Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-enwe Nchegbu Banyere Ntutu Isi Gị?

Ị̀ Na-enwe Nchegbu Banyere Ntutu Isi Gị?

Ị̀ Na-enwe Nchegbu Banyere Ntutu Isi Gị?

Ị PỤRỤ ịbụ otu n’ime ọtụtụ ndị na-ewepụta oge kwa ụbọchị ma jiri nlezianya na-enyocha ntutu isi ha n’enyo. Ma ndị ikom ma ndị inyom na-enwe mmasị ná ntutu isi ha, mgbe ụfọdụkwa, ọ pụrụ ịkpata nchegbu.

Mara Banyere Ntutu Isi Gị

Ị̀ maara ntutu ole dị gị n’isi? Ná nkezi, ha dị ihe dị ka 100,000. Otu ntutu isi na-anọgide na-eto ruo nanị ihe dị ka malite n’afọ abụọ ruo afọ isii, ọ dịghị anọgide na-eto n’akwụsịghị akwụsị. Ọ na-adapụzi, mgbe obere oge gasịkwara, ntutu isi ọhụrụ na-amalite ito n’otu oghere ahụ. A na-akpọ ogologo oge a ntutu isi na-anọru wee dapụ ma maliteghachi ito, usoro uto ntutu isi. (Lee igbe dị na peeji nke 25.) N’ihi usoro a, ọ bụrụgodị na mmadụ enweghị nsogbu n’ihe banyere ntutu isi ya, dị ka ọ na-adịkarị, ihe dị ka ntutu isi 70 ruo 100 na-adapụ kwa ụbọchị.

Gịnị na-akpata ndịrịta iche ndị anyị na-ahụ n’ụcha ntutu isi? Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-akọwa, sị: “N’ụzọ bụ́ isi, ihe na-ekpebi ụcha ntutu isi bụ otú ihe na-eji oji ma na-achatụ nchara nchara bụ́ melanin hà na otú e si kesaruo ya n’ahụ́ mmadụ.” Melanin bụ ihe na-ekpebi ụcha ihe bụ́ nke na-adị ná ntutu isi, n’akpụkpọ ahụ́, nakwa n’anya. Ọ bụrụ na ihe ahụ na-ekpebi ụcha ihe ebukwuo ibu, otú ahụ ka ntutu isi ga na-eji ojii karị. Ka ọ̀tụ̀tụ̀ melanin na-ebelata, ụcha ntutu isi na-adịgasị iche, site n’iji ojii gaa n’ịcha nchara nchara ma ọ bụ uhie uhie ma ọ bụ odo odo. Ọ bụrụ na ntutu isi enweghị melanin ma ọlị, ọ na-acha ezigbo ọcha ma na-egbuke egbuke.

Ihe na-echegbu ọtụtụ ndị, ma e wezụga ụgwa isi, bụ ntutu isi ịdapụsị adapụsị ma ọ bụ inwe isi awọ.

Ì Nwere Isi Awọ?

A na-elekarị isi awọ anya dị ka ihe na-egosi ịka nká. A na-elekarị ntutu isi dị ọcha anya dị ka ihe e ji amata ndị agadi. N’eziokwu, ntutu isi dị ọcha na-amụba ka mmadụ na-emewanye agadi. Otú ọ dị, tụkwasị n’ime agadi, a maara na ihe ndị ọzọ, dị ka ịkpara nri ókè nke ukwuu, na-akpata isi awọ. Isi awọ na-apụta n’agbanyeghị ma mmadụ ọ̀ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, n’agbanyeghịkwa ụcha ntutu isi onye ahụ, ọ bụ ezie na a pụrụ ịchọpụta ya ngwa ngwa n’ebe ndị nwere ntutu isi na-eji oji nọ.

N’ihi na ha nwere isi awọ, a pụrụ ile ụfọdụ ndị anya dị ka ndị meworo agadi karịa otú ha meworo n’ezie, ọ na-akpatakwara ha ahụ́ erughị ala. N’aka nke ọzọ, e nwere ndị, n’ihi enweghị isi awọ, bụ́ ndị na-enwe nchegbu banyere otú ọdịdị ha na-esighị kwekọọ n’afọ ndụ ha.

Isi ịcha awọ apụtaghị na ntutu isi anwụọla. N’eziokwu, akụkụ a na-ahụ anya nke ntutu isi nile anwụọlarị anwụ. Ntutu isi nke ọ bụla na-esi n’ime isi erupụta. A na-akpọ akụkụ a úkwù ntutu, ọ bụkwa ya bụ nanị akụkụ na-adị ndụ. Úkwù ntutu a na-arụ ọrụ dị ka ihe na-emepụta ntutu. Mgbe e mepụtara ntutu site ná nkewasị nke mkpụrụ ndụ ndị dị n’úkwù ntutu na-ekewasị ngwa ngwa, ọ na-amịrị melanin, bụ́ nke mkpụrụ ndụ ndị na-ekpebi ụcha ihe na-emepụta. N’ihi nke ahụ, ọ bụrụ na mkpụrụ ndụ ndị na-ekpebi ụcha ihe akwụsị imepụta melanin, ntutu ga na-acha ọcha.

Ọ dịbeghị onye maara ihe mere mkpụrụ ndụ ndị na-ekpebi ụcha ihe na-eji akwụsị na mberede imepụta melanin. Ya mere, a chọpụtabeghị ihe ngwọta na-adịgide adịgide iji gbochie isi ịcha awọ. A makwaara na mkpụrụ ndụ ndị na-ekpebi ụcha ihe, bụ́ ndị kwụsịworo ịrụ ọrụ pụrụ ịmaliteghachi ịrụ ọrụ. N’ụzọ na-akpali mmasị, Bible kwuru ọtụtụ ihe banyere ntutu isi, otu n’ime ihe atụ Jizọs nyere na-ezokwa aka ná ntutu isi na-acha ọcha. O kwuru, sị: “Ị pụghị ime ka otu ntutu chaa ọcha ma ọ bụ jie oji.” (Matiu 5:36) Okwu ndị a na-egosi na isi ịcha awọ abụwo ihe a maara kemgbe dị ka ihe karịrị ike mmadụ igbochi ma ọ bụ ịkwụsị.

Ụfọdụ ndị na-anwale ọgwụgwọ ndị ka ọhụrụ, dị ka ịgba ọgwụ melanin. Ndị ọzọ na-ahọrọ iteji ntutu isi ha, n’ezie nke a amaliteghị taa. Ndị Grik na ndị Rom oge ochie jiri ihe a na-eji eteji ntutu isi mee ihe. Ndị Ijipt oge ochie jiri ọbara oké ehi tejie ntutu isi ha. E nwere ihe ndekọ kwuru na Herọd Onye Ukwu, bụ́ onye dịrị ndụ n’oge Jizọs Kraịst, tejiri isi awọ ya iji zochie afọ ndụ ya.

Ma, mmadụ ịnọgide na-eteji ntutu isi ya na-ewe oge na mgbalị, ọ pụkwara ịkpatara ụfọdụ ndị nsogbu n’akpụkpọ ahụ́ ma ọ bụ mmetụta ndị na-adịghị mma. Ọ bụrụgodị na i kpebie iteji isi awọ gị, oge ga-eru mgbe ị ga-achọ ịkwụsị, mgbe ahụkwa, obi abụọ adịghịkwa ya na gị na ya ga-alụwa mgbe ọ ga-etopụtawa. N’akụkụ na-agba ume, isi awọ pụrụ ịdị mma ile anya ma mee ka i nwee ùgwù ị na-enwetụbeghị. Bible na-ekwu, sị: “Okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.”—Ilu 16:31.

Ntutu Isi Ịbụ nke Na-ejughị Eju na Isi Nkwọcha

Nsogbu ndị ọzọ a na-enwekarị ná ntutu isi bụ ntutu isi ịbụ nke na-ejughị eju na isi nkwọcha. Nsogbu ndị a dị adị eri oge. N’Ijipt oge ochie, ihe ndị e ji egbochi isi nkwọcha na-agụnye abụba ọdụm, nke enyi mmiri, nke agụ iyi, nke nwamba, nke agwọ, na nke ụgbala bekee. Taa, ihe ndị a sị e ji elekọta ntutu na elu isi, bụ́ ndị a na-azọrọ na ha dị irè, jupụtara n’ahịa, a na-emefukwa ego buru ibu na ha kwa afọ.

A na-enwe isi nkwọcha mgbe ntutu isi na-adịghịzi eto nke ọma. Nsogbu anụ ahụ́ ndị dị ka erighị nri na-edozi ahụ́, oké ahụ́ ọkụ dịtere aka, ma ọ bụ ụdị ọrịa akpụkpọ ahụ́ ụfọdụ pụrụ inwe mmetụta n’usoro dị otú o kwesịrị nke ntutu ji eto. Afọ ime na ịmụ nwa pụkwara inwe mmetụta n’usoro uto nke ntutu isi, nke na ọtụtụ ntutu isi na-adapụ tupu ntutu ọhụrụ etopụta. Otú ọ dị, mgbe ihe ndị na-akpata ya na-adịghịzi, ụdị ndapụsị a nke ntutu isi na-akwụsị, usoro uto nke ntutu isi na-adịghachikwa otú o kwesịrị.

A na-akpọ ụdị ọzọ nke ndapụsị ntutu isi alopecia. * Ọtụtụ mgbe, mgbe e nwere ụdị nsogbu a, ntutu na-adapụsị n’akụkụ dịgasị iche iche n’isi. Nnyocha ahụ́ ike ndị e mere na nso nso a na-enye echiche na ma eleghị anya, alopecia bụ ọrịa nke nsogbu metụtara usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ.

A na-akpọ ụdị ejughị eju nke ntutu isi nke a kasị enwe isi nkwọcha ndị ikom. Dị ka aha ya na-egosi, ọ bụ ndị ikom ka ọ na-eme. Ọ na-amalite n’ihu isi irichasịwa ma ọ bụ ntutu dị n’opu isi ịbụ nke na-ejukwaghị eju, ọ na-ejikwa nke nta nke nta eme otú ahụ. N’ebe ahụ o metụtara, usoro uto nke ntutu isi na-aghọ nke na-adịghịzi otú o kwesịrị, n’ikpeazụkwa, ọ ga-akwụsị ito eto. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica na-akọwa, sị: “N’akụkụ isi ebe ahụ o metụtara, ntutu isi ndị dị nwịrị nwịrị bụ́ ndị a na-akpọ vellus na-anọchi ndị ahụ toro ogologo, siri ike, dị oji dịbu n’ebe ahụ.” Nke a pụtara na ka usoro uto nke ntutu isi na-aga n’ihu, ntutu isi na-abụwanye nke na-ejughị eju na nke na-adịghị anọte aka, n’ikpeazụkwa, ọ dịghịzi nke ga-etolitenụ. Nke a bụ n’ihi ihe ndị e ketara eketa nakwa n’ihi mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ hormone nke na-adị n’ahụ́ ụmụ nwoke.

Isi nkwọcha ndị ikom pụrụ ibido nnọọ ngwa ngwa ọbụna mgbe mmadụ dị afọ iri na ụma, ma o yikarịrị ka ọ̀ ga-eme mgbe mmadụ nọ ná ngwụsị afọ ndị nke 30 ya ma ọ bụ ndị nke 40 ya. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ikom na-enwe ụdị ndapụsị a nke ntutu isi, ọ̀tụ̀tụ̀ o ji eme na-adịgasị iche site n’agbụrụ gaa n’agbụrụ nakwa site n’otu onye gaa n’ọzọ. N’ụzọ dị mwute, ka ọ dịgodị, e nwebeghị ihe ngwọta doro anya e nwere maka ọrịa a. Ụfọdụ ndị pụrụ ịhọrọ ikpu wig ma ọ bụ ka e tinyere ha ntutu isi. Nye ọtụtụ ndị, ilekọta ntutu isi ndị fọdụrụ afọdụ nke ọma iji belata ndapụsị nke ntutu isi pụrụ inye aka.

Ikwu na ntutu isi mmadụ ejughị eju apụtachaghị na ntutu isi onye ahụ na-adapụsị adapụsị. Kama nke ahụ, ọ pụrụ ịpụta na ntutu isi nke ọ bụla na-adịwanye gịrịgịrị, n’ihi ya, ntutu isi ahụ adịghịzi eju eju. Olee otú otu ntutu isi na-aha n’ibu? Dị ka otu nnyocha si kwuo, ọ pụrụ ịdịgasị iche, site na micron 50 n’ebe ụfọdụ ndị nọ ruo 100 micron n’ebe ndị ọzọ nọ. * Ntutu isi na-aghọwanye nke na-ejughị eju ka mmadụ na-emewanye agadị. Ọ pụrụ iyi ihe dị nta ma e nwee ọdịiche dị nanị micron ole na ole. Ma biko cheta na e nwere 100,000 ntutu isi. Ya mere, ntutu isi nke ọ bụla ịdịwanye gịrịgịrị na-eme nnọọ ka ntutu isi n’ozuzu ya ghara iju eju.

Lekọta Ntutu isi Gị

Ntutu isi na-etoru ihe karịrị ụzọ atọ n’ime ụzọ asatọ nke otu inch kwa ọnwa, ọ bụkwa otu n’ime akụkụ ahụ́ ndị kasị eto ngwa ngwa. Ọ bụrụ na e jikọta uto nke ntutu nile, ọ na-eru ihe karịrị mita 20 kwa ụbọchị!

Ọ bụ ezie na a chọpụtabeghị ọgwụgwọ bụ ọkpọka maka isi ịcha awọ na isi nkwọcha, anyị pụrụ ime ihe dị ukwuu iji lekọta ntutu isi nke anyị nwere enwe. Iri nri na-edozi ahụ́ otú kwesịrị ekwesị na ime ka ọbara na-erukwu n’isi dị oké mkpa. Ịkpara nri ókè nke ukwuu ma ọ bụ iri nri na-adịghị edozi ahụ́ pụrụ ime ka mmadụ nwee isi awọ na ntutu isi na-ejughị eju ngwa ngwa karị. Ndị ọkachamara na-atụ aro ka anyị na-asa isi anyị mgbe mgbe, ma na-ekwo elu isi anyị aka, na-ezere ịka ya mbọ. Nke a na-eme ka ọbara na-eru n’isi nke ọma. Mgbe ị sasịrị ntutu isi gị, ṅachaa ya nke ọma.

Ejila oké ike na-abọ isi gị. Ọ bụrụ na i nwere ntutu isi ogologo, ọ kasị mma ịghara ibu ụzọ bọọ isi gị malite n’úkwù ya ruo n’ọnụ ya. Kama nke ahụ, buru ụzọ jide ntutu isi gị aka, ma jiri mbọ́ bọgasịa ebe ọnụ ha ndị kekọtasịrị ibe ha. Mgbe ahụzi, bọọ ya site n’etiti ruo n’ọnụ ya. N’ikpeazụ, jiri nwayọọ rudaa ntutu isi gị ala ma bọzie site n’úkwù ruo n’ọnụ ya.

Ịhụ awọ n’isi gị ma ọ bụ ọtụtụ ntutu si n’isi gị dapụsịa pụrụ ịkpatara gị nchegbu. Ma, cheta na ndị ọzọ adịkarịghị enwe nchegbu banyere ntutu isi gị dị ka ị na-enwe. Ọ dị gị n’aka ikpebi ma ị̀ ga-eteji ntutu isi gị ma ọ bụ na ị gaghị eteji ya, ma ị̀ ga-ekpu wig ma ọ bụ na ị gaghị ekpu, ma ọ bụ ma ị̀ ga-achọ ọgwụgwọ ndị ọzọ. Otú ọ sọrọ ntutu isi ya na-acha, otú ọ sọkwara ya ya hara, ihe dị mkpa bụ idebe ya ọcha na ilekọta ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Lee Teta! (Bekee) nke April 22, 1991, peeji nke 12.

^ par. 20 Otu micron bụ otu ụzọ n’ime otu puku milimita.

[Igbe/Ihe Osise dị na peeji 25]

USORO UTO NTUTU ISI

Ntutu isi anyị tosịa, ọzọ amaliteghachi n’otu ebe ahụ. Ọ gụnyere oge uto, obere oge mgbanwe, na oge ọ na-akwụsịcha ito. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-akọwa, sị: “Ntutu isi adịghị eto n’oge ọ bụla ọ nọ n’oge nkwụsịcha uto, bụ́ mgbe ụ́kwù ya na-eyi okpiri. Ntutu nke ochie ahụ na-anọgide n’ebe ahụ ntutu na-erubanye ruo mgbe usoro uto ọzọ malitere. N’oge uto ahụ, ntutu nke ochie ahụ na-adapụ ka ntutu ọhụrụ na-etopụta ma nupụ ya n’ebe ahụ ntutu na-erubanye.” N’oge ọ bụla, ọ bụ ezie na ihe dị ka pasent 85 ruo 90 nke ntutu isi nọ na-eto, pasent 10 ruo pasent 15 ga-akwụsị ito, 1 pasent ga-anọkwa n’oge mgbanwe.

[Ihe Osise]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Oge mmalite uto

Oge uto na-aga n’ihu

Ebe ntutu na-erubanye

akwara

ihe na-emepụta mmanụ

ntutu isi

Oge nkwụsịcha uto

Oge nkwụsị uto

Oge mmaliteghachi uto

[Foto dị na peeji nke 22]