Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Mmehie Mbụ ahụ E Mere?

Gịnị Bụ Mmehie Mbụ ahụ E Mere?

Echiche Nke Bible

Gịnị Bụ Mmehie Mbụ ahụ E Mere?

AJỤJỤ a abụghị obere ajụjụ. Ọ bụ ajụjụ dị oké mkpa nye onye ọ bụla n’ime anyị. N’ihi gịnị? N’ihi na nnupụ Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi metụtara mmadụ nile malite n’oge ahụ ruokwa n’oge anyị a. Bible kwuru, sị: “Mmehie sitere n’otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile n’ihi na ha nile emehiewo.” (Ndị Rom 5:12) Ma, olee otú nanị ịghọrọ na iri mkpụrụ nke otu osisi si kpata oké ọdachi dị otú ahụ?

Mgbe Chineke kere Adam na Iv, o debere ha n’ogige mara mma nke nwekwara ihe ọkụkụ na mkpụrụ osisi ndị na-edozi ahụ́. Nanị otu osisi ka ha na-ekwesịghị iri mkpụrụ ya—‘osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.’ Ebe ọ bụ na Adam na Iv nweere onwe ha ime nhọrọ, ọ dị ha n’aka ịhọrọ irubere Chineke isi ma ọ bụ inupụrụ ya isi. Otú ọ dị, a dọrọ Adam aka ná ntị na “n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere [n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ] ị ghaghị ịnwụ anwụ.”—Jenesis 1:29; 2:17.

Mmachibido Iwu nke Kwesịrị Ekwesị

Otu iwu a a machibidoro Adam na Iv enweghị ihe ọ bụla o wepụrụ ha n’ahụ́; ha pụrụ iri mkpụrụ osisi ọ bụla ọzọ dị n’ogige ahụ. (Jenesis 2:16) Ọzọkwa, iwu ahụ a machibidoro ha adịghị egosi na di na nwunye ahụ nwere àgwà ọjọọ, ọ napụghịkwa ha ùgwù ha. A sị na ihe Chineke machibidoro ha iwu ime bụ ihe ọjọọ ndị dị ka iso ụmụ anụmanụ nwee mmekọahụ ma ọ bụ igbu ọchụ, ụfọdụ pụrụ ikwu na ụmụ mmadụ zuru okè nwere ọchịchọ ọjọọ ndị ọ dị mkpa ka e gbochie. Ma, a bịa n’iri ihe, e kere mmadụ iri ihe, ọ dịghịkwa ihe ọjọọ dị na ya.

Mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro Adam na Iv iwu iri ọ̀ bụ inwe mmekọahụ, dị ka ụfọdụ kwenyesiri ike na ọ bụ ya? Ọ dịghị ebe ọ bụla Akwụkwọ Nsọ kwadoro echiche a. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, mgbe Chineke nyere iwu ahụ, ọ bụ nanị Adam bụ mmadụ nọnụ, ihe àmà na-egosikwa na ọ nọgidere nanị ya ruo oge ụfọdụ. (Jenesis 2:23) Ọzọkwa, Chineke gwara Adam na Iv ka ha ‘mụọ ọmụmụ, baa ụba, jupụta ụwa.’ (Jenesis 1:28) O doro anya na ọ gaghị agwa ha ka ha mebie iwu ya ma mesịa ma ha ikpe ọnwụ n’ihi ime otú ahụ! (1 Jọn 4:8) Tụkwasị na nke ahụ, Iv riri mkpụrụ osisi ahụ tupu Adam, e mesịzie ya enye di ya ụfọdụ n’ime mkpụrụ osisi ahụ. (Jenesis 3:6) N’ezie, o doro anya na mkpụrụ osisi ahụ abụghị mmekọahụ.

Mgbalị Mmadụ Merela Iji Nwere Onwe Ya Ikpebi Otú Ọ Ga-esi Na-eme Omume

Osisi ịma ihe ahụ bụ osisi nkịtị. Ma, ọ na-anọchi anya oruru o ruuru Chineke ịbụ Onye Ọchịchị nke ga na-ekpebiri ụmụ mmadụ o kere eke ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ. N’ihi ya, ọ bụghị nanị na iri mkpụrụ osisi ahụ bụ ohi—iwere ihe Chineke—kamakwa ọ bụ mmadụ ime ihe na-erughịrị ya nke bụ́ ịchọ inwere onwe ya ikpebi ihe ọ ga na-eme. Ghọta na mgbe Setan ghasịịrị Iv ụgha na ‘ọ dịghị ọnwụ ha na-aghaghị ịnwụ’ ma ya na di ya rie mkpụrụ osisi ahụ, o kwuru, sị: “N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.”—Jenesis 3:4, 5.

Otú ọ dị, mgbe ha riri mkpụrụ osisi ahụ, Adam na Iv amaghị ihe ọma na ihe ọjọọ otú Chineke si mara ya. N’ezie, Iv gwara Chineke, sị: ‘Agwọ ahụ rafuru m.’ (Jenesis 3:13) Ma, Iv maara iwu ahụ Chineke nyere, ọ gwadịrị agwọ ahụ, bụ́ ọnụ na-ekwuru Setan, ihe Chineke nyere n’iwu. (Mkpughe 12:9) N’ihi ya, ọ kpachaara anya nupụ isi. (Jenesis 3:1-3) Ma, a rafughị Adam arafu. (1 Timoti 2:14) Kama iji obi ya nile rubere Onye Okike ya isi, o gere nwunye ya ntị ma chọọ inwere onwe ya dị ka nwunye ya mere.—Jenesis 3:6, 17.

Site n’igosi na ha enwerela onwe ha, Adam na Iv mebiri mmekọrịta ha na Jehova n’ụzọ na-enwekwaghị mmekwata, ma mee ka mmehie zuo ha ahụ́. Ọ bụ eziokwu na ha biri ndụ ruo ọtụtụ narị afọ, ha malitere ịnwụ ‘n’ụbọchị ahụ’ ha mehiere, dị ka alaka osisi e gbupụrụ egbupụ ga-esi malite ịkpọnwụ n’ụbọchị ahụ e gbupụrụ ya. (Jenesis 5:5) Ọzọkwa, ụbọchị ahụ bụ ụbọchị mbụ ha malitere inwe ahụ́ erughị ala. Ha bịara mara na ha gba ọtọ, ma chọwazie izo onwe ha ka Chineke ghara ịhụ ha. (Jenesis 3:7, 8) Obi ha malitekwara ịma ha ikpe, ahụ́ erughịzikwa ha ala, ihere amalitekwa mewe ha. Mmehie ha tinyere ha ọgba aghara n’isi, akọ na uche ha ana-agwakwa ha na ha emeela ihe ọjọọ.

Ka Chineke wee hụ na okwu ya mezuru nakwa na ọ gbasoro ụkpụrụ ya dị nsọ, ọ mara Adam na Iv ikpe ọnwụ n’ụzọ ziri ezi ma chụpụ ha n’ogige Iden. (Jenesis 3:19, 23, 24) Otú a ka Paradaịs, obi ụtọ, na ndụ ebighị ebi si fuo, mmehie, nhụjuanya, na ọnwụ amalitezie. Lee ọnọdụ na-agbawa obi nke a merela ka ụmụ mmadụ banye na ya! Ma, ngwa ngwa Chineke machara di na nwunye ahụ ikpe ọnwụ, o kwere nkwa imezi ihe nile mmehie ha mebiri n’emebighị ụkpụrụ ezi omume ya.

Jehova zubere ime ka ụmụ Adam na Iv nwere onwe ha pụọ n’agbụ mmehie nke na-akpata ọnwụ. O si n’aka Jizọs Kraịst mezuo nke a. (Jenesis 3:15; Matiu 20:28; Ndị Galeshia 3:16) Chineke ga-esi n’aka Jizọs kpochapụ mmehie na ihe nile mmehie kpatara ma mee ka ụwa nile ghọọ paradaịs, dị nnọọ ka o zubere ná mmalite.—Luk 23:43; Jọn 3:16.

Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?

Olee otú anyị si mara na mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu abụghị inwe mmekọahụ?—Jenesis 1:28.

▪ Gịnị ka iri mkpụrụ osisi ahụ na-egosi?—Jenesis 3:4, 5.

▪ Olee ndokwa Chineke merela iji mezie ihe mmehie mebiri?—Matiu 20:28.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

Mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu abụghị inwe mmekọahụ

[Foto dị na peeji nke 28, 29]

Iv chọrọ ịdị ka Chineke, na-ekpebiri onwe ya ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ