Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji kwere Ka Anyị Na-ata Ahụhụ?

N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji kwere Ka Anyị Na-ata Ahụhụ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji kwere Ka Anyị Na-ata Ahụhụ?

“Chineke nọ n’eluigwe ebe ihe nile dị mma, ebe anyị nọ n’ụwa ebe a na-ata ahụhụ.”—Mary. *

A MỤRỤ ndị na-eto eto nke oge a n’ime ụwa nke nwere obi ọjọọ. Ajọ ala ọma jijiji nakwa ọdachi ndị na-emere onwe ha, bụ́ ndị na-egbu ọtụtụ puku ụmụ mmadụ yiri ihe a na-ahụkarị. Agha na mwakpo nke ndị na-eyi ọha egwu bụzi isiokwu ndị a na-anụkarị n’akụkọ. Ọrịa, ime mpụ, na ihe mberede na-ata isi ndị anyị hụrụ n’anya. Nye Mary, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru n’elu, ọdachi rutere ya nnọọ ahụ́. O kwuru okwu iwe ahụ mgbe nna ya nwụsịrị.

Mgbe ọdachi dakwasịrị anyị, ọ bụ ihe e bu pụta ụwa inwe nkụda mmụọ, inwe mfu, ma ọ bụ ọbụna iwe iwe. ‘N’ihi gịnị ka nke a ji mee?’ ka ị pụrụ iche. ‘Gịnị mere o ji bụrụ m ka o mere?’ ma ọ bụ ‘Gịnị mere o ji mee ugbu a?’ Ajụjụ ndị dị otú ahụ chọrọ azịza ndị rijuru afọ. Ma iji nweta azịza ndị ziri ezi, anyị aghaghị ịga n’ebe kwesịrị ekwesị. N’eziokwu, dị ka nwa okorobịa aha ya bụ Turrell si kwuo, mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-enwe “mwute dị ukwuu nke na ha anaghị enwe ike iche echiche nke ọma.”

Ya mere, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ịchọ ụzọ ị ga-esi medata obi gị ka i wee nwee ike iche echiche—n’ụzọ ziri ezi.

Iche Ọnọdụ Ọjọọ Ihu

Ọ pụrụ ịbụ ihe na-adịghị enye obi ụtọ ichebara echiche, ma ọnwụ na ahụhụ bụ ihe ndị na-eme eme ná ndụ. Job kwutere ya mgbe ọ sịrị: “Mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.”—Job 14:1.

Bible na-ekwe nkwa ụwa ọhụrụ nke ‘ezi omume gaje ibi n’ime ya.’ (2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4) Otú ọ dị, tupu e nweta ọnọdụ ọma ndị dị otú ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ aghaghị ịgabiga oge a ga-enwe mmebi iwu n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-enwetụbeghị na mbụ. “Mara nke a,” ka Bible na-ekwu, “na n’ụbọchị ikpeazụ, oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị.”—2 Timoti 3:1.

Ogologo oge hà aṅaa ka a ga-enweru ihe isi ike a? Ndị na-eso ụzọ Jizọs jụkwara otu ajụjụ ahụ. Ma Jizọs agwaghị ha ụbọchị ma ọ bụ awa kpọmkwem mgbe usoro ihe a nke jupụtara n’ahụhụ ga-abịa ná njedebe. Kama nke ahụ, Jizọs sịrị: “Onye tachiworo obi ruo ọgwụgwụ bụ onye a ga-azọpụta.” (Matiu 24:3, 13) Okwu Jizọs na-agba anyị ume ilepụ nnọọ anya n’ihu. Anyị aghaghị ịdị njikere ịtachi obi n’ọtụtụ ọnọdụ ndị dị njọ tupu ọgwụgwụ ahụ emesịa bịa.

Ụta Ọ̀ Dịịrị Chineke?

Ya mere, ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya iwesa Chineke iwe n’ihi na ọ na-ekwe ka anyị na-ata ahụhụ? Ezi uche adịghị ya ime otú ahụ ma ọ bụrụ na i cheta na Chineke ekwewo nkwa ịkwụsị ahụhụ nile. Ọ bụghịkwa ihe ezi uche dị na ya iche na ọ bụ Chineke na-akpata ihe ọjọọ ndị na-emenụ. Ọtụtụ ọdachi ndị na-eme na-abụ nnọọ n’ihi ihe ndabara. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ifufe feturu osisi, o wee merụọ mmadụ ahụ́. Ndị mmadụ pụrụ ịkpọ nke a aka ọrụ Chineke. Ma, ọ bụghị Chineke kwaturu osisi ahụ. Bible na-enyere anyị aka ịghọta na ihe ndị dị otú ahụ bụ nnọọ ihe ndị dị mwute “mgbe na ihe ndapụta” na-akpata.—Eklisiastis 9:11.

Mmadụ pụkwara ịta ahụhụ n’ihi enweghị ezi uche. Ka e were ya na otu ìgwè ndị ntorobịa ṅụrọrọ mmanya anya ma buru ụgbọala pụọ. Ha enwee ajọ ihe mberede. Ònye ka ụta dịịrị? Ọ̀ bụ Chineke? Ee e, ha ghọtara ihe ha kụrụ n’ihi enweghị ezi uche ha.—Ndị Galeshia 6:7.

‘Ma ike Chineke ó rughị eru iji kwụsị ahụhụ ugbu a?’ ka ị pụrụ ịjụ. Ndị ikom ụfọdụ kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Bible chere echiche banyere nke ahụ. Onye amụma bụ́ Habakọk jụrụ Chineke, sị: “N’ihi gịnị ka Ị na-elegide ndị na-aghọgbu aghọgbu? n’ihi gịnị ka Ị na-agba nkịtị mgbe onye na-emebi iwu na-eloda onye dị ezi omume karịa ya?” Otú ọ dị, Habakọk ejighị ọkụ ọkụ ruo ná nkwubi okwu. O kwuru, sị: “M ga-echekwa ịhụ ihe Ọ ga-ekwu megide m.” N’ikpeazụ, Chineke mesiri ya obi ike na Ya ga-akwụsị ahụhụ na “mgbe a kara aka.” (Habakuk 1:13; 2:1-3) Ya mere, anyị aghaghị inwe ndidi, na-echere ka Chineke kwụsị ajọ omume n’oge kara aka.

Na-ezere ịdị ngwa n’ikwubi na, n’ụzọ ụfọdụ, Chineke chọrọ ka anyị na-ata ahụhụ ma ọ bụ na ọ na-ele anyị ule. Ọ bụ eziokwu na ahụhụ pụrụ ime ka àgwà ndị kasị mma anyị nwere pụta ìhè. Ọ bụkwa eziokwu na Bible na-ekwu na ọnwụnwa ndị Chineke kwere ka anyị nweta pụrụ ịnụcha okwukwe anyị. (Ndị Hibru 5:8; 1 Pita 1:7) N’ezie, ọtụtụ mmadụ, bụ́ ndị gabigaworo ọnwụnwa ma ọ bụ ọnọdụ ndị na-akpasasị uche, na-aghọ ndị na-enwe ndidi na ọmịiko karị. Ma anyị ekwesịghị ikwubi na ọ bụ Chineke kpatara ahụhụ ha na-ata. Echiche dị otú ahụ adịghị egosi na mmadụ bu ịhụnanya na amamihe Chineke n’uche. Bible na-ekwu hoo haa, sị: “N’oge ọnwụnwa, ka onye ọ bụla ghara ịsị: ‘Ọ bụ Chineke na-anwa m.’ N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” N’ụzọ megidere nke ahụ, “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè” sitere n’aka Chineke!—Jems 1:13, 17.

Ihe Mere Chineke Ji Kwere Ka Ihe Ọjọọ Dịgide

Ya mere, olee ebe ihe ọjọọ si abịa? Cheta na Chineke nwere ndị na-emegide ya—karịsịa, “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Chineke tinyere nne na nna mbụ anyị, bụ́ Adam na Iv, n’ime ụwa nke na-enweghị nsogbu. Ma Setan mere ka Iv kwenye na ihe ga-akara ya mma ma ọ hapụ ịnọ n’okpuru ịchịisi Chineke. (Jenesis 3:1-5) N’ụzọ dị mwute, Iv kwenyeere Setan n’ụgha ahụ ọ ghaara ya ma nupụrụ Chineke isi. Adam sonyeere ya ná nnupụisi a. Gịnị si na ya pụta? ‘Ọnwụ gbasara ruo mmadụ nile,’ ka Bible na-ekwu.—Ndị Rom 5:12.

Kama ịkwụsị nnupụisi a ozugbo site n’ibibi Setan na ndị na-eso ụzọ ya, Chineke hụrụ na o kwesịrị ekwesị ikwere ka oge gafee. Gịnị ka nke ahụ ga-emezu? Otu ihe bụ na ọ ga-egosi na Setan bụ onye ụgha! Ọ ga-emekwa ka e nwee ọtụtụ ihe àmà ndị na-egosi na ụmụ mmadụ inwere onwe ha pụọ n’ebe Chineke nọ adịghị ihe ọzọ ọ ga-arụpụta ma ọ́ bụghị ịla n’iyi. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe meworonụ kpọmkwem? “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ọzọkwa, ‘mmadụ enwewo ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.’ (Eklisiastis 8:9) Okpukpe ụmụ mmadụ na-ezi ihe ndị na-emegide ibe ha. Omume ụmụ mmadụ ajọgbuola onwe ya ná njọ. Ọchịchị ụmụ mmadụ anwalewo ụdị ịchịisi ọ bụla a pụrụ ichetụ n’echiche. Ha na-abịanye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta dị iche iche, na-emekwa iwu dị iche iche, ma ha enwebeghị ike igbo mkpa na-akpa ndị nkịtị. Agha ndị a na-alụ emewo ka nhụsianya na-arịwanye elu.

N’ụzọ doro anya, ọ dị anyị mkpa ka Chineke mee ihe iji kwụsị ajọ omume! Ma nke a ga-eme nanị n’oge Chineke kara aka. Tupu mgbe ahụ, anyị nwere ihe ùgwù ịkwado ịchịisi Chineke site n’irube isi n’iwu nakwa n’ụkpụrụ ya dị ka ha dị na Bible. Mgbe ihe ndị dị njọ mere, anyị pụrụ inweta nkasi obi n’olileanya ahụ e ji n’aka nke bụ́ ịdị ndụ n’ime ụwa nke nsogbu na-adịghị na ya.

Ọ Bụghị Nanị Gị

Otú o sina dị, mgbe anyị na-ahụju anya, anyị pụrụ ịdị na-ajụ, sị ‘Gịnị mere o ji bụrụ m?’ Otú ọ dị, Pọl onyeozi na-echetara anyị na ọ bụghị nanị anyị na-ata ahụhụ. Pọl na-ekwu na “ihe nile e kere eke nọgidere na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.” (Ndị Rom 8:22) Ịmara eziokwu a pụrụ inyere gị aka ịnagide ahụhụ. Dị ka ihe atụ, mwakpo ahụ ndị na-eyi ọha egwu wakporo New York City na Washington, D.C na September 11, 2001, kpasasịrị Nicole uche. “Obi mapụrụ m, ụjọ ejidekwa m,” ka ọ na-ekwu. Ma mgbe ọ gụrụ ihe ndekọ ndị kwuru otú ụmụnna ya Ndị Kraịst si nagide ọdachi ahụ, echiche ya gbanwere. * “M bịara ghọta na ọ bụghị nanị m ka o metụtara. Amalitewo m ịgbake nke nta nke nta n’ihe mgbu na mwute m na-enwe.”

N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịchọ onye ị pụrụ ịgwa okwu—nne ma ọ bụ nna gị, enyi gị tozuru okè, ma ọ bụ Onye Kraịst bụ́ okenye. Ịkọrọ onye ị tụkwasịrị obi otú obi dị gị ga-eme ka i nweta “okwu ọma” nke ga-agba gị ume. (Ilu 12:25) Otu Onye Brazil bụ́ Onye Kraịst na-eto eto na-echeta, sị: “Nna m nwụnahụrụ m afọ itoolu gara aga, amakwaara m na otu ụbọchị, Jehova ga-akpọlite ya n’ọnwụ. Ma otu ihe nke nyeere m aka bụ idetu otú obi dị m n’akwụkwọ. Ọzọkwa, mụ na ndị enyi m bụ́ Ndị Kraịst kwurịtara banyere ihe ndị ahụ.” Ì nwere ndị “enyi na-ahụ n’anya” ị pụrụ ịkọsara nchegbu ndị ị na-enwe? (Ilu 17:17) Ọ bụrụ otú ahụ, rite uru site n’enyemaka ha ga-eji ịhụnanya nye gị! Atụla ụjọ ịkwa ákwá ma ọ bụ ikwupụta nchegbu ndị ị na-enwe. Ọbụnadị “anya mmiri gbara Jizọs” n’otu oge n’ihi ọnwụ otu enyi ya!—Jọn 11:35.

Bible na-emesi anyị obi ike na otu ụbọchị, a ga-eme ka anyị ‘nwere onwe anyị pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure’ ma nụ ụtọ “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Ndị Rom 8:21) Tupu oge ahụ eruo, ọtụtụ ndị bụ́ ezigbo mmadụ pụrụ ịta ahụhụ. Nweta nkasi obi site n’ịmara ihe na-akpata ahụhụ ndị dị otú ahụ—nakwa na ha agaghị adịte aka.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 21 Lee usoro isiokwu bụ́ “Obi Ike N’agbanyeghị Ọdachi,” ná mbipụta Teta! nke January 8, 2002.

[Foto dị na peeji nke 20]

Ọ pụrụ ịbụrụ gị ihe enyemaka ikwupụta na igosipụta mwute ị na-enwe