Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Kwesịrị Isi Mesoo Nwa Agbọghọ nke Gosiri Mmasị n’Ebe M Nọ?

Olee Otú M Kwesịrị Isi Mesoo Nwa Agbọghọ nke Gosiri Mmasị n’Ebe M Nọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Kwesịrị Isi Mesoo Nwa Agbọghọ nke Gosiri Mmasị n’Ebe M Nọ?

“Ọ bụ Susan malitere ya, ọ dịghịkwa m njọ. Ọ dị m nnọọ mma.”— James. *

“Ọ bụrụ na nwoke adịghị eme ihe n’eziokwu mgbe ya na ụmụ nwanyị na-emekọ ihe, ọ pụrụ ibute ọdachi.”—Roberto.

NA NSO nso a, otu nwa agbọghọ bịakwutere gị ma gwa gị na o nwere ihe ya chọrọ ịgwa gị. Ị na-ahụkarị ya mgbe unu na ndị enyi unu nọkọrọ, ọ na-atọkwa gị ụtọ iso ya akparịta ụka ma ọ bụ na-emekọ ihe. Ma, ihe ọ gwara gị enyebeghị gị ọnụ okwu. Ọ chọrọ ka unu malite mmekọrịta ịhụnanya, ọ chọkwara ịma ma ị chọrọ ya.

Nke a pụrụ iju gị anya ma ọ bụrụ na i kweere na ọ bụ nwoke kwesịrị ịgwa nwanyị okwu ọlụlụ. Ọ bụ ezie na ọ na-adịkarị otú ahụ, buru n’uche na site n’ibu ụzọ gwa gị ya, nwa agbọghọ ahụ emebighị ụkpụrụ Bible. * Eziokwu a pụrụ inyere gị aka ịzaghachi n’ụzọ dị mma.

Mgbe i chebasịịrị okwu ahụ echiche, ị pụrụ ikpebi na i torubeghị ikwuwe okwu ọlụlụ ma ọ bụkwanụ na, ka ọ dị ugbu a, i nweghị mmasị ịlụ nwa agbọghọ ahụ. Obi gị pụkwara ịma gị ikpe, gị ana-eche ma ò nwere ihe i mere o ji chewe na ị chọrọ ịlụ ya. Gịnị ka i kwesịrị ime? Nke mbụ, i kwesịrị ichebara mmetụta ya echiche.

Chebara Mmetụta Ya Echiche

Chee echiche banyere ihe nwa agbọghọ nọ n’ọnọdụ a gabigara. Ebe ọ bụ na ọ na-agụsi ya agụụ ike ka i nwee mmasị n’ebe ọ nọ, ọ pụrụ ịbụ na o jiriwo ọtụtụ ụbọchị mụgharịa otú ọ ga-esi gwa gị ihe ahụ ọ gwara gị. Ka ọ mụgharịsịrị ka ọ ga-esi jiri okwu na ihu ọchị ndị kwesịrị ekwesị gwa gị ya, ya abịazie tụlewe na i nwekwaranụ ike ịjụ. N’ikpeazụ, ya akata obi, obi na-amapụ ya akwụsịlata, o wee bịa gwa gị ihe dị ya n’obi.

N’ihi gịnị ka o ji tinye onwe ya n’ọnọdụ a tara akpụ? Ikekwe, o nwere ịhụnanya kpuru ìsì n’ebe ị nọ. Ọzọkwa, ọ pụrụ ịbụ na àgwà ọma gị dọọrọ mmasị ya n’ụzọ ọ na-esighị adọrọ mmasị ọtụtụ ndị. N’ihi ya, ihe ahụ ọ gwara gị nwere ike ịgụnye ụdị mma a na-adịghị aja gị kwa ụbọchị.

Ihe mere e ji akọwa ihe a nile abụghị ka ị dabere na ha wee mee mkpebi, kama ọ bụ iji chetara gị ka i jiri obiọma mesoo ya ihe. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Julie kwuru, sị: “Ọ bụrụgodị na nwoke ahụ enweghị mmasị n’ebe ọ nọ, isi kwesịrị ibu nwoke ahụ na e nwere onye gosiri mmasị n’ebe ọ nọ. N’ihi ya, kama ighewe nnọọ ọnụ oghe gwa ya na ya achọghị, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, o kwesịrị iji obiọma mesoo ya ihe ma jiri nwayọọ gwa ya ya.” Ka anyị weregodị ya na nke ahụ bụ nnọọ ihe ị chọrọ ime—“jiri nwayọọ gwa ya ya,” ma ọ bụ chọọ ụzọ ọzọ dị nro ị ga-esi gwa ya na ị chọghị.

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị gwabuola ya na ị chọghị? Ị pụrụ ịbụ onye a nwara ugbu a iji olu ike gwa ya na ị chọghị. Guzogide ọnwụnwa ahụ. Ilu 12:18 na-asị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha: ma ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.” Olee otú ị ga-esi jiri “ire ndị maara ihe” kwuo okwu?

Ị pụrụ ikele ya nnọọ ekele maka ịgwa gị obi ya nakwa maka inweru mmasị n’ebe ị nọ otú ahụ. Rịọ ya mgbaghara ọbụna n’ihi amaghị ama mee ka o chewe na ị chọrọ ịlụ ya. Jiri obiọma gwa ya n’ụzọ doro anya na ọ dịghị gị otú ahụ ọ dị ya. Ọ bụrụ na ọ ghọtaghị ihe ị na-ekwu, ya abụrụkwa na ọ dị mkpa ka i kwusikwuo ya ike, ị ka kwesịrị izere iji olu ike ma ọ bụ okwu mkparị gwa ya ya. Ghọta na obi ya esighị ike, otú i si zaghachi ga-emetụkwa ya n’obi, n’ihi ya, nweere ya ndidi. Ọ bụrụ gị nọ n’ọnọdụ ya, ọ ga-adị gị mma ma o jiri nwayọọ gwa gị ya, ọ́ bụghị ya?

Otú ọ dị, ọ pụrụ ịnọgide na-ekwu na ị kpachaara anya duhie ya. Ọ pụrụ ikwu ihe ụfọdụ i mere bụ́ ndị mere o ji chewe na ị chọrọ ịlụ ya. Ọ pụrụ ikwu, sị, ‘Ì chetara mgbe i nyere m fụlawa?,’ ma ọ bụ ‘Ì chetara ihe ị gwara m n’ọnwa gara aga mgbe anyị abụọ so na-aga ihe?’ Ugbu a, ị ghaghị inyocha onwe gị nke ọma.

Kweta nke Bụ́ Eziokwu

Ndị na-eme nchọpụta n’oge ochie na-ewerekarị mba ndị ha chọpụtara dị ka ndị ha kwesịrị imeri ma rigbuo. Taa kwa, ụfọdụ ụmụ nwoke na-ele ụmụ nwanyị anya otú ahụ. Ọ na-atọ ha ụtọ iso ụmụ nwanyị na-eme enyi ma ha adịghị achọ ibu ibu dị n’alụmdi na nwunye. Ha na-agbalị inweta obi ụmụ nwanyị n’enweghị mgbe ha bu n’obi ịlụ ha alụ. Nwoke dị otú ahụ na-eji aghụghọ eme ka nwanyị hụwa ya n’anya. Otu Onye Kraịst bụ́ okenye kwuru, sị: “O yiri ka ụfọdụ ụmụ okorobịa hà na-eme ha na nwa agbọghọ nke a kpatụ taa, echi ha na nwa agbọghọ ọzọ akpawa. Ọ dịghị mma iji obi nwanyị na-egwuri egwu otú ahụ.” Ebee ka ịchọ ọdịmma onwe onye dị otú ahụ na-eduga?

“Dị ka onye ara nke na-atụ akụ́ na-ere ọkụ, na akụ́, na ọnwụ; otú a ka onye ahụ dị nke [ghọgbuworo] mmadụ ibe ya, wee sị, Ọ́ bụghị egwú ka m na-egwu?” (Ilu 26:18, 19) Mgbe nwoke chọrọ ka ya na nwanyị dị ná mma n’ihi ọdịmma nke onwe ya nanị, nwanyị ahụ ga-emesị chọpụta ihe bụ́ obi ya. Mgbe ahụ, aghụghọ nwoke ahụ pụrụ ịkpatara nwanyị ahụ obi mgbawa, dị ka akụkọ na-esonụ na-egosi.

Otu nwa okorobịa bịara nwee mmasị n’ebe otu nwa agbọghọ nọ, ma o nweghị mmasị ịlụ ya. Ya ana-akpọ ya aga n’ụlọ nri ndị dị mma, ha abụọ ana-esokwa aga nnọkọ ntụrụndụ. Obi na-adị ya ụtọ mgbe ọ bụla ya na nwa agbọghọ ahụ nọ, nwa agbọghọ ahụ nwekwara mmasị n’ihu ọ na-enye ya, obi ya abụrụ na ọ chọrọ ịlụ ya. Mgbe nwa agbọghọ ahụ chọpụtara na ọ bụ nanị ka ha dị ná mma ka ọ chọrọ, o wutere ya nke ukwuu.

Ọ bụrụ na i mewo n’amaghị ama ka nwa agbọghọ ahụ bịakwutere gị chewe na ị chọrọ ịlụ ya, gịnị ka i kwesịrị ime? Nanị ihe ịgbachitere onwe gị na ịnwa ime ka ihe i mere yie ihe ziri ezi ga-eme bụ ịgbawa ya obi. Tụlee ụkpụrụ a dị na Bible: “Onye na-ekpuchi njehie ya nile, ọ gaghị agara ya: ma onye na-ekwupụta ha, nke na-ahapụkwa ha, a ga-enwe obi ebere n’ahụ́ ya.” (Ilu 28:13) N’ihi ya, kwuo eziokwu. Kweta ebe ndị ị mejọrọ. Ọ bụrụkwa na ị kpachaara anya rie obi ya, kweta na i mejọrọ ya. Jiri obi gị nile rịọ ya mgbaghara.

Otú ọ dị, atụkwala anya na mgbaghara ị rịọrọ ya bụ ebe okwu ahụ ga-ebi. Nwa agbọghọ ahụ pụrụ ịnọgide na-ewesa gị iwe ruo oge ụfọdụ. Ọ pụrụ ịbụ na ị ghaghị ịkọwara ndị mụrụ ya ihe i mere. Ị pụkwara ịta ahụhụ ya n’ụzọ ndị ọzọ. Ndị Galeshia 6:7 na-ekwu, sị: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọkwa.” Ma site n’ịrịọ ya mgbaghara na ime ihe ọ bụla ị pụrụ ime iji hụ na i meziri ihe i mebiri, ị ga-enyere ya aka ibiri ndụ ya gaa n’ihu. Ahụmahụ a ga-enyekwara gị aka ‘ichezi egbugbere ọnụ gị ka ọ ghara ikwu okwu aghụghọ’ n’ihe ọ bụla ị na-eme ná ndụ, gụnyere ihe ndị gbasara ụmụ nwanyị.—Abụ Ọma 34:13.

Chee Echiche nke Ọma Tupu Ị Na-azaghachi

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmatakwu nnọọ nwa agbọghọ ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, i kwesịrị ịghọta na nwoke na nwanyị ime enyi na ịkpachi anya abụghị ụzọ isi na-ekpori ndụ. Mmetụta siri ike nwoke na nwanyị na-akpachi anya na-enwe n’ebe ibe ha nọ bụ ihe na-eduga ha n’ikwe onwe ha nkwa ọlụlụ. Mgbe ha lụsịrị, mmetụta ndị ahụ na-enyere ha aka ịrapagidesi ike n’ahụ́ ibe ha dị ka di na nwunye. Olee otú ịmara nke a pụrụ isi metụta gị ugbu a?

Mgbe i chesịrị echiche banyere nwa agbọghọ a, ị pụrụ ịchọpụta na e nwere ọtụtụ ihe na-adọta gị n’ebe ọ nọ. O mepeela ụzọ, ị gaghịkwa achọ imechi ya. Ma, kama iji ọsọ malite ikwu okwu ọlụlụ, chọọ ụzọ unu abụọ ga-esi chebe onwe unu pụọ ná nsogbu n’ikpeazụ.

Oge ga-eru mgbe ị pụrụ ịchọ ịjụtụ ụfọdụ ndị toro eto maara ya ajụjụ ụfọdụ. Tụọrọ ya aro ka ọ jụọkwa ụfọdụ ndị maara gị banyere gị. Onye ọ bụla n’ime unu kwesịrị ịjụ ndị ahụ toro eto ebe ndị ha chere onye nke ọzọ na-eme nke ọma nakwa ebe ndị ọ na-adịghị eme nke ọma. Unu pụkwara ịjụ ndị okenye ọgbakọ ihe bụ́ echiche ha. Ọ dị mma ịmata ma onye ị na-achọ ịlụ ọ̀ bụkwa onye a na-ele anya ọma n’ọgbakọ Ndị Kraịst.

Ma ị pụrụ ikwu, sị, ‘Gịnị mere ndị ọzọ ga-eji tinye ọnụ n’ihe ndị dịịrị m?’ Nke bụ́ eziokwu bụ na ọbụna n’okwu ndị dịịrị nanị gị, dị ka okwu ọlụlụ, ịmata ihe bụ́ echiche nke ndị ọzọ bụ ihe ezi uche dị na ya. N’ezie, Akwụkwọ Nsọ kwadoro ya, n’ihi na Ilu 15:22 na-ekwu, sị: “N’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ ka [ihe] na-eguzosi ike.” Ndị ahụ ị ga-ajụ abụghị ha ga-emere gị mkpebi. Ma “ndụmọdụ nke mkpụrụ obi” ha ga-enye pụrụ ime ka ị hụ ihe ụfọdụ ị na-amaghị banyere nwa agbọghọ ahụ nakwa banyere onwe gị.—Ilu 27:9.

James, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru ná mmalite, mere nke a. Ọ bụ ezie na o bi nanị ya, ọ gwara ndị mụrụ ya banyere Susan. Mgbe ahụ, ya na Susan gwarịtara ibe ha aha ndị ha maara toro eto bụ́ ndị pụrụ ịgwa ha ihe ụfọdụ ga-enyere ha aka ịma ma ihe ọ̀ ga-adabara ha ma ha lụọ. Mgbe James na Susan nụrịtara ihe dị mma banyere onwe ha, ha malitere ileru onwe ha anya iji mara ma hà ga-alụ. Ọ bụrụ na i mee otu ihe ahụ tupu adịm ná mma unu abamie ime, ahụ́ ga-aka nnọọ eru gị ala ná mkpebi ị ga-eme n’ikpeazụ.

Nke kasịnụ, kpegara Jehova ekpere. Ebe ọ bụ na adịm ná mma bụ nzọụkwụ na-eduga n’ọlụlụ, rịọ Chineke ka o nyere gị aka ịhụ ma adịm ná mma unu a ọ̀ pụrụ iduga n’ọlụlụ. Nke ka mkpa, rịọ Chineke ka o nyere unu aka ime mkpebi ndị ga-eme ka unu bịarukwuo ya nso. Nke ahụ bụ ihe ga-eme ka unu abụọ nwee obi ụtọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ndị dị n’isiokwu a.

^ par. 6 A tụlere otú nwa agbọghọ pụrụ isi gwa nwa okorobịa mmetụta ọ na-enwe n’ebe ọ nọ n’isiokwu “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị” bụ́ ndị pụtara ná mbipụta Teta! nke November 8, 2004, na January 8, 2005.

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Ọ bụrụ na i nweghị mmasị n’ezie n’ebe ọ nọ, kpachara anya ka ị ghara ime ka o chewe na i nwere