ na Quebec abụrụwo “ndị ọha mmadụ kwara emo, kpagbuo, ma kpọọ asị; ma ha agbalịwo iji usoro iwu mee ihe ịgbaso Chọọchị, ọchịchị, mba, ndị uwe ojii, na echiche ndị mmadụ mgba.”

Omume ụlọikpe Quebec pụtara ìhè n’ụzọ ha si mesoo nwanne m nwoke, bụ́ Joe. E boro ya ebubo na ọ na-akpaghasị udo. Ọkàikpe bụ́ Jean Mercier mara Joe ikpe ịga nga ụbọchị 60. Mgbe ahụ n’oké iwe, o si n’oche ya tie mkpu sị na ọ dị ya ka ya tụọ Joe nga mkpụrụ ọka!

Otu akwụkwọ akụkọ kwuru na Mercier nyere ndị uwe ojii nọ na Quebec iwu ka ha “jide onye ọ bụla ha hụrụ a maara ma ọ bụ e chere na ọ bụ Onyeàmà.” Akparamàgwà dị otú ahụ gosịrị na ihe ndị ahụ e kwuru n’ime traktị anyị bụ́ Quebec’s Burning Hate bụ eziokwu. Ihe na-esonụ bụ ụfọdụ isiakụkọ ndị pụtara n’akwụkwọ akụkọ Canada ndị a na-edeghị na Quebec: “Oge Ụwa Nọ n’Ìsì Alaghachi na Quebec” (The Toronto Star), “Nlaghachi nke Njụta Okwukwe” (The Globe and Mail, Toronto), “Ọchịchị Aka Ike Fascist Na-esi Ísì Ọjọọ” (The Gazette, Glace Bay, Nova Scotia).

Ịgọpụ Ebubo nke Ịgba Ọchịchị Mgba Okpuru

Na 1947, enyeere m Maazi Stein aka n’okwu ikpe anyị mbụ e nyochara banyere ịgba ọchịchị mgba okpuru, bụ́ nke Aimé Boucher. Aimé ekesawo traktị ụfọdụ na nso ụlọ ya. Mgbe a na-enyocha ikpe Aimé, anyị gosiri na ọ dịghị ụgha ọ bụla dị na Quebec’s Burning Hate, kama na o ji okwu dị ike mee mkpesa banyere arụ ndị a kpara megide Ndịàmà Jehova. Anyị gosiri na ọ dịbeghị akwụkwọ a gbara ndị ahụ kpara arụ ndị a. A mawo Aimé ikpe nanị maka ịkpọsa ha n’ihu ọha. Ihe ndị gbara akwụkwọ ahụ na-egosi bụ na: Ikwu eziokwu aghọwo mpụ!

Ụlọikpe ndị dị na Quebec adaberewo ná nkọwa na-edoghị anya e nyere “ịgba ọchịchị mgba okpuru” eri afọ 350 gara aga, nke na-ekwu na a pụrụ ịma onye ọ bụla na-akatọ ọchịchị ikpe ime mpụ. Duplessis dabekwaara ná nkọwa ahụ iji kpagbuo ndị na-akatọ ọchịchị ya. Ma na 1950 Ụlọikpe Kasị Elu nke Canada nakweere okwu anyị welitere nke bụ́ na n’ọchịchị onye kwuo uche ya nke oge a, “ịgba ọchịchị mgba okpuru” gụnyere ịkpali ime ihe ike ma ọ bụ nnupụisi megide ọchichị. Quebec’s Burning Hate enweghị ihe dị otú ahụ, n’ihi ya kwa ọ bụ okwu nkịtị nke iwu kwadoro. N’ihi otu mkpebi a dị mkpa, e mechiri okwu ikpe 123 nile metụtara ịgba ọchịchị mgba okpuru! Eji m anya m hụ otú Jehova si nye mmeri ahụ.

Ịgba Mgba Megide Ime Nnyocha

Obodo Quebec nwere ụkpụrụ iwu nke machibidoro nkesa akwụkwọ n’anataghị ikike n’aka onyeisi ndị uwe ojii. Nke a bụ kpọmkwem ime nnyocha, ma si otú a bụrụ imebi nnwere onwe okpukpe. A tụwo Laurier Saumur, bụ́ onye na-eje ozi mgbe ahụ dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, nga ọnwa atọ n’ihi ụkpụrụ iwu a ma bo ya ebubo ndị ọzọ maka ya.

Na 1947 a gbara akwụkwọ metụta ihe ruuru mmadụ n’aha Nwanna Saumur iji kwụsị Obodo Quebec iji ụkpụrụ iwu ya eme ihe megide Ndịàmà Jehova. Ụlọikpe ndị dị na Quebec kpebiri ikpe megide anyị, ọzọkwa anyị tinyere akwụkwọ mkpegharị ikpe n’Ụlọikpe Kasị Elu nke Canada. N’October 1953, mgbe e kpesịrị ikpe ahụ ruo ụbọchị asaa n’ihu ndị ọkàikpe itoolu nke Ụlọikpe ahụ, a nabatara arịrịọ anyị ka a kagbuo iwu ahụ. Ụlọikpe ahụ ghọtara na ikesa okwu ndị e biri ebi sitere na Bible bụ akụkụ bụ́ isi nke ofufe ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova n’ihi ya bụrụkwa ihe nwere nchebe nke iwu pụọ ná nnyocha.

N’ihi ya okwu ikpe Boucher kpebiri na iwu kwadoro ihe Ndịàmà Jehova na-ekwu; ma mkpebi nke Saumur kwuru otú a pụrụ isi kwuo ya na ebe a pụrụ ikwu ya. Mmeri ahụ e nwere n’okwu ikpe Saumur dujere n’ịkagbu ihe karịrị akwụkwọ 1,100 dabeere n’ụkpụrụ iwu a gbara na Quebec. E wepụkwara ihe karịrị akwụkwọ 500 a gbara na Montreal n’ihi enweghị ihe akaebe ọ bụla. N’oge na-adịghị anya e wepụrụ ebubo ahụ nile—e nweghịzikwa okwu ikpe anyị fọdụrụ na Quebec!

Mwakpo Ikpeazụ nke Duplessis

N’enweghị iwu ọ bụla ọ ga-eji mee ihe megide Ndịàmà Jehova, ná mmalite January 1954, Duplessis gbakwụnyere otu iwu ọhụrụ, Ụkpụrụ Iwu nke 38, bụ́ nke usoro mgbasa ozi kọwara dị ka ‘iwu na-emegide Ndịàmà Jehova.’ O kwuru na ndị chere na o nwere onye na-achọ ikwu okwu “nkatọ ma ọ bụ mkparị” pụrụ ịgba akwụkwọ n’enweghị ihe akaebe ọ bụla. Dị ka ọkàikpe ukwu nke mba ahụ, Duplessis pụrụ ịnata ikike igbochi onye ahụ e boro ebubo ikwu okwu ọ bụla n’ihu ọha. Ozugbo e nyere ikike ahụ megide otu onye, a ga-egbochikwa ndị òtù nile nke chọọchị onye ahụ ikwu okwu. Ọzọkwa, a ga-ejichi ma bibie Bible na akwụkwọ okpukpe nile nke chọọchị ahụ, a ga-emechikwa ebe nile ha na-anọ efe ofufe ruo mgbe e kpebiri ikpe ahụ, bụ́ nke pụrụ iwe ọtụtụ afọ.

Ụkpụrụ Iwu nke 38 yiri iwu e mere na narị afọ nke 15 n’oge Njụta Okwukwe nke Spain n’ọchịchị Torquemada. Onye ahụ e boro ebubo na ndị òtù ya nile agaghị enwekwa ihe ọ bụla ruuru ha n’enweghị ihe àmà nke ime ihe ọjọọ. Banyere Ụkpụrụ Iwu nke 38, ụlọ ọrụ mgbasa ozi mara ọkwa na e nyewo ndị uwe ojii nọ n’ógbè ahụ ntụziaka imechi Ụlọ Nzukọ Alaeze nile nke Ndịàmà Jehova na ijichi na ibibi Bible na akwụkwọ ha ndị ọzọ. N’ịbụ ndị ajọ iyi egwu dị otú a chere ihu, Ndịàmà Jehova wepụrụ akwụkwọ okpukpe ha nile site n’ógbè ahụ. Otú ọ dị, ha nọgidere jiri nanị Bible ha na-arụ ọrụ nkwusa ihu ọha ha.

Ụkpụrụ ahụ ghọrọ iwu na January 28, 1954. Na January 29, n’elekere 9:00 nke ụtụtụ, anọ m n’ụlọ ikpe ahụ ịgba akwụkwọ n’aha Ndịàmà Jehova nile nọ n’ógbè Quebec, na-achọ ka a kagbuo iwu a kpam kpam ọbụna tupu Duplessis enwee ike iji ya mee ihe. Okàikpe ahụ enyeghị ikike ịkagbu ya ruo nwa oge n’ihi na e jibeghị Ụkpụrụ Iwu nke 38 mee ihe. Ma o kwuru na ọ bụrụ na ọchịchị anwaa iji ya mee ihe, na m pụrụ ịbịakwute ya maka nchebe. N’ụzọ dị otú ahụ, omume ọkàikpe ahụ rụkwara otu ọrụ ahụ ikike ịkagbu ya ruo nwa oge ga-arụ, n’ihi na ozugbo Duplessis ga-anwadị iji iwu a mee ihe, a ga-akwụsị ya!

N’izu na-esochi, anyị cheere ịhụ ma ndị uwe ojii ha pụrụ ime ihe n’ihi iwu ọhụrụ a. Ọ dịghị ihe merenụ! Iji chọpụta ihe kpatara ya, edokwara m ule. Ndị ọsụ ụzọ abụọ, bụ́ Victoria Dougaluk (onye mesịrị bụrụ Steele) na Helen Dougaluk (onye mesịrị bụrụ Simcox), jiri akwụkwọ gaa site n’ụlọ ruo n’ụlọ na Trois-Rivières, bụ́ obodo Duplessis. Ọzọkwa, ọ dịghị ihe merenụ. Ka ụmụnna nwanyị ahụ ji nnọọ ọrụ n’aka, ezigara m Laurier Saumur ka ọ kpọọ ndị uwe ojii nọ n’ógbè ahụ na telifon. N’akọwaghị onwe ya, o mere mkpesa na Ndịàmà Jehova na-eme nkwusa nakwa na ndị uwe ojii adịghị etinye iwu ọhụrụ nke Duplessis n’ọrụ.

N’amaghị nke a na-akọ, onye uwe ojii ahụ nọ n’ọrụ sịrị: “Ee, anyị maara na e tiri iwu ahụ; ma n’ụbọchị na-esochi ya Ndịàmà Jehova natara ikike megide anyị, n’ihi ya ọ dịghị ihe anyị pụrụ ime.” Ozugbo ahụ, anyị bughachiri akwụkwọ anyị n’ógbè ahụ, ruokwa afọ iri okwu a nọrọ n’ụlọikpe dị iche iche, ọrụ nkwusa anyị gara n’ihu n’enweghị ihe mgbochi.

Tụkwasị n’ikike ahụ, anyị chọkwara ka e kwuo na Ụkpụrụ Iwu nke 38 ekwekọghị n’ụkpụrụ iwu mba. Iji gosi na iwu a lekwasịrị anya kpọmkwem n’ebe Ndịàmà Jehova nọ, anyị kpebiri iji ịka anya mee ihe—izigara Duplessis akwụkwọ na-amanye ya ka ọ bịa mgbe a ga-enyocha okwu ahụ ma gbaa akaebe. Agbara m ya ajụjụ ọnụ ruo awa abụọ na ọkara. Echetaghachiiri m ya ugboro ugboro mkpọsa ihu ọha ndị o mere banyere “agha ebere na-adịghị na ya megide Ndịàmà Jehova” na okwu o kwuru na Ụkpụrụ Iwu nke 38 ga-abụ njedebe nke Ndịàmà Jehova nọ na Quebec. N’oké iwe, ọ gwara m, sị: “Ị bụ nwa okoro na-enwetụghị nkwanye ùgwù!”

“Maazị Duplessis,” ka m zaghachiri, “a sị na anyị na-ekwu okwu banyere ụdị mmadụ anyị bụ, apụrụ m ịgwa gị okwu ole na ole. Ma ebe ọ bụ na anyị nwere okwu dị mkpa anyị na-ekwu, biko ị̀ pụrụ ịkọwatụrụ ụlọikpe a ihe mere na ị zaghị ajụjụ ikpeazụ a jụrụ gị.”

Na 1964, agbaghara m Ụkpụrụ Iwu nke 38 n’Ụlọikpe Kasị Elu nke Canada. Ma ha jụrụ ikpebi na o kwekọghị n’ụkpụrụ iwu n’ihi na e jibeghị iwu ahụ mee ihe. Otú ọ dị, mgbe ahụ Duplessis anwụwo, ọ dịkwaghị onye chọrọ ịma banyere Ụkpụrụ Iwu nke 38. Ọ dịghị mgbe e jiri ya mee ihe megide Ndịàmà Jehova ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ.

N’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ Duplessis na 1959, Ụlọikpe Kasị Elu nke Canada nyere ya iwu ka ọ kwụọ Nwanna Roncarelli ụgwọ iti aka n’obi n’ihi ịkagbu ikike ire mmanya ya n’ụzọ iwu na-akwadoghị. Kemgbe ahụ ọtụtụ ndị Quebec enwewo nnọọ omume enyi. Dị ka ngụkọ ọchịchị mere sị dị, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà nọ n’ebe ahụ amụbawo site na 300 na 1943 ruo ihe karịrị 33,000 taa. E debawo aha Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ ugbu a dị ka òtù okpukpe nke anọ kasị n’ọnụ ọgụgụ n’ógbè ahụ. Eleghị m mmeri n’okwu ikpe ndị a ma ọ bụ ihe ịga nke ọma nke ozi Ndịàmà Jehova anya dị ka ihe mmadụ ọ bụla rụzuru. Kama, o gosiwo m na Jehova na-enye mmeri, n’ihi na agha ahụ bụ nke ya ọ bụghị nke anyị.—2 Ihe E Mere 20:15.

Mgbanwe nke Ọnọdụ

Na 1954, alụrụ m onye ọsụ ụzọ mara mma si England, bụ́ Margaret Biegel, anyị rụkọkwara ọsụ ụzọ ọnụ. Anọgidere m na-ahụ maka okwu ikpe ndị metụtara Ndịàmà Jehova ma n’ime Canada ma na United States na ije ozi dị ka onye ndụmọdụ n’okwu ikpe ụfọdụ na Europe na Australia. Margaret ghọrọ odeakwụkwọ m ma nye m nkwado bara uru nke ukwuu ruo ọtụtụ afọ. Na 1984, mụ na Margaret laghachiri ibi n’alaka Canada, enyekwara m aka iguzobeghachi Ngalaba Okwu Ikpe. N’ụzọ dị mwute, na 1987, Margaret nwụrụ n’ọrịa cancer.

Mgbe mama m nwụsịrị na 1969, nwanne m nwoke bụ́ Joe na nwunye ya bụ́ Elsie, bụ́ ndị e nyere ọzụzụ dị ka ndị ozi ala ọzọ na klas nke itoolu nke Watchtower Bible School of Gilead, kpọbatara papa m n’ebe obibi ha ma lekọta ya ruo mgbe ọ nwụrụ ka afọ 16 gasịrị. Site n’ụzọ ịchụ onwe ha n’àjà nke a, ha nyeere m aka ịnọgide n’ozi oge nile, aga m na-enwe ekele mgbe nile maka nke a.

Mgba Na-aga n’Ihu

Ruo ọtụtụ afọ, okwu ikpe nke Ndịàmà Jehova agbanwewo. Ọtụtụ okwu ikpe gụnyere ichebe ihe onwunwe na inweta ikike maka Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ. Ndị ọzọ bụ okwu ndị metụtara ịkpọrọ nwa bụ́ nke ndị nne ma ọ bụ ndị nna na-abụghị Ndịàmà na-eji ikwesi olu ike n’ihe ndị metụtara okpukpe eme ihe iji nweta ikike ịkpọrọ nwa nanị ha ma ọ bụ igbochi nne ma ọ bụ nna bụ́ Ndịàmà iso ụmụ ha na-ekerịta nkwenkwe na omenala okpukpe ndị bara uru.

Otu ọkàiwu bụ́ onye America, bụ́ Linda Manning, bịara n’alaka Canada na 1989 iji nye aka ruo nwa oge n’okwu ikpe. Anyị lụrụ na November afọ ahụ ma nọgide na-eje ozi n’obi ụtọ n’ebe a kemgbe ahụ.

N’afọ ndị 1990, mụ na ọkàiwu ibe m nọ n’alaka Canada ebe a bụ́ John Burns, jere Japan ma nyere ụmụnna anyị ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ aka imeri n’okwu ikpe dị mkpa nke metụtara nnwere onwe nwa akwụkwọ nwere ịghara ikere òkè n’ihe ọmụmụ ọgụ aka na ụkwụ nke ụlọ akwụkwọ ya chọrọ. Anyị nwekwara mmeri n’okwu banyere ikike onye toruworo ogo mmadụ nwere ịjụ mmịnye ọbara.

Mgbe ahụ, na 1995 na 1996, mụ na Linda nwere ihe ùgwù nke ịnọ ọnwa ise na Singapore n’ihi iwu a machibidoro Ndịàmà Jehova ná mba ahụ na n’ihi akwụkwọ ndị a gbara ha maka ya. Ekpechiteere m ndị ikom, ndị inyom, na ndị ntorobịa 64 ndị e boro ebubo ime mpụ maka ịga nzukọ ndị Kraịst na inwe Bible na akwụkwọ okpukpe, ọnụ ha. Anyị enweghị mmeri na nke ọ bụla n’ime okwu ikpe ndị a, ma anyị hụrụ otú Jehova si wusie ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ike iji iguzosi ike n’ezi ihe na ọṅụ na-atachi obi.

Enwere M Ekele Ikerewo Òkè

N’afọ ndụ 80, ana m aṅụrị ọṅụ inwe ezi ahụ ike ma nwee ike ịnọgide na-ekere òkè n’okwu ikpe nke ndị Jehova. Adị m njikere mgbe ọ bụla ịga n’ụlọikpe ikwuchitere ezi ihe. Ọ bụụrụ m ihe obi ụtọ ịhụ ka ọnụ ọgụgụ Ndịàmà nọ na Canada rịrị elu site na 4,000 na 1940 ruo 111,000 ugbu a. Ndị mmadụ na ihe omume na-agbanwe mgbe nile, ma Jehova nọgidere na-eduzi ndị ya n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu, na-ahụ na ha na-enwe ọganihu ime mmụọ.

È nwere nsogbu? Ee, ma Okwu Jehova na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide gị ga-aga nke ọma.” (Aịsaịa 54:17) N’ịdabere n’ihe karịrị afọ 56 m tinyeworo n’ozi oge nile ‘ịgọpụrụ ozi ọma ahụ na ime ka o guzosie ike,’ apụrụ m ịgba akaebe banyere ịbụ eziokwu nke amụma Aịsaịa!—Ndị Filipaị 1:7.

[Foto dị na peeji nke 19]

Mụ na nwanne m nwoke nke nta na ndị mụrụ anyị

[Foto dị na peeji nke 19]

Hayden Covington, ọkàiwu

[Foto dị na peeji nke 19]

Mụ na Nathan Knorr

[Foto dị na peeji nke 20]

Duplessis ka ọ na-esekpuru ala n’ihu Kadinal Villeneuve

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Foto W. R. Edwards sere

[Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]

Frank Roncarelli

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Site n’ike nke Canada Wide

[Foto dị na peeji nke 21]

Aimé Boucher

[Foto dị na peeji nke 24]

Mụ na ndị ọkàiwu ibe m bụ́ John Burns na nwunye m bụ́ Linda