Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Kasị Mma Ụmụaka Ji Egwuri Egwu

Ihe Ndị Kasị Mma Ụmụaka Ji Egwuri Egwu

Ihe Ndị Kasị Mma Ụmụaka Ji Egwuri Egwu

Olee ụdị ihe ụmụaka ji egwuri egwu m kwesịrị ịzụtara nwa m? Ego ole ka o kwesịrị ifu m? Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ma eleghị anya ị jụwo ajụjụ ndị a ọtụtụ ugboro. Otú ọ dị, obi ga-adị gị ụtọ ịmara na ihe ndị kasị mma ụmụaka ji egwuri egwu pụrụ ịbụ ndị nke kasị dị ọnụ ala.

“Ụmụaka na-aka erite uru n’ihe ha ji aka ha eme karịa n’ihe ha na-ekiri nanị nkiri, n’ihi ya, ihe ngwuri egwu ndị dị mfe bụ́ ndị na-achọ iji nkà eme ihe dị mma karịa ụmụ obere ụgbọala ndị na-egbuke egbuke a na-etinye batrị ma ọ bụ ụmụ bebi ndị na-ekwu okwu, bụ́ ndị na-adịchaghị enye nwa gị ohere ime ihe dị ukwuu banyere ha,” ka akwụkwọ bụ́ Motivated Minds—Raising Children to Love Learning na-ekwu. Ụmụ obere ụgbọala ndị na-egbuke egbuke a na-etinye batrị ma ọ bụ ụmụ bebi ndị na-ekwu okwu pụrụ ịbụ “ihe a na-anụ ụtọ ha ná mmalite, ma ụmụaka na-akwụsịkarị inwe mmasị n’ebe ha dị ngwa ngwa, n’ihi na ha adịtụghị enye ha ohere ịchọpụta ihe ma ọ bụ ichepụta ihe.”

Dabere n’afọ ndụ nwatakịrị, ihe ngwuri egwu ndị na-akpali iji uche eme ihe na-agụnye ihe ndị dị mfe dị ka ihe ndị a na-edo ka blọkụ, mkpo ihe, akwụkwọ, ihe ndị e ji ese ihe, na ọbụna ájá na mmiri. “Obere ihe ngwuri egwu, ndị dị ka anụ ụlọ,” ka akwụkwọ ahụ bụ́ Motivated Minds na-ekwu, “ga-eme ka [nwatakịrị] nwee ohere idokọ ihe n’ìgwè n’ìgwè, ma jiri otu ihe tụnyere ọzọ, ọ ga-emekwa ka ọ zụlite nkà ịsụ asụsụ ya site n’ichepụta akụkọ.” Akwụkwọ ahụ na-atụkwa aro inye ụmụaka ngwá egwú ndị dị mfe—ma ọ bụrụ na ị dị njikere idi mkpọtụ ha na-eme—n’ihi na ha na-enye ụmụaka ohere ịchọpụta ụda ihe na otú e si rụọ ihe ahụ.

Ụmụaka nwere nkà ichepụta ihe, ha nwekwara mmasị ma n’ịmụ ihe ma n’igwuri egwu. Ya mere, gịnị ma i nyere ha aka n’akụkụ atọ nile ahụ site n’iji amamihe na-ahọrọ ihe ndị ha ji egwuri egwu.