Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nna Na-agbahapụ Ụmụ Ha—Nsogbu Na-arịwanye Elu

Ndị Nna Na-agbahapụ Ụmụ Ha—Nsogbu Na-arịwanye Elu

Ndị Nna Na-agbahapụ Ụmụ Ha—Nsogbu Na-arịwanye Elu

Ọ NỤ ọgụgụ ndị nna na-agbahapụ ezinụlọ ha na-arịwanye elu. Ná ngwụsị afọ ndị 1990, akwụkwọ akụkọ bụ́ USA Today kpọrọ United States “mba kasị nwee ọnụ ọgụgụ nke ezinụlọ ndị na-enweghị nna.” Otú ọ dị, ndị nna ịgbahapụ ụmụ ha bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ.

Na Brazil, ọgụgụ ọnụ e mere n’afọ 2000 kpughere na ọnụ ọgụgụ nke ezinụlọ ndị ụmụ nwanyị bụ ndị isi ha dị nde 11.2 n’ime ngụkọta nke nde 44.7. Na Nicaragua, pasent 25 nke ụmụaka nọ n’ebe ahụ bụ ndị ha na nanị nne ha bi. Na Costa Rica, ọnụ ọgụgụ nke ụmụaka ndị nna ha na-ekwetaghị na ọ bụ ha mụrụ rịrị elu n’afọ ndị 1990 site na pasent 21.1 ruo pasent 30.4.

Ndekọ ọnụ ọgụgụ a sitere ná mba atọ ndị a bụ nanị ihe atụ ndị na-egosi ihe na-eme n’ụwa nile. Tụlee ụdị ọzọ nke nsogbu nke ndị nna ịgbahapụ ụmụ ha.

Ha Nọ Ya Ma Ha Anọghị Ya

Biko lee igbe bụ́ “Papa, Olee Mgbe Ọzọ Ị Ga-abịa?” Nao, bụ́ onye dị afọ 23 ugbu a, na-ekwu, sị: “Tupu m malite ụlọ akwụkwọ praịmarị, ọ na-esi ike ka m hụ nna m. N’otu oge, ka ọ nọ na-apụ, arịọrọ m ya, sị, ‘Lọtakwa, ị̀ nụ?’”

Ọ bụ mmekọrịta ezinụlọ ndị yiri nke Nao na nna ya nwere kpaliri onye edemede Poland bụ́ Piotr Szczukiewicz ikwu, sị: “Nna yiri onye dị mkpa bụ́ nke na-efu efu n’ime ezinụlọ.” N’eziokwu, ọtụtụ ndị nna so ezinụlọ ha biri ma na-akwado ha n’ụzọ ego. Otú ọ dị, dị ka magazin ndị France bụ́ Capital si kwuo ya, “nanị ihe ọtụtụ ndị nna na-eme bụ ịkpa afọ ezinụlọ ha, ha adịghị ekere òkè n’ịkụziri ụmụ ha ihe.”

Mgbe mgbe, ihe a na-ahụ bụ na e nwere nna n’ime ezinụlọ ma ọ dịghị ekere òkè ná ndụ ụmụ ya. Uche ya dị n’ebe ọzọ. “Ọ bụrụgodị na [nna ahụ] nọ ya n’anụ ahụ́,” ka magazin ndị France bụ́ Famille chrétienne na-ekwu, “uche ya nwere ike ghara ịdị ya.” N’ihi gịnị ka uche ọtụtụ ndị nna taa na-ejighị adị n’ezinụlọ ha?

Dị ka magazin ahụ a kpọtụrụ aha n’elu na-akọwa, ihe bụ́ isi kpatara ya bụ na “ọ ghọtaghị ihe bụ́ ọrụ nna ma ọ bụ di.” Dị ka echiche nke ọtụtụ ndị bụ́ nna si dị, ọrụ nke ezi nna agwụla iwelata ụgwọ ọnwa buru ibu. Dị ka onye edemede Poland bụ́ Józef Augustyn si kwuo ya, “ọtụtụ ndị nna na-eche na ha bụ ezi nna n’ihi na ha na-enye ezinụlọ ha ego.” Ma ime nke ahụ bụ nanị otu n’ime ibu ọrụ nke onye bụ́ nna.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụaka adịghị agụ uru nna ha bara dabere n’ego ole ọ na-akpata ma ọ bụ n’ego ole onyinye ọ pụrụ inye ha na-ada. Kama nke ahụ, ihe ụmụaka chọrọ n’ezie—nke karịrị nnọọ onyinye a na-ahụ anya—bụ ịhụnanya, oge, na nlebara anya nke nna ha. Ndị a bụ ihe ndị dị ha mkpa n’ezie.

Mkpa Maka Ime Nnyochagharị

Dị ka otu akụkọ nke Ụlọ Ọrụ Etiti Na-ahụ Maka Mmụta na Japan wepụtara si kwuo, “ndị nna kwesịrị inyochagharị ụzọ ndụ ha, bụ́ nke a na-etinye n’ụzọ gabigara ókè n’ịrụ ọrụ.” Ajụjụ abụrụ, Nna ọ̀ ga-eme mgbanwe maka ọdịmma nke ụmụ ya? Akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Gießener Allgemeine kọrọ banyere otu nnyocha e mere bụ́ nke ihe ka ọtụtụ ná ndị bụ́ nna a gbara ajụjụ ọnụ jụrụ ibute ụmụ ha ụzọ karịa ọrụ ha.

Ụmụntakịrị pụrụ inwe mwute dị ukwuu n’ihi ihe pụrụ iyi enweghị mmasị nke nna ha n’ebe ha nọ. Lidia, bụ́ onye dị afọ 21 ugbu a, na-echeta nke ọma ihe nna ya nọ na-eme mgbe ọ bụ nwata nwanyị na Poland. Ọ na-akọwa, sị: “Ọ dịghị agwa anyị okwu. Ọ dịghị anyị na ya nke ma ihe ibe ya na-eme. Ọ maghị na m nọ na-aga atụrụ ndụ n’ụlọ egwú disko.” N’otu aka ahụ, Macarena, bụ́ onye dị afọ 21 nke si Spen, na-ekwu na mgbe ya bụ nwata, nna ya “na-eso ndị enyi ya pụọ ná ngwụsị izu iji kporie ndụ, ọtụtụ mgbe kwa, a dịghị ahụ ya anya ruo ụbọchị ụfọdụ.”

Ịma Ihe Ndị E Kwesịrị Ibute Ụzọ

Ihe ka ọtụtụ ná ndị bụ́ nna pụrụ ịghọta na ha na-enye ụmụ ha oge na nlebara anya dị nnọọ nta. Otu onye Japan bụ́ nna nke otu nwata nwoke dị afọ iri na ụma kwuru, sị: “Ana m enwe olileanya na nwa m ga-aghọta ọnọdụ m. Ana m eche banyere ya mgbe nile, ọbụna mgbe m ji ọrụ n’aka.” Ma, nanị inwe olileanya na nwata ga-aghọta ihe mere nna ya na-ejighị elebara ya anya ọ̀ ga-edozi nsogbu ahụ?

Obi abụọ ọ bụla adịghị ya, ezi mgbalị—ee, ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà—dị mkpa iji na-egbo mkpa nwatakịrị. N’ụzọ doro anya, inye ụmụaka ihe kasị dịrị ha mkpa—ya bụ, ịhụnanya, oge, na nlebara anya—adịghị mfe. Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị n’achịcha [ma ọ bụ, nri nkịtị] ka mmadụ ga-esi dị ndụ.” (Matiu 4:4) Ọ bụkwa eziokwu na nanị ihe onwunwe apụghị ime ka ụmụaka too nke ọma. Dị ka onye bụ́ nna, ị̀ dị njikere ịchụ ihe pụrụ ịdị oké ọnụ ahịa nye gị n’àjà—oge gị ma ọ bụ ikekwe ọbụna ohere nke inwekwu ọganihu n’ọrụ gị—iji nwee oge gị na ụmụ gị ga-eji na-anọrị?

Akwụkwọ akụkọ bụ́ Mainichi Daily News nke February 10, 1986, kọrọ banyere otu nna nke bịara ghọta mkpa ụmụ ya dị n’ezie. A kọrọ na ya, sị: “Otu onye nọ n’ọkwa dị elu n’Ụlọ Ọrụ Ụgbọ Okporo Ígwè nke Mba Japan họọrọ ịgba arụkwaghịm kama ikewapụ onwe ya n’ebe ezinụlọ ya nọ.” Akwụkwọ akụkọ ahụ hotaziri ihe onyeisi ọrụ ahụ kwuru, sị: “Onye ọ bụla pụrụ ịrụ ọrụ dị ka ọga kpata kpata. Ma, ọ bụ nanị m bụ nna nke ụmụ m.”

N’ezie, nzọụkwụ mbụ n’ịghọ ezi nna bụ ịghọta ụdị nna dị ụmụaka mkpa. Ka anyị tụlee ihe ịbụ ụdị nna ahụ na-agụnye.

[Igbe dị na peeji nke 13]

“Papa, Olee Mgbe Ọzọ Ị Ga-abịa?”

Nke ahụ bụ ajụjụ Nao, bụ́ nwatakịrị nwanyị Japan nke dị afọ ise, jụrụ nna ya ka ọ na-aga ọrụ otu ụbọchị. Ọ bụ ezie na o bi n’ụlọ ha, Nao adịkebeghị ahụ ya. Ọ na-alọtakarị ọrụ mgbe Nao hiworo ụra ma na-agakarị ọrụ mgbe Nao na-etetabeghị.