Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Egwuregwu Ndị Dị Ize Ndụ” Ì Kwesịrị Ime Ha?

“Egwuregwu Ndị Dị Ize Ndụ” Ì Kwesịrị Ime Ha?

Echiche nke Bible

“Egwuregwu Ndị Dị Ize Ndụ” Ì Kwesịrị Ime Ha?

“N’ỤBỌCHỊ NDỊ A, ỌTỤTỤ N’IME ANYỊ AKWỤSỊWỌ ỊBỤ NANỊ NDỊ NKIRI, BỤRỤZIE NDỊ NA-AWỤTU N’ỤGBỌELU, NA-EJI ỤDỌ ARỊTU SITE N’ELU UGWU, NA-EJI ỤGBỌ EPEEPE ESI N’EBE MMIRI NA-ASỤDA AWỤTU, NA-ESOKWA AZỤ̀ SHARK AMABA N’IME MMIRI.”—AKWỤKWỌ AKỤKỌ BỤ́ WILLOW GLEN RESIDENT.

OKWU a na-akọwa omume na-abawanye ụba n’egwuregwu. Ihe omume ndị dị ka isi n’ụgbọelu awụtu, ịrị elu ice, ọkwọ ụgbọelu iji parachute si n’igwe na-awụtu n’ala, na iji parachute esi n’ebe dị oké elu amapụ * bụ́ ndị na-ewu ewu n’ebe nile n’ụzọ pụtara ìhè, na-egosi na e nwere oké mmasị n’ime ihe ndị dị ize ndụ n’ụwa a. A na-ejikwa bọọdụ a na-akpọre na snow, ịnyịnya ígwè e ji arị ugwu, obere bọọdụ ụkwụ anọ a na-akpọre na ice, na ndị nke nwere otu ụkwụ, eme ihe a na-apụghị ime n’ikike onwe onye site n’ịma ugwu ndị kasị elu aka, ebe ndị kasị kpọdaa akpọda, na ebe ndị kasị ogologo a ga-awụfe awụfe. Dị ka magazin bụ́ Time na-ekwu, ịrị elu n’iwu ewu nke “egwuregwu ndị dị ize ndụ”—egwuregwu ndị na-eme ha na-etinye onwe ha n’ihe ize ndụ—na-eme ka ọ pụta ìhè na ọtụtụ nde mmadụ na-enwe oké mmasị ikere òkè ‘n’ebe ihe nile nọrọ gwụ dị ka a pụrụ isi kwuo ya, bụ́ ebe ihe ize ndụ, nkà, na egwu na-ejikọ aka eme ka ndị na-ekere òkè n’egwuregwu nanị ná ngwụsị izu nakwa ndị ji ya mere aka ọrụ na-eche na ha na-eme nke ọma karịa ka ha na-emebu.’

Otú ọ dị, ịrị elu nke ihe a na-ewu ewu nwekwara oké ihe ọ na-efu ndị na-eme ya. Ọtụtụ mmadụ na-emerụ ahụ mgbe e mebigara egwuregwu ndị na-adịchaghị emerụ ahụ ókè. Na 1997, na United States, ndị ịkpọre obere bọọdụ ụkwụ anọ na ice buteere mmerụ ahụ bụ́ ndị e bugara n’ọnụ ụlọ ebe a na-elekọta ndị ọnọdụ ahụ ike ha chọrọ nlebara anya ngwa ngwa n’ụlọ ọgwụ ji ihe karịrị pasent 33 rịa elu, ndị ịkpọre bọọdụ na snow buteere ya ejiri pasent 31 rịa, ndị ịrị ugwu buteere ya, jikwa pasent 20 rịa elu. Ihe egwuregwu ndị ọzọ na-akpata pụtara ìhè ọbụna karị, dị ka a pụrụ ịhụ n’ọnụ ọgụgụ na-abawanye ụba nke ndị egwuregwu ndị dị ize ndụ na-ebutere ọnwụ. Ndị na-akwado egwuregwu ndị a maara banyere ihe ize ndụ ndị dị na ha. Otu nwanyị na-eme egwuregwu ski nke dị ize ndụ na-asị: “M na-ebu ọnwụ n’uche mgbe nile.” Otu onye ji egwuregwu ịkpọre bọọdụ na snow mere aka ọrụ kwubiri ihe nile site n’ịsị na ọ bụrụ na “i merụghị ahụ, mara na ị dịghị agbalịsi ike.”

N’ihi eziokwu ndị a, olee otú onye Kraịst kwesịrị isi na-ele ime ihe omume ndị a anya? Olee otú Bible pụrụ isi nyere anyị aka ikpebi ma ànyị kwesịrị ime egwuregwu ndị dị ize ndụ? Ịtụle otú Chineke si ele ịdị nsọ nke ndụ anya ga-enye aka ịza ajụjụ ndị a.

Otú Chineke Si Ele Ndụ Anya

Bible na-agwa anyị na Jehova bụ ‘isi iyi nke ndụ.’ (Abụ Ọma 36:9) E wezụga ike ihe a kpọrọ mmadụ, o jikwa nlezianya dị ukwuu nye anyị ihe dị anyị mkpa maka ịnụ ụtọ ndụ. (Abụ Ọma 139:14; Ọrụ 14:16, 17; 17:24-28) Ya mere, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na ọ na-atụ anya n’aka anyị ilekọta ihe o ji obiọma ya nye anyị. Iwu na ụkpụrụ e nyere mba Israel na-enyere anyị aka ịghọta eziokwu ahụ.

Iwu Mosis chọrọ ka mmadụ mee ihe iji chebe ndụ ndị ọzọ. Ọ bụrụ na e meghị nke a mmadụ ewee nwụọ, a ga-ele onye ahụ nke gaara egbochi ọdachi ahụ anya dị ka onye ikpe ọbara mara. Dị ka ihe atụ, e nyere onye nwe ụlọ iwu ka o wuo obere mgbidi, nke a na-akpọ ihe mgbochi, gburugburu elu ụlọ ọhụrụ ya dị larịị. Ma ọ bụghị ya, ikpe ọbara ga-ama ụlọ ahụ ma mmadụ si n’elu ya daa nwụọ. (Deuterọnọmi 22:8) Ọ bụrụ na ehi asọgbuo mmadụ mgbe a na-atụghị anya ya, a gaghị agụ onye nwe ehi ahụ n’onye ikpe mara. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na a maara ehi ahụ dị ka nke dị ize ndụ, a dọọkwa onye nwe ya aka ná ntị na mbụ ma o debeghị ehi ahụ nke ọma, ọ bụrụkwa na ehi ahụ asọọ mmadụ mpi, a ga-agụ onye nwe ehi ahụ n’onye ikpe ọbara mara, a pụkwara igbu onye ahụ. (Ọpụpụ 21:28, 29) Ebe ọ bụ na ndụ dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova, Iwu ya gosiri na o ji ichekwa ndụ kpọrọ ihe n’ụzọ dị ukwuu.

Ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi ghọtara na ụkpụrụ ndị a metụtakwara mmadụ ime ihe ndị dị ize ndụ. N’otu ihe ndekọ Bible, Devid gosiri ọchịchọ inwe ike ‘ịṅụ mmiri sitere n’olulu mmiri Betlehem.’ Betlehem nọ n’okpuru Filistia n’oge ahụ. Mgbe ha nụrụ ihe Devid kwuru, mmadụ atọ n’ime ndị agha ya jisiri ike banye n’ọmụma ụlọikwuu ndị Filistia, sete mmiri n’olulu mmiri Betlehem wee butere ya Devid. Olee otú Devid si meghachi omume? O kweghị aṅụ mmiri ahụ kama ọ wụfuru ya n’ala. O kwuru, sị: “Ya bụrụ m ihe arụ sitere na Chineke m, ime ihe a: m̀ ga-aṅụ ọbara ndị ikom ahụ ndị ji ndụ ha n’aka ha jee? n’ihi na ha ji ndụ ha n’aka ha kute ya.” (1 Ihe E Mere 11:17-19) Nye Devid ọ bụ ihe arụ itinye ndụ n’ihe ize ndụ iji mee onwe ya obi ụtọ.

Jisọs meghachiri omume n’ụzọ yiri nke ahụ mgbe, n’ọhụụ ma eleghị anya, Ekwensu nwara ya ọnwụnwa ka o si n’elu akụkụ ụlọukwu tụda onwe ya iji hụ ma ndị mmụọ ozi hà ga-echebe ya ka ọ ghara imerụ ahụ. Jisọs zara sị: “Anwala Onyenwe anyị Chineke gị.” (Matiu 4:5-7) Ee, ma Devid ma Jisọs maara na o zighị ezi n’anya Chineke ime ihe na-enweghị isi bụ́ nke pụrụ itinye ndụ mmadụ n’ihe ize ndụ.

N’iburu ihe atụ ndị a n’uche, anyị pụrụ ịjụ, sị: ‘Olee otú anyị ga-esi amata egwuregwu nke dị ize ndụ? Ebe ọ bụ na ntụrụndụ nkịtị, nke na-adịghị ize ndụ, pụrụ ọbụna ịbụ nke e mebigara ókè, olee otú anyị pụrụ isi kpebie ókè anyị kwesịrị imeru ya?’

Ò Kwesịịrị Ihe Ize Ndụ Dị na Ya?

Iji obi eziokwu tụlee ihe omume ọ bụla anyị pụrụ ịdị na-eche n’echiche ga-enyere anyị aka ịmata azịza ya. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ruo ókè hà aṅaa ka a na-enwe ihe ọghọm n’egwuregwu a? Ànatara m ọzụzụ ma ọ bụ ènwere m ihe dị mkpa iji gbochie mmerụ ahụ? Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na m daa ada ma ọ bụ zọhie ụkwụ ma ọ bụ ọ bụrụ na ihe m ji echebe onwe m emebie? Ọ̀ ga-arụpụta obere ihe ọghọm, ka m̀ nwere ike nwee nnukwu mmerụ ahụ ma ọ bụ nwụọ?’

Ime ihe ndị na-adịghị mkpa ma dị ize ndụ n’aha ntụrụndụ pụrụ imetụta mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke onye Kraịst na Jehova na iru eru ya maka inwe ihe ùgwù ndị pụrụ iche n’ọgbakọ. (1 Timoti 3:2, 8-10; 4:12; Taịtọs 2:6-8) N’ụzọ doro anya, ọbụna mgbe ha na-ekere òkè ná ntụrụndụ, ọ dị mkpa ka ndị Kraịst tụlee otú Onye Okike si ele ịdị nsọ nke ndụ anya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ebe dị oké elu na-anọchị anya ụlọ, polu dị elu, àkwà mmiri, na ọnụ ọnụ ugwu. A na-ewere egwuregwu nke mmadụ isi n’ihe kwụ otu ebe dị ka ụlọ, àkwà mmiri, na ọnụ ọnụ ugwu tụpụ onwe ya dị ka ihe dị oké ize ndụ nke na Òtù Na-ahụ Maka Ogige Ntụrụndụ na United States machibidoro ya iwu.