Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Mgbe Mmadụ Na-amalite Ịdị Ndụ?

Olee Mgbe Mmadụ Na-amalite Ịdị Ndụ?

Olee Mgbe Mmadụ Na-amalite Ịdị Ndụ?

GIANNA kwuru sị: “Nne mụrụ m dị afọ iri na asaa na ime ọnwa asaa na ọkara mgbe o kpebiri iji ọgwụ e ji nnu mee tee ime ahụ. * Ọ sịkwara: “Ọ bụ m ka o bu n’afọ ma chee na ya eteela ime ahụ. Ma anwụghị m.”

Ọ bụ n’afọ 1996, bụ́ mgbe Gianna dị afọ iri na itoolu ka o kwuru ihe ndị a n’ihu otu kọmitii nke gọọmenti U.S. mgbe ha na-eleba anya n’okwu gbasara ite ime. Mgbe Gianna dị ọnwa asaa na ọkara n’ime afọ nne ya, akụkụ ahụ́ ya dum apụtachaala. Ikekwe, ị ga-ekweta na ọ ghọọla nnọọ mmadụ mgbe ahụ, ebe ọ bụ na ọ dịwakwara ndụ mgbe ọ pụtara n’akpa nwa.

Oleekwanụ maka mgbe Gianna dị naanị izu ise n’akpa nwa, bụ́ mgbe ọ hà ka otu inch e kere ụzọ atọ? Ọ bụ eziokwu na akụkụ ahụ́ ya dị iche iche apụtachabeghị otú o kwesịrị, ma o nwezuola akwara na ihe ndị ọzọ niile ga-eme ka akụkụ ahụ́ ya ndị ọzọ pụtachaa, nweekwa ụbụrụ. O nweela obi nke na-akụ ugboro iri asatọ n’otu nkeji ọ bụla, bụ́ nke na-eme ka ọbara nwee ike ịga n’akwara ndị dị n’ahụ́. N’ihi ya, ọ bụrụ na Gianna bụ mmadụ mgbe ọ dị ọnwa asaa na ọkara n’akpa nwa nne ya, à ga-asị na onye kwuru na Gianna bụ mmadụ mgbe ọ dị izu ise, n’agbanyeghị na ahụ́ ya dum apụtachabeghị otú o kwesịrị, ekwuteghị ya?

Ịtụrụ Ime Bụ Ọrụ Ebube

Akụkụ ahụ́ niile ga-adị n’ahụ́ nwa e bu n’afọ na-amalite ito mgbe ọbara ọcha si n’ahụ́ nwoke na àkwá si n’ahụ́ nwaanyị jikọrọ ọnụ. Ígwè ọrụ ọgbara ọhụrụ enyerela ndị ọkà mmụta sayensị aka ịchọpụta ihe ndị dị ịtụnanya na-eme n’ime otu mkpụrụ àkwá a nke ya na ọbara ọcha jikọrọ. Mkpụrụ ndụ ndị mejupụtara DNA (deoxyribonucleic acid) nke nna na nke nne na-ejikọta ghọọ mmadụ.

Ọ bụ site ná mkpụrụ ndụ mbụ ahụ ka ọrụ ebube nke otú mmadụ ga-adị ma a mụọ ya si amalite. Ọ bụ mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị, nke so na DNA, na-ekpebi otú anyị ga-adị ma a mụọ anyị. Ọ bụ DNA na-ekpebi ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ihe niile banyere anyị. Ọ bụ ya na-ekpebi ókè anyị ga-etoru ogologo, otú ihu anyị ga-adị, ụcha anya anyị na ntutu isi anyị, nakwa ọtụtụ puku ihe ndị ọzọ ga-adị n’ahụ́ anyị.

Ka oge na-aga, mkpụrụ ndụ mbụ ahụ na-ekewa na-emepụta mkpụrụ ndụ ndị ọhụrụ. Mkpụrụ ndụ ọhụrụ ọ bụla na-enwekwa ihe niile dị na nke mbụ ahụ. Ọ bụ ihe dị ịtụ n’anya na mkpụrụ ndụ nke ọ bụla na-eto ma ghọọ akụkụ ahụ́ nke ọ bụla dị mkpa ka ọ ghọọ. Mkpụrụ ndụ ndị a na-aghọ obi, ụbụrụ, ọkpụkpụ, akpụkpọ ahụ́, nakwa ime anya anyị, bụ́ nke dị mmiri mmiri. Ị hụlanụ ihe mere e ji ekwukarị na otú mkpụrụ ndụ mbụ ahụ si nwee ihe niile ga-emecha ghọọ mmadụ ná mmalite bụ “ọrụ ebube.”

Dr. David Fu-Chi Mark, bụ́ ọkà mmụta a ma ama, onye na-eme nnyocha banyere ihe ndị dị ndụ, kọrọ, sị: “Ihe niile gbasara mmadụ na otú ọ ga-esi too ezuchaala nnọọ mgbe onye ahụ ka bụ otu mkpụrụ ndụ.” O kwukwara, sị: “O doola anya ugbu a na mmadụ ọ bụla na-adị ezigbo iche n’ibe ya malite mgbe a tụụrụ ime ya.”

Ọ̀ Ghọọla Mmadụ n’Ime Akpa Nwa?

Malite mgbe nwaanyị tụụrụ ime, nwa ahụ nọ n’ime akpa nwa ya abụghị mkpụrụ ndụ nkịtị dị n’ime afọ nne ya, kama, ọ bụ mmadụ nọọrọ onwe ya. Ahụ́ nne nwa ahụ na-ewere nwa ahụ dị ka ọbịa. E wezụga na nwa ahụ na-anọ na-akpa nwa ebe a rụrụ ka ọ na-echebe ya, ahụ́ nne ya agaaraghị anabata ya. Mmadụ ọhụrụ a, nke nọ n’akpa nwa nne ya ebe e chebere ya, bụ mmadụ nke nwere DNA dị iche na nke onye ọ bụla ọzọ.

Ụfọdụ na-ekwu na ebe ọ bụ na n’ihi nsogbu ụfọdụ, ahụ́ nwaanyị na-eji aka ya ewepụ ọtụtụ àkwá ndị ọbara ọcha banyerela na ha, oleezi ihe ga-eme na dọkịta agaghị ewepụ nwa nọ n’afọ? Ma, o nwere ezigbo ihe dị iche n’ọnwụ mberede na ịkpachara anya gbuo ọchụ. N’otu obodo dị n’ebe Ndịda America, n’ime otu puku ụmụaka ọ bụla, ụmụaka iri asaa na otu na-anwụ tupu ha agbaa otu afọ. Ma ebe ọtụtụ ụmụaka na-anwụ otú a, ọ̀ ga-ekwesị ekwesị ma mmadụ gbuo nwa na-erubeghị otu afọ? Mbanụ!

Ọ dị mma ịmara na Baịbụl kwuru na ndụ mmadụ na-amalite mgbe ọ ka nọ n’ime afọ. Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid dere banyere Chineke, sị: “Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ, e dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị.” (Abụ Ọma 139:16) Devid asịghị naanị na Chineke hụrụ “nwa e bu n’afọ,” kama ọ sịrị, “M bụ nwa e bu n’afọ,” si otú ahụ mee ka a ghọta na yanwa bụ́ Devid malitere dịwa ndụ mgbe a tụụrụ ime ya, ogologo oge tupu a mụọ ya. Devid sikwa n’ike mmụọ nsọ Chineke kwuo na mgbe a tụụrụ ime ya, na akụkụ ahụ́ ya niile malitere ito dị ka e si mee atụmatụ ya ma ọ bụ dị ka e si dee ya “n’akwụkwọ,” nke mere ya ka ọ bụrụ onye ọ bụ.

Biko chetakwa na Baịbụl asịghị na nwaanyị tụụrụ ime otu mkpụrụ ndụ. Kama, ọ sịrị: “A tụrụwo ime nwa nwoke!” (Job 3:3) Nke a na-egosikwa na dị ka Baịbụl si kwuo, na nwa ọ bụla na-amalite dịwa ndụ mgbe a tụụrụ ime ya. N’eziokwu, ọ bụ mgbe ahụ ka ọ ghọrọ mmadụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Otú e si eji ọgwụ e ji nnu mee ete ime bụ site n’ịgbanye nwaanyị dị ime ọgwụ a gwakọtara ụdị nnu na-egbu egbu n’akpa nwa ya, nke a na-abanye nwa ahụ e bu n’afọ n’ahụ́, ọ na-egbukarịkwa ya n’ime awa abụọ. Ihe dị ka awa iri abụọ na anọ gafee, ime emewe nwaanyị ahụ, ya amụọ nwa nwụrụla anwụ ma ọ bụkwanụ mgbe ụfọdụ, nwa nọ ọ̀ dị ndụ ọnwụ ka mma.

[Foto ndị dị na peeji nke 6, 7]

Nwa e bu n’afọ nke dị izu ise abụghịzi naanị ọbara nkịtị—o nweela ihe niile ga-aghọ ihe ndị na-adị n’ahụ́ mmadụ

(otú ọ hà kpọmkwem)