Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị A Chụrụ n’Ọrụ na Mberede!

Ndị A Chụrụ n’Ọrụ na Mberede!

Ndị A Chụrụ n’Ọrụ na Mberede!

“Mgbe a chụrụ m n’ọrụ, ọ dị m ka à wụrụ m bọket mmiri oyi n’ahụ́. Ùgwù m dara nke ukwuu.”—Tony, bụ́ onye nọ na Germany.

“Ọ dị m nnọọ ka à ga-asị na e bokwasịrị m nkume dị arọ n’isi. Dị ka nne nanị ya na-azụ ụmụ, abịara m chegbuwe onwe m banyere otú m ga-esi na-akpa afọ ụmụ m abụọ ma na-akwụ ihe ndị dị ka ụgwọ ụlọ.”—Mary, bụ́ onye nọ n’India.

“Adara m mbà n’obi nke ukwuu mgbe a chụrụ m n’ọrụ, anọkwa m na-enwe nchegbu ma m̀ ga-enwe ike ịchọta ọrụ ọzọ.”—Jaime, bụ́ onye nọ na Mexico.

N’ỤWA nile, ọtụtụ nde mmadụ nọ n’ụdị ọnọdụ ahụ Tony, Mary, na Jaime nọ na ya. Ihe dị ka ná ngwụsị narị afọ gara aga, e kwuru na ihe dị ka pasent 10 nke ndị toruru ịrụ ọrụ na Europe nakwa n’Ebe Etiti Eshia—ihe dị ka nde mmadụ iri abụọ na atọ—na-achọ ọrụ. N’ụfọdụ mba ndị na-emepechaghị emepe, ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị toruru ịrụ ọrụ enweghị ọrụ. Na United States, “ihe fọrọ nke nta ka o ruo nde mmadụ abụọ na narị puku isii ghọrọ ndị na-enweghịzi ọrụ n’ime ọnwa 28 gara aga,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times nke July 2003, kwuru.

N’ọtụtụ ala, ịchọ ọrụ na-abụ oké ihe isi ike. Dị ka ihe atụ, kwa afọ, imerime ndị gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị nakwa na mahadum na-achọgharị ọrụ. Ọzọkwa, mmadụ inwe akara ugo mmụta ma ọ bụ inweta ọzụzụ pụrụ iche n’ọrụ ụfọdụ abụghị ihe na-eme ka e jide n’aka na ọ ga-enweta ụdị ọrụ ọ chọrọ. N’ihi ya, ndị mmadụ ịgbanwe ọrụ ọtụtụ ugboro ná ndụ bụ ihe a na-ahụkarị ugbu a. Ụfọdụ na-ahapụdị ọrụ ha mụrụ rụwa ụdị ọrụ ọzọ.

Ọ bụrụ na a chụọ gị n’ọrụ, gịnị ka ị pụrụ ime iji nwee ike ịchọta ọrụ ọzọ? Mgbe ị chọtasịkwara ọrụ, gịnị ka ị pụrụ ime iji nọgide na ya?