Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo Ka Ọ̀ Bụ Eziokwu?

Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo Ka Ọ̀ Bụ Eziokwu?

Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo Ka Ọ̀ Bụ Eziokwu?

Timoti, onye bụ́ okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst, gwara ndị nwere mmasị n’ife ezi Chineke ka ha ghara ige ntị ná “nkụzi ụgha” na “akụkọ ifo.” (1 Timoti 1:3, 4, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Ụdị ịdọ aka ná ntị ahụ ọ̀ dị mkpa taa? Ee, ọ dị mkpa n’ihi na echiche na-ezighị ezi ndị mmadụ nwere banyere Baịbụl na ihe ọ na-akụzi na-eme ka ha ghara ife Chineke ezi ofufe. N’okpuru ebe a, ị ga-ahụ ụfọdụ ihe a na-ekwukarị banyere Baịbụl. Ị ga-ahụkwa ihe Baịbụl n’onwe ya kwuru. Ihe ndị a ga-enyere gị aka ịmata nke bụ́ akụkọ ifo na nke bụ́ eziokwu.

Akụkọ ifo: Ọ dịghị otú ọrụ ebube ndị e dekọrọ na Baịbụl ga-esi kwe omume.

Eziokwu: Ụmụ mmadụ nwere ọtụtụ ihe ha ga-amụta banyere ihe ndị Chineke kere. Ọ dịghị onye ọkà mmụta sayensị ga-akọwali ihe niile banyere ikike ndọda, kọwalie ihe niile mejupụtara atọm, ma ọ bụ kọwaa kpọmkwem ihe oge bụ. “Ị̀ ga-achọpụtali ihe omimi nke Chineke, ka ị̀ ga-achọpụtali ebe ịdị ukwuu nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile jedebere?” (Job 11:7) Ebe ọ bụ na anyị enweghị ike ịghọtacha ihe ndị e kere eke, ndị ọkà mmụta sayensị maara nke a na-akọ anaghịzi adị ngwa ikwu na ihe agaghị ekwe omume.

Akụkọ ifo: Okpukpe niile na-eduga n’ebe Chineke nọ.

Eziokwu: Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:31, 32) Ọ bụrụ na okpukpe niile na-eduga n’ebe Chineke nọ, ọ̀ ga-adị mkpa ime ka ndị nọ ha nwere onwe ha? N’eziokwu, Jizọs kụziri na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nọ ‘n’okporo ụzọ nke na-eduba ná ndụ.’—Matiu 7:13, 14.

Akụkọ ifo: Ndị ezi omume niile na-aga eluigwe ma ha nwụọ.

Eziokwu: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile. Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi. Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, debekwa ụzọ ya, ọ ga-ebulikwa gị elu inweta ụwa.” (Abụ Ọma 37:11, 29, 34) Ọ bụ naanị mmadụ dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ga-aga eluigwe. Ọrụ Chineke nyere ha bụ ‘ịchị ụwa dị ka ndị eze.’—Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 4.

Akụkọ ifo: “Agba Ochie” abaghịziri Ndị Kraịst uru.

Eziokwu: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru.” (2 Timoti 3:16, 17) “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) “Agba Ochie,” bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru, na-akụziri anyị ihe ndị dị mkpa banyere Chineke, ọ na-emekwa ka anyị kwenyesie ike “n’Agba Ọhụrụ” bụ́ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

Akụkọ ifo: Ọtụtụ n’ime ihe ndị e dere n’akwụkwọ Jenesis, nke gụnyere akụkọ banyere Adam na Iv, bụ́ akụkọ ifo.

Eziokwu: Onye dere Oziọma Luk malitere n’Adam dewe osuso ọmụmụ Jizọs. (Luk 3:23-38) Ọ bụrụ na Jenesis bụ akụkọ ifo, oleezi aha ndị bụ́ aha ndị dịrị ndụ n’ezie na ndị bụ́ nke akụkọ ifo n’usoro ọmụmụ ahụ? Jizọs, bụ́ onye dịrị ndụ n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa, kweere na ihe e dere na Jenesis, nke gụnyere akụkọ banyere Adam na Iv, bụ eziokwu. (Matiu 19:4-6) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ekwuo na ihe dị n’akwụkwọ Jenesis emeghị eme, ọ pụtara na anyị atụkwasịghị Jizọs n’onwe ya nakwa ọtụtụ ndị so dee Baịbụl obi.—1 Ihe E Mere 1:1; 1 Ndị Kọrịnt 15:22; Jud 14.