Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịzụlite Ụmụ n’Ọzụzụ nke Chineke

Ịzụlite Ụmụ n’Ọzụzụ nke Chineke

Echiche nke Bible

Ịzụlite Ụmụ n’Ọzụzụ nke Chineke

“Otú Ị Ga-esi Setịpụ Ụkpụrụ Nduzi Ụmụ Gị Na-agaghị Emebi”

“Ụkpụrụ Ise I Kwesịrị Ịkụziri Nwa Gị Tupu O Ruo Afọ Ise”

“Nkà Mmetụta Uche Ise Nwatakịrị Ọ Bụla Kwesịrị Inwe”

“Ihe Ise Na-egosi na Ị Na-emebiga Ebere Ókè”

“Nkà Dị Egwu nke Inye Ọzụzụ n’Otu Minit”

Ọ BỤRỤ na inye ụmụaka ọzụzụ dị mfe, ndị mmadụ agaraghị enwecha mmasị n’isiokwu ndị a na-ahụ na magazin, dị ka ndị ahụ e depụtara n’elu. Ọtụtụ akwụkwọ ndị e dere banyere inye ụmụaka ọzụzụ gaara apụwo n’anya. Otú ọ dị, ọ dịtụbeghị mgbe ịzụlite ụmụaka dị mfe. Ọbụna ọtụtụ puku afọ gara aga, e kwuru na “ihe na-akpasu nna ya iwe ka nwa nzuzu bụ, ọ bụkwaara nwanyị mụrụ ya ihe ilu.”—Ilu 17:25.

Taa, n’agbanyeghị ọtụtụ ndụmọdụ a na-enye banyere ya, ọtụtụ ndị nne na nna amaghị otú ha ga-esi nye ụmụ ha ọzụzụ. Enyemaka dị aṅaa ka Bible na-enye?

Ihe Ọzụzụ Pụtara n’Ezie

Bible na-akọwa n’ụzọ doro anya ọrụ dịịrị ndị nne na nna banyere inye ọzụzụ. Dị ka ihe atụ, Ndị Efesọs 6:4, na-asị: “Ndị bụ́ nna, unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a kpọtụrụ nna aha karịsịa dị ka onye kwesịrị ibute ụzọ n’ilekọta ụmụ ya. Otú ọ dị, onye bụ́ nne na-eso di ya arụkọ ọrụ.

Okwu Grik mbụ a sụgharịrị ịbụ “ọzụzụ” ná Ndị Efesọs 6:4 na-agụnye, ọ bụghị nanị ịdọ aka ná ntị, mgbazi, na inye ahụhụ, kamakwa ọ na-agụnye inye ntụziaka na inye ihe ọmụma. Ya mere, inye ọzụzụ karịrị nnọọ ịba mba; ọ na-agụnye ihe nile ọ dị mkpa ịkụziri ụmụaka iji mee ka ha nwee ihe ịga nke ọma. Ma, olee otú ndị nne na nna pụrụ isi zere ịkpasu ụmụ ha iwe?

Na-egosi Mmetụta Ọmịiko

Gịnị na-akpasu nwata iwe? Tụlee ọnọdụ a. Were ya na e nwere onye ọrụ ibe gị nke ahụ́ na-agbakasịkarị, nke na-adịghịkwa enwe ndidi. Ọ dịghị ihe i mere na-adị ya mma. Ọ na-eyikarị ka ọ na-akatọ ihe nile i kwuru ma mee. Mgbe mgbe, ọ na-ajụ ọrụ ị rụrụ ma na-eme ka i nwee mmetụta nke ị bụ onye a jụrụ ajụ. Nke ahụ ọ́ gaghị akpasu gị iwe ma kụdaa mmụọ gị?

Otu ihe ahụ pụrụ ime n’ebe nwata nọ ma ọ bụrụ na nne na nna ya na-amajakarị ya ma ọ bụ na-ejikarị iwe agbazi ya. Ọ bụ eziokwu na ọ dị mkpa ịgbazi ụmụaka site n’oge ruo n’oge, Bible nyekwara ndị nne na nna ikike ime otú ahụ. Otú ọ dị, ịkpasu nwata iwe site n’iji obi ọjọọ na iwe na-emeso ya ihe pụrụ ịkpatara ya obi mgbawa, ọdachi ime mmụọ, ọbụnakwa merụọ ya ahụ́.

Ụmụ Gị Kwesịrị Ka I Lebara Ha Anya

Ndị nne na nna aghaghị iwepụta oge iji soro ụmụ ha na-anọkọ. Banyere iwu Chineke, Deuterọnọmi 6:7 na-agwa ndị nna, sị: “Ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” A mụrụ ụmụaka inwe mmetụta nke ịbụ ndị nne na nna ha na-eche banyere ha nke ukwuu. Iso ụmụ gị na-ekwurịta okwu n’olu dị nro kwa ụbọchị pụrụ inyere gị aka ịghọta mmetụta ndị ha na-enwe. Nke a pụrụ ime ka ọ dịrị gị mfe karị iji ụkpụrụ ndị dabeere na Bible na-eru n’obi ha, na-akpali ha ‘ịtụ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu.’ (Eklisiastis 12:13) Nke a bụ otu akụkụ nke ọzụzụ Chineke.

Mgbe ndị nne na nna zụlitere ụmụ ha n’ụzọ dị mma, ha pụrụ ime ka ha nwee àgwà ndị dị mma ma kwadebe ha iche ọnwụnwa nke ndụ ihu. Ilu 23:24, 25 na-akọwa ihe ga-esi na ya pụta, sị: “Nna nke onye ezi omume ga-etegharị egwú ọṅụ nke ukwuu: onye na-amụkwa onye maara ihe ga-aṅụrị ọṅụ na ya. Ka nna gị na nne gị ṅụrịa, ka nwanyị mụworo gị tegharịakwa egwú ọṅụ.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 27]

“NDUZI ECHICHE NKE JEHOVA”

Ndị Efesọs 6:4 na-ekwu banyere “nduzi echiche nke Jehova.” Okwu Grik mbụ e ji mee ihe maka okwu ahụ bụ́ “nduzi echiche” ka a sụgharịrị na Bible ụfọdụ ịbụ “iburu n’uche” na “ndụmọdụ.” Okwu ndị ahụ na-egosicha na ezinụlọ aghaghị ime ihe karịrị nanị ịgụ Bible ma ọ bụ ịdị na-amụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, iji mezuo iwu. Ọ dị ndị nne na nna mkpa ịhụ na ụmụ ha na-aghọta ihe Okwu Chineke kwuru, mkpa ọ dị irube isi, ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ha nọ, na nchebe ọ na-echebe ha.

Olee otú a pụrụ isi rụzuo nke a? Judy, bụ́ nne nke ụmụ atọ, hụrụ mkpa ọ dị ime ihe karịrị nanị ịdị na-echetara ụmụ ya ụkpụrụ Chineke mgbe nile. “Achọpụtara m na ọ dịghị amasị ha mgbe m kwughachiri otu ihe ugboro ugboro n’otu ụzọ ahụ. Amalitere m ịchọ ụzọ dịgasị iche m ga-esi na-ezi ha ihe. Otu ụzọ bụ ịchọ isiokwu ndị dị na magazin Teta!, bụ́ ndị kọwara isi ihe ndị ahụ n’ụzọ ndị dị ọhụrụ. N’ụzọ dị otú a, amụtara m otú m ga-esi na-enye ha ihe ncheta ndị dị ha mkpa n’akpasughị ha iwe.”

Angelo, bụ́ onye ezinụlọ ya dabara n’ihe isi ike, na-akọ otú o si kụziere ụmụ ya nwanyị ịtụgharị uche n’Okwu Chineke, sị: “Anyị na-agụkọ Bible ọnụ, mgbe ahụ, ana m ahọrọ nkebi ahịrịokwu ụfọdụ ma kọwaa otú ha si metụta ọnọdụ ụmụ m nọ na ya. Ka oge na-aga, mgbe ha nọ na-agụ Bible n’onwe ha, ana m ahụ ka ha na-echebara ihe ha na-agụ echiche n’ụzọ miri emi, na-atụgharị uche n’ihe ọ pụtara nye ha.”