Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Bụrụ na Anyị Agbasaa, Olee Otú M Ga-esi Die Ya?

Ọ Bụrụ na Anyị Agbasaa, Olee Otú M Ga-esi Die Ya?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Ọ Bụrụ na Anyị Agbasaa, Olee Otú M Ga-esi Die Ya?

“Mụ na ya na-akpa kemgbe ọnwa isi, anyị bụkwa enyi kemgbe afọ ise. Mgbe ọ chọrọ ka anyị gbasaa, ọ maghị otú ọ ga-esi gwa m ya. Ya akwụsịzie ịtụpụrụ m ọnụ. Amaghị m ihe m ga-eme eme. Ihe a o mere enyeghị m ọnụ okwu. Ihe m nọ na-ajụ onwe m bụ, ‘Olee ebe m si mejọọ ya?’”—Rachel. *

GỊ NA onye gị na ya na-akpa gbasaa, o nwere ike imebi gị obi ma mee gị ka ị na-ebe ákwá ákwá. Were Jeff na Susan dị ka ihe atụ. Ha kpara ruo afọ abụọ. N’ime afọ abụọ ahụ, ha abụọ bịara hụ nnọọ onwe ha n’anya. N’otu ụbọchị, Jeff na-eji ekwe ntị ezigara Susan ozi ọtụtụ ugboro iji gwa ya na ya hụrụ ya n’anya. Site n’oge ruo n’oge, ọ na-enye ya onyinye iji gosi ya na o bu ya n’obi. Susan sịrị: “Jeff na-agbalị nnọọ ige m ntị na ịghọta otú obi dị m. Ọ naghị eji m egwu egwu.”

Ọ dịghị anya, Jeff na Susan amalite ikwu okwu ọlụlụ nakwa ebe ha ga-ebi ma ha lụchaa. Jeff jụdịrị Susan otú mgbaaka ọ na-eyi na-aha. Ma otu ụbọchị, Jeff gwara Susan na o nweghịzi ihe jikọrọ ya na ya! Nke a mere ka Susan kwụrụ ọtọ kpọnwụọ. Ike ụwa gwụrụ ya nke na ọ na-echefu onwe ya mgbe ụfọdụ. Ọ sịrị: “Isi malitere ịgba m ghara ghara, o nweghịzikwa ihe ike na-adị m ime.” *

Ihe Mere O Ji Agbawa Obi

Ọ bụrụ na ụdị ihe a mere Susan emetụla gị, i nwere ike ichewe, sị, ‘M̀ ga-emecha chefuo ihe a echefuo n’ụwa a?’ (Abụ Ọma 38:6) O kwere nghọta na obi ga-agbawa gị. Gị na onye gị na ya na-akpa ịgbasa nwere ike ịbụ otu n’ime ihe ndị kacha agbawa obi metụrụla gị. Ụfọdụ ekwuodịla na mmadụ na onye ya na ya na-akpa ịgbasa dị ka ebe nnukwu ihe pụrụ mmadụ n’ahụ́. O nwedịrị ike ịdị gị otú ọ na-adị onye mmadụ nwụnahụrụ dị ka e kwuru n’okpuru ebe a:

Ekwetaghị ya. ‘Ọ bụghị eziokwu na anyị agbasaala. Ama m na ọ ga-emecha lọghachi.’

Iwe. ‘Olee otú ọ ga-esi mee m ụdị ihe a? Ònyedị ka o chere ọ bụ!’

Inwe obi Ilu. ‘Ụwa niile kpọrọ m asị. O nwetụghị onye ga-ahụ m n’anya.’

Ikweta ya. ‘Ihe ga-emecha dị mma. Ọ na-ewute m, ma ọ ga-emecha pụọ m n’obi.’

Nke bụ́ eziokwu bụ na ị ga-emecha kweta na unu agbasaala. E nwere ọtụtụ ihe ga-ekpebi oge ọ ga-ewe tupu gị ekweta na unu agbasaala. Ihe ndị ahụ gụnyere ogologo oge unu kpara na ebe adịm ná mma unu ruru. Ka ọ dịgodị, olee otú i nwere ike isi die ya?

Otú Ị Ga-esi Nwee Ike Ị Gawakwa n’Ihu

O nwere ike ị nụtụla ebe ndị mmadụ na-ekwu, sị, E mechaa, ọ ga-adị mma. Mgbe ahụ unu ka gbasara ọhụrụ, ọ ga-adị gị ka o nweghị mgbe ọ ga-emecha dị mma. Nke a bụ n’ihi na ọ bụghị naanị oge na-ekpebi ma ị̀ ga-emecha chefuo ihe ahụ merenụ. Iji maa atụ: Ọ bụrụ na i merụọ ahụ́, ọ ga na-afụ gị ụfụ ugbu a ma e mechaa ọ ga-ala. Ọ dị mkpa ka ị kwụsị ọbara na-agba gị ma mee ka ọ kwụsị ịfụ gị ụfụ. Ọ dịkwa mkpa ka i lekọta ya anya ka nje ghara ịbanye ya. Otu ahụ ka ọ dịkwa mgbe e nwere ihe gbawara gị obi. Ọ ga na-afụ gị ụfụ n’obi ugbu a. Ma e nwere ihe ndị ị ga-eme ka mgbu ahụ ọ na-egbu gị n’obi belata nakwa ka ọ ghara ime gị ka i nwee obi ilu. Ka oge na-aga ka obi mgbawa ahụ i nwere ga na-akwụsị, ma gịnị ka gịnwa nwere ike ime iji belata ya? Gbalịa mee ihe ndị a na-esonụ.

Ọ gụọ gị ákwá, bepụ ya. Ọ dịghị njọ ibe ákwá ma ákwá gụọ gị. Baịbụl kwudịrị na e nwere “oge ịkwa ákwá” na ọbụnadị “oge ịkwa ákwá arịrị.” (Ekliziastis 3:1, 4) Ibe ákwá adịghị egosi na ị dịghị ike. N’otu oge, mgbe ọtụtụ nsogbu juru Devid isi, dike a obi kara kwuru, sị: “N’ogologo abalị dum, m na-eme ka ihe ndina m dee mmiri; m na-eme ka ihe ndina m jupụta n’anya mmiri m.”—Abụ Ọma 6:6.

Hụ na ị daghị ọrịa. Imega ahụ́ na iri nri ndị na-edozi ahụ́ ga-enyere gị aka inwetaghachi ume n’ihi oké echiche ị na-eche maka ihe ahụ merenụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ọzụzụ nke ahụ́ bara  . . . uru.”—1 Timoti 4:8.

Olee ihe ndị ọ ga-adị mkpa ka i mee iji hụ na ị daghị ọrịa?

․․․․․

Anọla nkịtị. Akwụsịla ime ihe ndị na-amasị gị ime. Ugbu a kwa ka ọ dị oké mkpa ka ị ghara ịkpara onwe gị. (Ilu 18:1) Iso ndị hụrụ gị n’anya na-akpa ga-eme ka i nwee ihe dị mma ị ga na-eche.

Olee ihe ndị i nwere ike ịmalite mewe kama ịnọ nkịtị?

․․․․․

Gwa Chineke otú ọ dị gị n’obi. Nke a nwere ike isi ike omume. Ọ na-adịdị ụfọdụ ka ọ̀ bụ Chineke kpataara ha nsogbu ahụ. Ihe ha na-ekwu n’obi ha bụ, ‘Ekpechara m ekpere niile m kpere iji nweta onye ọ ga-abụ mụ na ya, lezienụ ihe mere ugbu a!’ (Abụ Ọma 10:1) Ma, ọ̀ ga-adị mma ma anyị lewe Chineke anya naanị dị ka onye na-anọ n’eluigwe ejikọta mmadụ abụọ chọrọ ịlụ? Mbanụ; ọ bụghịkwanụ ya na-eme ka otu onye n’ime mmadụ abụọ na-akpanụ kwuo na ya achọghịzi. Ma otu ihe anyị maara banyere Jehova bụ na: “Ihe banyere [gị] na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:7) N’ihi ya, gwa ya otú ọ dị gị n’obi n’ekpere. Baịbụl na-ekwu, sị: “Mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Olee kpọmkwem ihe ndị ị ga-agwa Jehova n’ekpere banyere ha ka ị na-edi obi ilu ị na-enwe n’ihi na unu agbasaala?

․․․․․

Ilepụ Anya n’Ihu

Mgbe i nwetachara onwe gị, ọ ga-adị mma ka i leghachi anya azụ ma cheta ihe ndị mere mgbe gị na onye ahụ ka na-akpa. Mgbe ị dị njikere ime ya, i nwere ike ịhụ na idetu azịza nke ajụjụ ndị e dere n’okpuru ebe a edetu ga-enyere gị aka.

▪ Ọ̀ gwara gị ihe mere o ji chọọ ka unu gbasaa? Ọ bụrụ na ọ gwara gị, detuo ihe ahụ ọ gwara gị n’okpuru ebe a, ọ sọgodị ya ya bụrụ na i chere na ihe ahụ erughị ime ka unu gbasaa.

․․․․․

▪ Olee ihe ndị ọzọ i chere mere unu ji gbasaa?

․․․․․

▪ Ugbu a ị na-eche ya, ò nwere ihe ndị i chere na a sị na i mere unu agaraghị agbasa? Ọ bụrụ na e nwere, gịnị ka ọ bụ?

․․․․․

▪ Ihe a mere gị ò meela ka ị hụ ebe ndị ị ga-achọ imekwu nke ọma na ha, ma n’adịm na mma gị na Chineke ma n’otú i si eche echiche?

․․․․․

▪ Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ emechaa kpawa, olee ihe ndị ị na-agaghị achọ ime na ihe ndị ị ga-achọ ime?

․․․․․

N’eziokwu, ọ dabaraghị gị na onye ahụ gị na ya kpara otú ị tụrụ anya ya. Ma buru nke a n’uche: Mgbe nnukwu mmiri na-ezo, ihe a na-echetakarị bụ otú ihu igwe si gbajie na otú mmiri ahụ si na-ezosi ike. Ma mmiri ahụ ga-emecha kwụsị, anwụ ebidokwa chawa. Ụmụ agbọghọ ndị ahụ e kwuru okwu ha ná mmalite mechara die ihe ahụ mere ha, ka oge na-agakwa, ha mechara chefuo ihe niile merenụ. Obi sie gị ike na nke gị ga-adịkwa otú ahụ!

Ị gaa n’Ịntanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a kpọrọ ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 5 Ọ bụ ezie na ọ bụ ụmụ nwaanyị ka a kọrọ maka ha n’isokwu a, ihe ndị a kọwara ebe a ga-abakwara ụmụ nwoke uru.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Mgbe gị na onye gị na ya na-akpabu gbasara, gịnị ka ị mụtara?

▪ Gịnị ka ị mụtara banyere onye ahụ?

▪ Ònye ka i nwere ike ịkọrọ otú ọ dị gị n’obi mgbe o yiri ka mgbasa ahụ unu gbasara ekweghị gị odidi?

[Igbe dị na peeji nke 18]

ARO

Susan, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mmalite, depụtara amaokwu dị iche iche si n’Akwụkwọ Nsọ ma debe ha n’ebe ọ ga na-eru ya aka ngwa ngwa ka o nwee ike ịgụ ha mgbe ọ dị ya ka ya bewe ákwá. I nwekwara ike ime otú ihe ahụ site n’idepụta ụfọdụ amaokwu Baịbụl ndị dị n’isiokwu a.

[Foto dị na peeji nke 17]

Gị na onye gị na ya na-akpa ịgbasa dị ka ebe i merụrụ ahụ́—ọ ga na-afụ gị ụfụ ugbu a, ma e mechaa ọ ga-ala