Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mee Ka Anwụrụ Ọkụ Na-egbu Mmadụ Pụọ

Mee Ka Anwụrụ Ọkụ Na-egbu Mmadụ Pụọ

Mee Ka Anwụrụ Ọkụ Na-egbu Mmadụ Pụọ

IHE ndekọ e nwere banyere ya na-agbawa obi: Mmadụ atọ na-anwụ n’ụlọ ha n’ime minit ọ bụla kwa ụbọchị. Gịnị na-egbu ha—ọ bụ anwụrụ ọkụ si n’ihe ndị e ji emenwu ọkụ.

Gịnị bụ ihe ndị a e ji emenwu ọkụ? Ọ pụrụ ịbụ nsị́ anụ kpọrọ nkụ, osisi nwụrụ anwụ, ahịhịa, ma ọ bụ ihe ọkụkụ ndị a tụtụtara n’ikpo ahịhịa. Otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị bi n’ụwa, ihe karịrị ijeri mmadụ abụọ, na-eji ihe ndị a emenwu ọkụ ha ji esi nri na nke ha ji eme ka ụlọ ha kporo ọkụ, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Kathmandu Post nke Nepal, na-ekwu. Ọ na-abụkarị ihe ndị ogbenye ọnụ ntụ pụrụ inweta iji na-emenwu ọkụ.

N’ụzọ dị mwute, anwụrụ ọkụ na-esi n’ọkụ e ji ihe ndị a menwuo na-egbu mmadụ. N’ihi ya, gịnị ka a pụrụ ime? “Ihe a pụrụ ime iji kwụsị imebi ikuku n’ime ụlọ arachaghị ahụ́: mee ka anwụrụ ọkụ ghara ịdị na-abanye n’ime ụlọ ma ọ bụ i mee ka nke dị n’ime ụlọ pụọ,” ka òtù bụ́ Intermediate Technology Development Group (ITDG) kwuru, bụ́ òtù na-enyere ndị nọ n’ọtụtụ mba aka imeziwanye ọnọdụ ibi ndụ ha.

Aro mbụ a tụrụ bụ ịdị na-esi nri n’èzí. Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na nke ahụ agaghị ekwe omume ma ọ bụ na o kwesịghị ekwesị? Òtù ITDG na-atụ aro ka i mee ka ikuku na-abatakwu n’ime ụlọ gị. Ọ dị ụzọ abụọ a pụrụ isi mee ya. Otu bụ site n’ịkpọpu ebe elu nke ahụ́ ụlọ ahụ (a ga-eji waya yitewere ụgbụ anwụnta mechie ebe ahụ a kpọpuru ka obere ụmụ anụmanụ ghara isi na ya na-abata). Nke ọzọ bụ site n’itinye windo na ya (windo nwere ibo ga-eme ka ndị mmadụ ghara isi ebe ahụ na-enyobata anya). Nke a na-eme ka ikuku nwee ike ịbata nke ọma ma mee ka anwụrụ ọkụ na-apụ. Otú ọ dị, ịkpọpu ahụ́ ụlọ agaghị enwe isi ma ọ bụrụ na ihe mere e ji akwanye ọkụ n’ụlọ bụ iji mee ka ime ụlọ kporo ọkụ. N’ihi ya, a pụrụ iji ụzọ ọzọ dịkwa mfe mee ihe.

Ịrụ ihe na-ekpuchi ekwu ọkụ bụ otu n’ime ụzọ ndị a nakweere nakwa ụzọ ndị dị irè e si eme ka anwụrụ ọkụ pụọ, ka òtù ITDG na-ekwu. A pụrụ iji ígwè dị mbadamba ma ọ bụ ọbụna blọọkụ na ájá rụọ ihe na-agaghị eri oké ego e ji ekpuchi ekwu ọkụ. A na-eji ya ekpuchi ekwu, ma rụnye ya mpio nke anwụrụ ọkụ ga-esi na ya na-apụ n’elu. Ndị ọkachamara na-ekwu na mgbe e mere ka ikuku na-abata n’ime ụlọ site n’ebe gheere oghe n’elu, e jirikwa ihe e ji ekpuchi ekwu ọkụ na-eme ihe, ikuku ọjọọ ndị dị n’ụlọ na-ebelata ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 80. Ndị nwere ihe a e ji ekpuchi ekwu ọkụ na-ekwu na ahụ́ adịkwuola ha mma, na ha na-adị ọcha ugbu a karị, na ha na-arụ ọrụ ugbu a karị, nakwa na ọ na-atọ ha ụtọ ịnọ n’ụlọ ugbu a karị—nke a bụ ihe àmà na-egosi na ihe dị nnọọ mfe omume pụrụ ime ka ndụ ka mma.

[Foto dị na peeji nke 18]

Otu kichin dị na Kenya nke nwere ihe na-ekpuchi ekwu, nwee windo, nweekwa nnukwu oghere n’ebe elu ya

[Ebe E Si Nweta Foto]

Dr. Nigel Bruce/www.itgd.org