Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Na-enyere Ha Aka Ibi Ndụ Bakwuru Uru

Ọ Na-enyere Ha Aka Ibi Ndụ Bakwuru Uru

Ọ Na-enyere Ha Aka Ibi Ndụ Bakwuru Uru

▪ Akwụkwọ bụ́ ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’ emetụtala nnọọ ndụ nke ọtụtụ ndị gụrụla ya. Otu nwaanyị kwuru, sị: “Aghọtakwuola m na Jizọs dị adị n’ezie. Ọrụ ya edokwuola m nnọọ anya. Achọrọ m ibi ndụ bakwuru uru ugbu a ma soro na-ekwusa ozi ọma ahụ dị nnọọ ụmụ mmadụ mkpa.”

Otu nna dere, sị: “Akwụkwọ ahụ enyerela m aka ịhụ mkpa ọ dị ịdị na-eṅomi ihe nlereanya zuru okè Jizọs hapụụrụ anyị . . . Akwụkwọ a emeela ka m mụta ịtụgharị uche n’ihe ndị Jizọs kụziri nakwa n’àgwà ndị o nwere mgbe ọ nọ n’ụwa ebe a—ịdị umeala n’obi, ịhụnanya, inwe nnọọ ndidi, nrubeisi, nakwa ịnọgidesi ike n’ihe. Jizọs hapụụrụ anyị ihe nlereanya magburu nnọọ onwe ya nke gbarala m ume ịnọgide na-atachi obi.”

Onye ọzọ gụrụ akwụkwọ ahụ kwuru na ya kweere nnọọ ihe e dere n’azụ akwụkwọ ahụ, nke akụkụ ya ụfọdụ kwuru, sị: “Jizọs Kraịst bụ onye ndú nke Chineke nyere anyị, nke dị mmadụ niile mkpa. . . . Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịmatakwu Jizọs nke ọma ma sochikwuo ya anya karị.” Onye ahụ kwuziri, sị, “N’eziokwu, akwụkwọ ahụ na-enyere anyị aka ịhụ Jizọs n’anya, inwe okwukwe na ya, na irubere ya isi ma na-eso nzọụkwụ ya.”

Akwụkwọ a bụ́ ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’ nwere peeji 192, iri na atọ n’ime peeji ndị a nwere foto sachiri nke ọ bụla n’ime ha, bụ́ ndị na-egosi ihe dị iche iche Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Baịbụl ebe obibi n’efu.