Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Mgbe A Mụrụ Jizọs?

Olee Mgbe A Mụrụ Jizọs?

Echiche Baịbụl

Olee Mgbe A Mụrụ Jizọs?

AKWỤKWỌ bụ́ Encyclopedia of Early Christianity kwuru, sị: “Ọ dịghị onye maara kpọmkwem ụbọchị a mụrụ Kraịst.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ nde ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst gburugburu ụwa na-eme ememme ncheta ọmụmụ Jizọs na December 25. Ma, o nweghị ebe ụbọchị a pụtara na Baịbụl. Ọ̀ bụ eziokwu na a mụrụ Jizọs n’ọnwa December?

Ọ bụ ezie na Baịbụl ekwughị kpọmkwem ụbọchị a mụrụ Jizọs, o kwuru ihe na-egosi na a mụghị ya n’ọnwa December. Ọzọkwa, akwụkwọ ndị ọzọ na-abụghị Baịbụl na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere e ji họrọ December 25 ka ọ bụrụ ụbọchị e ji echeta ọmụmụ ya.

Olee Ihe Mere O Ji Bụrụ na A Mụghị Ya na December?

A mụrụ Jizọs n’obodo Betlehem nke dị na Judia. Oziọma Luk kọrọ, sị: “N’otu obodo ahụkwa, e nwere ndị ọzụzụ atụrụ ndị bi n’ọhịa. Ha na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị.” (Luk 2:4-8) Nke a abụghị ihe ọhụrụ. Akwụkwọ bụ́ Daily Life in the Time of Jesus kwuru, sị: ‘Oge atụrụ ndị ahụ na-anọ n’èzí n’afọ na-aka oge ha na-anọ n’ụlọ.’ Ma, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ hà ga-akpọrọ ìgwè atụrụ ha nọrọ n’èzí n’abalị na December bụ́ oge oyi na-atụ? Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: ‘Ha na-anọ n’ime ụlọ n’oge oyi; naanị nke a nwere ike ime ka mmadụ ghọta na oge ahụ e ji agba Krismas kemgbe ụwa, bụ́ oge oyi, yiri ka o zighị ezi ebe ọ bụ na Oziọma Luk kwuru na ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’èzí.’

Nke a kwekọrọ nnọọ n’ihe ọzọ dị n’Oziọma Luk: “N’ụbọchị ndị ahụ, Siza Ọgọstọs tiri iwu ka e deba aha elu ụwa dum mmadụ bi n’akwụkwọ; (ndeba aha mbụ a e debara n’akwụkwọ bụ mgbe Kwiriniọs bụ gọvanọ Siria;) mmadụ niile wee gaa ka e deba aha ha n’akwụkwọ, onye ọ bụla n’obodo nke ya.”—Luk 2:1-3.

O nwere ike ịbụ na ihe mere Ọgọstọs ji nye iwu a bụ iji mata ọnụ ọgụgụ mmadụ ole e nwere ma mara ndị ruru eru ịtụ ụtụ isi na ndị ruru eru ịga agha. N’agbanyeghị na afọ ime Meri eruwela ọmụmụ, iji rube isi n’iwu ahụ, ya na di ya bụ́ Josef so si Nazaret gaa Betlehem, bụ́ njem dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri ise. Ngwa cheenụ ya. Ò yiri ka Ọgọstọs—bụ́ onye ọchịchị na-anaghị etinyekarị aka n’ọchịchị ime obodo—ọ̀ ga-agwa ndị na-achọbu otú ha ga-esi nupụrụ ọchịchị ya isi ka ha mee ogologo njem dị otú ahụ n’oge oyi?

Ọ dị mma ịma na ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị ọkà mmụta Baịbụl ekwetaghị na a mụrụ Jizọs na December 25. N’ezie, ị ga-ahụ ihe yiri nke a n’akwụkwọ nkà ihe ọmụma ọ bụla aka gị ga-eru. Akwụkwọ bụ́ Our Sunday Visitor’s Catholic Encyclopedia kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị kwekọrịtara na a mụghị Jizọs na December 25.”

Ihe Mere E Ji Họrọ December 25

Ọtụtụ narị afọ ka Jizọs nwụsịrị, a họọrọ December 25 ka ọ bụrụ ụbọchị a mụrụ ya. N’ihi gịnị? Ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kweere na oge ahụ a họọrọ ka ọ bụrụ oge e ji agba Krismas n’afọ bụ nnọọ oge ndị ọgọ mmụọ ji eme ememme ha.

Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “Otu ihe a na-akọ ebe niile na ọ bụ ya mere e ji malite ịgba Krismas na December 25 bụ na a gbanwere ememme bụ́ dies solis invicti nati (‘ụbọchị a mụrụ anyanwụ a na-anaghị emeri emeri’), bụ́ oge ezumike a ma ama n’Alaeze Ukwu Rom nke a na-enwe n’oge oyi iji cheta mgbe anyanwụ na-amaliteghachi ịcha, bụ́ nke na-egosi na oge oyi agwụwala nakwa na oge opupu ihe ubi na oge okpomọkụ amalitewala, ka ọ ghọọ ememme Ndị Kraịst.”

Akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Americana na-agwa anyị, sị: “Ihe mere e ji họrọ December 25 ka ọ bụrụ ụbọchị e ji agba Krismas edochaghị anya, ma a na-ekwukarị na a họọrọ ụbọchị ahụ ka o wee kwekọọ n’ememme ndị ọgọ mmụọ na-eme n’oge oyi, mgbe chi na-anaghị eji ngwa ngwa, iji cheta ‘mgbe anyanwụ na-apụtaghachi.’ . . . Ndị Rom na-emekwa ememme Saturnalia ha n’oge a (bụ́ ememme a na-emere Saturn, bụ́ chi ọrụ ubi, na nke a na-eme iji cheta mgbe anyanwụ na-apụtaghachi).” N’ememme ndị ahụ, ndị mmadụ na-emekarị omume rụrụ arụ ka ha na-eri oriri oké mkpọtụ. Ọ bụghị ihe ijuanya na e jikwa omume ahụ mara ememme Krismas dị iche iche a na-eme taa.

Otú Anyị Kwesịrị Isi Kwanyere Kraịst Ùgwù

Ụfọdụ ndị chere na Ndị Kraịst ka kwesịrị ịdị na-echeta ọmụmụ Jizọs n’agbanyeghị na a maghị kpọmkwem ụbọchị a mụrụ Jizọs. N’uche nke ha, e mee ememme ahụ n’ụzọ dị ùgwù, ọ ga-abụ ụzọ kwesịrị ekwesị isi kwanyere Kraịst ùgwù.

N’ezie, ọmụmụ Jizọs bụ ihe dị mkpa mere eme a kọrọ banyere ya na Baịbụl. Baịbụl kwuru na mgbe a mụrụ Jizọs, ọtụtụ ndị mmụọ ozi pụtara na mberede ma malite ịbụ abụ otuto nye Chineke, sị: “Ka otuto dịrị Chineke n’ebe kasị elu, ka udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti ndị Chineke meere amara.” (Luk 2:13, 14) Ma, anyị kwesịrị iburu n’uche na ọ dịtụghị ebe Baịbụl kwuru ihe gositụrụ na e kwesịrị ịdị na-eme ememme ncheta ọmụmụ Jizọs. Kama nke ahụ, Baịbụl nyere anyị nnọọ iwu ka anyị na-echeta ọnwụ ya, bụ́ nke Ndịàmà Jehova na-eme otu ugboro n’afọ. (Luk 22:19) Nke ahụ bụ otu ụzọ anyị si akwanyere Jizọs ùgwù.

N’abalị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ dị ka mmadụ, o kwuru, sị: “Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu emee ihe m na-enye unu n’iwu.” (Jọn 15:14) O kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na unu hụrụ m n’anya, unu ga-edebe ihe niile m nyere n’iwu.” (Jọn 14:15) N’ezie, ọ dịghị ụzọ ka mma anyị nwere ike isi kwanyere Jizọs Kraịst ùgwù karịa ịmụta ihe ndị ọ kụziri ma na-eme ha.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

Olee ihe mere ọ na-enweghị ike iji bụrụ na a mụrụ Jizọs na December?—Luk 2:1-8.

▪ Olee ihe dị mkpa karịa ụbọchị a mụrụ mmadụ?—Ekliziastis 7:1.

▪ Olee ụzọ kasị mma isi kwanyere Jizọs ùgwù?—Jọn 14:15.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

Baịbụl kwuru ihe gosiri na a mụghị Jizọs na December

[Foto dị na peeji nke 12]

Ndị ọzụzụ atụrụ hà ga-akpọrọ atụrụ ha nọrọ n’èzí mgbe snoo na-ada?

[Ebe E Si Nweta Foto]

Todd Bolen/Bible Places.com