Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Jehova Bụ Onye Na-agụgụ M Obi”

“Jehova Bụ Onye Na-agụgụ M Obi”

“Jehova Bụ Onye Na-agụgụ M Obi”

Okwu ndị ahụ dị n’elu bụ nsụgharị nke ụkpụrụ nduzi nke Eze Charles nke Itoolu nke Sweden. Ọ na-agụ n’asụsụ Latin, sị, “Iehovah solatium meum.” Eze a so n’usoro ndị eze chịrị Sweden, site na 1560 ruo 1697, bụ́ ndị mere ka aha Chineke pụta ìhè ná mkpụrụ edemede Hibru ma ọ bụ Latin ná mkpụrụ ego, n’ihe nrite ọla, ma ọ bụ n’ụkpụrụ nduzi onwe onye. Charles nke Itoolu guzobekwara Usoro Ndị Eze nke Jehova. N’ụbọchị e chiri ya eze na 1607, Charles yi ihe olu a kpọrọ ihe olu Jehova.

Gịnị dugara ndị eze a ime otú ahụ? Ndị ọkà mmụta kweere na ọ bụ ndị Òtù Calvin nọ na Europe n’oge ahụ, nakwa nkwanye ùgwù ha nwere n’ebe Bible dị, kpaliri ha. Ebe ọ bụ na ha bụ ndị eze gụrụ akwụkwọ nke ọma n’oge ntụte ahụ, ihe àmà na-egosi na ha maara aha aka Chineke, bụ́ Jehova, nke ọma n’asụsụ Latin. Obi abụọ adịghị ya na ụfọdụ ghọtara na aha ahụ pụtara ọtụtụ puku ugboro n’ihe odide Bible Hibru mbụ.

Ọ bụ ihe e dekọrọ nke ọma nke na n’akụkụ dị iche iche nke Europe na narị afọ nke 16 na nke 17, a na-edekarị aha ahụ bụ́ Jehova ná mkpụrụ ego nakwa n’ihe nrite ọla, tinyere ụlọ ọha mmadụ na-eji eme ihe nakwa na chọọchị dị iche iche. Ihe àmà na-egosi na okwu Chineke kwuru n’onwe ya, bụ́ nke e hotara n’Ọpụpụ 3:15, bụ nke a nabatara ma na-akwanyere ùgwù n’ebe ahụ nile: “Jehova . . . bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi.”

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

IHE OLU NA BAAJỊ NKE USORO NDỊ EZE NKE JEHOVA, 1606, ndị e ji ọlaedo, enamel na nkume kristal na garnet mee

EZE ERIK NKE IRI NA ANỌ 1560-1568

EZE CHARLES NKE ITOOLU 1599-1611 (nwanne nwoke nke Erik nke Iri na Anọ)

EZE GUSTAVUS NKE ABỤỌ ADOLPH 1611-1632 (nwa nwoke nke Charles nke Itoolu)

EZE NWANYỊ CHRISTINA 1644-1654 (nwa nwanyị nke Gustavus nke Abụọ Adolph)

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ihe olu: Livrustkammaren, Stockholm Sverige; mkpụrụ ego: Kungl. Myntkabinettet, Sveriges Ekonomiska Museum