Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchụ Ego Ọ̀ Na-akpatara Gị Nsogbu?

Ịchụ Ego Ọ̀ Na-akpatara Gị Nsogbu?

Ịchụ Ego Ọ̀ Na-akpatara Gị Nsogbu?

Ị̀ BAA ọgaranya echi, gịnị ka ị ga-eme? Ị̀ ga-akwụsịlata ịkpa ego ma riwe nke ị kpara akpa? Ka ị̀ ga-akwụsị ịrụ ọrụ ma wepụtakwuo oge iji soro ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị na-anọkọ? Ka ị̀ ga-amalite ịrụ ọrụ i nwere nnọọ mmasị na ya? Ọ dị mma ịmara na ọtụtụ ndị bara ọgaranya adịghị eme ihe ndị ahụ. Kama nke ahụ, ha na-anọgide na-achụ ego ná ndụ ha nile—ma ọ́ bụghị iji kwụchaa ụgwọ ha kotere ọhụrụ, ya abụrụ nanị ka ha wee bakwuo ọgaranya.

Otú ọ dị, ụfọdụ ndị tinyerela ndụ ha n’ịchụ ego achọpụtawala mmetụta ọjọọ ụzọ ha si na-achụ ego nwerela n’ahụ́ ha, n’ezinụlọ ha, nakwa n’àgwà ụmụ ha. Na nso nso a, akwụkwọ dị iche iche, ihe omume televishọn, nakwa fim dị iche iche adọọla aka ná ntị megide ibi ndụ ndị oké ozu, ma na-agba ndị mmadụ ume “iji aka ha họrọ ibi ndụ dị mfe.” Ọtụtụ n’ime akwụkwọ na fim ndị a mere ka o doo anya na mmadụ itinye ndụ ya nile n’ịchụ ego pụrụ ịkpatara ya nsogbu—nsogbu ndị dị ka nsogbu ụbụrụ, obi mgbawa, nakwa ọbụna ọrịa.

N’ezie, ọ bụghị taa ka e bidoro nwewe nchegbu banyere nsogbu ndị ịhụ ego n’anya na-akpata. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, Bible kwuru, sị: “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ amaghị ihe nke na-emerụkwa ahụ́, bụ́ ndị na-akwakpu mmadụ ná mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile, sitekwa n’ịchụso ịhụnanya nke a e duhiewo ụfọdụ pụọ n’okwukwe, ha ejiriwokwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara.”—1 Timoti 6:9, 10.

Ihe a Bible kwuru ọ̀ bụnụ eziokwu? Ndị tinyere ndụ ha n’ịchụ ego na akụnụba, hà na-ata ahụhụ ya n’ezie? Ka hà na-enweta ihe nile ha chọrọ—ya bụ, akụnụba, ezi ahụ́ ike, na ezinụlọ na-enwe obi ụtọ? Ka anyị hụ.