Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgba Chaa Chaa—Ihe Na-adọrọ Oké Mmasị n’Ụwa Nile

Ịgba Chaa Chaa—Ihe Na-adọrọ Oké Mmasị n’Ụwa Nile

Ịgba Chaa Chaa—Ihe Na-adọrọ Oké Mmasị n’Ụwa Nile

JOHN, bụ́ onye tolitere na Scotland, nọ na-enwe olileanya inweta ihe nrite lọtrị. “Ana m azụ tiketi lọtrị kwa izu,” ka ọ na-ekwu. “Ọ na-efu m nanị obere ego, ma tiketi ahụ mere ka m nwee olileanya inweta ihe nile m tụworo anya ya.”

Kazushige, bụ́ onye bi na Japan, nwere mmasị n’iji ịnyịnya asọ mpi. “Iso ndị enyi m agba chaa chaa n’ahịrị ebe a na-eji ịnyịnya asọ mpi bụụrụ m nnọọ ihe mkpori ndụ, mgbe ụfọdụ kwa ana m erite nnukwu ego,” ka o chetara.

“Bingo bụ egwuregwu kasị amasị m,” ka Linda, bụ́ onye bi n’Australia na-ekwu. “Àgwà a na-efu m ihe dị ka $30 kwa izu, ma mkpali a na-enwe mgbe e ritere ihe na-amasị m.”

John, Kazushige, na Linda lere ịgba chaa chaa anya dị ka ụdị ihe ntụrụndụ na-adịchaghị njọ. Ọtụtụ narị nde mmadụ gburugburu ụwa na-enwekwa echiche dị otú ahụ. Njụta echiche e mere na 1999 gosiri na ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị America nabatara ịgba chaa chaa. Na 1998, ndị America na-agba chaa chaa mefuru ihe dị ka ijeri $50 n’ụdị ịgba chaa chaa iwu kwadoro—karịa ngụkọta nke ihe ha mefuru n’ịgba tiketi maka ihe nkiri, n’ịzụ egwú a kpọnyere na kaseti, n’ikiri egwuregwu, n’ịga ogige ntụrụndụ, nakwa n’ịzụ egwuregwu vidio.

Dị ka nnyocha e mere na nso nso a si dị, n’ime otu afọ, ihe karịrị pasent 80 nke ndị bi n’Australia gbara chaa chaa ma ọ dịkarịa ala otu ugbo, pasent 40 gbakwara chaa chaa kwa izu. Ná nkezi, ndị toworo eto nọ ná mba ahụ na-emefu ihe karịrị $400 (U.S.) kwa afọ n’ịgba chaa chaa, ihe dị ka okpukpu abụọ nke ihe ndị Europe ma ọ bụ ndị America na-emefu, na-eme ka ndị Australia soro n’ime ndị kasị enwe mmasị n’ịgba chaa chaa n’ụwa.

Ọtụtụ ndị Japan bụ ndị pachinko, bụ́ egwuregwu obere bọl a na-ahịọgharị ahịọgharị riri ahụ́, ha na-emefukwa ọtụtụ ijeri kwa afọ n’iti ebe n’egwuregwu ahụ. Na Brazil, ọ dịkarịa ala, a na-emefu ijeri $4 n’ịgba chaa chaa kwa afọ, ihe ka ukwuu n’ime ya na-abụ n’ịgba tiketi lọtrị. Ma ọ bụghị nanị ndị Brazil nwere mmasị na lọtrị. Magazin bụ́ Public Gaming International mere atụmatụ na nso nso a na e nwere “lọtrị 306 ná mba 102.” N’ezie, ịgba chaa chaa bụ ihe na-adọrọ oké mmasị n’ụwa nile—ihe na-adọrọ oké mmasị nke ụfọdụ ndị sịrị na ọ na-eweta abamuru dị ukwuu.

Sharon Sharp, bụ́ onye nnọchiteanya nke Ụlo Ọrụ Na-enyocha Egwuregwu Ọha na Eze, kwuru na na United States, site 1964 ruo 1999, e si n’ego e nwetara na lọtrị “nweta ihe dị ka ijeri $125 maka atụmatụ mmefu ego steeti, a nọwokwa na-enweta akụkụ kasị ukwuu nke ego a kemgbe 1993.” E wepụtara ihe dị ukwuu n’ego a maka usoro mmụta ọha na eze, ogige ntụrụndụ nke steeti, na iwu ihe ọha na eze ga-eji na-eme egwuregwu. Ụlọ ọrụ ndị na-agba chaa chaa na-ewekwa ọtụtụ ndị n’ọrụ, n’Australia nanị, ha na-ewe ihe dị ka 100,000 mmadụ n’ọrụ n’achụmnta ego karịrị 7,000.

N’ihi ya, ndị na-akwado ịgba chaa chaa na-arụ ụka na e wezụga ịbụ ihe ntụrụndụ, ịgba chaa chaa iwu kwadoro na-eme ka e nwee ọrụ, na-eme ka e nweta ego site n’ụtụ isi, na-emekwa ka ọnọdụ akụ̀ na ụba ndị na-ada ada ka mma.

Ya mere, ọtụtụ ndị ga-ajụ, sị, ‘Gịnị dị njọ n’ịgba chaa chaa?’ Azịza nye ajụjụ a bụ́ nke a tụlere n’isiokwu ndị na-esonụ pụrụ nnọọ ịgbanwe otú i si ele ịgba chaa chaa anya.

[Foto dị na peeji nke 13]

John

[Foto dị na peeji nke 13]

Kazushige

[Foto dị na peeji nke 13]

Linda