Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Kwesịrị Ịtụ Ndị Nwụrụ Anwụ Ụjọ?

Ì Kwesịrị Ịtụ Ndị Nwụrụ Anwụ Ụjọ?

Echiche Baịbụl

Ì Kwesịrị Ịtụ Ndị Nwụrụ Anwụ Ụjọ?

Ndị a na-akpọ ndị Annang na Nigeria kweere na ọ bụrụ na a kwanyereghị ndị nwụrụ anwụ ùgwù otú kwesịrị ekwesị tupu e lie ha, na mkpụrụ obi ha ga-akpatara ndị ezinụlọ ha nsogbu ma ọ bụdị ọnwụ. Ụfọdụ ndị China kwekwaara na ọ bụrụ na e lighị mmadụ otú omenala obodo ha si chọọ, na mkpụrụ obi onye ahụ ga-abịa ọgụ ma ọ bụdị gbuo ndị ọzọ.

N’ỌTỤTỤ ebe n’ụwa taa, ndị mmadụ kweere na mmadụ nwụọ na o nwere ihe na-esi n’ahụ́ ya pụọ—mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ ya. Ọtụtụ ndị kwekwaara na mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ nke onye nwụrụ anwụ nwere ike ịkpaghasị ihe ná ndụ ndị ezinụlọ ya ma ọ bụ ná ndụ ndị enyi ya.

Ma, ọ̀ bụ eziokwu na e nwere ihe na-apụ n’ahụ́ mmadụ nke na-adịrị ndụ gawa ma onye ahụ nwụọ? “Ihe” ahụkwa, ò nwere ike imerụ ndị dị ndụ ahụ́? Gịnị ka Baịbụl na-ekwu banyere nke a?

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Maara Ihe Na-emenụ?

Baịbụl kwuru na ndị nwụrụ anwụ “amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” O kwukwara na ndị nwụrụ anwụ bụ “ndị na-adịghị ndụ.” (Ekliziastis 9:5; Aịzaya 26:14) Okwu Chineke kwuru banyere nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam, sị: “Jehova bụ́ Chineke wee jiri ájá si n’ala kpụọ mmadụ ma kunye ume ndụ n’oghere imi ya, mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.”Jenesis 2:7.

Ị̀ chọpụtara na e kere Adam ka ọ bụrụ mkpụrụ obi, nke bụ́ onye dị ndụ? Dị ka Baịbụl kwuru, Chineke etinyeghị mkpụrụ obi n’ime Adam, nke nwere ike dịrị ndụ na-aga ma ọ nwụọ. N’ihi ya, mgbe Adam mehiere, ọ nwụrụ. Ọ ghọrọ “mkpụrụ obi . . . nwụrụ anwụ.” (Ọnụ Ọgụgụ 6:6) Baịbụl kwukwara na “mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie, ọ bụ ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4) Anyị niile ketara mmehie ma ọ bụ ezughị okè n’aka nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị anwụọ, mkpụrụ obi anwụọla.—Ndị Rom 5:12.

Mgbe Baịbụl na-akọwa ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, ọ naghị eji okwu ndị na-esi ike nghọta, kama ọ na-eji okwu ndị na-adị mfe nghọta, dị ka “ịda n’ụra ọnwụ.” (Abụ Ọma 13:3) Jizọs kwuru banyere otu nwata nwaanyị dị afọ iri na abụọ, sị: “Ọ nwụghị anwụ kama ọ na-ehi ụra.” Ndị mmadụ “wee malite ịchị ya ọchị, na-akwa ya emo, n’ihi na ha maara na ọ nwụwo.” Ma, Baịbụl gwara anyị na Jizọs kpọtere nwa ahụ n’ụra ọnwụ.—Luk 8:51-54.

Otu ihe ahụ mekwara mgbe Lazarọs nwụrụ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ya na-aga na nke Lazarọs “ịkpọte ya” n’ụra. Ndị na-eso ụzọ Jizọs aghọtaghị ihe ọ na-ekwu, n’ihi ya, “Jizọs gwara ha hoo haa, sị: ‘Lazarọs anwụwo.’” Pọl onyeozi kwukwara banyere “ndị dara n’ụra ọnwụ” ma kwuo na n’oge Chineke kara aka, ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ.—Jọn 11:11-14; 1 Ndị Tesalonaịka 4:13-15.

Ọ dị mma ịmara na ọ dịghị ebe ọ bụla Baịbụl kwuru na mkpụrụ obi na-adịrị ndụ gawa ma mmadụ nwụọ. N’ihi ya, ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji tụwa ndị nwụrụ anwụ ụjọ. Gịnịzi mere ndị mmadụ ji kwere na o nwere ihe dị mmadụ n’ahụ́ nke na-adịrị ndụ gawa ma onye ahụ nwụọ? Gịnịkwa mere ndị mmadụ ji atụ ụjọ na ndị nwụrụ anwụ ga-emerụ ndị dị ndụ ahụ́?

Ụgha na Aghụghọ

Okpukpe ụgha na-akụziri ndị mmadụ na onye nwụrụ anwụ anwụchabeghị. Kemgbe ụwa, ọtụtụ ndị bi n’ụwa kweere n’ozizi bụ́ na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ. Ọ bụ nke a mere na ọ bụrụ na onye na-achị obodo anwụọ n’ebe ụfọdụ, dị ka mgbe ndị na-achị Ijipt oge oche, bụ́ ndị a na-akpọ Fero nwụrụ, a na-egbu ndị ohu ha, ka ha nwee ike ịnọgide na-ejere ndị ọchịchị ha nwụrụ anwụ ozi n’ala mmụọ.

E nweela ọtụtụ ndị e mere ka ha kweta na ọ bụ mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ na-abịa enye ha nsogbu. Ha kwenyesiri ike na ọ bụ mkpụrụ obi nke ndị ikwu ha na nke ndị ọzọ nwụrụ anwụ, bụ́ ndị ha na-emereghị ihe ndị ha kwesịrị imere ha, na-abịa enye ha nsogbu. Ma, Akwụkwọ Nsọ mere ka anyị ghọta na nke a abụghị eziokwu. Ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ a na-adịghị ahụ anya na-abịa enye ndị mmadụ nsogbu ndị ahụ, ọ na-atọkwa ha ụtọ ịmaja na iyi ndị mmadụ egwu.—Luk 9:37-43; Ndị Efesọs 6:11, 12.

Akwụkwọ Nsọ kpọrọ Setan “nna ụgha,” onye “na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.” Ya na ndị mmụọ ọjọọ ya “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.” (Jọn 8:44; 2 Ndị Kọrịnt 11:14; Mkpughe 12:9) N’eziokwu, ọ bụ Setan bụ isi sekpụ ntị na-akụzi ụgha ahụ bụ́ na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ nakwa na ndị nwụrụ anwụ nwere ike imerụ ndị dị ndụ ahụ́.

Ma, a naghị eji ụgha ndị a aghọgbu ndị kweere n’ihe Baịbụl na-akụzi. Ha maara nke ọma na ọ bụ Setan na-anwa ịghọgbu ndị mmadụ ka ha kwere na ndị nwụrụ anwụ na ndị dị ndụ nwere ike ikwurịta okwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na dị ka Baịbụl kwuru: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5) N’eziokwu, Okwu Chineke na-agwa anyị eziokwu ndị na-eme ka anyị nwere onwe anyị ma ghara ịbụ ndị a ghọgburu n’okwu gbasara ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ!—Jọn 8:32.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Ndị nwụrụ anwụ hà maara ihe ọ bụla?Ekliziastis 9:5; Aịzaya 26:14.

▪ Gịnị na-eme ka ọtụtụ ndị kwere na e nwere ihe dị n’ahụ́ mmadụ nke na-adịrị ndụ gawa ma onye ahụ nwụọ?Jọn 8:44.

▪ Olee ebe anyị nwere ike isi mata nke bụ́ eziokwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ?Jọn 8:32; 17:17.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

Ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ na-emenye ndị mmadụ ụjọ