Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Okpukpe Onwe Onye” Ọ̀ Bụ Ihe Ngwọta Ya?

“Okpukpe Onwe Onye” Ọ̀ Bụ Ihe Ngwọta Ya?

“Okpukpe Onwe Onye” Ọ̀ Bụ Ihe Ngwọta Ya?

KA IKIKE NJIKỌ OKPUKPE nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ na-ebelata, ọ bụtụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị ga-echepụta okpukpe nke ha. Otú ọ dị, ajụjụ ndị na-ebilite bụ, Ime otú ahụ ọ̀ pụrụ n’ezie igbo mkpa ime mmụọ mmadụ? “Okpukpe onwe onye” ọ̀ bụ ihe ngwọta ya?

Iji zaa ajụjụ ndị a, anyị pụrụ ibu ụzọ tụlee ma okpukpe onwe onye ọ̀ pụrụ n’ezie ịbụ nke na-enye afọ ojuju ma ọ bụrụ na anyị ejiri ‘ikike iche echiche’ anyị, bụ́ otu n’ime onyinye kasịnụ ụmụ mmadụ nwere, nyochaa ya nke ọma.—Ndị Rom 12:1.

Onye na-eche echiche n’ụzọ ziri ezi adịghị anabata ihe ndị na-emegiderịta onwe ha. Otú ọ dị, n’otu nnyocha e mere na Sweden banyere okpukpe onwe onye, e kwubiri na ọtụtụ mgbe ndị mmadụ “n’echebaraghị ihe echiche nke ọma, na-eji echiche dị iche iche e nwere banyere ndụ (nakwa ndị ezi uche pụrụ igosi na ha enweghị nkwekọ) agwakọta n’echiche nke ha.”

Dị ka ihe atụ, ọ bụ nanị pasent 2 nke ndị zọọrọ na ha bụ “Ndị Kraịst n’ụzọ nke ha” kpọtụrụ Jizọs aha, ọbụna dị ka onye dịrị adị. Ma, a kpọtụrụ nkwenkwe ịlọ ụwa uche ugboro ugboro. Ugbu a, ọ̀ bụ na o megideghị onwe ya bụ́ mmadụ ịkpọ onwe ya onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst ma na-eleghara ụzọ ndụ na ozizi ya anya—ọbụna na-anakwere ozizi ndị megidere nnọọ nke Kraịst? *

Ikike iche echiche anyị yikwara ka ọ̀ na-ezere ihe ndị yiri ka ha edoghị nnọọ anya na ndị a na-apụghị ịghọta aghọta. Otú ọ dị, mgbe a jụrụ ha ma hà kweere na “Chineke ma ọ bụ ike yiri chi,” ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị a gbara ajụjụ ọnụ zara na “Ihe” dị otú ahụ nwere ike ịdị. Otu onye kwuru, sị: “Ekweere m n’ihe karịrị ike mmadụ ma ọ bụchaghị n’ihe nwere ọdịdị nke Chi.” Ndị nke kweererị na Chineke chere na ọ “dịghị ekere òkè pụtara ìhè ná ndụ ha.” N’ihi ya, akụkọ ahụ kọwara okpukpe onwe onye dị ka “usoro echiche na ụkpụrụ ndị na-edoghị anya na ndị na-akpakọghị ọnụ,” o kwubiri okwu site n’ihota otu n’ime azịza ndị a na-enwetakarị: “Ekweere m n’ihe, ma ejighị m n’aka ihe ọ bụ.”

Nnyocha e mere banyere okpukpe onwe onye na Canada gosiri ihe yiri azịza ndị ahụ. Magazin bụ́ Alberta Report na-ekwu, sị: “Anyị na-ahụzi ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke nkwenkwe n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ihe ọ bụla a pụrụ ichetụ n’echiche, ma a pụghị ịhụ ezi uche na ya. Mgbe anyị nwaziri ịchọpụta ụdị nduzi nkwenkwe onwe onye ndị a na-enye ná ndụ ha, ọ dịghị nke a na-ahụ n’ezie. E nweghị ihe na-achịkwa ụkpụrụ omume ha. Ya mere ọ dịghị uru ọ bụla ọ bara.” Magazin ahụ kwuru banyere “chi e kerisịrị ekerisị” n’ihi na ndị na-anakwere nkwenkwe ndị dị otú ahụ “na-ahọrọ ụmụ urughuru ụkpụrụ okwukwe ndị mbụ ahụ.” Ì chere na ọ bụ echiche ziri ezi bụ́ ime ka nkwenkwe okpukpe—ọbụna olileanya maka ọdịnihu—dabere n’echiche ndị dị otú ahụ na-edoghị anya, ndị na-erijughị afọ, na ndị e kerisịrị ekerisị?

Mkpa Ọ Dị Anyị Inwe Mkpakọrịta

Mkpakọrịta, òtù ụmụnna, na ịdị n’otu abụwo ihe ndị kwenyere n’okpukpe ji akpọrọ ihe eri oge. (Ọrụ 2:42, 46) Ma ebe ọ bụ na okpukpe onwe onye dị nnọọ ka aha ya si dị—nke onwe onye—olee otú ọ pụrụ isi gboo mkpa ndị a?

Nanị ihe okpukpe onwe onye, nke bụ́ “onye ọ bụla bụ chọọchị nke ya,” na-eme ọ́ bụghị ịmụba na ime ka nkewa okpukpe e nwere n’etiti ụmụ mmadụ kakwuo njọ? “Okpukpe na-adaberezi n’echiche onwe onye . . . , n’ihi ya kwa anyị aghọwo mba e nwere ọ bụghị narị ole na ole nke nkwenkwe dị iche iche, kama ọ bụ nde ole na ole,” ka magazin ahụ bụ́ Alberta Report kwuru. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na ọbụna a kọwawo okpukpe onwe onye dị ka otu ụdị nke enweghị nchịkwa n’ụzọ ime mmụọ.

Gịnị Banyere Ụkpụrụ Omume?

Onye Sweden bụ́ Bishọp Martin Lönnebo kwuru n’ajụjụ ọnụ akwụkwọ akụkọ bụ́ Svenska Dagbladet gbara ya na “okpukpe onwe onye apụghị ime ka ọgbọ anyị nwee afọ ojuju, ọ na-enwekwa ihe isi ike inyefe ọgbọ ọhụrụ ụkpụrụ omume ya.” N’ụzọ ụfọdụ, àgwà a na-ahụkarị n’etiti ndị nne na nna bụ́ ndị Sweden n’ebe ịzụ ụmụ dị na-egosi na echiche a bụ eziokwu. Akwụkwọ akụkọ ahụ bụ́ Svenska Dagbladet si otú a chịkọta àgwà ahụ: “Kwere ihe masịrị gị! Amanyekwala ụmụ gị ime mkpebi. Kama hapụ ha ka ha mee nhọrọ mgbe ha toruru ogo ya.”

Akwụkwọ akụkọ ahụ kwetara na a pụrụ ile ịkụziri ụmụaka ụkpụrụ okpukpe anya dị ka ịmanye mmadụ ikwere ihe. Ma, akwụkwọ akụkọ ahụ kwubiri, sị: “Nkụzi a a na-akụziri ụmụaka ụkpụrụ okpukpe pụrụ ịbụ ihe ọma, ọ pụkwara ịbụ nanị ụzọ ha ga-esi . . . kpebiere onwe ha ihe.” N’ezie, ọnọdụ ndị na-eto eto nọ na ya ugbu a na-enye echiche na okpukpe onwe onye emewo ihe dị nta n’ime ka ezinụlọ dị n’otu na-adabere n’ụkpụrụ ndị dị mma bụ́ ndị otu ọgbọ pụrụ inyefe ọgbọ ọzọ.

Ya mere, o yiri ka okpukpe onwe onye apụghị ịza ajụjụ dị iche iche banyere ndụ n’ụzọ a pụrụ ịdabere na ha nakwa n’ụzọ ndị na-adịghị emegiderịta onwe ha, ọ pụghịkwa ime ka ndị mmadụ dị n’otu ma ọ bụ gboo mkpa ihe a kpọrọ mmadụ nwere maka nduzi n’ihe banyere omume. Isiokwu ahụ e hotara na mbụ n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Svenska Dagbladet kwuru ihe a banyere okpukpe onwe onye: “Mgbe ‘okwukwe’ gụnyere ihe nile, ọ tọgbọ chakoo. Mgbe ọ na-adịghị mgbe ọ bụla ọ dị mkpa ka a kpaara nnwere onwe ókè, ọ dịghịzi adị irè.”

N’ụzọ doro anya, n’ọtụtụ ụzọ, okpukpe onwe onye adịghị egbo mkpa ime mmụọ ndị mmadụ. N’ezie, olee otú mmadụ pụrụ isi tụọ anya n’ụzọ ziri ezi igbo mkpa ndị ahụ site nanị n’ịhọrọgasị nkwenkwe site n’ọtụtụ ọdịnala, dị ka a ga-asị na ọ na-ahọrọ nri ndị kasị eto akpịrị n’elu tebụl e dokọjuru ụdị nri dịgasị iche iche? O yikwara ka ò doola anya na njikọ okpukpe adawo n’igbo mkpa ndị dị otú ahụ. Ya mere, olee ebe anyị pụrụ iche ihu?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Jizọs akụzighị na ndị nwụrụ anwụ na-alọ ụwa. Kama nke ahụ, ọ kụziri na ndị nwụrụ anwụ nọ n’ọnọdụ adịghị adị nke yiri ụra, na-echere mbilite n’ọnwụ n’ọdịnihu.—Jọn 5:28, 29; 11:11-14.

[Foto dị na peeji nke 18, 19]

Ànyị kwesịrị ile okpukpe anya dị ka ebe e dokọjuru ụdị nri dịgasị iche iche, na-ahọrọ nkwenkwe ndị masịrị anyị?