Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Ị Ga-aza?

Olee Ihe Ị Ga-aza?

Olee Ihe Ị Ga-aza?

Olee Ihe Na-ekwesịghị Ekwesị na Foto A?

Gụọ Jọshụa 2:15-18; 6:15-21; 7:1, 20, 21. Ugbu a lee foto a. Olee ihe ndị na-ekwesịghị ịdị na ya? Dee azịza ha n’okpuru ebe a.

1. ․․․․․

2. ․․․․․

3. ․․․․․

4. ․․․․․

IHE A GA-EKWURỊTA:

Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị ghara iwere ihe onye ọzọ?

Site na Magazin A

Zaa ajụjụ ndị a, ma denye amaokwu Baịbụl (ndị) na-adịghị na ha.

PEEJI NKE 14 Alụmdi na nwunye kwesịrị ịbụ gịnị n’etiti mmadụ niile? Ndị Hibru:․․․

PEEJI NKE 14 Mgbe ọchịchọ ọjọọ tụụrụ ime, gịnị ka ọ na-amụpụta? Jems:․․․

Gịnị Ka Ị Maara Banyere Ndị Amụma?

Gụọ 2 Ihe E Mere 18:1-19:3. Zazie ajụjụ ndị a.

5. ․․․․․

Gịnị bụ aha onye amụma ahụ Eze Ehab kpọrọ asị?

6. ․․․․․

Gịnị mere Ehab ji kpọọ onye amụma ahụ asị?

7. ․․․․․

Gịnị ka onye amụma ahụ gwara Ehab, gịnịkwa ka Ehab mere?

IHE A GA-EKWURỊTA: Olee mgbe o nwere ike ịdị mkpa ka i nwee ụdị obi ike onye amụma a nwere?

AZỊZA

1. Mgbidi Jeriko dara tupu ndị Izrel abaa n’obodo ahụ lụso ha agha.

2. Ụdọ ahụ Rehab konyere na windo bụ ụdọ na-acha ọbara ọbara, ọ bụghị nke na-acha anụnụ anụnụ.

3. Ekan zuuru uwe, otu mkpirisi ọlaedo, na shekel ọlaọcha, ọ bụghị arụsị.

4. Ọ bụghị n’abalị ka ha lụsoro Jeriko agha.

5. Mịkaya.

6. O kwuru ihe Jehova ga-eme Ehab.

7. O kwuru na Ehab ga-anwụ n’agha. Ehab kwuru ka a tụkpuo Mịkaya n’ụlọ mkpọrọ.