Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ànyị kwesịrị ịgbasa?

Ànyị kwesịrị ịgbasa?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Ànyị kwesịrị ịgbasa?

“Naanị ọnwa atọ anyị malitere ịkpa, anyị abụọ nọzi na-ekwu na ọ ga-adabara nnọọ anyị. Anyị nọkwa na-ekwu otú anyị ga-esi bikọọ ná ndụ anyị niile ka à ga-asị na anyị ejidela n’aka na anyị ga-alụ.”—Jessica. *

“Ozugbo m hụrụ ya, ahụkpọrọ m anya, ma ka afọ ole na ole gachara, ọ maliteziri inwe mmasị n’ebe m nọ! Ọ tọrọ m ụtọ inweta enyi nwoke tọrọ m nke ga na-elekọta m.”—Carol.

Ka oge na-aga, ma Jessica ma Carol na ndị enyi ha nwoke gbasara. Gịnị mere ha ji gbasaa? Hà dị iberibe ịhapụ ụmụ okorobịa ọma ndị ahụ?

GỊ NA nwa okorobịa akpaala ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu afọ. Ná mmalite, obi siri gị ike na ọ bụ ya bụ “onye nke gị.” * Mgbe ụfọdụ, ị na-echetadị otú obi dị gị mgbe unu malitere ịkpa. Ma ugbu a, i nwewela obi abụọ. Ì kwesịrị ileghara ihe ndị ahụ na-eme ka ị na-enwe obi abụọ anya? Olee otú ị ga-esi mara ma ùnu kwesịrị ịgbasa?

Nke mbụ, otu eziokwu i kwesịrị iburu n’uche bụ: Ileghara ihe ndị na-egosi na ọ gaghị adabara gị na onye gị na ya na-akpa anya dị ka ịhụ ihe na-agbara gị àmà na ụgbọala gị enweela nsogbu ma gbachi nkịtị. Nsogbu ahụ agaghị akwụsị; o nwedịrị ike ịka njọ. Olee ihe ụfọdụ ndị ọ ga-abụ ị hụ gị amara na ọ gaghị adabara gị na onye ahụ gị na ya na-akpa?

Ọ dị anyị ọkụ n’ahụ́. Nsogbu nwere ike ịdapụta ma ọ bụrụ na ọ dị unu ọkụ n’ahụ́. Carol chetara ihe mere ya, wee kwuo, sị: “Anyị nọ na-ezigara ibe anyị ozi E-mail, na-ekwurịta okwu ma n’Ịntanet ma na fon. Ụzọ nzirịta ozi ndị ahụ na-aka eri mmadụ isi karịa ikwu okwu ihu na ihu n’ihi na o nwere ike ime ka unu rie onwe unu obi n’egbughị oge!” Unu ekwekwala ka ihe ọ bụla mee ka unu ghara ịmata onwe unu nke ọma. Ụdị adịm ná mma a ekwesịghị ịdị ka ahịhịa toro ngwa ngwa ma kpọnwụọ ngwa ngwa. Kama, o kwesịrị ịdị ka ihe ọkụkụ mmadụ kụrụ, nke na-eji nwayọọ nwayọọ na-eto.

Ọ na-akatọ m ma na-eleda m anya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ana kwuru, sị: “Enyi m nwoke na-eleda m anya mgbe niile, ma ọ na-agụ m ka mụ na ya na-anọ mgbe niile.” O kwukwara, sị, “Ediri m ọtụtụ ihe ndị m na-amaghị na m ga-edili!” Baịbụl katọrọ ikwu “okwu mkparị.” (Ndị Efesọs 4:31) Okwu mkparị—ọ sọgodị ya ya bụrụ na e ji olu ọma kwuo ya—ekwesịghị ịdị n’etiti mmadụ abụọ hụrụ onwe ha n’anya.—Ilu 12:18.

Ọ bụ onye iwe ọkụ. Ilu 17:27 na-ekwu, sị: “Mmụọ nke onye nwere nghọta na-adị jụụ.” Erin chọpụtara na enyi ya nwoke na-ewe iwe ọkụ. Ọ sịrị: “Mgbe ọ bụla anyị nwere nghọtahie, ọ na-akwa m aka nke na mgbe ụfọdụ m na-emerụsị ahụ́.” Baịbụl na-agwa Ndị Kraịst, sị: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma . . . n’etiti unu.” (Ndị Efesọs 4:31) Onye na-adịghị ejideli onwe ya erubeghị ya na nwaanyị ịkpa.—2 Timoti 3:1, 3, 5.

Ọ chọghị ka ndị ọzọ mara na mụ na ya na-akpa. Angela kwuru, sị: “Enyi m nwoke achọghị ka ndị ọzọ mara na mụ na ya na-akpa. Iwe wedịrị ya mgbe papa m matara!” N’eziokwu, e nwere ike inwe ezigbo ihe mere mmadụ abụọ na-akpanụ ga-eji ghara ịchọ ka ndị ọzọ mara banyere ya ná mmalite. Ma ịkpachara anya na-ezochiri ya ndị kwesịrị ịma banyere ya nwere ike ịkpata nsogbu.

O bughị n’obi ịlụ m. E nwere ezigbo ihe mere nwa okorobịa na nwa agbọghọbịa bụ́ Ndị Kraịst ji akpa—ya bụ, iji nyere ha aka ịmatakwu onwe ha iji chọpụta ma ọ̀ ga-adabara ha ịlụ. N’ezie, nke a apụtaghị na ozugbo gị na nwa okorobịa kpawara unu amalite ime ndokwa maka agbamakwụkwọ unu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị adịghị alụ onye mbụ ha na ha kpara. Ma, o kwesịghị ka mmadụ na onye ọzọ kpawa ma ọ bụrụ na ọ dịbeghị njikere ịlụ di ma ọ bụ nwunye.

Anyị dị ná mma taa echi anyị esee. Ilu 17:17 na-ekwu, sị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile.” Nke a apụtaghị na unu abụọ ga na-ekwekọrịta n’ihe niile. Ma, ọ bụrụ na ọ na-abụ unu dị ná mma taa echi unu esee, o nwere ike ịbụ na e nwere ihe gbara ọkpụrụkpụ unu kwesịrị ilebara anya, dị ka Ana mechara chọpụta. Ọ sịrị: “Obi gbawara m nnọọ ọtụtụ mgbe mụ na enyi m nwoke sere okwu! Ọ na-abụ e mechaa mụ alaghachi ka mụ na ya dozie, n’agbanyeghị na m maara na ọ kaara m mma ịhapụ ya.”

Ọ na-achọ ka mụ na ya nwee mmekọahụ. “Ọ bụrụ na ị hụrụ m n’anya, ị ga-ekwe ka anyị mee ya.” “Ịhụnanya anyị ekwesịghị ịbụ naanị n’ọnụ.” “Nke a abụghị mmekọahụ.” Ụmụ okorobịa ejirila okwu aghụghọ ndị a rata ụmụ agbọghọ iso ha nwee mmekọahụ. Jems 3:17 na-ekwu, sị: “Amamihe nke si n’elu bu ụzọ dị ọcha.” Enyi gị nwoke kwesịrị ịbụ onye dị ọcha n’omume na onye na-agaghị akwanye gị ime ihe obi gị na-agwa gị na ọ bụ omume rụrụ arụ. Enwela enyi nwoke na-agaghị emeli otú ahụ!

Ndị ọzọ adọọla m aka ná ntị banyere ya. Baịbụl na-ekwu, sị: “Nweta ndụmọdụ niile i nwere ike inweta, i ga-enwekwa ihe ịga nke ọma; ma ọ́ bụghị ya, ị ga-ada.” (Ilu 15:22, Today’s English Version) Jessica na-ekwu, sị: “I kwesịghị ileghara ihe ndị ezinụlọ gị na ndị gị na ha bụwara enyi kemgbe ụwa chere anya, dịkwa nnọọ ka ị na-ekwesịghị ileghara ihe ndị obi gị na-agwa gị na-egosi na i kwesịrị ịhapụ onye a anya. Ka ị na-elegharakwu ihe ndị ọzọ na-agwa gị anya, otú ahụ ka ị na-eme ka ihe sikwuoro gị ike.”

Ihe ndị a anyị tụlere bụ naanị ole na ole n’ihe ndị ga-eme ka ị mara na adịm ná mma unu nwere ike ịkpatara gị nsogbu. * Ọ bụrụ na i nwere enyi nwoke gị na ya na-akpa, olee otú o si na-eme n’ihe ndị a anyị tụlere? Dee ihe ọ bụla na-echegbu gị n’ohere e wepụtara n’okpuru ebe a.

․․․․․

Otú Unu Ga-esi Gbasaa

Ka e were ya na i kpebiela na unu ga-agbasa. Olee otú ị ga-esi eme ya? E nwere ọtụtụ ụzọ isi mee ya, ma buru ihe ndị a na-esonụ n’uche.

Kata obi. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Trina kwuru, sị: “Ekwere m ka enyi m nwoke na-emere m mkpebi m niile nke na ụjọ tụrụ m ịhapụ ya.” Ọ chọrọ mmadụ ịkata obi iji gwa onye ya na ya na-akpa na ha kwesịrị ịgbasa mgbe ọ dị mkpa ka ha gbasaa. Ma, ọ dị mma ikwu obi gị. (Ilu 22:3) Ọ ga-enyere gị aka inwe ike ịdị na-agwa onye gị na ya na-akpa ihe ị chọrọ na ihe ị na-achọghị mgbe ahụ unu na-akpa—nakwa ma unu mechaa lụọ.

Mesoo ya otú ị ga-achọ ka e si mesoo gị. Ọ bụrụ na ọ bụ onye gị na ya na-akpa chọrọ ka unu gbasaa, olee otú ị ga-achọ ka o si mesoo gị? (Matiu 7:12) N’eziokwu, ọ gaghị adị mma ma ị gwa enyi gị nwoke na ị chọrọ ka unu gbasaa site n’izigara ya ozi na E-mail, n’ekwe ntị, ma ọ bụ si na fon zigara ya okwu nke na-asị “E nweghịzi ihe jikọrọ mụ na gị!”

Chọta oge na ebe dị mma iji gwa ya ya. Ùnu kwesịrị ịkpa ya ihu na ihu ka ùnu ga-akpa ya na fon? Ì kwesịrị idegara ya akwụkwọ ozi ka ọ̀ bụ kpaa ya ihu na ihu? Ihe a niile dabeere n’otú ihe si dị. Unu ekwesịghị ịkparịta ya n’ebe o nwere ike ịnọ tie gị ihe, ọ gaghịkwa adị mma ka unu nọrọ n’ebe ọ bụ naanị unu abụọ nọ, bụ́ ebe ọchịchọ ọjọọ nwere ike ịbata unu n’uche.—1 Ndị Tesalonaịka 4:3.

Gwa ya eziokwu. Gwa ya eziokwu ihe mere i ji chee na ọ dị mma ka unu gbasaa. Ọ bụrụ na ọ dị gị ka enyi gị nwoke emesoghị gị ihe otú dị mma, kwuo ya. Kwuo ihe otú ọ dị gị n’obi. Dị ka ihe atụ, kama ịsị “Ị na-akatọkarị m,” kwuo sị, “Ọ na-adị m ka ị̀ na-akatọ m mgbe i mere ihe dị otú a ma ọ bụ otú a.”

Dịkwa njikere ige ya ntị. È nwere ihe ị na-aghọtachaghị? Ekwela ka o jiri ọnụ bịrịbịrị mee ka ị gbanwee obi gị, ma abụla osi ọnwụ, kama chebara okwu ahụ echiche nke ọma. Baịbụl na-adụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha ‘bụrụ ndị na-anụ ihe ngwa ngwa, ndị na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.’—Jems 1:19.

Ị gaa n’Ịntanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwere aha ndị dị n’isiokwu a agbanwe.

^ par. 6 Ọ bụ ezie na e dere isiokwu a ka à na-agwa onye nke nwaanyị okwu, ihe ndị a kọwara ebe a ga-abara ma nwoke ma nwaanyị uru.

^ par. 16 Ị chọọ ịmakwu banyere isiokwu a, gụọ Teta! July–September 2007, peeji nke 18-20.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Depụta àgwà ndị ị ga-achọ ka onye gị na ya na-akpa nwee n’okpuru ebe a. ․․․․․

▪ Olee àgwà ndị i weere na ha ekwesịghị ekwesị? ․․․․․

[Igbe dị na peeji nke 24]

ONYE GỊ NA YA NA-AKPA KWESỊRỊ . . .

❑ ịbụ onye gị na ya nọ n’otu okpukpe. —1 Ndị Kọrịnt 7:39.

❑ ịbụ onye na-agaghị akwanye gị ime ihe obi gị gwara gị na ọ bụ omume rụrụ arụ.—1 Ndị Kọrịnt 6:18.

❑ ịdị na-echebara ma gị ma ndị ọzọ echiche.—Ndị Filipaị 2:4.

❑ ịbụ onye ndị ọzọ na-ekwu okwu ọma banyere ya.—Ndị Filipaị 2:20.

[Igbe dị na peeji nke 24]

KPACHARA ANYA MA Ọ BỤRỤ NA ENYI GỊ NWOKE . . .

❑ na-esikarị ọnwụ ka ọ bụrụ ihe o kwuru ka a ga-eme.

❑ na-eme mgbe niile ka ị na-eche na ọ bụ gị ka nsogbu ọ bụla si n’aka, ka i yie onye iberibe, ma ọ bụ ka i yie onye na-abaghị uru.

❑ adịghị achọ ka gị na ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị na-anọkọ.

❑ na-achọ ịma ebe ị nọ mgbe ọ bụla.

❑ na-ebokarị gị ebubo na ị na-achụ ụmụ nwoke ndị ọzọ mgbe ọ na-enweghị ezigbo ihe mere ọ ga-eji kwuo otú ahụ.

❑ na-abakarị mba ihe ọ ga-eme gị ma ọ bụ na-etiri gị iwu ihe ị ga-emerịrị.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ileghara ihe ndị na-egosi na ọ gaghị adabara gị na onye gị na ya na-akpa anya dị ka ịhụ ihe na-agbara gị àmà na ụgbọala gị enweela nsogbu ma gbachi nkịtị

MMANỤ ỤGBỌALA GỊ AGWỤWALA