Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ncha—“Ọgwụ Mgbochi Ọrịa I Ji Aka Gị Enye Onwe Gị”

Ncha—“Ọgwụ Mgbochi Ọrịa I Ji Aka Gị Enye Onwe Gị”

Ncha—“Ọgwụ Mgbochi Ọrịa I Ji Aka Gị Enye Onwe Gị”

“IHE nke abụọ kasị egbu ụmụaka n’ụwa abụghị ịba, ma ọ bụ ụkwara nta, ma ọ bụkwanụ ọrịa AIDS. Ọ bụ . . . afọ ọsịsa,” ka magazin bụ́ The Economist na-akọ. Ma, ọtụtụ n’ime ụmụaka ndị a o gburu gaara anọ ndụ taa ma a sị na ha na ezinụlọ ha ji ncha na-akwọ aka ha mgbe nile.

Ndị na-eme nchọpụta n’Ụlọ Akwụkwọ London nke A Na-amụ Banyere Ịdị Ọcha na Ọgwụ nke Ebe Okpomọkụ chọpụtara na “ịkwọ aka nke ọma pụrụ iji pasent 43 belata afọ ọsịsa,” ka The Economist na-ekwu. “Ọ pụkwara ibelata ọrịa ndị na-emetụta oghere e si ekuru ikuku, bụ́ ọrịa kasị egbu ụmụaka. Nnyocha sara mbara e mere n’etiti ndị agha America gosiri na ịkpọ imi na ịkwa ụkwara ji pasent 45 belata mgbe ndị agha nọ na-akwọ aka ugboro ise n’ụbọchị.” Ihe ka ọtụtụ n’ezinụlọ ndị bi n’ala ndị ka na-emepe emepe na-azụtali ncha. N’ihi ya, a na-akọwa ya n’ụzọ dabara adaba dị ka “ụdị ọgwụ mgbochi ọrịa i ji aka gị enye onwe gị.” Ọ bụkwa nke na-adịghị egbu mgbu!

Bible n’onwe ya na-agbakwa ume banyere ịdị ọcha. “Ka anyị sachapụ onwe anyị ihe nile pụrụ imerụ akpụkpọ ahụ́ ma ọ bụ mmụọ,” ka 2 Ndị Kọrint 7:1 na-ekwu. (The New English Bible) Ọ bụ ezie na Chineke na-elekwasị ịdị ọcha ime mmụọ anyị anya n’ụzọ bụ́ isi, ọ na-elekwa ịdị ọcha anụ ahụ́ anya dị ka ihe dị mkpa. (Levitikọs, isi nke 12-15) N’ezie, ọ dịghị atụ anyị anya n’aka imebiga ihe ókè n’ihe banyere ịdị ọcha. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị kwesịrị ime ka ọ bụrụ àgwà anyị ịdị na-akwọ aka mgbe anyị gasịrị mposi, mgbe anyị sasịrị nwatakịrị ahụ́ ma ọ bụ gbanwee ya ákwà, tupu anyị esiwe ma ọ bụ riwe nri, nakwa n’oge ọ bụla ọzọ bụ́ mgbe o yiri nnọọ ka anyị nwere ike ibunye ndị ọzọ nje nkịtị ma ọ bụ nje virus ndị dị ize ndụ. Site n’ịdị na-akwọ aka mgbe nile, anyị na-egosi ịhụnanya Ndị Kraịst n’ebe ndị òtù ezinụlọ anyị na ndị nile anyị na ha pụrụ imekọ ihe nọ.—Mak 12:31.