Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa Ọ̀ Ga-enyeli Ndị Ga-ebi na Ya n’Ọdịnihu Nri?

Ụwa Ọ̀ Ga-enyeli Ndị Ga-ebi na Ya n’Ọdịnihu Nri?

Ụwa Ọ̀ Ga-enyeli Ndị Ga-ebi na Ya n’Ọdịnihu Nri?

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA CANADA

▪ Mgbe otu ìgwè ụmụ akwụkwọ na ndị ọkà n’ihe metụtara mbara ala, bụ́ ndị so n’otu ọmụmụ ihe a kpọrọ Ọnọdụ Ihe Ndị Dị Ndụ na Ebe Obibi Ha n’Ime Otu Puku Afọ Gara Aga [MA], jisịrị afọ anọ mụọ banyere ihe ndị dị ndụ na ebe obibi ha n’ụwa niile, ha bipụtara ihe mbụ ha chọpụtara. Ndị a bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị ha chọpụtara: N’ime afọ iri ise gara aga, otú ọnụ ọgụgụ ndị chọrọ nri, ezigbo mmiri ọṅụṅụ, osisi, ogho, na ihe ndị e ji emenwu ọkụ si rịa elu emeela ka mbara ụwa gbanwee nke ukwuu ma mee ka o siere ya ike imepụta ihe ga-ezuru ndị ga-ebi na ya n’ọdịnihu. A na-ebogbu ikike ụwa anyị a nwere ime ka ihe ọkụkụ mịa mkpụrụ, ime ka ihe ọkụkụ ndị dị n’ime ọhịa wepụta ikuku ndụ, na ime ka osimiri mepụta ihe ndị na-enyere ndụ aka, n’ibu. Ụdị ihe ọkụkụ na anụmanụ dị iche iche na-apụ n’anya n’ike n’ike.

Akwụkwọ akụkọ Canada, bụ́ Globe and Mail, kwuru, sị: “Ụmụ mmadụ na-emebi nnọọ ụwa otú a na-emebitụbeghị ya nke na ha nwere ike ime ka ọnọdụ ụwa gbanwee ozugbo ma kpata ọrịa, mee ka a gharazie inwe oké ọhịa ma ọ bụ mee ka e nwee ebe ndị ihe ndị dị ndụ na-agaghị ebili.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwukwara, sị: “A na-ebibisị ebe ndị dị mmiri mmiri n’ụwa, oké ọhịa, ala ịkpa, osimiri, ebe ndị a na-egbu azụ̀ n’akụkụ oké osimiri, na ebe ndị ọzọ ihe ndị dị ndụ na-ebi bụ́ ndị na-eme ka e nwee ikuku dị ọcha, nwee mmiri, bụ́kwa ebe ndị na-emepụta ihe ndị na-edozi ihe niile dị ndụ ahụ́.” Ọ bụ ezie na ndị isi nke MA kweere na ụmụ mmadụ ga-akwụsịli mbibi a na-ebibi ihe ndị dị ndụ na ebe obibi ha, ha kwuru na nke ahụ “ga-achọ ka ndị niile na-eme mkpebi mee ka a gbanwee nnọọ otú e si emeso mbara ụwa ihe.”

È nwere ike ịzọpụta mbara Ụwa? Eenụnụ! Ebe ọ bụ na ọ bụ anyị ka Chineke nyere ọrụ ilekọta ihe ndị o kere eke, anyị kwesịrị ime ike anyị niile ịkwanyere ebe obibi anyị ùgwù. (Abụ Ọma 115:16) Ma, ọ bụ naanị Chineke ga-eme ka ihe ndị di ndụ na ebe obibi ha dịkwa otú ọ dịbu na mbụ. “Onye Ukwu nke kere” anyị kwere nkwa na ya ga-elebara ụwa anya ma ‘mee ka ihe jupụta n’ime ya.’ (Job 35:10; Abụ Ọma 65:9-13) Nke a ga-agụnye oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha n’ihi na ebe Jehova Chineke bụ Onye Okike, o nwere ike n’ebe oké osimiri dị. (Abụ Ọma 95:5; 104:24-31) Ọ ga-emezukwa ihe ndị o kwere ná nkwa n’ihi na Chineke ‘apụghị ịgha ụgha.’—Taịtọs 1:2.

Ịmata na ụwa ga-enyeli ndị ga-ebi na ya n’ọdịnihu nri na-akasi anyị nnọọ obi. Nke a na-akpali ndị niile na-atụ egwu Chineke ito ya n’ihi amamihe ya na-enweghị atụ, ike ya, na ịdị mma ya, nakwa n’ihi ịhụnanya ya niile n’ebe ihe ndị o kere eke dị.—Abụ Ọma 150:1-6.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 30]

Ụwa: Foto NASA