Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere M Ji Kwesị Ịdị Na-agụ Ihe?

Gịnị Mere M Ji Kwesị Ịdị Na-agụ Ihe?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Mere M Ji Kwesị Ịdị Na-agụ Ihe?

“Ike ịgụ ihe anaghị adị m. Kama ịgụwa ihe, ana m aga kiriwe telivishọn.” — Margarita, ọ dị afọ 13, o si Russia.

“A sị m họrọ ịgụ akwụkwọ ma ọ bụ ịkụ ‘basketball,’ m ga-ahọrọ ịkụ ‘basketball.’” — Oscar, ọ dị afọ 19, o si United States.

Ọ BỤRỤ na i jisiri ike gụruo n’ahịrịokwu a, ikekwe ị ga-aghọta na ịgụ ihe bụ ihe dị mkpa nke mmadụ kwesịrị ịmụta. N’agbanyeghị nke ahụ, ị pụrụ iwere ịgụ akwụkwọ ma ọ bụ ọbụna otu isiokwu gbara na magazin otú i si ewere ịnụ ọgwụ: Ị maara na ọ ga-adị gị mma n’ahụ́, ma ọ gaara amasị gị ma a sị na ị ga-ezeteli ya.

Ndị na-ebipụta Teta! gbara ndị ntorobịa si mba 11 ajụjụ ọnụ iji chọpụta ihe ịma aka na uru ndị ha na-erite n’ịgụ ihe. Ha kwuru ihe ndị na-esonụ.

Gịnị mere ịgụ ihe ji esiri gị ike?

“Ọ na-adị m ka enweghị m oge maka ya.”—Semsihan, ọ dị afọ 19, o si Germany.

“Ịgụ ihe bụ ọrụ siri ike. Ọ na-eme m umengwụ.”—Ezekiel, ọ dị afọ 19, o si Philippines.

“Anaghị m achọ ka mmadụ manye m ịgụ ihe ndị na-agwụ ike ọgụgụ.” —Christian, ọ dị afọ 15, o si England.

“Ọ bụrụ na ọ bụ obere akwụkwọ, enwere m ike nwee mmasị ịgụ ya. Ma, ọ bụrụ akwụkwọ ukwu, ọ na-amafu m obi.”—Eriko, ọ dị afọ 18, o si Japan.

“Ihe ndị ọzọ na-adọpụkarị uche m. Uche m anaghị adịgide n’ihe m na-agụ.” —Francisco, ọ dị afọ 13, o si South Africa.

A na-agba Ndị Kraịst na-eto eto ume ịdị na-agụ Bible. (Abụ Ọma 1:1-3) Ọ̀ na-esiri gị ike ịgụ ya? Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike, gịnị kpatara ya?

“Bible bụ nnọọ nnukwu akwụkwọ! Echeghị m na m ga-agụchali ya ná ndụ m nile!”—Anna, ọ dị afọ 13, o si Russia.

“Akụkụ ụfọdụ nke Bible na-esi ike nghọta, ha anaghịkwa atọ ụtọ.”—Jezreel, ọ dị afọ 11, o si India.

“Ọ na-esiri m ike ịgụchi Bible anya n’ihi na ahazitụghị m ihe omume m ahazi.”—Elsa, ọ dị afọ 19, o si England.

“Ọ na-esiri m ike n’ihi na ọrụ ụlọ na ihe omume ụlọ akwụkwọ na-ewekọrọ ihe ka ukwuu n’oge m.”—Zurisadai, ọ dị afọ 14, o si Mexico.

“Ọ na-esiri m ike ịgụ Bible n’ihi na apụghị m ibelata oge m na-etinye n’egwuregwu.”—Sho, ọ dị afọ 14, o si Japan.

O doro anya na ịgụ ihe na-esi ike. Ma, ò kwesịrị mgbalị ọ bụla e meere ya? Olee uru ndị i riterela n’ịgụ ihe?

“Ịgụ ihe emeela ka m mụtakwuo ihe, o meekwala ka obi na-esikwu m ike mgbe ọ bụla mụ na ndị mmadụ na-ekwurịta okwu.”—Monisha, ọ dị afọ 14, o si India.

“Ịgụ ihe na-eme ka ahụ́ ruo m ala, na-emekwa ka uche m pụọ ná nsogbu ndị m na-enwe.—Alison, ọ dị afọ 17, o si Australia.

“Ịgụ ihe na-eme ka m mara banyere ebe ndị m na-agaraghị ama ma a sị na m gụghị banyere ha.”—Duan, ọ dị afọ 19, o si South Africa.

“Ịgụ ihe na-enyere m aka iji aka m chọpụta ihe, kama ịdabere n’ihe ndị ọzọ kọọrọ m.”—Abihú, ọ dị afọ 16, o si Mexico.

Olee ihe nyeere gị aka inwe mmasị n’ịgụ ihe?

“Malite nnọọ mgbe m ka dị obere, ndị mụrụ m na-agba m ume ịdị na-agụpụta ihe agụpụta.”—Tanya, ọ dị afọ 18, o si India.

“Ndị mụrụ m gbara m ume ịdị na-eji anya nke uche m ahụ ihe m na-agụ banyere ya, ka m na-ewere ya na m na-ahụ ihe m na-agụ banyere ya.”—Daniel, ọ dị afọ 18, o si England.

“Papa m tụụrụ m aro ka m malite n’akwụkwọ Bible ndị ka atọ m ụtọ, dị ka Abụ Ọma na Ilu. Ugbu a, achọpụtala m na ịgụ Bible na-enye ọṅụ, ọ bụghị ibu arụ.”—Charene, ọ dị afọ 16, o si South Africa.

“Tupu m ruo afọ anọ, ndị mụrụ m arụtarala m tebụl na shelf, ha debekwara akwụkwọ nile ha zụtaara m kemgbe a mụrụ m, na ya.”—Airi, ọ dị afọ 14, o si Japan.

Gịnị mere i ji chee na ọ dị mkpa ịgụ Bible?

“Ndị mmadụ nwere ọtụtụ ihe na-abụghị eziokwu ha kweere banyere Bible. Ọ ka nnọọ mma ma i jiri aka gị gụọ ihe Bible kwuru banyere ihe ndị a.” (Ọrụ 17:11)—Matthew, ọ dị afọ 15, o si United States.

“Ka i wee ghọta Bible, ị ga-echebarịrị ihe ị na-agụ echiche. Ma, ịgụ ya enyerela m aka iji obi ike na-ekwu okwu, ma na-ekwu ya n’ụzọ doro anya, mgbe m na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị m kweere.” (1 Timoti 4:13)—Jane, ọ dị afọ 19, o si England.

“Mgbe m na-agụ Bible, ọ na-adị m ka Jehova ò ji ọnụ ya agwa m okwu. Ọ na-emetụ m n’obi mgbe ụfọdụ.” (Ndị Hibru 4:12)—Obadiah, ọ dị afọ 15, o si India.

“Enwetawala m ọṅụ n’ịgụ Bible n’ihi na ọ na-akọrọ m ihe Jehova na-eche banyere m, na-enyekwa m ezi ndụmọdụ.” (Aịsaịa 48:17, 18)—Viktoriya, ọ dị afọ 14, o si Russia.

Olee oge ị na-eji agụ Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible?

“Enwere m usoro m na-eji agụ Bible. Ihe mbụ m na-eme kwa ụtụtụ bụ ịgụ otu isiakwụkwọ Bible.”—Lais, ọ dị afọ 17, o si Brazil.

“M na-agụ Bible na akwụkwọ ndị ọzọ nke Ndị Kraịst n’ụgbọ okporo ígwè mgbe m na-aga akwụkwọ. Anọgidela m na-eme nke a ruo afọ anọ ugbu a.”—Taichi, ọ dị afọ 19, o si Japan.

“Ana m agụtụ Bible n’abalị ọ bụla tupu m lakpuo.”—Maria, ọ dị afọ 15, o si Russia.

“M na-agụ peeji anọ nke ‘Ụlọ Nche’ ma ọ bụ ‘Teta!’ kwa ụbọchị. Ana m agụchapụ magazin ndị ahụ tupu ọzọ abịa.”—Eriko, ọ dị afọ 18, o si Japan.

“M na-agụ Bible kwa ụtụtụ tupu m gawa akwụkwọ.”—James, ọ dị afọ 17, o si England.

Dị ka ihe ndị a ndị na-eto eto kwuru na-egosi, ịgụ ihe pụrụ ime ka obi sikwuo gị ike, meekwa ka i nwekwuo ihe ọmụma. Gị ịgụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible—gụnyere magazin a—ga-enyekwara gị aka ‘ịbịaru Chineke nso.’ (Jems 4:8) N’ihi ya, ọ bụrụgodị na ịgụ ihe na-esiri gị ike, akwụsịla!

IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee ihe mere o ji dị mkpa ka ị na-agụ Okwu Chineke?

▪ Olee otú ị pụrụ isi ‘zụpụta oge’ iji na-agụ Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible?—Ndị Efesọs 5:15, 16.

[Igbe dị na peeji nke 11]

JIKỌTA YA NA IHE Ị MAARA

Jikọta ihe ị gụtara na ihe ị dị mbụ mara banyere onwe gị na ihe ndị gbara gị gburugburu. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị na-esonụ:

Ya na Ihe Ị Gụtarala Mbụ Ọnọdụ ma ọ bụ nsogbu ndị m gụtara n’akwụkwọ a hà yiri ndị m gụtatụrụla n’akwụkwọ, na magazin, ma ọ bụ n’akụkọ ndị ọzọ? Ndị a kọrọ banyere ha na ya, hà na-akpa àgwà ka ndị ọzọ m gụtatụrụla banyere ha?

Ya na Onwe Gị Olee otú ihe e kwuru ebe a si metụta ọnọdụ m, omenala m, nsogbu m? M̀ pụrụ iji ya dozie nsogbu m ma ọ bụ mee ka ndụ m ka mma?

Ya na Ihe Ndị Gbara Gị Gburugburu Gịnị ka ọ na-akụziri m banyere ihe ndị e kere eke, ụwa anyị a, ọdịnala dị iche iche, ma ọ bụ nsogbu ndị a na-enwe n’obodo? Gịnị ka ọ na-akụziri m banyere Onye Okike?