Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ókè Ha Aṅaa Ka Ọ Dịruru ná Mkpa Inye Ụmụaka Ọzụzụ Mgbe Ha Dị Nnọọ Obere?

Ókè Ha Aṅaa Ka Ọ Dịruru ná Mkpa Inye Ụmụaka Ọzụzụ Mgbe Ha Dị Nnọọ Obere?

Ókè Ha Aṅaa Ka Ọ Dịruru ná Mkpa Inye Ụmụaka Ọzụzụ Mgbe Ha Dị Nnọọ Obere?

FLORENCE dị afọ 40 ma chọsie nnọọ ike ịmụta nwa. Otú ọ dị, mgbe ọ dị ime, otu dọkịta dọrọ ya aka ná ntị na nwa ahụ pụrụ inwe nsogbu ịmụta ihe ma a mụọ ya. O kweghị ka nke a kụdaa mmụọ ya, ọ mụkwara nwa ahụ́ gbasiri nnọọ ike.

Obere oge mgbe ọ mụsịrị nwa ya nwoke, bụ́ Stephen, Florence malitere iji ohere ọ bụla dapụtaranụ na-agụrụ ya ihe ma na-ekwusara ya okwu. Ka nwa ahụ na-etolite, ha gwuru egwuregwu, mee mkpapụ, mụọ otú e si agụ ọnụ ọgụgụ, ma bụọ abụ. “Anyị na-egwu egwuregwu ọbụna mgbe m na-asa ya ahụ́,” ka ọ na-echeta. Ihe ndị ahụ rụpụtara ihe ndị bara uru.

Mgbe Stephen dị afọ 14, o ji akara ugo mmụta pụta na Mahadum nke Miami. Afọ abụọ ka e mesịrị, bụ́ mgbe ọ dị afọ 16, ọ gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị ọkàiwu, dịkwa ka akụkọ ndụ ya si kwuo, o mesịrị ghọọ onye a tọchara n’etiti ndị ọkàiwu nọ na United States. Nne ya, bụ́ Dr. Florence Baccus—onye bụbu onye nkụzi na onye laworo ezumike nká n’ọrụ inye ụmụ akwụkwọ ndụmọdụ—etinyewo oge dị ukwuu n’ịmụ banyere inye ụmụaka ọzụzụ n’oge ha ka dị nnọọ obere. O kwenyesiri ike na ọ bụ otú o si lebara nwa ya nwoke anya n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ na otú o si kpalie ya ime ihe, gbanwere ọdịnihu ya.

Ebumpụta Ụwa Ka Ọ̀ Bụ Ọzụzụ

Otu isiokwu nke kpataworo arụmụka dị mkpa n’etiti ndị ọkà n’akparamàgwà ụmụaka n’oge na-adịbeghị anya abụwo ma ihe na-ekere òkè ka ukwuu n’uto nke nwata ọ̀ bụ “ebumpụta ụwa,” ya bụ ihe nwata ketara eketa, ka ọ̀ bụ “ọzụzụ” e nyere ya. Ihe ka ukwuu ná ndị nchọpụta kwenyesiri ike na ụzọ ihe abụọ ahụ na-ekere òkè n’uto nke nwata.

Ọkachamara n’ọzụzụ ụmụaka, bụ́ Dr. J. Fraser Mustard, na-akọwa, sị: “Ihe anyị maara ugbu a dabere ná

nchọpụta e mere bụ́ na ahụmahụ ndị nwata nwetara mgbe ọ dị nnọọ obere na-emetụta otú ụbụrụ ya ga-esi arụ ọrụ.” Prọfesọ Susan Greenfield kwukwara n’otu aka ahụ, sị: “Dị ka ihe atụ, anyị maara na akụkụ ụbụrụ nke na-eme ka mkpịsị aka aka ekpe nke ndị na-akpọ ngwá egwú violin na-arụ ọrụ, na-ebu ibu karịa nke ndị na-adịghị akpọ ngwá egwú violin.”

Ọzụzụ E Kwesịrị Inye

N’ịgbaso nchọpụta ndị a e mere, ọtụtụ ndị nne na nna abụghị nanị na ha na-agbalịsi ike iziga ụmụ ha n’ezigbo ụlọ akwụkwọ ọta akara, kamakwa ha na-emefu ego dị ukwuu n’iziga ụmụ ha n’ebe ndị a na-akụzi otú e si akụ egwú na otú e si ese ihe. Ụfọdụ kweere na ọ bụrụ na nwata amụọ ihe nile, mgbe ọ na-emewanye okenye, ọ ga-enwe ike ime ihe nile. Ebe ndị a na-akụzi ihe ọmụmụ ndị pụrụ iche na ụlọ akwụkwọ ọta akara na-amụbawanye. Ụfọdụ ndị nne na nna dị njikere ime ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji mee ka ụmụ ha bụrụ ọkà ibe.

Ụdị mgbalị a ọ̀ bara uru n’ụzọ nile? Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ka ọ̀ na-eme ka ụmụaka nwee ike ime ọtụtụ ihe mgbe ha tolitere, ọtụtụ mgbe, ọ na-eme ka ha ghara inweta ahụmahụ ndị dị mkpa ụmụaka na-enweta site n’igwuri egwu n’onwe ha. Ndị ọkà nkụzi na-ekwu na ụmụaka igwuri egwu n’onwe ha na-akwalite nkà nchepụta ihe ma na-eme ka nwatakịrị zụlite nkà nke iso ndị ọzọ na-emekọ ihe, nke iche echiche, na nke igosipụta mmetụta.

Ụfọdụ ndị ọkachamara n’ọzụzụ ụmụaka kweere na egwuregwu ndị nne na nna na-eduzi n’onwe ha na-eme ka e nwee ụdị ọhụrụ nke ụmụaka na-enye nsogbu—ụmụaka ndị mụrụ ha na-anaghị enye ohere ọ bụla bụ́ ndị nọ ná nrụgide, ndị ọ na-esiri ike ime mkpebi, ndị na-apụghị ihi ụra, na ndị na-eme mkpesa na ahụ́ na-egbu ha mgbu. Otu ọkà n’akparamàgwà mmadụ na-ekwu na ka ụmụaka ndị a na-erule afọ iri na ụma, ọtụtụ n’ime ha amụtabeghị otú e si anagide nsogbu, ha na-abụkwa “ndị ike gwụrụ, ndị na-anọpụrụ onwe ha iche na ndị nnupụisi.”

Ya mere, ọtụtụ ndị nne na nna nọ ná mgbagwoju anya. Ha chọrọ inyere ụmụ ha aka inwe ikike nke ịmụta ihe nile ha ga-amụtali. Otú ọ dị, ha pụrụ ịhụ nzuzu dị n’ịmanye obere ụmụaka ime nnọọ ihe karịrị ike ha, ịmanye ha ime nnọọ ihe ọkụ ọkụ. Ọ̀ dị ụzọ a ga-esi mee ka ihe nọrọ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị n’akụkụ a? Olee otú ikike ụmụaka nwere ito eto haruru, oleekwa otú a pụrụ isi zụlite ya? Olee ihe nne na nna pụrụ ime iji jide n’aka na ụmụ ha ga-enwe ihe ịga nke ọma? Isiokwu ndị na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.

[Foto dị na peeji nke 13]

Ahụmahụ ndị nwata nwetara mgbe ọ dị nnọọ obere pụrụ imetụta otú ụbụrụ ya ga-esi arụ ọrụ

[Foto dị na peeji nke 14]

Egwuregwu na-akwalite nkà nchepụta ihe ma na-eme ka nwata na-enwekwu nkà nke ime ihe