Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Agha Nuklia—Olee Ndị Na-eyi Egwu Ya?

Agha Nuklia—Olee Ndị Na-eyi Egwu Ya?

Agha Nuklia—Olee Ndị Na-eyi Egwu Ya?

“Iji ngwá agha nuklia kpochapụ ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ ime eme n’ezie. O kwere omume taa, . . . n’agbanyeghị na Agha Nzuzo ahụ biri ihe karịrị afọ iri gara aga.”—Onye Bụbu Onyeisi nke Ụlọ Ọrụ Nchebe nke United States bụ́ Robert S. McNamara nakwa James G. Blight, bụ́ prọfesọ nke mmekọrịta mba na mba n’Ụlọ Akwụkwọ Watson A Na-amụ Banyere Mba Ndị Ọzọ.

N’AFỌ 1991 bụ́ mgbe Agha Nzuzo ahụ biri, a hịgara aka ogologo nke klọọkụ ụbọchị mbibi ahụ a ma ama azụ ka ọ fọdụ minit 17 tupu “etiti abalị.” E sere klọọkụ ụbọchị mbibi ahụ n’ihu magazin bụ́ Bulletin of the Atomic Scientists, ọ bụkwa ihe nnọchianya nke ókè e chere na ụwa rurula nso n’ịlụ agha nuklia (etiti abalị). N’oge ahụ, a hịgakwuru aka ogologo nke klọọkụ ahụ azụ pụọ n’etiti abalị karịa ka e metụworo kemgbe a malitere iji klọọkụ ahụ eme ihe n’afọ 1947. Otú ọ dị, kemgbe afọ 1991, aka ogologo ahụ amalitekwala ịga ihu ọzọ. Dị ka ihe atụ, na February 2002, a hịgakwuru aka klọọkụ ahụ ihu o wee fọdụzie minit asaa tupu etiti abalị, nke bụ́ nke ugbo atọ a hịgara aka klọọkụ ahụ ihu kemgbe Agha Nzuzo ahụ bisịrị.

N’ihi gịnị ka ndị bipụtara magazin ahụ nke na-akọ banyere nkà mmụta sayensị ji chee na ọ dị mkpa ịhịga aka klọọkụ ahụ ihu? N’ihi gịnị ka ha ji chee na egwu agha nuklia ka dị? Oleekwa ndị na-eyi udo egwu?

Ihe Nzuzo nke Dị ná “Mbelata” Ahụ

“A ka nwere ihe karịrị ngwá agha nuklia 31,000,” ka magazin ahụ bụ́ Bulletin of the Atomic Scientists na-akọwa. Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Pasent 95 nke ngwá agha ndị a dị na United States na Russia, ihe karịkwara 16,000 abụrụwo ndị a kwadebere maka mgbapụ.” Ụfọdụ ndị pụrụ ịchọpụta enweghị nkwekọ o yiri ka è nwere n’ọnụ ọgụgụ bọmbụ nuklia ndị dịnụ. Ọ̀ bụ na nke ọ bụla n’ime mba ndị a bụ́ dike ná ngwá agha nuklia ekwughị na ha ebelatala bọmbụ ndị ha nwere ruo 6,000?

Ihe ndị na-esonụ na-ekpughe ihe nzuzo nke dị ná “mbelata” ahụ. Otu akụkọ si n’aka òtù Carnegie Endowment for International Peace na-akọwa, sị: “Ọnụ ọgụgụ nke bọmbụ 6,000 ndị a ga-enwe bụ ndị e ji ụkpụrụ ndekọ ihe a kapịrị ọnụ bụ́ nke e kwekọrịtara ná [Mkparịta Ụka Banyere Mbelata nke Ngwá Agha Ndị Na-aga Kpọmkwem n’Ebe A Tụrụ Aka]. Mba abụọ ahụ ka ga-enwe ọtụtụ puku ngwá agha ndị ọzọ na-adịghị aga n’ebe dị anya nakwa ndị e chekwara maka ọdịnihu.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Dị ka Bulletin of the Atomic Scientists si kwuo, “ọtụtụ n’ime bọmbụ ndị United States, ma ọ bụrụ na ọ bụghịdị ha nile, bụ́ ndị a tọturu n’ebe e gwunyegasịrị ha maka mgbapụ, ka a ga-echekwa n’ebe a na-akwakọba ngwá agha (tinyere ihe dị ka bọmbụ 5,000 ndị a kwakọbawororịị) kama ịtụghasị ha.”

Ya mere, tụkwasị n’ọtụtụ puku bọmbụ nuklia ndị ahụ na-aga kpọmkwem n’ebe a tụrụ aka, bụ́ ndị dị njikere maka iji ha mee ihe, ndị ka dịkwa n’ebe a kwakọbara ha—ndị a pụrụ ịnọ n’otu kọntinent gbaga kpọmkwem na kọntinent ọzọ—e nwere ọtụtụ puku bọmbụ nuklia nakwa ngwá agha nuklia ndị ọzọ a rụrụ iji mee ihe n’ebe ndị na-adịghị anya. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mba abụọ ahụ bụ́ dike ná ngwá agha nuklia ka nwere ọtụtụ ngwá agha nuklia n’ebe ha na-akwakọba ngwá agha bụ́ ndị zuru iji kpochapụ mmadụ nile nọ n’ụwa ọtụtụ ugboro! Inwe ọtụtụ ngwá agha dị ize ndụ otú ahụ na-akpata ihe iyi egwu ọzọ—ịgbapụ mgbọ ogbunigwe nuklia n’ọghọm.

Agha Nuklia Ọghọm

“Ndị agha na-achịkwa ngwá agha nuklia nke [United States] abụwo ndị na-agbaso usoro ime ihe nke bụ́ ‘gbapụ ngwá agha ozugbo e nwere ihe àmà,’” ka Robert S. McNamara na James G. Blight, bụ́ ndị e hotara ihe ha kwuru na mbụ, na-ekwu. Gịnị ka nke a pụtara? “Bọmbụ anyị dị njikere maka mgbapụ n’otu oge ahụ bọmbụ ndị Russia ka nọ n’elu,” ka ha na-akọwa, na-agbakwụnye, sị: “N’usoro ime ihe a, ihe karịrị minit 15 apụghị ịgafe site n’oge e nwetara ihe àmà mbụ nke mwakpo ndị Russia ruo oge anyị ga-agbapụ mgbọ ogbunigwe anyị.” Dị ka otu onye bụbu onye agha na-ahụ maka ịgbapụ mgbọ ogbunigwe United States nke na-aga kpọmkwem n’ebe a tụrụ aka, si kwuo, “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbọ ogbunigwe nile dị n’ala dịcha njikere maka mgbapụ n’ime minit abụọ.”

Ọnọdụ a nke ịdị njikere na-eme ka e nwee ihe ize ndụ na a pụrụ ịgbapụ mgbọ ogbunigwe n’ọghọm mgbe e nwetara ihe àmà na-abụghị eziokwu. “N’ihe karịrị otu oge,” ka akụkọ gbara na magazin bụ́ U.S.News & World Report na-akọwa, “e nwetawo ntụziaka hiere ụzọ, bụ́ ndị kwuru ka a gbapụ bọmbụ nuklia n’oge ndị America na-amụgharị ihe ndị metụtara ịgbapụ bọmbụ nuklia.” E nwewokwa ịdọ aka ná ntị hiere ụzọ otú ahụ na Russia. Mgbe ụgbọelu rọket ndị Norway ji eme nnyocha nyere ihe mgbaàmà na-ezighị ezi n’afọ 1995, president ndị Russia malitere ime ndokwa ka a gbapụ mgbọ ogbunigwe nuklia ha.

Ọnọdụ a nke ịdị njikere n’oge nile maka ịgbapụ bọmbụ nuklia na-eme ka ndị nọ n’ọnọdụ ime mkpebi na-enwe nrụgide dị ukwuu. Ọ dabara nnọọ nke ọma na n’oge ndị gara aga, ndị ọchịagha chọpụtara na ịdọ aka ná ntị ndị ahụ hiere ụzọ, ruokwa ugbu a, e gbochiwo agha nuklia. Banyere otu nke mere n’afọ 1979, otu onye nnyocha kọwara, sị: “Ihe gbochiri ndị America [ịgbapụ] bọmbụ ha bụ ihe mgbaàmà ịdọ aka ná ntị e nwetara n’oge site n’ígwè ọrụ satellite ha, bụ́ nke gosiri na ọ dịghị mgbọ ogbunigwe ndị Soviet dị n’elu.” Otú ọ dị, ka oge na-aga, ígwè ọrụ satellite ndị na-enye ihe mgbaàmà dị otú ahụ n’oge, na-amalite imebi. Ndị nnyocha na-enwe nchegbu na “ihe ka ọtụtụ n’ígwè ọrụ satellite ndị Russia, bụ́ ndị na-enye ihe mgbaàmà n’oge, akwụsịla ịrụ ọrụ ma ọ bụkwanụ si n’ụzọ ha kpafuo.” Ya mere, dị ka otu osote onyeisi ndị agha mmiri laworo ezumike nká na United States kwuru ọtụtụ afọ gara aga, “ohere e nwere na n’ihi nghọtahie, inye onye na-ekwesịghị ekwesị ikike ma ọ bụ n’ihi ihe ọghọm, otu mba ga-agbapụ bọmbụ ma ọ bụ mgbọ ogbunigwe nuklia ha mgbe mba nke ọzọ na-emebeghị ihe ọ bụla, dị ukwuu taa dị ka ọ dịworo mgbe ọ bụla ọzọ gara aga.”

Mba Ọhụrụ Ndị Batara n’Òtù Nuklia

Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ngwá agha nuklia dị n’aka mba abụọ ahụ bụ́ dike ná ngwá agha nuklia, e nwekwara mba ndị ọzọ nwere ngwá agha nuklia dị ka China, France, na Great Britain. N’oge na-adịbeghị anya, India na Pakistan sonyere ná mba ndị a e kwupụtaworo na ha nwere ngwá agha nuklia, bụ́ ndị a na-akpọ ndị òtù nuklia. E wezụga mba ndị a, a na-akọwakarị ọtụtụ mba ndị ọzọ, gụnyere Izrel, dị ka mba ndị na-achọ inweta—ma ọ bụ ma eleghị anya ndị nwetawororịị—ngwá agha nuklia.

Esemokwu ọ bụla nke metụtara nke ọ bụla n’ime mba ndị ahụ so n’òtù nuklia, gụnyere mba ndị nke batara ọhụrụ, pụrụ ime ka e jiri ngwá agha nuklia lụọ agha. “Nsogbu ahụ India na Pakistan nwere . . . bụ ọnọdụ mere ka ọ fọdụ nnọọ nke nta ka mba abụọ lụọ agha nuklia kemgbe e nwesịrị Ọgba Aghara Cuba ahụ nke Metụtara Mgbọ Ogbunigwe,” ka Bulletin of the Atomic Scientists na-akọwa. N’ịhụ na agwọ nọ n’akịrịka ná mmalite afọ 2002, ọtụtụ mmadụ tụwara egwu na a pụrụ iji ngwá agha nuklia lụọ agha.

Tụkwasị na nke a, nrụpụta a rụpụtara ngwá agha ọ gwụrụ mba ndị ọzọ etinyekwuola ihe n’ohere e nwere na a ga-eji bọmbụ nuklia lụọ agha. Ka ọ na-akọ banyere otu akụkọ nzuzo e si na Pentagon nweta, akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kwuru na “iji ngwá agha nuklia bibie nkwakọba nke ngwá agha ndị iro bụ́ ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa, ngwá agha ndị e ji kemikal mee na ngwá agha ọ gwụrụ mba ndị ọzọ” pụrụ isonyewo n’atụmatụ ngwá agha nuklia nke ndị America.

Mwakpo ndị na-eyi ọha egwu wakporo United States na September 11, 2001, tinyekwuru ihe n’egwu ụwa na-atụ na a pụrụ iji ngwá agha nuklia mee ihe. Ọtụtụ ndị kweere ugbu a na òtù ndị na-eyi ọha egwu na-anwa ịkpụpụta—ma ọ bụ ikekwe na ha enweelarị—ngwá agha nuklia. Olee otú nke ahụ ga-esi kwe omume?

Ndị Na-eyi Ọha Egwu na “Bọmbụ Akpakara Timgwom”

Ọ̀ pụrụ ikwe mee iji ngwá ndị a zụrụ n’ahịa nzuzo rụpụta bọmbụ nuklia? Dị ka magazin bụ́ Time si kwuo, azịza ya bụ ee. Magazin ahụ kọrọ banyere otu ìgwè e guzobere iji gbochie ndị na-eyi ọha egwu iji ngwá nuklia mee ihe. Ka ọ dị ugbu a, ìgwè ahụ “akpụpụtawo ihe karịrị [bọmbụ] iri na abụọ” ha nọ n’ụlọ mee, site ‘n’iji ngwá nkà na ụzụ ndị ha zụtara n’ụlọ ahịa a na-ere ngwá electronic na ụdị ihe na-enye ngwá agha nuklia ike bụ́ ndị a na-ere n’ahịa nzuzo,’ mee ihe.

Ịchịsa ngwá agha nuklia na ịtụghasị ngwá agha nuklia amụbakwuwo ohere e nwere na a pụrụ izu ha n’ohi. “Ịtọtu ọtụtụ puku ngwá agha nuklia ndị Russia site n’ebe e gwunyegasịrị ha n’ihe ndị e ji agbapụ ha, n’ụgbọelu nakwa n’ụgbọ okpuru mmiri ndị e ji atụ ha, bụ́ ndị a na-eche nche nke ọma, ma dọwazie ha n’ebe na-adịchaghị nchebe, ga-eme ka ndị na-eyi ọha egwu, bụ́ ndị kpọrọ ekwo nkụ, nwee oké ọchịchọ nke ịga ebe ndị ahụ buru ha,” ka magazin Time na-ekwu. Ọ bụrụ na otu obere ìgwè mmadụ enweta akụkụ dị iche iche nke ngwá agha nuklia a tụghasịrị atụghasị ma tụkọtaghachi ha, ìgwè dị otú ahụ pụrụ isonye n’òtù nuklia n’oge na-adịghị anya!

Magazin bụ́ Peace na-azọrọ na ọ dịghịdị mkpa ịtụkọtaghachi bọmbụ nuklia iji sonye n’òtù nuklia. Nanị ihe dị mkpa bụ inwetazu uranium ma ọ bụ plutonium ndị pụrụ ịgbawa agbawa. Magazin ahụ na-ekwu, sị: “Ndị na-eyi ọha egwu bụ́ ndị nwere uranium ọgbara ọhụrụ a pụrụ iji mere ngwá agha, pụrụ ịkpata mgbawa n’ụzọ dị mfe nanị site n’itinye otu ọkara ya n’ime ọkara nke ọzọ.” Olee ókè a chọruru ngwá nuklia dị otú ahụ? Dị ka magazin ahụ si kwuo, “kilogram atọ ga-ezu.” Nke ahụ fọrọ nke nta ka ọ haruo ka ngwá nuklia ndị a pụrụ iji mee ngwá agha bụ́ ndị e nwetara n’aka ndị ahịa iwu e jidere na Czech Republic n’afọ 1994!

Akpakara timgwom nke nuklia pụrụ ịghọ ụdị ọzọ nke ngwá agha nuklia. “Ihe na-enye ndị ọkachamara nsogbu n’obi n’ezie bụ ngwakọta na-egbu egbu a na-agwakọta ihe mkpofu na-ewepụta ụzarị na bọmbụ nkịtị,” ka magazin bụ́ The American Spectator na-ekwu. A maara ụdị ngwá agha a na-ebusasị ụzarị na-egbu egbu dị ka bọmbụ akpakara timgwom. Olee otú ha dịruru n’ize ndụ? Bọmbụ akpakara timgwom na-eji “bọmbụ nkịtị ndị bụ́ ọkpọka ebusasị ụzarị ndị na-egbu nnọọ egbu n’ebumnobi nke ibunye ndị a tụrụ ya nsí kama ịgbarisị ha ma ọ bụ regbuo ha n’ọkụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ IHT Asahi Shimbun na-akọwa. Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Mmetụta ha na-enwe n’ahụ́ ndị mmadụ pụrụ isite n’ọrịa ụzarị na-egbu egbu na-akpata gaa n’ọnwụ ahụhụ na-eji nwayọọ egbu.” Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị na-ekwu na akpakara timgwom nke nuklia e nwetara n’ụzọ dị mfe agaghị akpata mmerụ ahụ́ dị ukwuu, onwunwe e nwere ngwá agha nuklia ndị pụrụ ịgbawa agbawa n’ahịa nzuzo na-eme ka ọtụtụ ndị na-enwe nchegbu. Dị ka nnyocha e mere gburugburu ụwa n’oge na-adịbeghị anya na-egosi, ihe karịrị pasent 60 nke ndị nile zaghachirinụ chere na ndị na-eyi ọha egwu ga-eji ngwá agha nuklia mee ihe n’ime afọ iri na-abịanụ.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụwa ka nọ n’egwu agha nuklia. Akwụkwọ akụkọ Britain bụ́ Guardian Weekly nke January 16-22, 2003, kwuru, sị: “Ohere e nwere na [United States] ga-eji ngwá agha nuklia mee ihe, dị ukwuu ugbu a karịa oge ọ bụla ọzọ malite n’oge kasị njọ nke agha nzuzo ahụ. . . . [United States] ji nke nta nke nta na-amụba ihe ndị ha lere anya dị ka ihe ndị ga-akpali ha iji ngwá agha nuklia mee ihe.” Ya mere, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịjụ, sị: À pụrụ izere agha nuklia? È nwere olileanya ọ bụla dịnụ na a ga-enwe ụwa nke egwu agha nuklia na-agaghị adị na ya? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Igbe dị na peeji nke 6]

Ọ̀ Bụ Ọgbọ Nuklia nke Abụọ?

Ka ọ na-ede ihe na magazin bụ́ The New York Times Magazine, Bill Keller bụ́ onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ (onye bụzi onyeisi oche ndị editọ nke akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times) kwupụtara echiche bụ́ na mba nile abanyewo n’ọgbọ nuklia nke abụọ. Nke mbụ dịgidere ruo January 1994, mgbe Ukraine kwetara inyefe ngwá agha ndị ha nwetara site n’ebe bụbu Soviet Union. N’ihi gịnị ka o ji ekwu banyere ọgbọ nuklia nke abụọ?

Keller na-ede, sị: “Ọ bụ mgbawa a nụrụ n’okpuru ala nke ọzara Rajasthani n’afọ 1998 malitere ọgbọ nke abụọ nke nuklia, bụ́ mgbe gọọmenti ọhụrụ nke India nke dị n’aka ndị Hindu nwalere bọmbụ nuklia ise. Mgbe izu abụọ gasịrị, Pakistan sochiri.” Gịnị mere nnwale ndị a ji dị iche ná ndị nke a nwalere n’ọgbọ nuklia bu ụzọ? “Ndị a bụ ngwá agha nuklia e bu otu ógbè n’obi kpọmkwem wee rụọ.”

Ya mere, ụwa ọ̀ pụrụ inwe mmetụta nke anọghị n’ihe ize ndụ maka inwekwu mba abụọ bụ́ isi sonyere n’òtù nuklia? Keller gara n’ihu ikwu, sị: “Mba ọhụrụ nke ọ bụla nwetara ngwá agha nuklia na-amụba ohere e nwere na a ga-alụ agha nke ga-emetụta mba nwere ngwá agha nuklia.”—“The Thinkable” (Ihe A Pụrụ Ichetụ n’Echiche), The New York Times Magazine, May 4, 2003, peeji nke 50.

Ọnọdụ ahụ bịara ka njọ mgbe a nụrụ na ọ pụrụ ịbụ na North Korea nwere “nnọọ plutonium nwere ike izu iji rụpụta bọmbụ nuklia isii ndị ọhụrụ. . . . Kwa ụbọchị, a na-enwewanye ihe ize ndụ na North Korea ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ịrụpụta ngwá agha nuklia ndị ọhụrụ, ikekwekwa, ọbụna nwalee otu n’ime ha iji mara otú ọ ga-esi rụọ ọrụ.”—The New York Times, July 18, 2003.

[Foto dị na peeji nke 7]

Onye ọrụ gọọmenti egosi bọmbụ nuklia nke yiri igbe

[Ebe E Si Nweta Foto]

AP Photo/Dennis Cook

[Foto dị na peeji nke 7]

Ígwè ọrụ “satellite” ndị na-enye ihe mgbaàmà n’oge, bụ́ ndị meworo ochie, emebiwala

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto NASA

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 5]

Ụwa: Foto NASA