Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmụta Ihe Site n’Aka Ndị Kraịst Narị Afọ Mbụ

Ịmụta Ihe Site n’Aka Ndị Kraịst Narị Afọ Mbụ

Ịmụta Ihe Site n’Aka Ndị Kraịst Narị Afọ Mbụ

“Nọrọnụ na nche: eleghị anya a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.”—Ndị Kọlọsị 2:8.

OTÚ ahụ ka Pọl onyeozi si dọọ Ndị Kraịst narị afọ mbụ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ ndị dị n’ịgbaso nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ n’ajụghị ase. Ha pụrụ ijigide nduzi ahụ a pụrụ ịdabere na ya bụ́ nke Jizọs na ndịozi ya nyere, bụ́ ozizi ndị wetawoororị ha abamuru dị ukwuu, ma ọ̀ bụkwanụ ha aghọọ anụ oriri nye nchepụta echiche na-agbanwe agbanwe nke ụmụ mmadụ, bụ́ ụzọ ndụ nke wetawoororị ọtụtụ nde mmadụ ihe mgbu na nhụjuanya.—1 Ndị Kọrint 1:19-21; 3:18-20.

Ibi Ndụ “Dị Ka Kraịst”

Ndị lụrụ agha ntụte n’ihe dị ka otu puku afọ gara aga aghọtaghị na ibi ndụ “dị ka Kraịst” pụtara ihe karịrị nnọọ nanị ikwupụta nguzosi ike n’ihe nye Jizọs Kraịst. (Matiu 7:21-23) Ọ pụtara ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ kpam kpam n’ihe ndị Jizọs kụziri dị ka a na-achọta ha n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible. (Matiu 7:15-20; Jọn 17:17) “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m,” ka Jizọs Kraịst kwuru, “unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m.” (Jọn 8:31) “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m,” ka o kwuru, “ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:35.

N’eziokwu, Ndị lụrụ agha ntụte ahụ aghọwo anụ oriri nye “aghụghọ efu dị ka ọdịnala mmadụ si dị.” Ọ bụghịkwa ihe ijuanya na a ghọgburu ndị nkịtị, mgbe ndị ndú okpukpe ha, ndị bishọp ha kpọmkwem, “ghọrọ ndị a ma ama dị ka ndị agha.” “Mmụọ yiri nke agha bịara jupụta nnọọ n’etiti ndị ụkọchukwu,” ka akwụkwọ bụ́ Cyclopedia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature, nke McClintock na Strong dere na-ekwu, “nke na mgbe ọ bụla o yiri ka à pụrụ inweta ihe ọ bụla [site n’agha], ha na-adị njikere ịlụ agha.”

Gịnị dugara n’ọnọdụ a dị mwute? Mgbe ndịozi nke narị afọ mbụ nwụsịrị, ndị ndú chọọchị si n’ezi ofufe dapụ si nnọọ n’ozizi Kraịst kpafuo, dị nnọọ ka Okwu Chineke buru n’amụma. (Ọrụ 20:29, 30) E mesịa, chọọchị nke e metọworo bịara na-esorowanye ọchịchị na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe na-akpachi anya. Na narị afọ nke anọ, e kwuru na a tọghatara Eze Ukwu Rom bụ́ Constantine gaa n’Iso Ụzọ Kraịst mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ. Mgbe ahụ, ka akwụkwọ ahụ bụ́ Cyclopedia, na-ekwu, “ojiji e ji ihe nnọchianya arụsị gbanwere ọkọlọtọ nke Obe mere ka ọ bụrụ iwu na Onye Kraịst ọ bụla ga-eje ozi dị ka onye agha.”

N’ezie, Ndị Kraịst anọghị n’okpuru iwu dị otú ahụ. Ma “arụmụka ire ụtọ” nke nkà ihe ọmụma mmadụ dugara ha n’imebi n’ụzọ dị ukwuu ihe nile Kraịst nọchiri anya ya. (Ndị Kọlọsị 2:4) Ọ dịwo anya a nọworo na-eji arụmụka ndị na-eduhie nnọọ eduhie eme ihe iji mee ka agha na esemokwu ụmụ mmadụ zie ezi. Otú ọ dị, n’ezie, onye nwere ọmịiko ma ọ bụ onye na-asọpụrụ Chineke itinye aka ‘n’arụrụala nke agha, dị ka e si mee ya n’oge gboo ma ọ bụ n’oge a,’ ka Cyclopedia ahụ na-ekwu, “apụghị ikwekọ n’ụzọ ọ bụla. . . n’ụkpụrụ nke Iso Ụzọ Kraịst.”

Okpukpe ndị na-esoghị na Krisendọm anọwokwa na-etinye aka n’agha kemgbe ọtụtụ narị afọ. Dị nnọọ ka chọọchị ndị nke Krisendọm, ha egbuwo ndị òtù nke okpukpe ha nakwa ndị ọzọ n’ihi ndịrịta iche nke mba, òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na okpukpe. Ha ejiwo ime ihe ike ma ọ bụ iyi egwu ya mee ihe iji tọghata ndị ọzọ gaa n’okpukpe ha. Iji nwaa imezu nzube ha, ụfọdụ n’ime ha ekerewo òkè ná mgbuchapụ ndị wewooro ọnọdụ n’akụkọ ihe mere eme. O nweghị ọdịiche dị n’etiti ha na okpukpe ndị nke Krisendọm.

Ịnọpụ Iche n’Ụwa

N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ ji nwee ike izere agha nkwafu ọbara na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oge ha? Ọ bụ ụkpụrụ abụọ bụ́ isi nyeere ha aka. Nke mbụ, e nwere iwu Jizọs nyere Pita onyeozi mgbe Pita ji mma agha mee ihe iji chebe ya: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya, n’ihi na ndị nile na-ebu mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) Nke abụọ bụ okwu Jizọs gwara Paịlet mgbe ọ jụrụ Jizọs ajụjụ banyere ọdịdị nke ọbụbụeze Jizọs: “Alaeze m abụghị akụkụ nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ akụkụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndụ Juu. Ma, dị ka ihe si dịrị, alaeze m esiteghị n’ebe a.”—Jọn 18:36.

Olee otú Ndị Kraịst narị afọ mbụ si tinye ụkpụrụ ndị ahụ n’ọrụ? Ha nọpụrụ iche kpam kpam n’ebe ụwa dị, na-anọpụ iche kpam kpam ma a bịa n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ihe ndị metụtara agha. (Jọn 15:17-19; 17:14-16; Jems 4:4) Ha jụrụ ibuli ngwá ọgụ megide mmadụ ibe ha. O doro anya site n’akụkọ ihe mere eme na Ndị Kraịst narị afọ mbụ esonyeghịrị òtù ndị Juu hụrụ mba ha n’anya ma ọ bụ usuu ndị agha nke eze ukwu Rom. Ka o sina dị, ha anwaghị ịgwa ndị ndú ọchịchị ihe ha ga-eme, ebe ọ bụ na nke ahụ bụ ibu ọrụ dịịrị ndị ndú gọọmenti ahụ.—Ndị Galeshia 6:5.

Justin Martyr dere na narị afọ nke abụọ O.A. banyere Ndị Kraịst ‘kpụgharịworo mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè.’ (Maịka 4:3) N’ịzaghachi ndị gbaghara ọnọdụ ahụ Ndị Kraịst weere, Tertullian jụrụ, sị: “À ga-ewere ya dị ka ihe ziri ezi n’iwu ịbụ onye na-ebu mma agha, mgbe Onyenwe anyị mere ka a mara na onye na-ebu mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha?”

Rubere Chineke Isi Dị Ka Onye Na-achị Achị Karịa Mmadụ’

Ịjụ ịga agha emeghị ka ihe dịrị Ndị Kraịst oge mbụ mfe. O megidere nkwenkwe ndị a nabatara n’oge ahụ. Celsus, bụ́ onye iro nke Iso Ụzọ Kraịst, mere nkwenkwe ha akaje. O kweere na onye ọ bụla kwesịrị ije agha mgbe ndị na-achị achị chọrọ ka e mee otú ahụ. N’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ, Ndị Kraịst oge mbụ jụrụ ịgbaso nkà ihe ọmụma ọ bụla nke mmadụ bụ́ nke megidere ozizi Kraịst. “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ,” ka ha kwuru.—Ọrụ 4:19; 5:29.

Ndịàmà Jehova n’oge a agbasowo ihe nlereanya ha. Dị ka ihe atụ, na Nazi Germany, ha jụwapụrụ isi ikere òkè n’agha igbu ọchụ nke Hitler. Ha dị njikere idi mkpagbu ọ bụla, ọbụna nwụọ ma ya dị mkpa, kama ha ga-emebi nnọpụiche ha dị ka Ndị Kraịst. A kọrọ na ndị Nazi “tụrụ otu ọkara nke ọnụ ọgụgụ ha mkpọrọ, [ha] gbukwara otu ụzọ n’ụzọ anọ egbu” n’ihi njigide ha jigidesiri ụkpụrụ Bible ike. (Of Gods and Men) N’ihi ya, n’ime ọtụtụ iri nde ndị e gburu n’Agha Ụwa nke Abụọ, ọ dịghị onye nke Onyeàmà Jehova gburu. Kama ha ga-egbu ndị ọzọ, Ndịàmà dị njikere iji ndụ ha chụọ àjà, dị ka ọtụtụ n’ime ha mere.

Ihe Anyị Pụrụ Ịmụta

Ihe ndị dị aṅaa ka ihe ndị mere n’oge gara aga pụrụ ịkụziri anyị? N’ezie, otu n’ime ha bụ nke a: Nkà ihe ọmụma mmadụ anọgidewo na-eduga n’ịkpọasị na mwụfu ọbara n’etiti mba na mba na n’etiti ụmụ mmadụ. Eklisiastis 8:9 na-ekwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.” Ihe bụ́ isi kpatara nke a dị na Jeremaịa 10:23, bụ́ ebe Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” Ee e, Chineke ekeghị ụmụ mmadụ iduzi ihe omume ha n’ụzọ na-aga nke ọma, n’adabeghịrị n’ebe ọ nọ. E nyeghị ha ikike a. Akụkọ ihe mere eme nile anwapụtawo nke ahụ.

Ugbu a, dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu, anyị apụghị ịgbanwe ihe ndị ndú nke mba dị iche iche na-eme ka ha na-ewetaghachi ọdachi ndị gaworo aga, e nyeghịkwa anyị ikike ịnwa ime ka ha kweta ịgbaso ụzọ ụfọdụ. Ma ọ dịghị anyị mkpa ịbụ ndị e mere ka ha kere òkè n’agha ha nile ma ghọọ akụkụ ha. Jizọs kwuru banyere ụmụazụ ya, sị: “Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:14) Iji zere ikere òkè n’agha nke ụwa a, anyị aghaghị ikwe ka Okwu Chineke, bụ́ Bible—ọ bụghị nkà ihe ọmụma mmadụ na-agbanwe agbanwe mgbe nile—na-eduzi ndụ anyị.—Matiu 7:24-27; 2 Timoti 3:16, 17.

Ọdịnihu Dị Ebube

Okwu Chineke a pụrụ ịdabere na ya na-eme nnọọ ihe karịrị inye ihe ọmụma banyere oge gara aga na oge dị ugbu a. Ọ na-enye nduzi e ji n’aka maka ọdịnihu. (Abụ Ọma 119:105; Aịsaịa 46:9-11) Ọ na-emekwa ka ihe bụ́ nzube Chineke maka mbara ala a doo anya. Ọ gaghị ekwe ka ụmụ mmadụ bibie elu ala site n’izuzuru na-eji ike dị ukwuu nke sayensị na nkà na ụzụ nyeworo ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọ ga-ahụ na elu ala a ghọrọ Paradaịs ahụ o zubeburu ka ọ bụrụ.—Luk 23:43.

Okwu Chineke kwuru banyere nke a, sị: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.” (Ilu 2:21, 22) Nke a ga-ewere ọnọdụ n’isi nso, n’ihi na oge nsogbu ndị a na-enye ihe àmà na anyị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ” nke ajọ usoro ihe dị ugbu a. (2 Timoti 3:1-5, 13) N’eziekwa, a gụwo ụbọchị ikpeazụ ndị a ọnụ; ha na-abịa ná njedebe. Amụma Bible na-akụziri anyị, sị: “Ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17; Daniel 2:44.

N’isi nso, Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa’ ma jiri ụwa ọhụrụ nke “ezi omume gajekwa ibi n’ime” ya dochie ụwa dị ugbu a nke ime ihe ike jụpụtara na ya. (Mkpughe 11:18; 2 Pita 3:10-13) Mgbe ahụ, n’ebe ndị fọdụrụnụ nọ, “ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” (Mkpughe 21:1-4) Agha na ime ihe ike ga-apụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi, ebe ọ bụ na a ga-emezu amụma dị n’Aịsaịa 2:4 n’ụzọ zuru ezu: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” Gị onwe gị kwa pụrụ ịnụ ụtọ ọdịnihu ahụ dị ebube nke ga-adịru ebighị ebi ma ọ bụrụ na ị mụta ihe site n’ihe ndị mere n’oge gara aga.—Jọn 17:3.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

Ndịàmà Jehova amụtawo ihe site n’aka Ndị Kraịst oge mbụ

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Jizọs sịrị na Alaeze ya abụghị akụkụ nke ụwa a

[Foto dị na peeji nke 10]

Okwu Chineke na-ekwe nkwa ndụ ebighị ebi n’izu okè n’elu ala paradaịs