Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Gbara Ndị Ntorobịa Katọlik Ume Ka Ha Na-agba Àmà

A Gbara Ndị Ntorobịa Katọlik Ume Ka Ha Na-agba Àmà

A Gbara Ndị Ntorobịa Katọlik Ume Ka Ha Na-agba Àmà

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! N’AUSTRALIA

N’ỌNWA July afọ gara aga, ndị Roman Katọlik n’ụwa niile gbakọtara n’obodo Sydney dị n’Australia iji mee ememme Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa nke afọ 2008, nke bụ́ ememme gbasara okpukpe nke Chọọchị Katọlik na-ahazi.

Ndị ọbịa, ma ọ bụ ndị si mba ọzọ bịa ememme ahụ, si n’otu narị mba na iri mba asaa jupụta n’okporo ụzọ ndị dị n’obodo ahụ, jiri obere ọkọlọtọ n’aka na-efegharị ya, na-agụ egwú, na-awụgharị, na-eme ka a mara na o nwere ememme a na-eme n’obodo ahụ. Ọtụtụ puku ndị mmadụ kwụụrụ n’Ọdụ Ụgbọ Mmiri Sydney ka ha nwee ike hụ Poopu Benedict nke Iri na Isii, bụ́ onye ji ụgbọ mmiri bịa. Ụgbọ mmiri iri na abụọ ndị ọzọ a chọrọ mma sokwa ya bịa. Ihe dị ka narị nde mmadụ ise n’ụwa niile nọ na-ekiri ya na tiivi ka ọ na-eme.

Ihe dị ka narị puku mmadụ anọ bịara gere Mas ikpeazụ e doro n’otu ámá egwuregwu dị n’obodo ahụ, nke ndị so na ha bụ ndị isi chọọchị dị puku anọ nakwa puku mmadụ abụọ ndị si n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi dị iche iche. Mgbakọ a bụ mgbakọ mbụ e nwerela mmadụ hà otú ahụ bịara ya n’Australia. Ọnụ ọgụgụ ndị bịaranụ karịkwara nnọọ nke ndị bịara egwuregwu Olimpik e mere ná mba ahụ n’afọ 2000.

Gịnị bụ Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa? Gịnị mere e ji eme ya? Gịnị na gịnị ka a na-eme n’ụbọchị ahụ? Oleekwa ihe o mere ka a mara banyere okwukwe ndị na-eto eto ná mba Sydney?

‘Okwukwe nke Na-anwụ Anwụ’

Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa bụ ememme a na-eme kwa afọ iji mee ka okwukwe ndị ntorobịa Katọlik sie ike. N’ụbọchị ahụ, ndị Katọlik ndị ọzọ na-emekarị ememme ahụ na chọọchị ha dị iche iche. Ma, n’afọ abụọ ma ọ bụ atọ ọ bụla, ndị ntorobịa Katọlik si ná mba dị iche iche n’ụwa na-agbakọta n’otu nnukwu obodo ma nọrọ ebe ahụ mee ememme ahụ. E nweela obodo iri ná mpaghara dị iche iche n’ụwa ebe a nọ mee ememme ahụ, ọtụtụ nde mmadụ gakwara ha.

Ma ndị isi chọọchị ahụ kwukwara na ihe ọzọ mere e ji eme ememme a bụ iji nyere ndị ntorobịa Katọlik aka ka ha kwụsị ịgbapụsị na chọọchị ha. George Cardinal Pell, bụ́ nnukwu ụkọchukwu ndị Katọlik n’Australia kwuru, sị: “Otu nnukwu nsogbu anyị nwere bụ na ọtụtụ ndị na-agbapụsị na chọọchị Katọlik, ruokwa n’ókè ụfọdụ, okwukwe ha na-anwụ anwụ. Ememme Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa bụ otu n’ime mgbalị anyị na-eme iji kwụsị nsogbu ndị a.”

Ozi e si n’aka ndị isi chọọchị Katọlik nweta na-egosi na ọnụ ọgụgụ ndị ụkọchukwu e nwere n’ụwa niile na-agbada n’ike n’ike. E nweela ọtụtụ iri puku ndị ụkọchukwu gbara arụkwaghịm n’ọrụ ụkọchukwu ha ma gaa lụrụ nwaanyị n’ime iri afọ ole na ole gara aga. N’Australia, ọnụ ọgụgụ ndị a na-enye ọzụzụ ka ha bụrụ ndị ụkọchukwu agbatuola nnọọ. Ihe karịrị mmadụ asaa n’ime mmadụ iri akwụsịla ịnara ọzụzụ n’ime afọ iri atọ gara aga. Na dayọsis kacha nnukwu e nwere n’Australia taa, afọ ndụ nke ọtụtụ ndị ụkọchukwu nọ ebe ahụ bụ bido n’iri afọ isii gawa. Ma, n’afọ 1977, afọ ndụ ọtụtụ ndị ụkọchukwu e nwere n’oge ahụ bụ bido n’iri afọ anọ gawa.

N’ọtụtụ mba, ọtụtụ mmadụ adịghị agakarịzi chọọchị. Ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla n’Australia na-ekwu na ya bụ onye Katọlik, ma, ọ bụ naanị ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ iri n’ime ha na-agachi chọọchị anya. E kee ndị ntorobịa Katọlik ụzọ iri, e kwuru na ndị na-aga chọọchị n’ime ha erughị otu ụzọ. Ihe ọzọkwa bụ na ọtụtụ ndị Katọlik na-enupụ isi n’ihe chọọchị ha na-akụzi banyere inwe mmekọahụ, igbochi afọ ime, na ịgba alụkwaghịm. Ike agwụla ụfọdụ ndị n’ihi akụkọ ọjọọ ndị ha na-anụ na-eme na chọọchị, nke otu n’ime ha bụ akụkọ banyere ndị ụkọchukwu ndị na-edina ụmụaka.

Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sydney Morning Herald kwuru na Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa “bụ nnọọ mgbalị ikpeazụ a na-eme iji kwụsị ndị mmadụ ịgbapụsị na chọọchị. Ndị isi chọọchị n’Australia na Rome na-atụ anya na ndị ntorobịa a ga-eme ka ihe dịkwa mma na chọọchị Katọlik.” Gịnị ka ndị ndú chọọchị na-eme iji nweta obi ndị ntorobịa a?

Ihe Ngosi Ndị Mara Mma na Oriri na Nkwari

Ụfọdụ n’ihe ndị e mere n’Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa nke afọ 2008 bụ igosi ndị mmadụ ihe ndị mara mma chọọchị nwe, mgbakọ ebe a nọ kụziere ndị mmadụ ihe, ịga ebe chọọchị Katọlik weere dị ka ebe ndị dị nsọ, na mgbakọ ukwu dị iche iche a nọ na ha doo Mas. Ọ bụ eziokwu na ihe ndị a tọrọ nnọọ ọtụtụ n’ime ndị a bịara obodo ahụ ụtọ, ụfọdụ chọpụtara na o nwere ihe ọzọ mere ememme ahụ ji tọọ ụtọ. Otu nwa agbọghọ onye Katọlik aha ya bụ Alexandra, onye si mba United States, kwuru banyere ụbọchị a bụ́ Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa, sị: “Ọ bụ nnọọ nnukwu oriri na nkwari ka anyị bịara.”

E mere narị ihe omume anọ na iri ise n’ememme ahụ were ụbọchị isii e mere n’obodo Sydney. Ụfọdụ n’ime ihe ndị e mere ebe ahụ bụ ịkụ egwú na ịgba egwú, fim, ihe nkiri, ihe ngosi, na ịgbagharị n’okporo ámá. Ụdị egwú ndị a gụrụ ebe ahụ bụ ụdị ukwe a na-ekwe ebe a na-eme ihe nkiri, abụ chọọchị Katọlik a na-adịghị eji ngwá egwú abụ, nakwa egwú rock na egwú rap, bụ́ egwú ndị na-ada oké ụda. Egwú rock ahụ dọtara mmasị ọtụtụ puku ndị na-eto eto, bụ́ ndị oriri oké mkpọtụ na-amasị.

Ihe ndị a kpataara ụfọdụ ndị Katọlik nchegbu. Otu ụkọchukwu aha ya bụ Peter Scott gwara ndị nta akụkọ nke Australia’s ABC News na oge ememme a “aghọọla naanị oge oriri na nkwari—izu oriri na nkwari na ịgụ egwú nakwa nke a na-eme ihe ndị ọzọ ụwa na-eme, nke na ọ bụzi ihe ole na ole dị nsọ n’ezie ka a na-eme n’izu ahụ.” N’afọ 2000, Poopu Benedict nke Iri na Isii, onye bụ́ Kadịnal Ratzinger n’oge ahụ, dere, sị: “Ndị mmadụ na-eji [egwú] ‘rock’ egosi ihe riri ha isi. N’ebe a na-eti egwú rock, ndị ọ na-atọ ụtọ na-efe egwú ahụ na ndị na-akụ ya ofufe, nke a abụghịkwanụ otú Ndị Kraịst si efe Chineke.”—The Spirit of the Liturgy.

Ajụjụ e nwere ike ịjụzi bụ, “Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa, ọ̀ ga-agbanwe ndụ ndị mmadụ?” Paul Collins, onye bụ́bu ụkọchukwu, sịrị, “O nwere ike ịgbanwe ndụ mmadụ ole na ole. Ma ọtụtụ ndị ọzọ ga-alaghachikwa n’ụdị ndụ ha na-ebibu. Ọ bụghị ememme ndị na-akpọtụ akpọtụ na-eme ka mmadụ mee ezigbo mgbanwe ná ndụ ya, kama ọ bụ mgbe mmadụ chebaara ndụ ya echiche, hazie onwe ya nke ọma ma dị njikere ileba anya ná nsogbu ndị ririla ya ahụ́ iji nwee ike ịhapụ ya.”

‘Bụrụnụ Ndị Àmà M’

Ihe ndị ahụ niile doro ndị isi chọọchị Katọlik anya. Ọ bụkwa nke a mere isiokwu Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa nke afọ 2008 ji bụrụ: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà m.” *

Ndị bishọp gbara ndị ahụ gbakọtaranụ ume ka ha “mụta ụzọ ọhụrụ ha ga-esi na-anụ ọkụ n’obi n’ịgbara ndị nke oge a àmà nke ọma banyere ihe ndị Kraịst kụziri, otú ahụ ndịozi Jizọs si jiri ịnụ ọkụ n’obi gbaa àmà.” Poopu Benedict nke Iri na Isii gbakwara ha ume ka ha ghọọ “ọgbọ ọhụrụ nke ndịozi Kraịst.” N’oge ọzọkwa, ọ gwara ha ka ha zisaara “ndị enyi ha, ndị ezinụlọ ha, nakwa onye ọ bụla ha hụrụ Ozi Ọma ahụ.”

Agbamume ndị a ruru n’obi ụfọdụ ndị nwere obi eziokwu n’ime ndị ahụ bịara ememme ahụ. Ramido, bụ́ onye dị afọ iri abụọ, nke si mba United States, gwara otu onye nta akụkọ, sị: “Eweere m izi ozi ọma dị ka ihe dị ezigbo mkpa.” Ma Beatrice, onye dị afọ iri na asatọ si mba Ịtali, sịrị: “Ndị na-eto eto nke oge a adịghị ekwu ihe ọ bụla banyere Chineke. Ịbụ onye na-agba àmà n’oge a siri ezigbo ike.” Ọtụtụ ndị bịara ememme ahụ kwetara ihe ụmụ agbọghọ abụọ si obodo Texas, U.S.A. kwuru, sị: “Naanị ndị anyị maara na-agba àmà n’obodo anyị si bịa bụ Ndịàmà Jehova!”

Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Na-agba Àmà

N’eziokwu, a maara Ndịàmà Jehova, ma ndị na-eto eto ha ma ndị agadi ha nke ọma na ha na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-agba àmà. Gịnị mere ha ji agba àmà? Sotir, Onyeàmà dị afọ iri abụọ na abụọ, nke si mba Sydney, sịrị: “Ọ bụ n’ihi na anyị hụrụ Chineke n’anya, hụ ndị mmadụ n’anya, hụkwa Baịbụl n’anya.”

N’oge a e mere ememme Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa nke afọ 2008, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ Ndịàmà Jehova na-eto eto dị narị anọ, ndị bi ná mba Sydney, so kwusaara ndị Katọlik si mba dị iche iche bịa eziokwu Baịbụl, n’agbanyeghị na Ndịàmà ahụ abịaghị maka ememme ahụ. Travas, onye dị afọ iri abụọ na ise, sịrị: “Obi dị m ụtọ ịhụ ndị na-eto eto Okwu Chineke na-amasị, n’ime ndị Katọlik a bịara obodo anyị. Ọtụtụ n’ime ha jụrụ ajụjụ ndị a ga-eji Baịbụl zaa, ọ tọkwara m ụtọ na ihe m zara ha juru ha afọ.”

Tarsha, bụ́ onye dị afọ iri abụọ na atọ, sịrị: “Ana m atụsara ahụ́ mgbe mụ na ha na-akparịta ụka. M mere ka ha mata na ọbịbịa ha n’obodo Sydney dị m ụtọ, m na-achọkwa ịma ihe ndị ha kweere.” Frazer, onye dị afọ iri abụọ, sịrị: “Mgbe o kwere mee, ana m enye ndị ọbịa ahụ onyinye. Ana m enye ha akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? * Ndị niile m nyere ya ji obi ụtọ nara ya.”

Obi tọrọ ọtụtụ ndị ọbịa ahụ ụtọ na ha na Ndịàmà ahụ na-eto eto kparịtara ụka. Suzanne, bụ́ onye si mba Fiji, jụrụ Belinda, bụ́ Onyeàmà dị afọ iri na itoolu, ihe mere Chineke ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Belinda gwara ya ka ha tụlee otú e si zaa ajụjụ ahụ n’akwụkwọ Bible Na-akụzi. Mgbe ha gụchara ya, Suzanne sịrị: “Ihe ndị mmadụ na-azakarị m ma m jụọ ha ajụjụ a bụ na a naghị aghọtacha otú Chineke si arụ ọrụ aghọtacha. Ugbu a ka m nwetara ihe bụ́ azịza ya!” Mgbe Belinda nyere Suzanne akwụkwọ ahụ, Suzanne tiri mkpu, sị: “Anọ m na-agbalị ichetacha ihe niile i kwuru. Amaghịdị m na ị ga-asị m werewa akwụkwọ a!”

Otu onye ọbịa si mba Philippines rịọrọ Marina, bụ́ Onyeàmà dị afọ iri abụọ na asaa, ka o see ya foto n’ihu otu ụlọ a ma ama na Sydney. Ha abụọ mechara nwee ezigbo mkparịta ụka, Marina nyekwara nwaanyị ahụ akwụkwọ Bible Na-akụzi. Nwaanyị ahụ gwara ya, sị: “Agwara m Chineke n’ekpere n’abalị ụnyaahụ na m chọrọ ịghọtakwu Baịbụl. Akwụkwọ a nwere ike ịbụ ihe Chineke ga-eji zaa ekpere m!”

Levi, bụ́ Onyeàmà dị afọ iri abụọ na asaa, na ndị ọbịa abụọ, bụ́ otu nne na nwa ya nwaanyị, ndị si obodo Panama malitere ịkparịta ụka. Ọ dịghị anya, mkparịta ụka ahụ agawa n’okwu gbasara Chineke, ha nwekwara ezigbo mkparịta ụka banyere ihe ndị Baịbụl na-akụzi. Ha abụọ naara akwụkwọ Bible Na-akụzi. Levi mechara jụọ ha, sị, “Olee ihe kacha tọọ unu ụtọ na njem a unu bịara?” Nke nwa agbọghọ ahụ welitere akwụkwọ Bible Na-akụzi ahụ ma kwuo, sị: “Ọ bụ ọhụhụ anyị na gị hụrụ.”

E nwere nnọọ ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ ndị Katọlik ọ gụrụ agụụ ịmatakwu ihe Baịbụl na-akụzi. Gịnwakwanụ? Ị̀ ga-achọ ịghọtakwu ihe Baịbụl na-akụzi? Ọ bụrụ na ị ga-achọ, ọ ga-adị mma ma ị gwa Ndịàmà Jehova ka ha bịa n’ụlọ gị kụziwere gị Baịbụl n’efu. Ọ ga-amasịkwa ha ịbịa nyere gị aka!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 19 E si n’Ọrụ 1:8 nweta isiokwu a.

^ par. 25 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

“Otu nnukwu nsogbu anyị nwere bụ na ọtụtụ ndị na-agbapụsị na chọọchị Katọlik, ruokwa n’ókè ụfọdụ, okwukwe ha na-anwụ anwụ.”—George Cardinal Pell nke ndị Roman Katọlik

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 17]

ỊKPỌSA ỌRỤ CHỌỌCHỊ

N’Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa nke afọ 2008, e mere ụdị mkpọsa a na-emetụbeghị ụdị ya mbụ ná mba Australia, ebe a nọ na ya kọwaa ụdị ọrụ dị iche iche ndị na-eto eto nwere ike ịhọrọ na chọọchị Katọlik. Ihe karịrị narị ndị mọnk na ndị nọn Katọlik nakwa ndị isi Katọlik ndị ọzọ gbara ihe karịrị mmadụ puku iri ise bịara ebe ahụ e mere mkpọsa ahụ ume ka ha gbalịa ịghọ ndị ụkọchukwu, ndị nọn, ma ọ bụ ịrụ ọrụ ndị ọzọ na Chọọchị Katọlik.

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Ndị ọbịa, ndị yi uwe ndị na-egbuke egbuke, nọ na-agagharị n’okporo ámá

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndịàmà Jehova kwusaara ndị ọbịa bịara obodo Sydney ozi ọma

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 16]

Getty Images