Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkụziri Kristi Ịhụ Chineke n’Anya

Ịkụziri Kristi Ịhụ Chineke n’Anya

Ịkụziri Kristi Ịhụ Chineke n’Anya

A MỤRỤ nwa anyị nwanyị, bụ́ Kristi, n’afọ 1977. N’oge na-adịghị anya mgbe a mụsịrị ya, dọkịta anyị gwara anyị ihe wụrụ anyị akpata oyi n’ahụ́: Kristi bu nsogbu dị njọ nke ịnụ ihe na ụdị na-adịchaghị njọ nke nsogbu ụbụrụ nke na-akpata ahụ́ mkpọnwụ, pụta ụwa. Anyị amatụghị ókè ọnọdụ ya a ga-emetụtaru ndụ anyị.

Ọnwa ole na ole mgbe e mesịrị, mụ na di m bụ́ Gary malitere ịnara ọzụzụ pụrụ iche n’obodo Melbourne, Australia, bụ́ ebe anyị nọ mụta ụzọ anyị na nwa anyị nwanyị ga-esi na-emekọrịta ihe. Anyị gakwara n’Ụlọ Ọrụ Mba nke A Na-anọ Enyocha Ntị bụ́ nke dị na Melbourne. N’ebe ahụ ka a nọ kwụnye ụmụ obere ngwá ndị na-enye aka ịnụ ihe ná ntị Kristi bụ́ onye dị ọnwa iri. Ngwá ndị ahụ amasịghị ya, ebe ọ bụkwa na ha nwere waya, ọ na-adọpụta ha ozugbo anyị kwụnyeghachisịrị ha n’obere ntị ya! E kegidekwara ọbọ batrị ya, bụ́ nke dị nnọọ arọ, n’ahụ́ ya.

N’ihi nsogbu ụbụrụ ahụ, o siiri Kristi ike ịmụta ịga ije. Nke ahụ pụtara na ọ ga na-anara ọgwụgwọ kwa izu n’aka onye na-eji usoro mmega ahụ́ agwọ ọrịa. Ma ka ọ na-erule oge Kristi dị afọ atọ, ọ malitere ịga ije n’onwe ya, ọ bụ ezie na ọ na-adakarị. A nọgidere jiri usoro mmega ahụ́ na-agwọ ya ruo mgbe ọ dị afọ ise. Ka ọ dị mgbe ahụ, anyị kwagara n’obodo dị nso bụ́ Benalla, bụ́ ebe Gary nọ na-achụ nta ego ya.

Agụmakwụkwọ Kristi

Otu onye nkụzi maka ndị ntị chiri mere ka anyị mara banyere agụmakwụkwọ pụrụ iche ọ ga-adị mkpa ka Kristi nwee. Nke ahụ pụtara na anyị ga-akwagakwa ebe ọzọ, nke ugbu a bụ na Bendigo, bụ́ obodo nke nwere ụlọ akwụkwọ maka ndị ntị chiri. Ebe ọ bụ na adị m ime nwa nke abụọ anyị, anyị gbutụrụ oge n’ịkwaga ebe ahụ ruo mgbe Kristi dị afọ anọ, nwa nwoke ọhụrụ anyị, bụ́ Scott, adịkwa ọnwa ise. N’otu ụlọ ọgwụ dị na Bendigo, a malitere inye ya usoro ọgwụgwọ kwa izu maka nsogbu ikwu okwu ya—ọgwụgwụ nke a ga-anọgide na-enye ya ruo afọ iri na-esonụ. Mụ na Gary malitekwara ịmụ asụsụ ndị ogbi.

Nchegbu kasịnụ anyị nwere bụ banyere ọzụzụ ime mmụọ nke Kristi. Ị manụ na mụ na Gary bụ Ndịàmà Jehova, anyị kpebisikwara ike ịzụlite Kristi “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Ma olee otú anyị ga-esi mee ya? Onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ Kristi na-aga kwuru, sị: “Ịkụziri Kristi banyere Chineke ga-abụ ihe kasị taa akpụ ịkụzi. Unu apụghị ịhụ Chineke anya, n’ihi ya, olee otú unu ga-esi kọwaara ya Ya?” Lee ihe ịma aka tara akpụ anyị chere ihu ugbu a! N’oge na-adịghị anya, anyị matara na ọ ga-ewe oge dị ukwuu, ọ ga-achọkwa ịmụchi ihe anya na inwe ndidi ruo ogologo oge.

Na mbụ, anyị ji foto na ihe osise mee ihe, na-eme ka okwu anyị na-adị nkenke ruo ókè o kwere mee. Anyị kpọọrọ ya na-aga nzukọ Ndị Kraịst na ọrụ nkwusa, n’agbanyeghị na ọ naghị aghọtacha ihe na-aganụ. Ka aka bịara ghọrọ Kristi nkọ n’asụsụ ndị ogbi, ọ malitere ịghọta ihe otú ọ na-adịbughị aghọta! N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ọtụtụ okwu, nkebi ahịrịokwu, na echiche ndị dị na Bible bụ́ ndị siri ike nkọwa. Otu n’ime akwụkwọ ndị kasị amasị ya bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible, * bụ́ nke e dere karịsịa maka ụmụaka. Ihe osise ya ndị tụrụ àgwà—tinyere ihe ndị anyị ji aka anyị seere ya—baara ya uru nke ukwuu. Ka oge na-aga, Kristi malitere ịhụ Chineke n’anya n’obi ya.

Onyeisi ụlọ akwụkwọ Kristi ji obiọma mee ka anyị na ụfọdụ Ndịàmà ndị ọzọ bụ́ ndị na-azụlitekwa ụmụaka ntị chiri, kwurịta okwu. Anyị nwere ọganihu dị ukwuu mgbe ha kọwaara anyị otú onye ntị chiri pụrụ isi kwusaara ndị na-anụ ihe ozi ọma. Otu ụzọ bụ ha inye ha kaadị e biri ozi dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Ya mere, mgbe Kristi dị njikere isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu Bible, nke ahụ esighịrị ya ike omume! Ọ ghọrọ onye nkwusa ozi ọma a na-emebeghị baptizim mgbe ọ dị afọ 14. N’afọ 1994, e mere ya baptizim mgbe ọ dị afọ 17.

Otú ọ dị, mkpakọrịta na-ewuli elu bịara dị Kristi mkpa, o sikwaara ya ike imete Ndịàmà na-anụ ihe enyi. N’ihi ya, mụ na Gary malitere iduzi klas asụsụ ogbi maka ndị òtù ọgbakọ anyị bụ́ ndị dị njikere inyere ndị ntị chiri aka. Ụfọdụ n’ime ndị bịara klas anyị mesịrị bụrụ ndị e were n’ọrụ maka ịsụgharịrị ndị ntị chiri okwu. Nke ka mkpa bụ na ọtụtụ ndị mụtara asụsụ ndị ogbi bịara nwee nnọọ mmasị n’iso Kristi na-ekwurịta okwu. Ugbu a, Kristi bịara nwee ike irite uru n’ụzọ zuru ezu ná nzukọ nakwa mgbakọ Ndị Kraịst anyị. Ọ ka na-ekerechi òkè anya na ha ruo ugbu a. Kristi na-enwe ekele dị ukwuu maka mmasị ụmụnna ji ịhụnanya na-enwe n’ebe ọ nọ.

Otu ụbọchị, Kristi gwara anyị banyere ọchịchọ o nwere ịghọ onye ọsụ ụzọ oge nile, ma ọ bụ onye na-ezisa ozi ọma oge nile. Gary nyeere ya aka ịgbata laịsensị e ji akwọ ụgbọala, mgbe a hazichakwara ihe ndị ọzọ, a họpụtara Kristi ịbụ ọsụ ụzọ oge nile n’afọ 1995. N’afọ 2000, ọ bịakwara nwee ike inweta ọrụ nwa oge n’otu ụlọ akwụkwọ elementrị. N’ebe ahụ, ọ na-enye aka akụziri ụmụaka ntị chiri ihe.

Ugbu a, mụ, Kristi, Gary, na nwa anyị nwoke bụ́ Scott, na-enweta ọṅụ nke ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile. Obi dị anyị ụtọ inwe ike iwepụta oge iji kụziere ndị mmadụ banyere Chineke anyị, bụ́ Jehova!

‘Ihe Obi Anyị Na-arịọ’

Ntị chiri Kristi ka bụụrụ anyị nile ihe ịma aka. N’oge ụfọdụ, mgbe Kristi nọ n’ozi Ndị Kraịst, ọ dịghị ahụ onye ga-asụgharịrị ya okwu, ọ dịghịkwa ahụ onye ọ pụrụ ịkọrọ echiche na mmetụta ya. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ na-adị m ka à ga-asị na ebi m ná mba ebe onye ọ bụla na-asụ asụsụ dị iche.” Otú o sina dị, anyị nile amụtawo ịnagide ọnọdụ ya nke ọma.

Anyị na-enweta nkasi obi n’okwu ndị dị n’Abụ Ọma 37:4: “Ka ihe Jehova tọọkwa gị ụtọ; Ọ ga-enyekwa gị ihe nile obi gị na-arịọ.” Olileanya nke Kristi na-ejighị egwu egwu bụ ịnụ ụda egwu na ụda nke ihe ndị e kere eke nakwa iji ọnụ ya gwa ndị ọ hụrụ n’anya okwu. Ana m atụsi anya ike maka ụbọchị Kristi ga-enwe ike ịnụ olu m. Anyị nwere okwukwe na, n’oge na-adịghị anya, a ga-emere anyị ihe a obi anyị na-arịọ, dị nnọọ ka Bible na-ekwe ná nkwa.—Aịsaịa 35:5.—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 14]

Kristi, ka o ji “Akwukwọm nke Akukọ Bible” mgbe ọ dị ọnwa 14

[Foto dị na peeji nke 15]

Ka Kristi ji kaadị e biri ebi na-ekwusa ozi ọma

[Foto dị na peeji nke 15]

Scott, Kristi, Gary, na Heather Forbes taa