Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Nwere Ihe Mere A Ga-eji Nwee Olileanya?

È Nwere Ihe Mere A Ga-eji Nwee Olileanya?

È Nwere Ihe Mere A Ga-eji Nwee Olileanya?

“Otu ihe dị njọ n’alụmdi na nwunye ndị nwere nsogbu bụ nkweta a na-ekwetasi ike na ihe apụghị ịka mma. Nkweta dị otú ahụ na-egbochi mgbanwe n’ihi na ọ na-eme ka ị ghara ịchọ ịnwale ihe ọ bụla ga-enye aka.”—DR. AARON T. BECK.

KA E were ya na i nwere ihe mgbu ma gaa hụ dọkịta ka o lee gị ahụ. Ị na-enwe nchegbu—nke ahụ kwekwara nghọta. E kwuwerị, ahụ ike gị—ọbụna ndụ gị kpọmkwem—pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ. Ma ka e were ya na mgbe o lesịrị gị ahụ, dọkịta ekpugheere gị akụkọ ọma bụ́ na ọ bụ ezie na nsogbu gị abụghị obere nsogbu, a prịgwọta ya. N’eziokwu, dọkịta ahụ agwa gị na ọ bụrụ na i jiri nlezianya gbasoo otu usoro ihe oriri na mmega ahụ na-agabigaghị ókè, ị pụrụ ịtụ anya ịgbake kpam kpam. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na obi ga-eru gị nnọọ ala, ị ga-ejikwa obi ụtọ gbasoo ndụmọdụ ya!

Jiri ọnọdụ a tụnyere ihe anyị na-atụle. Ị̀ na-enwe nsogbu n’alụmdi na nwunye gị? N’ezie, alụmdi na nwunye ọ bụla ga-enwe nsogbu na nghọtahie ndị nke ya. N’ihi ya, nanị inwetụ nsogbu ná mmekọrịta unu apụtaghị na ị nọ n’alụmdi na nwunye ịhụnanya kọrọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ọnọdụ ihe mgbu ahụ adịgide ruo ọtụtụ izu, ọtụtụ ọnwa, ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ afọ? Ọ bụrụ otú ahụ, nchegbu ị na-enwe kwesịrị ekwesị, n’ihi na nke a abụghị obere ihe. N’ezie, otú alụmdi na nwunye gị dị pụrụ imetụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ndụ gị—na nke ụmụ unu. Dị ka ihe atụ, e kwenyere na nsogbu alụmdi na nwunye pụrụ ịbụ ihe kasị akpata nsogbu ndị dị ka ịda mbà n’obi, arụpụtaghị ọrụ nke ọma, na ụmụaka emeghị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Ma ọ bụghị nanị nke ahụ. Ndị Kraịst na-aghọta na mmekọrịta nke ha na ndị òtù ọlụlụ ha pụrụ imetụta mmekọrịta ha na Chineke kpọmkwem.—1 Pita 3:7.

Eziokwu ahụ bụ́ na gị na onye òtù ọlụlụ gị nwere nsogbu apụtaghị na olileanya adịghị n’ọnọdụ ahụ. Ikweta ihe ahụ bụ́ eziokwu banyere alụmdi na nwunye—na a ga-enwe ihe isi ike—pụrụ inyere di na nwunye aka ile nsogbu ha anya otú ọ dị n’ezie ma rụọ ọrụ iji dozie ya. Otu di aha ya bụ Isaac na-ekwu, sị: “Amaghị m na ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị bụ́ di na nwunye ịdị na-enwetụ obi ụtọ, na-enwetụkwa obi ilu n’oge alụmdi na nwunye ha. Echere m na ọ dị ihe na-eme anyị!”

Ọ bụrụgodị na alụmdi na nwunye gị adịwo njọ ruo n’ọnọdụ nke na ịhụnanya kọrọ na ya, a prịzọpụta ya. N’eziokwu, mmejọ nke esemokwu na-akpata pụrụ ịdị ukwuu, karịsịa ma ọ bụrụ na nsogbu ahụ adịgidewo ruo ọtụtụ afọ. Ma, e nwere ezi ihe mere a ga-eji nwee olileanya. Mkpali bụ ihe dị oké mkpa. Ọbụna mmadụ abụọ nwere nnukwu nsogbu alụmdi na nwunye pụrụ imeziwanye ihe ma ọ bụrụ na ọ dị ha abụọ mkpa. *

N’ihi ya jụọ onwe gị sị, ‘Ruo ókè hà aṅaa ka m nwere ọchịchọ nke inwe ezi mmekọrịta?’ Gị na onye òtù ọlụlụ gị ùnu dị njikere itinye mgbalị iji meziwanye alụmdi na nwunye unu? Dr. Beck, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru ná mmalite, na-ekwu, sị: “Ọtụtụ mgbe enwewo m ihe ijuanya ịhụ otú a pụrụ isi dozie ihe yiri mmekọrịta ọjọọ mgbe ndị òtù ọlụlụ mekọrọ ihe ọnụ iji dozie ebe ndị e nwere nsogbu ma meziwanye akụkụ ndị dị mma n’alụmdi na nwunye ha.” Ma gịnị ma ọ bụrụ na onye òtù ọlụlụ gị adịghị njikere isonye? N’aka nke ọzọ, gịnị ma ọ bụrụ na o yie ka ọ maghị eziokwu ahụ bụ́ na e nwere nsogbu? Ọ̀ bụ ihe na-abaghị uru nanị gị ịrụ ọrụ iji meziwanye alụmdi na nwunye unu? Ọ dịghị ma ọlị! “Ọ bụrụ na i mee mgbanwe ụfọdụ,” ka Dr. Beck na-ekwu, “nke a n’onwe ya pụrụ ịkpali onye òtù ọlụlụ gị ime mgbanwe—ọ na-emekarị.”

Adịla ngwa ikpebi na nke a apụghị ime n’ọnọdụ nke gị. Echiche enweghị nchekwube dị otú ahụ pụrụ n’onwe ya ịbụ ihe kasị dị ize ndụ n’alụmdi na nwunye gị! Ọ dị mkpa ka otu n’ime unu buru ụzọ mee ihe. Ọ̀ pụrụ ịbụ gị? Ozugbo e mere ka e nwee mkpali, onye òtù ọlụlụ gị pụrụ ịhụ uru nke isoro gị mekọọ ihe ọnụ iji wulite alụmdi na nwunye nwere obi ụtọ karị.

N’ihi ya, gịnị ka unu pụrụ ime—n’otu n’otu ma ọ bụ dị ka di na nwunye—iji zọpụta alụmdi na nwunye unu? Bible bụ ihe enyemaka dị irè maka ịza ajụjụ a. Ka anyị hụ otú o si bụrụ ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 N’eziokwu, n’ọnọdụ ụfọdụ dị oké njọ, a pụrụ inwe ezi ihe ndị mere di na nwunye ga-eji kewaa. (1 Ndị Kọrint 7:10, 11) Ọzọkwa, Bible kwadoro ịgba alụkwaghịm n’ihi ịkwa iko. (Matiu 19:9) Ma à ga-agba onye òtù ọlụlụ alụkwaghịm ma ọ bụ na a gaghị agba ya bụ mkpebi onwe onye, ndị ọzọ ekwesịghịkwa ịrụgide onye òtù ọlụlụ nke aka ya dị ọcha ikpebi otu ihe ma ọ bụ ọzọ.—Lee akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi tEzinl, peeji nke 158-161, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.