Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe M Nwere Ike Ime Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọ M Ụtọ?

Olee Ihe M Nwere Ike Ime Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọ M Ụtọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Olee Ihe M Nwere Ike Ime Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọ M Ụtọ?

Ugboro ole ka ị na-agụ Baịbụl? (kanye ihe n’otu)

□ Kwa ụbọchị

□ Kwa izu

□ Ugboro ole ọzọ ․․․․․

Dezuo ahịrịokwu a.

Mgbe ịgụ Baịbụl na-adịghị atọ m ụtọ, ihe na-akpatakarị ya bụ na . . . (kanye ihe na ndị nke ọ bụ)

□ Ihe m na-agụ anaghị atọ m ụtọ

□ Ọ na-esiri m ike nghọta

□ E nwere ihe ndị na-adọpụ uche m

□ Ihe ọzọ ․․․․․

ỊGỤ Baịbụl ọ̀ na-agwụ gị ike? Ọ bụrụ na ọ na-agwụ gị ike, ị ga-ekweta n’ihe a Will, bụ́ onye dị afọ iri na asatọ, kwuru. Ọ sịrị: “Baịbụl yiri ihe nwere ike ịgwụ mmadụ ike ọgụgụ.” Ma, ọ sịkwara, “Ọ ga-agwụ gị ike ma ọ bụrụ na ị maghị otú ị ga-esi gụọ ya ya atọọ ụtọ.”

Olee ihe mere ị ga-eji mụta otú e si agụ Baịbụl ya atọọ gị ụtọ? Ị̀ ga-achọ ịmatakwu otú ị ga-esi

na-eme mkpebi ndị dị mma?

nweta ezigbo ndị enyi?

na-edi ihe isi ike?

Baịbụl nyere ndụmọdụ ndị dị mma n’okwu ndị a nakwa n’ihe ndị ọzọ. N’eziokwu, mmadụ ga-agba mbọ tupu o nweta ndụmọdụ ọma ndị a. Ma ịgba mbọ iji nweta ihe ọma ndị a dị nnọọ ka ebe mmadụ na-egwu ala iji chọta akụ̀ dị oké ọnụ ahịa: Ka ọ na-esikwuru onye ahụ ike, ka ihe ọ na-achọta ga na-emekwu onye ahụ obi ụtọ!—Ilu 2:1-6.

Olee otú i nwere ike isi chọta akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa dị na Baịbụl? Ibe akwụkwọ e nwere ike ịchakapụta achakapụta nke dị n’aka nri na peeji a, ga-enyere gị aka ịma otú ị ga-esi na-agụ Baịbụl—n’azụ ya kwa—ị ga-ahụ otú ị ga-esi malite ịgụ ya. Gbalịakwa mee ndị nke masịrị gị n’aro ndị a tụrụ na peeji ndị na-esonụ.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

A na-ekwu na ọ bụ mkpụrụ onye kụrụ ka ọ na-aghọrọ.

▪ Olee otú nke a si bụrụ eziokwu n’ihe gbasara ịgụ Baịbụl?

▪ Olee mgbe i nwere ike iwepụta oge na-agụ Baịbụl?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 19]

OTÚ E SI AGỤ BAỊBỤL

Tupu ị gụwa ya . . .

▪ Hụ na ị nọ ebe mkpọtụ na-adịghị ka uche gị nwee ike ịdị n’ihe ị na-agụ.

▪ Rịọ Chineke ka o nye gị nghọta.

Mgbe ị na-agụ ya . . .

▪ Chọta map na foto e sere ebe ndị ahụ ị na-agụ na Baịbụl ka ha nyere gị aka iji uche gị na-ahụ ihe ndị ị na-agụ.

▪ Tụlee ihe ndị gbara ya gburugburu, na-echebakwara ihe ị na-agụ echiche.

▪ Gụọ ihe ndị e dere n’ala ala peeji nakwa amaokwu ndị dị na ntụaka etiti peeji.

▪ Jụọ onwe gị ajụjụ ndị dị ka:

IHE NDỊ M CHỌPỤTARA: Olee mgbe o mere? Ònye kwuru ya? Ònye ka a gwara ya?

IHE M GHỌTARA: Olee otú m ga-esi kọwaara onye ọzọ ihe a?

URU Ọ BAARA M: Gịnị mere Jehova Chineke ji hụ na e dere ihe a n’Okwu ya? Gịnị ka ọ na-ekwu banyere àgwà ya na otú o si eme ihe? Olee otú m nwere ike isi mewe ihe ndị a m mụtara?

Mgbe ị gụchara ya . . .

▪ Mekwuo nchọnchọ n’akwụkwọ ndị dị ka Insight on the Scriptures na “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

▪ Kpeekwa ekpere ọzọ. Gwa Jehova ihe ndị ị mụtara na otú ị chọrọ isi mewe ha. Kelee ya maka Okwu ya, bụ́ Baịbụl.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]

OLEE OTÚ I NWERE IKE ISI MALITE ỊGỤ BAỊBỤL?

I nwere ike ịhọrọ . . .

 ❑ Isi n’isi gụrụ ya ruo ná ngwụcha.

❑ Ịgụ ya otú ihe ndị a kọrọ si mee. I nwere ike ịgụ ya otú e si dee akwụkwọ Baịbụl ndị ahụ ị chọrọ ịgụ ma ọ bụ otú ihe ndị a kọrọ na ha si mee.

❑ Ịgụ nkebi Akwụkwọ Nsọ dị iche kwa ụbọchị.

Monday: Akụkọ ihe ndị mere eme, bụ́ ndị na-atọ ụtọ ọgụgụ (Jenesis ruo Esta)

Tuesday: Akụkọ ndụ Jizọs na ihe ndị ọ kụziri (Matiu ruo Jọn)

Wednesday: Ndị Kraịst oge mbụ (Ọrụ)

Thursday: Amụma na ndụmọdụ ndị bara uru (Aịzaya ruo Malakaị, Mkpughe)

Friday: Abụ uri na ukwe ndị na-atọ ụtọ ọgụgụ (Job, Abụ Ọma, Abụ Sọlọmọn)

Saturday: Ndụmọdụ ndị na-enye aka ná ndụ (Ilu, Ekliziastis)

Sunday: Akwụkwọ ozi ndị e degaara ọgbakọ (Ndị Rom ruo Jud)

N’agbanyeghị otú ọ bụla ị họọrọ isi malite ịgụ ya, hụ na ị na-edetu ebe ị kwụsịrị! Kanye n’isiakwụkwọ ọ bụla ị gụchara, ma ọ bụkwanụ chọta ụzọ ọ bụla ọzọ ị ga-esi na-amata ebe ị gụruru.

Chakapụta igbe a, ma tinye ya n’ime Baịbụl gị!

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]

MEE KA Ị NA-AHỤ IHE Ị NA-AGỤ N’AKWỤKWỌ NSỌ!

Chọpụta ụzọ ndị ị ga-esi mee ka ihe ị na-agụ na-atọ gị ụtọ. Iji maa atụ:

□ Mgbe ị na-agụ aha ndị mmadụ, see ihe ga-egosi gị otú ha si mụta ibe ha.

□ Ọ bụrụ na ị na-agụ banyere otu onye rubeere Chineke isi, chọpụta àgwà ọma ndị onye ahụ nwere na ihe ọma ndị o mere nakwa ngọzi ndị nke a wetaara ya.—Ilu 28:20.

[Diagram]

Enyi Chineke

Nrubeisi

Ikwesị ntụkwasị obi

↑ ↑

Ebreham

□ See ihe ụfọdụ n’akwụkwọ ka ha nyere gị aka ịghọta ihe ị na-agụ.

□ Mgbe ị na-agụ otú otu ihe si mee, see otú ihe ndị ahụ ị na-agụ si mee ná mpempe akwụkwọ dị iche iche. N’okpuru ebe i sere nke ọ bụla, kọwaa ihe na-eme ebe ahụ.

□ Jiri akwụkwọ ma ọ bụ katọn rụọ ihe ị na-agụ banyere ya, dị ka ihe atụ ụgbọ Noa.—Lee Teta! January 2007 nke Bekee, peeji nke 22.

□ Gị na ndị enyi gị ma ọ bụ ndị ezinụlọ gị gụkọọ ya ọnụ. Aro: Gwa otu onye ka ọ na-agụpụta okwu onye dere akụkọ ahụ. Ebe ndị ọzọ ga na-agụpụta ihe ndị a kọrọ akụkọ ha n’ebe ahụ unu na-agụ kwuru.

□ Họrọ otu akụkọ dị na Baịbụl ma kọgharịa ya ka à ga-asị na ị chọrọ ka ọ gbaa n’akwụkwọ akụkọ. Si ụzọ dị iche iche kọọ ya, were ya na ị na-agba ndị a kọrọ akụkọ ha ma ọ bụ ndị ji anya ha hụ ihe merenụ ajụjụ ọnụ.

□ Họrọ otu akụkọ nke onye a kọrọ akụkọ ya mere ihe na-adịghị mma, ma chee ihe ka mma onye ahụ gaara eme! Dị ka ihe atụ, gụọ otú Pita si gọnahụ Jizọs. (Mak 14:66-72) Gịnị ka ọ gaara aka mma ka Pita mee n’oge a?

□ Kirie ma ọ bụ gee ihe nkiri Baịbụl ndị anyị nwere.

□ Dee ihe nkiri nke gị. Denyekwuo ihe ndị e nwere ike ịmụta n’akụkọ ahụ.—Ndị Rom 15:4.

IHE I NWERE IKE IME: Gị na ndị enyi gị ole na ole mee ihe nkiri ahụ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 21]

KA ỊGỤ BAỊBỤL NWEE IKE ỊGỤ GỊ AGỤỤ

▪ Nwee ihe mgbaru ọsọ! Dee ụbọchị ị ga-achọ ịmalite ịgụ Baịbụl nke onwe gị n’okpuru ebe a.

․․․․․

▪ Họrọ akwụkwọ Baịbụl nke na-amasị gị. (Gụọ igbe bụ́  “Olee Otú I Nwere Ike Isi Malite Ịgụ Baịbụl?”) Dezie akwụkwọ Baịbụl nke ị ga-achọ ibu ụzọ gụọ n’okpuru ebe a.

․․․․․

▪ Mgbe ị ka na-amalite amalite, agụtela ya aka. Ịgụ Baịbụl naanị nkeji iri na ise kadị mma karịa agụghị chaachaa. Dee oge i nwere ike iwepụta maka ịgụ Baịbụl n’okpuru ebe a.

․․․․․

Aro: Nwee Baịbụl nke naanị ihe ị ga na-eji ya eme bụ ịmụ ihe. Na-ede ihe ndị dị gị mkpa n’ime ya. Kanye ihe n’amaokwu ndị kacha baara gị uru.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 21]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“M na-agbalị ịgụtụ Baịbụl n’abalị ọ bụla tupu m lakpuo. Nke a na-eme ka m nwee ezigbo ihe m ga na-atụgharị n’uche m tupu ụra eburu m.”—Megan.

“M na-eji nkeji iri na ise atụgharị uche n’otu amaokwu Baịbụl. M na-agụ ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke amaokwu Baịbụl ọ bụla m gụrụ, gụọkwa amaokwu ndị dị na ntụaka etiti peeji, meekwa nchọnchọ ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ, anaghị m agụcha otu amaokwu Baịbụl n’otu oge, ma ihe m na-amụta n’otú a m si agụ Baịbụl karịrị akarị!”—Corey.

“E nwere oge m ji ọnwa iri gụchaa Baịbụl. Otú ahụ m si gụọ ya mere ka m hụ na e nwere ihe jikọrọ amaokwu Baịbụl dị iche iche, bụ́kwanụ nke m na-amabughị.”—John.

[Igbe dị na peeji nke 21]

Ọ BỤ GỊ GA-AHỌRỌ!

Họrọ otu akụkọ. Akụkọ ihe ndị mere eme juru na Baịbụl. Họrọ otu nke masịrị gị, ma si n’isi gụrụ ya ruo ná ngwụcha.

Aro: Ị chọọ ịmata otú ị ga-esi mụtakwuo ihe n’akụkọ nke ị họọrọ ịgụ, gụọ ihe dị na peeji nke 292 n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Họrọ otu n’Oziọma anọ ahụ. Gụọ Matiu (nke bụ́ Oziọma mbụ e dere), Mak (nke a kọrọ akụkọ ndị dị na ya ná mkpirikpi ná mkpirikpi nakwa otú na-atọ ụtọ ọgụgụ), Luk (nke kacha kwuo okwu banyere ekpere na ụmụ nwaanyị), ma ọ bụkwanụ Jọn (nke kọrọ ọtụtụ ihe ndị ọzọ a na-akọghị n’Oziọma Matiu, Luk na Mak).

Aro: Tupu ị gụwa ya, were obere oge gụọ banyere akwụkwọ Baịbụl ahụ na onye dere ya, ka i nwee ike ịghọtakwu ihe mere Oziọma ahụ ji pụọ iche ná ndị nke ọzọ.

Họrọ otu abụ ọma. Dị ka ihe atụ:

Ọ bụrụ na i nweghị ndị enyi, ya ana-adịkwa gị ka mmadụ niile na-agbara gị ọsọ, gụọ Abụ Ọma nke 142.

Ọ bụrụ na obi na-ajọ gị njọ n’ihi ihe ndị ị na-anaghị emete, gụọ Abụ Ọma nke 51.

Ọ bụrụ na ọ na-adị gị ka irube isi n’iwu Chineke abachaghị uru, gụọ Abụ Ọma nke 73.

Aro: Detuo abụ ọma ndị kacha gbaa gị ume ná ndị ị gụrụ.

[Igbe dị na peeji nke 22]

LEBAKWUO YA ANYA

Tụlee ihe ndị gbara ya gburugburu. Chọpụta mgbe e dere ya, ebe a nọ dee ya, na ihe ndị mere mgbe e dere amaokwu Baịbụl ị na-agụ.

Iji maa atụ: Gụọ Ezikiel 14:14. Daniel ọ̀ dị ihe dị ka afọ ole mgbe Jehova kwuru na ya na Noa na Job bụ ndị ezi omume?

Ihe ga-enyere gị aka: E dere Ezikiel isi nke 14 mgbe naanị afọ ise gachara a dọọrọ Daniel n’agha laa Babịlọn, nke nwekwara ike ịbụ mgbe ọ bụ nwatakịrị.

Ihe ndị bara uru i nwere ike ịmụta: Jehova ò weere na Daniel dị obere nke na Ọ chọpụtaghị na o rubeere ya isi? Olee mkpebi ọma ndị Daniel mere, bụ́ ndị mere e ji gọzie ya? (Daniel 1:8-17) Olee otú nwere ike isi ṅomie Daniel ma a bịa n’ime mkpebi ndị dị mma?

▪ Chebara ihe ị na-agụ echiche. Mgbe ụfọdụ otu okwu ma ọ bụ abụọ dị n’ihe ị gụrụ nwere ihe ọ ga-akụziri gị.

Iji maa atụ: Gụọ Matiu 28:7, gụọkwa Mak 16:7. Mgbe Mak na-ede na Jizọs ga-eme ka ndị na-eso ụzọ ya hụ ya anya, gịnị mere o ji denye ka a “gwakwa Pita”?

Ihe ga-enyere gị aka: Mak anọghị mgbe ihe ndị a mere; ọ ga-abụ Pita kọọrọ ya ihe ndị o dere.

Ihe ndị bara uru i nwere ike ịmụta: Gịnị mere ọ ga-ejirịrị bụrụ na obi sikwuru Pita ike mgbe ọ nụrụ na Jizọs chọrọ ka ya na ya hụ anya ọzọ? (Mak 14:66-72) Olee otú Jizọs si gosi na ya bụ ezigbo enyi Pita? Olee otú i nwere ike isi ṅomie Jizọs ma gosi na ị bụ ezigbo enyi?

Mekwuo nchọnchọ. Gụọ akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ Baịbụl iji ghọtakwuo ihe ị na-agụ.

Iji maa atụ: Gụọ Matiu 2:7-15. Olee mgbe ndị ahụ na-agụ kpakpando gara leta Jizọs?

Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Ụlọ Nche nke January 1, 2008, peeji nke 31, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ihe ndị bara uru i nwere ike ịmụta: Olee otú ọ ga-abụ na Jehova si nye ndị ezinụlọ Jizọs ihe ha ji lekọta onwe ha mgbe ha nọ n’Ijipt? Olee otú ịtụkwasị Chineke obi nwere ike isi nyere gị aka idi nsogbu ndị tara akpụ?—Matiu 6:33, 34.