Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Agha Nuklia—À Pụrụ Izere Ya?

Agha Nuklia—À Pụrụ Izere Ya?

Agha Nuklia—À Pụrụ Izere Ya?

“Ndị ahụ ga-azụ onwe ha makpuokwa amakpu dị ka atụrụ, ọ dịghịkwa onye ga na-eme ka ha maa jijiji.”—Zefanaịa 3:13.

MMADỤ nile chọsiri ike ka e nwee ụwa ebe ha na-agaghị na-atụ egwu agha nuklia. Otú ọ dị, n’ịhụ ọnọdụ ụwa a nọ na ya n’ezie, ọtụtụ ndị enweghị olileanya na ihe ga-emecha dị mma. “Echiche nke ịchịkwa, ibelata na imesị kpochapụ ngwá agha nuklia aghọwala ihe na-adịghị abatazi United States na mba ụwa n’obi,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian Weekly na-ekwu.

Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-ehota mgbalị mba ụfọdụ meworo n’akụkụ a. Dị ka ihe atụ, a na-eme atụmatụ na United States nanị mefuru ijeri dollar 2.2 n’otu afọ iji gbochie agha nuklia. N’ezie, nke a abụghị obere ego. Ka o sina dị, ịmara na otu mba ahụ na-emefukwa ihe dị ka ijeri dollar 27 kwa afọ iji kwadebe maka ịlụ agha nuklia, na-akpasu ọtụtụ ndị iwe.

Gịnị banyere nkwekọrịta udo dị iche iche? Mgbalị ndị dị otú ahụ hà pụrụ iweta olileanya?

Nkwekọrịta Dị Iche Iche Maka Nchịkwa Ngwá Agha Nuklia

Kemgbe a malitere inwe bọmbụ nuklia, e nwewo ọtụtụ nkwekọrịta bụ́ ndị e bu n’uche iji chịkwaa ma ọ bụ kpaa ókè n’ọnụ ọgụgụ ngwá agha nuklia e nwere. Ụfọdụ n’ime ha bụ Nkwekọrịta Maka Ịkwụsị Mmụba Ngwá Agha Nuklia, Mkparịta Ụka Banyere Ịkpa Ókè n’Ọnụ Ọgụgụ Ngwá Agha Ndị Na-aga Kpọmkwem n’Ebe A Tụrụ Aka, Mkparịta Ụka Banyere Mbelata nke Ngwá Agha Ndị Na-aga Kpọmkwem n’Ebe A Tụrụ Aka, nakwa Nkwekọrịta Ka Zuo Ezu Maka Ịmachibido Ịnwale Ngwá Agha Nuklia. Ọ̀ bụ na ndị a adịbeghị irè n’ime ka a gharazie ịtụ egwu agha nuklia?

Nkwekọrịta ọ bụla na-adabere ná nkwa ndị so mee nkwekọrịta ahụ kwere onwe ha. Dị ka ihe atụ, ịga nke ọma nke Nkwekọrịta Maka Ịkwụsị Mmụba Ngwá Agha Nuklia, bụ́ nke e nwere n’afọ 1970, bụ́ nke e nwerela mba 187 bịanyere aka na ya ka ọ na-erule December 2000, dabeere n’ọchịchọ obi nke mba ndị nwere na ndị na-enweghị ngwá agha nuklia bụ́ ndị bịanyere aka ná nkwekọrịta ahụ. Ọ bụ ezie na nkwekọrịta ahụ machibidoro mba ndị na-enweghị ngwá agha nuklia ịkpụpụta ma ọ bụ inweta ngwá agha nuklia, ọ chọrọ ka mba ndị nwere ngwá agha nuklia gbalịsie ike ibibi ngwá agha nuklia ha. Nke a ọ̀ dịwo irè? “N’agbanyeghị na isite ná Nkwekọrịta Maka Ịkwụsị Mmụba Ngwá Agha Nuklia achịkwa ngwá agha nuklia abụtụghị nke na-enweghị ntụpọ, ọ dịwo irè n’igbochi iji nkà na ụzụ na ụlọ ọrụ ndị nkịtị na-anọ emepụta ngwá nuklia, bụ́ ndị a na-elegide anya, mee ihe n’ụzọ ndị ọzọ,” ka Carey Sublette na-akọwa n’akwụkwọ bụ́ “Nuclear Weapons Frequently Asked Questions” (Ngwá Agha Nuklia Ajụjụ Ndị A Na-ajụkarị).

N’agbanyeghị na nkwekọrịta ahụ enwewo ihe ịga nke ọma ụfọdụ, “o mebeghị ka . . . ọtụtụ mba kwụsị ịchọ inwe ngwá agha ndị a, n’ọnọdụ ụfọdụ, ha enwetawokwa ya,” ka Sublette na-ekwu. Otú ọ dị, ọ na-ekwu na ha enwewo ike ime nke a nanị site n’iji ụzọ nzuzo na-akpụpụta ngwá agha nuklia n’ebe ọzọ na-abụghị n’ụlọ ọrụ ndị ahụ ndị na-ahụ maka Nkwekọrịta ahụ na-enyocha. N’ebe a, anyị na-ahụ ka nkwekọrịta ndị dị n’etiti mba na mba si bụrụ nke na-esighị ike: Ịdị irè nke nkwekọrịta ọ bụla na-adabere n’ikwesị ntụkwasị obi nke ndị mere nkwekọrịta ahụ. Ànyị pụrụ nnọọ ịnakwere nkwa ụmụ mmadụ? Azịza ya doro anya ka anyị na-ahụ ihe ndị bụ́ eziokwu banyere akụkọ ụmụ mmadụ.

Ya mere, olee ebe anyị pụrụ iche ihu maka olileanya?

Iche Echiche n’Ụzọ Ọhụrụ

Na December 2001, mmadụ 110 bụ́ ndị nwetara ihe nrite Nobel kwenyere ma bịanye aka ná nkwupụta nke na-agụ, sị: “Nanị olileanya e nwere maka ọdịnihu dabeere ná mba ụwa ịgbakọ aka mee ihe, bụ́ nke ọchịchị onye kwuo uche ya kwadoro. . . . Iji dịgide ndụ n’ụwa nke anyị gbanweworo, anyị aghaghị ịmụta iche echiche n’ụzọ ọhụrụ.” Ma, olee ‘ụzọ ọhụrụ’ nke iche echiche a chọrọ? Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na ndị ahụ ji ngwá agha nuklia ha eyi udo ụwa egwu ga-amụta ụzọ ọhụrụ nke iche echiche?

Bible na-adụ anyị ọdụ, sị: “Atụkwasịla obi n’ahụ́ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ́ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.” (Abụ Ọma 146:3) N’ihi gịnị? Bible na-aza, sị: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Ee, isi ihe kpatara ya bụ na e nyeghị ụmụ mmadụ ikike nke ịchị ụwa n’udo. Dị ka Bible na-ekwu, “mmadụ nwere ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.”—Eklisiastis 8:9.

Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ enweghị ike ịchị ụwa, ònye nwere ike ịchị ya? Bible na-ekwe nkwa na a ga-enwe udo n’okpuru ọchịchị a pụrụ ịtụkwasị obi bụ́kwa nke ruru eru. A na-ezo ọchịchị a aka n’ime Bible dị ka Alaeze Chineke, n’amaghịkwa na ọ bụ ihe ha na-eme, ọtụtụ nde mmadụ ekpewo ekpere maka ọchịchị a mgbe ha na-ekpe Ekpere Onyenwe Anyị: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe, . . . ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) Alaeze a nwere Jizọs Kraịst, bụ́ Onyeisi Udo, dị ka Eze na-achị ya. N’ịkọwa ịchịisi ya, Bible na-ekwu, sị: “Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ.”—Aịsaịa 9:6, 7.

Ọ bụrụgodị na “ndị a maara aha ha,” ma ọ bụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ndị ọchịchị bụ́ mmadụ amụtaghị ụzọ ọhụrụ a nke iche echiche, ị pụrụ ịmụta ya. Ndịàmà Jehova enyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka ịnakwere ozi olileanya nke Bible site n’usoro ọmụmụ Bible n’efu. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inwetakwu ihe ọmụma, biko kpọtụrụ ndị na-ebipụta magazin a, ma ọ bụkwanụ ị pụrụ ịga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị.

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

N’okpuru ọchịchị Alaeze Chineke, ụwa agaghịzi na-atụ egwu agha nuklia