Ihe Mere Anyị Eteghị Ime
Ihe Mere Anyị Eteghị Ime
VICTORIA, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya n’isiokwu nke mbụ, gwara enyi ya nwoke bụ́ Bill na ya agaghị ete ime ahụ. Victoria sịrị: “Eweere m na o nwere ihe dị ndụ nọ m n’ime. Mgbe m chọpụtara na ọ bụrụ na mụ na Bill nọgide na-akpa, ọ gaghị enyere m aka ọ bụla n’afọ ime ahụ, ahapụrụ m ya.”
Ma, Bill mechara gbanwee obi ya ma gwa Victoria ka ya lụwa ya. Ma ihe yiri ka ha amaghị otú ha ga-eme ya bụ ilekọta nwa ha nwoke a mụrụ ọhụrụ. Victoria, sịrị: “Anyị enweghị ego, uwe anyị nwere dịkwa ole na ole. A na-akwụ Bill obere ụgwọ ọnwa n’ebe ọ na-arụ ọrụ, anyị bikwa n’ụlọ na-abaghị anyị aba, ma ike agwụghị anyị.”
Ndị ọzọ enweekwala nsogbu ndị tara ezigbo akpụ n’ihi afọ ime ha na-adịghị njikere maka ya. Ma ha ekweghịkwa ete ime ahụ. Gịnị nyeere ha aka ikpebisi ike na ha agaghị ete ime ahụ ma die nsogbu ndị bịaara ha ka ha na-agbalị ịzụ nwa ha na-adịghị njikere maka ya? Ihe nyeere ha aka bụ amamihe ndị dị oké ọnụ ahịa dị na Baịbụl.
Abụla Onye Ọ Na-adị Ngwa Ngwa—Mee Atụmatụ Ndị Ga-abara Gị Uru
Baịbụl kwuru, sị: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru, ma onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.”—Ilu 21:5.
Mgbe Connie, bụ́ nne nwere ụmụaka nwoke atọ, nke otu n’ime ha nwere nkwarụ matara na ya dị ime, icheta na ya na-aga ịmụ nwa ọzọ enyeghị ya ọnụ okwu. Ọ sịrị: “Anyị enyejubeghị ndị nke anyị mụrụ amụ afọ ma ya fọdụzie onye ọzọ. Nke a mere ka anyị chewe echiche ite ime ahụ.” Ma kama ikpebi ihe ọ ga-eme ọkụ ọkụ, ọ kọọrọ ya Kay, bụ́ onye ọrụ ibe ya. Kay nyeere ya aka ịhụ na ọ bụ mmadụ dị ndụ ka o bu n’afọ, nke a mekwara ka o wepụ ite ime ahụ n’uche ya.
Ma, ihe dị Connie mkpa bụ ka e nyere ya aka mee atụmatụ ga-abara ya uru. Ebe ọ bụ na nwanne mama Connie bi nso ebe ahụ, Kay tụụrụ ya aro ka ọ gaa kọọrọ ya nsogbu ya. Mgbe ọ kọọrọ nwanne mama ya ahụ, o nwere mmasị inyere ya aka. Di Connie chọtakwuru ọrụ ego ọzọ ọ ga-arụ, ha akwafeekwa n’ụlọ katụ ọnụ ala. Ihe ndị a nyeziiri ha aka ilekọta nwa ọhụrụ ha.
Kay nyekwaara Connie aka ịchọta ụfọdụ ụlọ ọrụ ndị na-enyere ndị dị ime ha na-adịbeghị njikere maka ya aka. N’ọtụtụ mba, e nwere ụlọ ọrụ ndị dị otú ahụ na-enyere ndị nne mụrụ nwa ọhụrụ aka, ma ọ bụrụ na ha chọrọ enyemaka. E nwere ike ịchọta ụlọ ọrụ ndị dị otú a n’Ịntanet ma ọ bụ n’akwụkwọ ebe a na-ede nọmba fon dị iche iche. Mmadụ ga-agba ezigbo mbọ tupu o nweta enyemaka, ma ọ bụ “atụmatụ onye dị uchu” na-eweta uru.
Kweta Eziokwu ahụ Bụ́ na Ihe I Bu n’Afọ Bụ Mmadụ Dị Ndụ
Baịbụl kwuru, sị: “Anya onye ọ bụla nke maara ihe na-adị ya n’isi; ma onye nzuzu na-ejegharị n’oké ọchịchịrị.”—Ekliziastis 2:14.
Nwaanyị maara ihe n’ezie anaghị eleghara ihe bụ́ eziokwu anya ma ‘na-ejegharị n’ọchịchịrị,’ dị ka e nwere ike isi kwuo ya. Ọ na-eji ‘anya dị ya n’isi’ ahụ ụzọ, bụ́ nke na-eme ka ọ na-echezi echiche echezi. Nke a na-enyere ya aka ilebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime anya nke ọma ma mara ihe ndị o nwere ike ịkpatara ya. N’ihi ya, nwaanyị maara ihe adịghị ka nwaanyị na-achọghị ikweta ihe bụ́ eziokwu na-eme n’akpa nwa ya, kama ọ na-enwe obi ebere n’ahụ́ nwa o bu n’afọ, ma hụ na o chebere ya.
E ji kọmputa gosi Stephanie, bụ́ otu nwa agbọghọ dị ime, onye na-achọkwa ite ime ahụ, nwa o bu n’afọ nke dị ọnwa abụọ. Stephanie sịrị: “Ebewere m ákwá ozugbo. Ihe m nọ na-eche mgbe ahụ bụ: Gịnị mere m ga-eji chọọ igbu onye dị ndụ?”
Otu nwa agbọghọ ọzọ tụụrụ ime mgbe ọ na-alụbeghị di, nke aha ya bụ Denise, kwetakwara eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụ onye dị ndụ ka o bu n’afọ. Mgbe enyi ya nwoke nyere ya ego ka ọ gaa tee ime ahụ, Denise sịrị: “Ị̀ sị m gaa tee ime? Agaghị m anwa anwa eme ụdị ihe ahụ!” O si otú a jụ igbu nwa ya.
Ihe Ịtụ Egwu Mmadụ Na-akpata
Ọ bụrụ na ndị ọzọ na-enye gị nsogbu ka ị gaa tee Ilu 29:25.
ime, ya abụrụkwa na ọ gbatawala gị n’obi ime ya, ọ ga-adị mma ma i chebara ilu a dị na Baịbụl echiche. Ọ na-asị: “Ịtụ mmadụ egwu na-eweta ọnyà, ma a ga-echebe onye tụkwasịrị Jehova obi.”—Monica, bụ́ onye dị afọ iri na asaa, tụtara ime n’aka enyi ya nwoke mgbe Monica na-achọ ịbanye ụlọ akwụkwọ a na-amụ aka ọrụ. Nke a mere ka ike ụwa gwụ mama ya, onye bụ́ nwaanyị di ya nwụrụ nke nwere ụmụ ise ọ na-azụ. Mama ya chọrọ ka ọ gaa mụọ aka ọrụ ka ọ ghara ịbụ ogbenye otú ezinụlọ ha si bụrụ. N’ihi ihe ndị a, mama Monica siri ọnwụ na ọ ga-ete ime ahụ. Monica sịrị: “Mgbe dọkịta jụrụ m ma m chọrọ ite ime ahụ, asịrị m ya, ‘Mba!’”
Mgbe mama Monica chere na nke nwa ya nwaanyị agwụla, chetakwa nsogbu dị n’ilekọtakwa nwa ọzọ, ọ chụpụrụ Monica n’ụlọ. Monica gara biri na nke nwanne mama ya. Ka izu ole na ole gachara, obi mama ya jụụrụ, ya agwa ya ka ọ lọghachikwa n’ụlọ ha ka ọ nọrọ ebe ahụ mụọ nwa. Mgbe Monica mụrụ nwa ya nwoke bụ́ Leon, mama ya nyeere ya aka lekọta nwa ahụ, ọ bịakwara hụ nwa ahụ n’anya nke ukwuu.
Ebe otu nwaanyị lụrụla di aha ya bụ Robin si nweta nsogbu nke ya dị iche. Robin kwuru, sị: “Mgbe m dị ime, dọkịta m gwọrọ m ọrịa akụrụ na-arịa m tupu ya achọpụta na m dị ime. Ọ gwara m na nwa ahụ m bu n’afọ nwere ike inwe nkwarụ ma m mụọ ya.” Dọkịta ahụ gwaziri ya tee ime ahụ. Robin kwuru, sị: “Akọwaara m ya otú Baịbụl si ele ndụ anya. Agwara m ya na o nweghị ihe ga-eme ka m tee ime.”
Ọ bụ eziokwu na ihe dọkịta ahụ chere wee gwa ya tee ime ahụ adịghị njọ, ma nke ahụ abụghị ihe nwere ike ịta isi Robin. * Robin kwukwara, sị: “Mgbe m mụrụ nwa m nwaanyị, e lere ya ahụ́, naanị ihe a chọpụtara bụ na o nwere obere nsogbu n’ụbụrụ nke mere ka ọ ghara ikwu okwu nke ọma. Ọ na-eme nnọọ nke ọma. O ruola afọ iri na ise ugbu a, otú o si agụ ihe na-akakwa mma. Ejighị m ya egwu egwu, ana m ekelekwa Jehova ọtụtụ ugboro n’ụbọchị maka ya.”
Ịbụ Enyi Chineke Na-eme Ka Mmadụ Mee Ihe Dị Mma
Baịbụl na-ekwu, sị: “Ndị ha na Chineke na-abụ enyi bụ ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya ná ndụ ha.”—Abụ Ọma 25:14, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.
Ihe mere ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị na-adịghị ekwe ete ime ji eme otú ahụ bụ na ha na-echebara otú Chineke si ele okwu ahụ anya echiche. Ihe kacha ha mkpa bụ ka ha na Chineke nọgide bụrụ enyi, nakwa ka ha na-eme ihe na-atọ ya ụtọ. Ọ bụ nke a mere Victoria, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya ná mbụ, ji kpebisie ike na ya agaghị ete ime ahụ ọ dị. Ọ sịrị: “Ekwenyesiri m ike na Chineke na-enye ndụ, erughịkwa m eru iwepụ ndụ ahụ o nyere.”
Mgbe Victoria malitere ịmụchi Baịbụl anya, ya
na Chineke bịara bụrụkwuo enyi. Ọ sịrị: “Mkpebi ahụ m mere ịhapụ ite ime ahụ mere ka mụ na Chineke dịkwuo ná mma, meekwa ka m chọwa ime ihe ọ bụla ga-eme ya obi ụtọ n’ihe ọ bụla m na-eme ná ndụ. Mgbe m kpere ekpere ka o zi m ụzọ m ga-eso, ihe ndị ọzọ niile bịara daba nnọọ otú m si chọọ.”Ịbụ enyi Chineke, onye bụ́ Isi Iyi nke ndụ, na-eme ka anyị ghọtakwuo na nwa e bu n’afọ bụ onye dị ndụ e kwesịrị ịkwanyere ùgwù. (Abụ Ọma 36:9) Ihe ọzọkwa bụ na Chineke nwere ike inye nwaanyị ahụ dị ime na ezinụlọ ya “ike karịrị ike nkịtị” nke ga-enyere ha aka idi nsogbu ndị ha na-enweta n’ihi ime ọ bụla ha na-adịghị njikere maka ya. (2 Ndị Kọrịnt 4:7) Ugbu a, olee otú obi dị ndị ahụ rubere isi n’iwu Chineke nyere banyere ndụ, ná mkpebi ahụ ha mere oge ahụ?
Anyị Anaghị Akwa Mmakwaara
Obi ndị nne na nna a adịghị ama ha ikpe ma ọ bụ ha ana-enwe mwute mgbe niile ma ọ bụ na-eche na o nwere ihe funahụrụ ha. Ka oge na-aga, ha bịara lewe “mkpụrụ nke afọ” ahụ anya dị ka ụgwọ ọrụ kama ilewe ya anya ka ọnụ abụrụ ha abụ! (Abụ Ọma 127:3) Mgbe Connie, bụ́ onye e kwuru okwu ya na mbụ, mụchara nwa, naanị awa abụọ agaa, ya achọpụta na nke a bụ eziokwu! O ji obi ụtọ kpọọ onye ọrụ ibe ya bụ́ Kay ma gwa ya na obi na-atọ ya ka ya na-atụ anya ịzụ nwa ya nwaanyị ahụ ọ mụrụ ọhụrụ. Connie ji obi ụtọ kwukwaa, sị: “Ọ bụ nnọọ eziokwu na Chineke na-agọzi ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ.”
Gịnị mere o ji aba uru ile ndụ anya otú Chineke si ele ya? Ọ bụ n’ihi na Chineke, bụ́ Isi Iyi nke ndụ, nyere iwu na ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl “maka ọdịmma [anyị],” ma ọ bụkwanụ “ka o wee dịrị [anyị] mma.”—Diuterọnọmi 10:13; Bible Nsọ nke Union Version.
Victoria na Bill, bụ́ ndị anyị kọrọ akụkọ ha ná mmalite isiokwu nke mbụ na isiokwu nke a, kwuru na mkpebi ahụ ha mere ịghara ite ime ahụ, mere ka ha mee mgbanwe ná ndụ ha. Ha si otú a kwuo ya: “Anyị abụọ na-aṅụ ọgwụ ike n’oge ahụ, o nwekwara ike anyị gaara abụ ndị nwụrụ anwụ ugbu a ma a sị na anyị nọgidere na aṅụ ya. Ma ebe anyị na-egbughị nwa ahụ e bu n’afọ, o mere ka anyị chebara ndụ nke anyị echiche. Ndịàmà Jehova nyeere anyị aka ịgbanwe.”
Nwa ha nwoke bụ́ Lance fọrọ obere ka o ruo afọ iri atọ na anọ ugbu a, ọ lụkwara nwaanyị ihe karịrị afọ iri na abụọ gara aga. Lance kwuru, sị: “Nne na nna m malitere mgbe m bụ nwata kụziwere m otú m ga-esi na-eme mkpebi ndị dabeere ná Baịbụl. Nke a enyerela mụ na nwunye m na nwa anyị aka nke na anyị ga-asị na anyị nwere ezigbo obi ụtọ.” Papa ya, bụ́ onye chọburu ka mama ya bụ́ Victoria tee ime ahụ, kwuru, sị, “Akpata oyi na-awụ anyị n’ahụ́ ma anyị cheta na ọ fọrọ obere ka anyị gbuo nwa anyị nwoke a anyị ji eme ọnụ.”
Ka anyị kọzie ihe mere Monica, bụ́ onye na-ekweghị ete ime n’agbanyeghị na mama ya chọrọ ka o tee ya. Monica sịrị: “Izu abụọ m mụchara nwa m nwoke, Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị, amụtakwara m otú m ga-esi na-erubere Chineke isi n’ihe niile m na-eme ná ndụ. Ọ dịghị anya, mụ amalite ịkụziri nwa m nwoke bụ́ Leon uru irube isi n’iwu Chineke bara, ka oge na-agakwa, ọ bịara hụ nnọọ Chineke n’anya. Ugbu a Leon bụ onye ozi na-ejegharị ejegharị, onye na-aga eleta ọgbakọ Ndịàmà Jehova.”
Mgbe Leon chetara ihe mama ya mere, ọ sịrị: “Ịmata na ọ hụrụ m nnọọ n’anya, nke na ọ jụrụ ite ime m n’agbanyeghị na a kwanyere ya ọkụ n’ahụ́ ite ya, mere ka m chọọ iji ndụ m niile jeere Chineke ozi iji kelee ya maka ndụ a o nyere m, nke bụ́ onyinye dị oké ọnụ ahịa.”
Ọtụtụ ndị ghọtarala otú Chineke si ele ndụ anya adịghị akwa mmakwaara na ha kpebiri na ha agaghị ete ime nwa ha ma ha hụ nwa ahụ ugbu a. Ha nwere ike iji obi ụtọ, sị, “Anyị eteghị ime!”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 20 Ọ bụrụ na mgbe nwaanyị na-amụ nwa, isi ya achọọ ịbanye na ya, ọ bụ nwaanyị ahụ na di ya ka ọ dịịrị ikpebi onye a ga-azọ ndụ ya, ọ̀ bụ nke nwaanyị ka ọ̀ bụ nke nwa ya. Ọganihu ndị e nwerela n’otú e si agwọ ọrịa n’ọtụtụ mba emeela na ụdị ihe a anaghị emekarịzi.
[Foto dị na peeji nke 7]
Mgbe e ji kọmputa gosi Stephanie nwa ọnwa abụọ o bu n’afọ, o nyeere ya aka ikpebi ihe ọ ga-eme
(Ọ bụ anyị kara ya akara gburugburu)
[Foto dị na peeji nke 8]
Victoria na Lance
[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]
Victoria na Bill taa, na Lance na ezinụlọ ya
[Foto dị na peeji nke 9]
Monica na Leon nwa ya nwoke na-ekele Jehova na n’afọ iri atọ na isii gara aga, Monica ekweghị tee ime Leon