Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Ụmụaka n’Ezie?

Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Ụmụaka n’Ezie?

Echiche nke Bible

Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Ụmụaka n’Ezie?

Ọ TỤTỤ narị nde ụmụaka na-abụ ndị a na-erigbu, na-emegbu, ma na-emeso ihe ike kwa afọ. Ọtụtụ na-arụ ọrụ n’ọnọdụ ndị dị ize ndụ dị nnọọ ka à ga-asị na ha bụ ndị ohu. A na-atọrọ ma na-amanye ndị ọzọ ịghọ ndị agha ma ọ bụ ịghọ ụmụaka ndị na-agba akwụna. Ndị òtù ezinụlọ nke ọtụtụ ụmụaka emebikwuwo ntụkwasị obi ụmụaka ahụ nwere n’ebe ha nọ site n’idina ha nakwa site n’imegbu ha n’ụzọ ndị ọzọ jọgburu onwe ha.

N’ụzọ kwere nghọta, ọnọdụ ọjọọ ụmụaka nọ na ya na-ewute ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị na-echebara ndị ọzọ echiche. Ọ bụ ezie na ụfọdụ na-ekwere na ọ bụ anyaukwu na omume rụrụ arụ nke ụmụ mmadụ na-akpata ihe ka ukwuu ná mmegbu dị otú ahụ, ọ ka pụrụ isiri ha ike ikwere na Chineke nke ịhụnanya ga-ekwere ka e nwee ikpe na-ezighị ezi dị nnọọ otú ahụ. Ha pụrụ ịdị na-eche na Chineke agbahapụwo ụmụaka ndị a, nakwa ma eleghị anya na ọ dịghị eche banyere ha n’ezie. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Eziokwu ahụ na-ewute ewute bụ́ na a na-erigbu ma na-emegbukarị ụmụaka ọ̀ pụtaziri na Chineke adịghị eche banyere ha? Olee ihe Bible na-ekwu banyere ya?

Chineke Akatọọ Ndị Mmegbu

Ọ dịghị mgbe ọ bụla Jehova Chineke zubere ka ndị toworo eto obi tara mmiri na-erigbu ụmụaka. Imegbu ụmụaka bụ otu n’ime ọdachi kasịnụ nke nnupụisi ahụ ihe a kpọrọ mmadụ nupụrụ n’ogige Iden kpatara. Ọjụjụ ahụ ha jụrụ ọbụbụeze Chineke mere ka ụmụ mmadụ na-erigbu ibe ha n’ụzọ dị njọ.—Jenesis 3:11-13, 16; Eklisiastis 8:9.

Chineke na-akpọ ndị na-erigbu ndị na-adịghị ike na ndị na-apụghị ichebe onwe ha asị. Ọtụtụ mba oge ochie bụ́ ndị na-ejereghị Jehova ozi ji ụmụ ha chụọ àjà, ma Jehova kwuru na nke a bụ ‘ihe nke ya na-enyeghị n’iwu, na ọ bataghịkwa n’obi ya.’ (Jeremaịa 7:31) Chineke dọrọ ndị ya nke oge ochie aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na i weda [nwa mgbei] n’ala ma ọlị, o wee tikuo m n’ụzọ ọ bụla n’ezie, aghaghị m ịnụ ntiku ya; iwe m ga-adị ọkụ.”—Ọpụpụ 22:22-24.

Jehova Hụrụ Ụmụaka n’Anya

Nchebara echiche Chineke na-enwe n’ebe ụmụaka nọ pụtara ìhè ná ntụziaka amamihe dị na ya ọ na-enye ndị nne na nna. Ụmụaka ndị a zụlitere n’ezinụlọ dị nchebe yikarịrị ka hà ga-eto nke ọma ma ghọọ ndị na-akpa ezi àgwà. Ya mere, Onye Okike anyị mere alụmdi na nwunye ịbụ ndokwa ga-adịru oge ndụ nile bụ́ nke “nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ́ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ́.” (Jenesis 2:24) N’ime Bible, e nyere iwu na ọ bụ nanị ndị lụrụ di na nwunye ga na-enwe mmekọahụ, nke ọ ga-abụ na ụmụ ha ga-amụta pụrụ ịbụ ndị a zụlitere n’ọnọdụ ndị dị mma.—Ndị Hibru 13:4.

Akwụkwọ Nsọ mesikwara ike mkpa ọ dị nne na nna inye ụmụ ha ọzụzụ. “Ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ,” ka Bible na-ekwu, “ụgwọ ọrụ Ọ na-akwụ ka mkpụrụ nke afọ bụ. Dị ka akụ́ n’aka dike, otú a ka ụmụ a mụrụ na mgbe okorobịa dị.” (Abụ Ọma 127:3, 4) Ụmụ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa si n’aka Chineke bịa, ọ chọkwara ka ha na-enwe ihe ịga nke ọma. Chineke na-agba ndị nne na nna ume inye ụmụ ha nduzi dị mma ná ndụ, dị nnọọ ka ọkà n’ịgba ụta na-atụ akụ́ ya nke ọma mgbe ọ na-agba ya. “Ndị bụ́ nna,” ka Okwu Chineke na-enye ntụziaka, “unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.”—Ndị Efesọs 6:4.

Ụzọ ọzọ Jehova siworo gosi ịhụnanya ya n’ebe ụmụaka nọ bụ site n’ịkụziri ndị nne na nna ka ha na-echebe ụmụ ha pụọ n’aka ndị mmegbu. N’Izrel oge ochie, e nyere ọbụna “ụmụntakịrị” iwu ige ntị n’Iwu ahụ, bụ́ nke gụnyere iwu ndị metụtara mmekọahụ ndị kwesịrị ekwesị na ndị na-ekwesịghị ekwesị. (Deuterọnọmi 31:12; Levitikọs 18:6-24) Chineke na-achọ ka ndị nne na nna mee ihe nile ha pụrụ ime iji chebe ụmụ ha pụọ n’aka onye ọ bụla nke pụrụ irigbu ma ọ bụ imegbu ha.

Olileanya nke Dịịrị Ụmụaka

Jizọs Kraịst, bụ́ onye gosipụtara omume Nna ya n’ụzọ zuru ezu, gosipụtara n’ụzọ magburu onwe ya ịhụnanya dị ukwuu Jehova nwere n’ebe ụmụaka nọ. (Jọn 5:19) Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị chere na ha na-enyere ya aka, gbochiri ndị nne na nna ịkpọtara Jizọs ụmụntakịrị ha, Jizọs wesara ha iwe ma gbazie ha. “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m,” ka o kwuru. Mgbe ahụ, “o kukwaara ụmụaka ahụ n’aka ya wee malite ịgọzi ha.” (Mak 10:13-16) Ma Jehova Chineke ma Ọkpara ya adịghị eleda ụmụaka anya.

N’eziokwu, site n’aka Eze ya ọ họpụtara, bụ́ Jizọs Kraịst, Chineke ga-eme ihe n’isi nso iji mee ka ụmụaka ndị a na-emegbu nwere onwe ha. A ga-ebibi, ruo mgbe ebighị ebi, ndị anyaukwu na-erigbu ndị mmadụ n’ụwa nakwa ndị ji obi ịta mmiri na-emegbu ndị mmadụ. (Abụ Ọma 37:10, 11) Banyere ndị dị umeala n’obi bụ́ ndị na-achọ Jehova, Bible na-asị: “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

Ka ọ dịgodị, Chineke na-egosi ịhụnanya ya ọbụna ugbu a, site n’inyere ndị nile a na-erigbu nakwa ndị a na-emegbu aka n’ụzọ ime mmụọ nakwa n’ụzọ mmetụta uche. “Nke furu efu ka M ga-achọ,” ka ọ na-ekwe ná nkwa, “ọ bụkwa nke a chụfuru achụfu ka M ga-ewelata, ọkpụkpụ a gbajiri agbaji ka M ga-ekezikwa, nke ahụ́ ya na-adịghị ike ka M ga-emekwa ka ọ dị ike.” (Ezikiel 34:16) Site n’Okwu ya, mmụọ nsọ ya, nakwa ọgbakọ Ndị Kraịst, Jehova na-akasi ụmụaka ndị a na-emegbu na ndị na-enweghị ka ọ hà ha obi. Lee nnọọ ihe obi ụtọ ọ bụ ịmara na ugbu a, dị nnọọ ka ọ ga-eme n’ọdịnihu, na “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi nile, . . . na-akasi anyị obi ná mkpagbu nile anyị.”—2 Ndị Kọrint 1:3, 4.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]

© Mikkel Ostergaard /Panos Pictures