Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkwụsị Ntụtụaka

Ịkwụsị Ntụtụaka

Ịkwụsị Ntụtụaka

“Ọ bụghị nanị gị ka ịkwụsịlata ohi ga-abara uru, ọ ga-abara obodo dum uru; onye ọ bụla na-erite uru mgbe a kwụsịrị izu ohi.”—AKWỤKWỌ BỤ́ “EVERY RETAILER’S GUIDE TO LOSS PREVENTION.”

NTỤTỤAKA, dịkwa ka omume ọjọọ ndị ọzọ, yiri ka ọ̀ na-emetụta ụzọ mmadụ si eche echiche, na-akpali ya ime ka ihe o mere yie ihe ziri ezi. N’ihi ya, dị nnọọ ka onye ọrụ ugbo si efopụ ahịhịa, ọ dị ndị chọrọ ịkwụsị ntụtụaka mkpa iwepụ echiche ọjọọ n’obi ha. ‘Mee ka uche gị dị ọhụrụ,’ ka Bible dụrụ n’ọdụ ná Ndị Rom 12:2. Na 1 Pita 1:14, ọ gbakwara ume, sị: “Kwụsịnụ ịbụ ndị e mere ka ha kwekọọ n’ọchịchọ unu nwere n’oge gara aga.” Isi ihe ise na-esonụ pụrụ inyere onye na-eme aka ntụtụ aka ịgbanwe obi ya banyere izu ohi.

Ihe Ndị Na-enye Aka n’Inwe Echiche Ziri Ezi

▪ Nke mbụ, ntụtụaka megidere iwu. Ọ pụrụ ịbụ na, n’ebe i bi, ọ dịghị ihe e ji ohi kpọrọ, ọ dịghịkwa ihe a na-eme onye ohi. N’agbanyeghị nke ahụ, onye na-eme aka ntụtụ ka bụkwa iwu ka ọ na-ada.—Ndị Rom 13:1.

Gịnị na-eme mgbe ọtụtụ mmadụ na-ada iwu? Dị ka Bible si kwuo, “iwu na-esinwụ.” (Habakuk 1:3, 4) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ike iwu nwere igbochi ndị mmadụ ime ihe ụfọdụ na-ebelata, na-eme ka onye ọ bụla mewe ihe masịrị ya. Mgbe ọ bụla mmadụ mere aka ntụtụ, ọ na-emebi obodo. Nke a mee, onye ọ bụla na-ata ahụhụ ya.

▪ Nke abụọ, aka ntụtụ na-eme ka a ghara ịtụkwasị mmadụ obi. Ụdị emeghị ihe n’eziokwu ahụ na-emebi mmekọrịta mmadụ na ibe ya, na-eme ka o siere ndị mmadụ ike ịghọta ibe ha na iso ibe ha na-emekọ ihe n’ụzọ dị mma.—Ilu 16:28.

“Nsogbu kasịnụ m nwere bụ na m na-atụkwasịkarị ndị mmadụ obi.” Ihe a ka otu nwanyị nwere ụlọ ahịa a na-ere ákwà kwuru mgbe ndị ohi mere ka ahịa ya daa. N’oge mbụ, ọ tụkwasịrị ndị na-azụ ya ahịa na ndị na-erere ya ahịa obi na ha agaghị ezu ya ohi. Ugbu a, ọ dị ya ka ntụkwasị obi ahụ o nwere enweghị isi.

Ọ bụrụ na mmadụ aghaara onye ọzọ ụgha, ọ ga-emebi aha nke ya n’anya onye ahụ ọ ghaara ụgha. Ma, ndị aka ntụtụ na-eme ka a na-enyo onye ọ bụla batara n’ụlọ ahịa mgbe ha zusịrị ohi enyo. Ha na-eme ka e lewe ndị na-akwụwa aka ọtọ anya dị ka ndị pụrụ ịbụ ndị ohi. Ọ̀ dị onye kwesịrị itinye ndị ọzọ n’ọnọdụ ahụ?

▪ Nke atọ, mmadụ ịtụtụ aka pụrụ ime ka o tinye aka na mpụ karịrị nke ahụ. Ka oge na-aga, ndị na-eme aka ntụtụ pụrụ imesị mewe ihe ndị ga na-etinyekwu ha n’ihe ize ndụ.—2 Timoti 3:13.

Njedebe nke Ntụtụaka

▪ Nke anọ, bụ́kwanụ nke kasị mkpa, bụ na onye na-eme aka ntụtụ na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile anaghị adị ná mma. Okwu ya na-agwa onye ohi ka ọ “kwụsị izu ohi,” ọ na-adọkwa aka ná ntị banyere ikpe a ga-ekpe ndị na-eleda Ya anya. (Ndị Efesọs 4:28; Abụ Ọma 37:9, 17, 20) Ma, Jehova na-agbaghara ndị ohi bụ́ ndị gbanwerenụ. Ha na Chineke pụrụ ịdị n’udo.—Ilu 1:33.

▪ Nke ise, dịkwa ka mpụ ndị ọzọ, ntụtụaka ga-aghọ ihe mgbe ochie n’oge na-adịghị anya. Mgbe Alaeze Chineke ga-achịwazi ụwa n’ụzọ zuru ezu dị ka e kwere nkwa ya n’ime Bible, ụmụ mmadụ ga-eji ịkwụwa aka ọtọ na iguzosi ike n’ezi ihe na-emesorịta ibe ha ihe. Nke a pụtara na ụmụ mmadụ ga-enwere onwe ha pụọ n’oké ihe ntụtụaka na-efu.—Ilu 2:21, 22; Maịka 4:4.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]

ỤZỌ NA-ADỊGHỊ EFU OKÉ EGO E SI EGBOCHI OHI

Ụfọdụ ndị nwere obere ụlọ ahịa nwere ike ha agaghị enwe ego ịzụta ihe ndị dị ka kamera a na-edebe n’ụlọ ahịa iji na-ahụ ihe na-eme na ya. Ma nke a apụtaghị na ọ dịghị ihe ọ bụla ha pụrụ ime iji gbochie aka ntụtụ n’ụlọ ahịa ha. Mgbe mgbe, ndị nwere ụlọ ahịa pụrụ ichebe ngwá ahịa ha site n’ime ihe ụfọdụ ndị dị mfe.

N’otu akwụkwọ Michael Brough na Derek Brown, bụ́ ndị na-achọpụta ndị mere mpụ, gbakọtara aka dee, ha mesiri ike mkpa ọ dị ịdị na-eleru ndị na-abịa azụ ahịa anya, sị: “Na-eleru onye ọ bụla anya. . . . Gị na ndị na-erere gị ahịa bụ isi sekpụ ntị n’ịhụ na e chebere ụlọ ahịa gị.” Lee otú ha tụrụ aro isi na-agakwuru onye a na-enyo enyo na ọ bụ onye aka ntụtụ: “Ị̀ hụla ihe ị na-achọ? Biko wega ya n’ebe a na-akwụ ụgwọ, aga m agbakọrọ gị ego ole ọ bụ.” “Ọ̀ bụ m kechiere gị ya?” “Uwe oyi a ọ̀ ga-aba gị?” “Ọ̀ bụ m wetara gị ihe ị ga-eji tinye ya?” Ndị nchọpụta ahụ kwuru, sị: “Nke a na-eme ka ndị ahịa obi ha dị ọcha, nakwa ndị ohi, mara na ị hụla ha nakwa na i nwere mmasị n’ebe ha nọ.”

Banyere ime ka ihe dị n’usoro, ha kwuru, sị: “Na-akwaju ngwá ahịa akwaju ma na-ahazi ha nke ọma. Ịdị na-eleru anya mgbe nile n’ihe ndị ị kpọsara ga-eme ka ị mara ngwá ahịa ndị i nwere. Daberekwa n’otú i si hazie ha, ọ ga-adịkwuru gị mfe ịma mgbe e dogharịrị otu n’ime ha ma ọ bụ mgbe e wepụrụ ya.”Akwụkwọ bụ́ Every Retailer’s Guide to Loss Prevention.

Onye nchọpụta bụ́ Russell Bintliff na-atụ aro, sị: “Ịhụ na ọ dịghị ihe ndị nọchiri n’ebe ndị mmadụ si agagharị ná nnukwu ụlọ ahịa na ịkwaju ngwá ahịa akwạju ga-enyere ndị na-erere gị ahịa aka ịhụ ihe ndị bịara ịzụ ahịa na-eme. Site n’ịga n’ebe onye a na-enyo enyo garala, onye na-ere ahịa pụrụ ịma ihe na-efu. Mgbe ahụ, ọ pụrụ ime ka à ga-asị na ọ na-enyocha ngwá ahịa, ma si otú ahụ chọpụta ihe onye ahụ weere. . . . Ndị aka ntụtụ ga-ama ihe na-aga; ndị ahịa obi ha dị ọcha agaghịdị ama na a na-ele ha.” Banyere otú e kwesịrị isi dọba shelf n’ụlọ ahịa, ọ na-ekwu, sị: “E kwesịrị ịdọba ya otú ndị na-ere ahịa na [onye nwe ụlọ ahịa] ga-enwe ike ịhụ ndị bịara ịzụ ihe nke ọma.”—Akwụkwọ bụ́ Crimeproofing Your Business—301 Low-Cost, No-Cost Ways to Protect Your Office, Store, or Business.

[Foto dị na peeji nke 21]

Ime ihe n’eziokwu na-eme ka a tụkwasị mmadụ obi ma mete ya enyi