Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Kwesịrị Iji Ịga Ije Emega Ahụ́?

È Kwesịrị Iji Ịga Ije Emega Ahụ́?

È Kwesịrị Iji Ịga Ije Emega Ahụ́?

O YIRI ka ọtụtụ nde mmadụ hà na-eche na ọ bụrụ na ha esoghị n’òtù mmega ahụ́, na-etinye oge dị ukwuu n’inwe mmega ahụ́, mgbe ahụ, na ọ dịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime iji rite uru ahụ́ ike a na-enweta site ná mmega ahụ́. Ma, nke ahụ abụghị eziokwu. Dr. Russell Pate nke Mahadum South Carolina na-ekwu, sị: “Echere m na anyị aghaghị ikwupụta nkwado anyị nye echiche ahụ bụ́ na iji nwayọọ gagharịa gburugburu ebe obibi mgbe e risịrị nri bụ ihe dị nnọọ mma omume.”

Ma, ịga ije ọ̀ ga-abara gị uru dị ukwuu otú ahụ? Uru ahụ́ ike ịga ije bara ò hiri nne n’ezie?

Ịga Ije Bụ Ezigbo Ọgwụ

Onye Gris bụ́ dibịa bụ́ Hippocrates lere ịga ije anya dị ka “ọgwụ kasị mma mmadụ nwere.” N’ezie, e nwere ilu na-ekwu, sị, “Enwere m ndị dọkịta abụọ, ụkwụ aka ekpe m na ụkwụ aka nri m.” Ịga ije ọ̀ na-adị mma n’ahụ́ otú ahụ n’ezie?

Nnyocha ụfọdụ e mere na-enye echiche na ndị na-aga ije ugboro ugboro pụrụ ịbụ ndị na-agaghị na-arịakarị ọrịa otú ndị na-adịghị agagharị agagharị ga na-arịa. Nnyocha ndị ahụ na-egosi na ịga ije na-ebelata ohere e nwere ịrịa ọrịa obi na ọrịa strok. Ọ pụrụ ịchụ ọrịa shuga site n’ime ka ahụ́ nwee ike ịdị na-eji mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ insulin eme ihe n’ụzọ ka mma. Ọ na-eme ka ọkpụkpụ nọgide na-esi ike, si otú ahụ na-egbochi ọrịa ọkpụkpụ bụ́ osteoporosis. Ịga ije na-eme ka mmadụ nwee ume, dị gara gara, ma nwee ike. Ọ na-eme ka mmadụ felata, ịdị arọ ya adịkwa otú kwesịrị ekwesị. Tụkwasị na nke a, ịga ije na-eme ka mmadụ na-ehi ụra ka mma, na-eme ka ọ na-eche echiche nke ọma karị, ọ pụkwara ọbụna inye aka n’ịkwụsị ịda mbà n’obi.

Afọ ụfọdụ gara aga, a kọrọ na ndị nchọpụta nọ na Mahadum Ebe Ndịda California chọpụtara na ịga ije ruo minit 15 na-ebelata nchekasị na nrụgide karịa ka ọgwụ na-akụjụtụ ahụ́ si ebelata ha! Dị nnọọ ka mmega ahụ́ ndị ọzọ, ịga ije na-eme ka ahụ́ na-emepụta endorphin, bụ́ mmiri ọgwụ ụbụrụ nke na-ebelata ihe mgbu ma na-eme ka ahụ́ dị jụụ, na-eme ka mmadụ bụrụ onye ahụ́ ruru ala na onye ahụ́ dị mma.

Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Medical Post nke Canada si kwuo, ọbụna ịgagharị nnọọ maka ntụrụndụ pụrụ iweta abamuru ahụ́ ike. Otu nnyocha nke e bipụtara na magazin bụ́ The New England Journal of Medicine na-egosi na ịga ije ruo nanị mita 800 n’ụbọchị na-eme ka a dịkwuo ogologo ndụ. Nnyocha e mere na nso nso a na-enye echiche na imega ahụ́ ugboro atọ n’ụbọchị, ruo minit 10 n’oge nke ọ bụla, ga-arụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe imega ahụ́ ruo minit 30 n’otu mgbe ga-arụ n’ahụ́ gị. Ya mere, ị pụrụ iche banyere ịkwụsị ụgbọala gị n’ebe dịpụtụrụ adịpụ site n’ebe ị na-aga ma jirizie ụkwụ gatọpụ nke fọrọ afọ. Ma ọ bụkwanụ, mgbe ụfọdụ n’ụbọchị, ị pụrụ ịga ije ruo ebe na-adịchaghị anya.

Ọbụna a pụrụ inweta abamuru ka ukwuu site n’ịgasi ije ike. Dr. Carl Caspersen nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa na United States nke dị n’Atlanta, Georgia, kwuru, sị: “Ime mgbanwe site n’ịbụ onye na-adịghị agagharị agagharị gaa n’ịgasi ije ike ruo ọkara awa n’ọtụtụ ụbọchị n’izu pụrụ ibelata nnọọ ohere i nwere [ịrịa ọrịa].” Ihe dịkwa nnọọ mma banyere ịga ije bụ na ndị nọ n’afọ ndụ nile na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị ahụ́ dị otú ọ bụla, pụrụ ime ya. Ọzọkwa, ọ dịghị achọ mmadụ inweta ọzụzụ pụrụ iche ma ọ bụ nkà egwuregwu—ọ bụ nanị akpụkpọ ụkwụ dị mma.

Nụrụ Ụtọ Ịga Ije Dị Mma

Yiri uwe ga-adị gị mma n’ahụ́ nke na-adịghị akpa gị akpà. Iji mee ka ahụ́ kporo gị ọkụ, yikwasị ya uwe ndị ọzọ dị mfe myipụ. Yiri akpụkpọ ụkwụ na-adịghị eke gị eke nke na-adịghị arọ, nke na-adịghịkwa ogo, nke e ji ihe dị nro rụọ. Ha kwesịrị ịkatụ akpụkpọ ụkwụ ndị ị na-eji akpọchi akpọchi. Ọ bụrụ na i mere atụmatụ ịga ije ruo ihe karịrị ọkara otu awa ma mmiri agaghị adị n’ebe ị na-aga, ị pụrụ iji ihe na-adịghị arọ gbara mmiri ị ga-eji gaa. Mee ka ahụ́ gbagaa gị site n’iji nwayọọ na-aga n’ime minit ise mbụ. Ehurula ehuru, mee ka ikpere aka gị na ikpere ụkwụ gị hulatatụ ehulata, kwụchitụ aka gị, ma akwụchisila ya ike.

Mgbe ahụ́ gbagara gị, malite ịgasi ije ike otú i si aga, na-aga ya otú ikiri ụkwụ gị ga-ebu ụzọ ruo ala tupu mkpịsị ụkwụ gị eruo. Ka nke a wee kwe gị omume, ọ dị gị mkpa iyi akpụkpọ ụkwụ dị nro. Ihe a nile hà na-ada gị ka ihe siri ike ncheta? Atụla uche—ọtụtụ mmadụ si otú a aga ije. Ije gị kwesịrị inye gị ohere inwe mkparịta ụka zuru ezu n’emeghị ka ị na-eku ume ọkụ. Ọ bụrụ na ị ka bụ onye ọhụrụ n’ịga ụdị ije a, jiri nke nta nke nta na-amụba oge i ji aga ya, ebe ị na-agaru, na otú i si agasi ike. Jiri ya nwayọọ site n’ịghara ịdị na-agasichazi ike ma i ruwe ebe ị na-aga. *

Obi mmadụ ịkụsikwu ike na mmadụ iku ume ọkụ ọkụ karị bụ ihe ndị dị otú kwesịrị, ndị na-egosi na mmadụ megara ahụ́, dịkwa ka obere ọsụsọ bụ. Uru ahụ́ pụrụ ịfụ gị ụfụ n’ụbọchị ole na ole ndị mbụ. Chọpụta otú ije ị na-aga si emetụta ahụ́ gị ma mee ihe banyere ya. Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị̀ na-adọgbu onwe gị, jiri nwayọọ na-aga ma ọ bụ zurutụ ike. Otú ọ dị, ọ bụrụ na i nwee ihe àmà ndị dị ka obi nsekọta ma ọ bụ obi mgbu, obi ịkụsi ike, nsogbu siri ike nke iku ume ọkụ ọkụ, ajụ obubu, ma ọ bụ agbọ onunu, kwụsị ịga ije ma gaa ozugbo ka dọkịta lebara gị anya. *

Ebe ọ bụ na ịga ije adịghị enyecha nsogbu n’ahụ́, ọ pụrụ ịba uru n’ụzọ ụfọdụ karịa ihe ndị dị ka ịgba ọsọ na ihe omume ndị na-eme ka mmadụ na-eku ume nke ọma. N’ihi ya, a dịghị enwecha ohere nke inwe nsogbu ná nkwonkwo nakwa n’uru ahụ́. N’ezie, ịga ije bụ ihe omume mbụ ndị ọkachamara ná mmega ahụ́ na-atụ aro ya. Ya mere, maka ọdịmma gị, na-aga ije!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Maka ndị chọrọ ka calorie dị ha n’ahụ́ belata, iji minit 12 ruo minit 9 aga otu kilomita ga-eme ka pasent 30 nke calorie dị ha n’ahụ́ pụọ n’ime otu minit. Ịgasikwu ike site n’iji minit 9 ruo minit 7 aga otu kilomita ga-eme ka ihe ruru pasent 50 nke calorie dị ha n’ahụ́ pụkwuo n’ime otu minit. Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-aga ije iji nwee ahụ́ ike na-eji ihe dị ka minit 7 ruo minit 9 aga otu kilomita.

^ par. 13 Ọ pụrụ ịkasị mma ịkpọtụrụ dọkịta tupu ị malite usoro mmega ahụ́, karịsịa ma ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa obi, ọbara mgbali elu, ma ọ bụ ọrịa ụfọdụ ndị ọzọ.

[Igbe dị na peeji nke 31]

IHE ỤFỌDỤ NDỊ Ị GA-EME NA NDỊ Ị NA-AGAGHỊ EME MGBE Ị NA-AGA IJE

● Ehurula ehuru mgbe ị na-aga ije, na-elepụ anya n’ihu

● Agasila ije ike. Echela na ị ghaghị ịgasi nnọọ ije ike nke na ị ga na-eku ume ọkụ ọkụ wee ghara inwe ike ịkparịta ụka otú i si akparịta

● Amatịla ụkwụ gị gabiga ókè. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgasikwu ike, na-azọpụ ụkwụ gị ngwa ngwa karị, ma amatịla ya nke ukwuu

● Na-efe aka gị ihu na azụ, n’ekogaghị aka gị ekoga. Zere ịdị na-efe aka gị akụkụ akụkụ

● Ebula ụzọ zọruo ọbụ ụkwụ gị n’ala. Buru ụzọ zọruo ikiri ụkwụ gị n’ala ma zọtuzie ọbụ ụkwụ gị na mkpịsị ụkwụ gị

● Echela na ọ dị gị mkpa ibu ibu. Ọ na-eme ka mmadụ ghara ịga ije otú o kwesịrị isi aga ma na-enye akwara jikọrọ uru ahụ́ na ọkpụkpụ ọrụ karịrị ya