Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Na-akpali Agụụ Mmekọahụ—Ọ̀ Bụ Ihe Egwuregwu Na-adịghị Emerụ Ahụ́?

Ihe Na-akpali Agụụ Mmekọahụ—Ọ̀ Bụ Ihe Egwuregwu Na-adịghị Emerụ Ahụ́?

Echiche nke Bible

Ihe Na-akpali Agụụ Mmekọahụ—Ọ̀ Bụ Ihe Egwuregwu Na-adịghị Emerụ Ahụ́?

MGBE ndị ọkà mmụta ihe ochie nke ngwụsị narị afọ nke iri na itoolu malitere igwupụta ihe n’ụzọ dị n’usoro n’usoro ná mkpọmkpọ ebe oge ochie nke obodo Pompeii, ihe ndị ha gwupụtara juru ha anya. Ihe osise na ihe a kpụrụ akpụ ndị na-egosi mmekọahụ n’ụzọ pụtara ìhè jupụtara ebe nile n’ihe osise ndị e sere n’ahụ́ ájá na n’ọrụ nkà dị iche iche. Ndị ọchịchị kposara ihe ndị a na-awụ akpata oyi n’ahụ́ n’ụlọ ndebe ihe ochie ndị zoro ezo n’ihi na ha enweghị mmasị na ha. Ha wepụtara okwu Bekee bụ́ pornography, nke a sụgharịrị ịbụ “ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ” na-adabere n’okwu Grik abụọ bụ́ pornē na graphos, nke pụtara “ide ihe banyere ndị akwụna”—iji kọwaa ọrụ nkà ndị a gbara ihe nile n’anwụ. Taa, a na-akọwa ihe ndị na-akpalị agụụ mmekọahụ dị ka igosi omume ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’akwụkwọ, na foto, n’ihe ndị a kpụrụ akpụ, n’ihe nkiri sịnịma, nakwa n’ihe ndị ọzọ, ndị e zubere iji kpalie agụụ nke mmekọahụ.

N’ụbọchị ndị a, ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ jupụtara ebe nile, o yikwara ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ọha mmadụ nke oge a ha na-anabata ha. N’ebe ọ na-apụtabu n’ebe ndị a na-eme ihe nkiri sịnịma ndị jọrọ njọ nakwa n’ógbè ndị akwụna, o jupụtaziri ugbu a n’ọtụtụ obodo. Na United States nanị, ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-enye ihe karịrị ijeri dollar iri kwa afọ!

Ụfọdụ ndị, bụ́ ndị na-agbachitere ya na-akwalite ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ dị ka ụzọ nke isi mee ka alụmdi na nwunye nke na-adịghị atọ ụtọ bụrụ nke na-atọ ụtọ. Otu onye edemede kwuru, sị: “Ọ na-akpali iji uche na-ese onyinyo ihe dị iche iche. Ọ na-enye ndụmọdụ n’ụzọ isi nweta obi ụtọ ná mmekọahụ.” Ndị ọzọ na-ekwu na ọ na-eme ka e nwee ike ikwu okwu banyere mmekọahụ n’ezoghị ọnụ. “Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ baara ụmụ nwanyị uru,” ka Wendy McElroy, bụ́ onye edemede na-ekwu.

Ma ọ bụghị mmadụ nile kwetara nke ahụ. Ọtụtụ mgbe, e jikọtawo ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na ọtụtụ àgwà ọjọọ na ihe ọjọọ ndị na-esi na ha apụta. Ụfọdụ ndị na-ekwu na e nwere njikọ dị n’agbata ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na ndina n’ike tinyere ụdị ime ihe ike ndị ọzọ a na-eme megide ndị nwanyị na ụmụaka. Otu onye nke jiworo otu ụzọ gbuo ọtụtụ mmadụ bụ́ Ted Bundy kwetara na ya nwere “agụụ siri ike maka ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ́ ndị na-egosi ime ihe ike.” Ọ na-ekwu, sị: “Onye ahụ adịghị achọpụta nke a ngwa ngwa ma ọ bụ mata na ọ bụ nnọọ ezigbo nsogbu. . . . Ma mmasị a . . . na-aghọ nke e chere ihu n’ebe ihe ndị metụtara mmekọahụ dị, bụ́ ndị na-agụnye omume ime ihe ike. Achọrọ m ikwusikwu okwu ike banyere otú agụụ a si eji nke nta nke nta eto. Ọ dịghị eto n’ime mkpirikpi oge.”

N’ihi ọtụtụ arụmụka a na-arụ nakwa njupụta nke ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ jupụtara ebe nile taa, ị pụrụ ịdị na-eche sị: ‘Ọ̀ dị ntụziaka ọ bụla Bible na-enye n’okwu a?’

Bible Ezoghị Ọnụ n’Ihe Banyere Mmekọahụ

N’ime Bible, e kwuru ihe ndị metụtara mmekọahụ hoo haa, n’asọghị ihere. (Deuterọnọmi 24:5; 1 Ndị Kọrint 7:3, 4) “Ṅụrịakwa ọṅụ na nwunye ị lụrụ n’okorobia,” ka Solomọn dụrụ n’ọdụ. “Ka ara ya abụọ na-eju gị afọ na mgbe nile.” (Ilu 5:18, 19) E nyere ndụmọdụ na nduzi doro anya banyere mmekọahụ, gụnyere ókè a kpara n’inwe mmekọahụ. A machibidoro ndị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe banyere ụdị mmekọahụ nile rụrụ arụ.—Levitikọs 18:22, 23; 1 Ndị Kọrint 6:9; Ndị Galeshia 5:19.

Ọbụna n’ebe ndị a a kpaara ókè, a na-atụ anya inwe njide onwe onye na nkwanye ùgwù. “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ nile,” ka Pọl onyeozi dere, “ka ihe ndina alụmdi na nwunye bụrụkwa ihe na-enweghị mmerụ.” (Ndị Hibru 13:4) Ndụmọdụ a dị nnọọ iche n’ebumnobi e ji na-emepụta ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ nakwa ozi ha na-ezipụ.

Ihe Na-akpali Agụụ Mmekọahụ Na-agbanwe Ihe Mmekọahụ Bụ

Kama igosi omume mmekọahụ dị ka ngosipụta nke ịhụnanya n’ụzọ dị mma, nke mikwara emi, n’etiti nwoke na nwanyị n’ime alụmdi na nwunye dị nsọpụrụ, ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-eweda mmekọahụ ala ma na-agbanwe ihe ọ bụ. A na-egosipụta inwe mmekọahụ n’ejighị ya kpọrọ ihe nakwa mmekọahụ rụrụ arụ dị ka ihe ndị na-enye obi ụtọ na nke na-agụ nnọọ agụụ. A na-emesi imeju agụụ onwe onye n’ajụghị ase banyere onye nke ọzọ ike.

A na-egosi ụmụ nwanyị, ụmụ nwoke, na ụmụaka dị ka nanị ihe ndị e ji emeju agụụ mmekọahụ. “A na-atụ mma n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-adabere n’ọdịdị elu ahụ́ mmadụ, na-eme ka a na-atụ anya ihe ndị ezi uche na-adịghị na ha,” ka otu akụkọ na-ekwu. “Igosi ụmụ nwanyị dị ka ndị na-enweghị ihe ha bụ, ndị na-achọ ma na-echere mgbe nile ka ohere dapụta, ndị na-enweghị uru ha bara bụ́ ndị ụmụ nwoke na-eji enwe mmekọahụ, ndị na-eyipụ uwe ha ma na-agba ọtọ n’ihi ego na n’ihi iji mee ihe ntụrụndụ apụghị ịbụ ozi nke na-egosi ịha nhata, inwe ùgwù na inwe uche nke ụmụ nwanyị,” ka akụkọ ọzọ kwubiri.

N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ịhụnanya “[adịghị] akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị,” ka Pọl dere. “Ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya.” (1 Ndị Kọrint 13:5) Bible na-adụ ndị ikom ọdụ ka ha “na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha” ma “na-ekenye ha nsọpụrụ,” ọ bụghị ile ụmụ nwanyị anya dị ka nanị ihe e ji emeju agụụ mmekọahụ. (Ndị Efesọs 5:28; 1 Pita 3:7) Onye na-ekiri ihe oyiyi nke ndị gba ọtọ, ma onye ahụ ọ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, ọ̀ na-akpa àgwà kwesịrị ekwesị n’ezie? Onye ahụ ọ̀ na-egosi nsọpụrụ na nkwanye ùgwù n’ezie? Kama ime ka a zụlite ịhụnanya, ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-eme ka a zụlite ịchọ ọdịmma onwe onye.

E nwekwara ihe ọzọ a ga-atụle. N’oge na-adịghị anya, dịkwa ka ọ dị n’ihe banyere ihe mkpali ọ bụla ọzọ na-ezighị ezi, ihe pụrụ ịdị na-akpali akpali na mbụ na-aghọ ihe na-adịkwaghị akpali akpali. “Ka oge na-aga,” ka otu onye edemede kwuru, “[ndị na-eji ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ eme ihe] na-achọ ihe ndị na-egosi omume ndị ka njọ, ndị rụrụ arụ karị . . . Ha pụrụ ịrụgide onye òtù ha iso ha mee omume mmekọahụ ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ karị . . . , na-ebelata ikike ha [onwe ha] nwere igosi ezi ịhụnanya.” Nke ahụ ò yiri ka ọ bụ ihe egwuregwu nke na-adịghị emerụ ahụ́? Ma e nwere ihe ọzọ dị mkpa mere a ga-eji zere ihe ndị na-akpalị agụụ mmekọahụ.

Bible na Agụụ Ihe Ọjọọ

Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị taa na-eche na ọ dịghị ihe dị njọ ma ọ bụ ihe dị ize ndụ n’imeju agụụ mmekọahụ ndị ha na-eche n’uche ha, Bible ekwenyeghị na nke ahụ. Ọ kọwara n’ụzọ doro anya na e nwere njikọ dị kpọmkwem n’agbata ihe anyị na-eweba n’uche anyị na otú anyị sị eme omume. “A na-anwa onye ọ bụla site n’ọchịchọ nke aka ya ịrapụta ya ma raa ya ụrà,” ka Jems bụ́ onye na-ezo ụzọ Kraịst na-akọwapụta. “Ọchịchọ ahụkwa, mgbe ọ tụrụwooro ime, na-amụpụta mmehie; mmehie, n’aka nke ya, mgbe e mechaworo ya, na-eweta ọnwụ.” (Jems 1:14, 15) Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla nke nọgidere na-ele nwanyị anya nke na agụụ iso ya nwee mmekọahụ gụrụ ya esoroworị ya kwaa iko n’obi ya.”—Matiu 5:28.

Dị ka ma Jems ma Jizọs gosiri, ụmụ mmadụ na-eme ihe n’ihi nkwali nke sitere n’ọchichọ ha nwere n’ime obi ha. Ọchịchọ ndị ahụ, mgbe a zụlitere ha, nwere ike iri mmadụ isi nke ukwuu ka oge na-aga. Iguzogide ihe ndị riri mmadụ isi na-esi nnọọ ike, n’ikpeazụkwa ọ pụrụ iduga onye ahụ n’ime ya eme. N’ihi ya, ihe anyị na-eweba n’uche anyị pụrụ inwe mmetụta dị nnọọ ukwuu n’ihe ndị anyị na-emesịa mee.

Agụụ mmekọahụ ndị a na-eche n’echiche pụrụ igbochi ofufe anyị na-efe Chineke. Ọ bụ ya mere Pọl jiri dee, sị: “Meenụ ka akụkụ ahụ́ unu . . . nwụọ n’ihe metụtara ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ na-emerụ ahụ́, na ọchịchọ anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị.”—Ndị Kọlọsi 3:5.

N’ebe a, Pọl na-ejikọta agụụ mmekọahụ na ọchịchọ anyaukwu, nke bụ́ inwe agụụ gabigara ókè maka ihe mmadụ na-enweghị. * Ọchịchọ anyaukwu bụ otu ụdị nke ikpere arụsị. N’ihi gịnị? N’ihi na onye nwere ọchịchọ anyaukwu na-ebute ihe ahụ ọ chọrọ ụzọ tupu ihe ọ bụla ọzọ, gụnyere Chineke. Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-akpali agụụ ihe ọjọọ maka ihe mmadụ na-enweghị. “Ị chọrọ iso onye ọzọ nwee mmekọahụ. . . . Ọ dịghị ihe ọzọ ị na-eche n’echiche ma e wezụga agụụ ihe ahụ ị na-enweghị. . . . Anyị na-efe ihe na-agụ anyị agụụ ofufe,” ka otu onye na-ede ihe banyere okpukpe kwuru.

Ihe Na-akpali Agụụ Mmekọahụ Na-emerụ Emerụ

“Ihe ọ bụla dị ọcha, ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma ọ bụla dịnụ . . . , nọgidenụ na-atụle ihe ndị a,” ka Bible na-adụ ọdụ ya. (Ndị Filipaị 4:8) Onye ọ bụla nke na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ma jiri ya na-emejupụta uche ya na-ajụ ndụmọdụ Pọl. Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ ihe na-ekwesịghị ekwesị n’ihi na ọ na-ekpughe akụkụ ahụ́ na omume ndị zoro ezo n’ihu ọha n’asọghị ihere. Ọ na-asọ oyi n’ihi na ọ na-eweda ndị mmadụ ala ma na-eme ka ha ghara ime omume ka ụmụ mmadụ. Ọ bụ enweghị ịhụnanya n’ihi na ọ dịghị akwalite omume ịdị nro ma ọ bụ iche banyere ndị ọzọ. Ọ na-akwalite nanị agụụ ihe ọjọọ nke ọdịmma onwe onye nanị.

Site n’igosi omume rụrụ arụ na ndị nke na-asọ oyi n’asọghị ihere, ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-emebi ma ọ bụ na-ebelata mgbalị Onye Kraist na-eme ịzụlite ‘ịkpọasị maka ihe ọjọọ.’ (Emọs 5:15) Ọ na-emesi ime mmehie ike, o megidekwara nnọọ agbamume Pọl nyere ndị Efesọs nke bụ́ “ka a ghara ihotadị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu n’etiti unu, dị nnọọ ka o kwesịrị ndị nsọ; ma ọ bụ omume ihere . . . ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ, bụ́ ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị.”—Ndị Efesọs 5:3, 4.

Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-emerụ ahụ́ n’ezie. Ọ bụ irigbu ndị mmadụ, ọ na-emerụkwa emerụ. Ọ pụrụ imebi mmekọrịta mmadụ na mmadụ, na-agbanwe inwe mmekọahụ kwesịrị ekwesị ịghọ ihe nkiri. Ọ na-emerụ uche na ọnọdụ ime mmụọ nke onye na-ekiri ya. Ọ na-akwalite àgwà ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na nke anyaukwu ma na-akụziri ndị mmadụ ile ndị ọzọ anya dị ka ihe dị mma nanị iji mejuo agụụ ihe ọjọọ na-agụ ha. Ọ na-emebi mgbalị ime ihe dị mma na inwe akọ na uche dị ọcha. Nke kasị mkpa, ọ pụrụ igbochi ma ọ bụ imebi mmekọrịta ime mmuọ mmadụ na Chineke nwere. (Ndị Efesọs 4:17-19) N’ezie, ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ ọrịa ọjọọ nke a na-aghaghị izere.—Ilu 4:14, 15.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 N’ebe a, Pọl adịghị ekwu banyere agụụ dị otú o kwesịrị nke inwe mmekọahụ—ọchịchọ nke mmadụ iso di ya ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọahụ dị otú o kwesịrị.

[Foto dị na peeji nke 26]

Ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-agbanwe otú mmadụ si ele onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya anya