Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Malite N’oge Nyewe Ụmụ Gị Ọzụzụ dị Mma

Malite N’oge Nyewe Ụmụ Gị Ọzụzụ dị Mma

Malite N’oge Nyewe Ụmụ Gị Ọzụzụ dị Mma

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA CANADA

▪ Otu akụkọ gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kwuru, sị: “E nwere ike isi na televishọn mụta ezigbo ihe.” Ma, “ụmụaka ịnọ ọtụtụ awa n’ihu tiivi na-enweghị ihe ha na-eme, na-akpatara ha nsogbu ma n’ahụ́ ma n’uche.” Ọ na-emekwa ka ha ghara inwe ohere ịmụta iji uche ha na-echepụta otú e si arụpụta ihe, na-emekwa ka ha ghara ịmụ ihe, nakwa ka ha ghara ịmụta otú ha na ndị ọzọ ga-esi na-emekọrịta ihe.

Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na mgbe ndị nchọpụta nọ n’ụlọ ọgwụ a na-akpọ Children’s Hospital dị n’obodo Seattle, nke dị na Washington, U.S.A., nyochasịrị otú puku ụmụaka abụọ na narị ise si ele tiivi, ha “chọpụtara na tupu ụmụaka ndị nọ n’agbata otu afọ na afọ atọ, bụ́ ndị na-elekarị tiivi, eruo afọ asaa, ọ na-esiri ha ike ige ntị nke ọma mgbe a na-akụziri ha ihe.” Ụmụaka ndị ahụ na-ewekarịkwa iwe ọkụ, ha anaghịkwa enwe ndidi, uche ha anaghị adịtekwa aka n’ihe a na-akụziri ha. Dị ka Dr. Jane M. Healy bụ́ ọkà n’otú ụmụaka si amụta ihe si kwuo, “ọtụtụ ndị nne na nna, bụ́ ndị a chọpụtara na uche ụmụaka ha anaghị adịcha n’ihe a na-akụziri ha, bịara chọpụta na nsogbu a ụmụ ha na-enwe belatara nnọọ mgbe ha kwụsịrị ụmụ ha ile tiivi.”

Gịnị ka ndị nne na nna nwere ike ime iji belata oge ụmụ ha ji ele tiivi? Akwụkwọ akụkọ ahụ tụrụ aro ka ha mee ihe ndị a: Gwa nwa gị mgbe ọ ga-ele tiivi na oge ọ ga-eleru ya n’ụbọchị ọ bụla. Ejila tiivi mere ihe na-elegidere gị nwa. Kama, hụ na nwa gị na-eso gị arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ ruo ókè ọ ga-ekwe ya mee. Họpụta ihe ndị a na-eme na tiivi ị ga-achọ ka nwa gị lee, hụkwa na ị gbanyụrụ tiivi gị ozugbo o lechara ha. Mgbe ọ bụla o kwere mee, sonyere nwa gị mgbe ọ na-ele ihe ndị ahụ ị họpụtaara ya, gị na ya kparịtakwa ihe unu na-ele. N’ikpeazụ, hụ na ị kwụsịlatara otú i si ele tiivi.

Ọ na-ewe oge inyere ụmụaka aka ịmụta iji uche ha na-echepụta otú e si eme ihe na ịmụta otú ha na ndị ọzọ ga-esi na-emekọrịta ihe. Ọ chọkwara ndị nne na nna ikpebisi ike n’ihe ha na-eme, chọọkwa n’aka ha inwe njide onwe onye. Ihe ọma ndị ọ na-arụpụta na-egosi na mgbalị ndị e mere maka ya efughị ọhịa. Otu ilu oge ochie gosiri na nke a bụ eziokwu mgbe ọ sịrị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị; ọbụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị ahapụ ya.” (Ilu 22:6) Otu ụzọ dị oké mkpa e si enye ụmụaka ọzụzụ dị otú ahụ bụ ịkụziri ha ịkpa àgwà dị mma.

Ndịàmà Jehova enweela ihe ịga nke ọma n’ịzụ ụmụ ha n’ihi na ha na-eji akwụkwọ ha bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ akụziri ụmụ ha ịkpa ezi àgwà. N’eziokwu, o doro anya na ndị nne na nna ha na ụmụ ha na-enwe ezigbo mkparịta ụka mgbe ha ka dị obere, na ndị nke na-egosikwa ụmụ ha na ha hụrụ ha n’anya, ga-erite uru dị ukwuu. È nwere ihe ga-eme ndị nne na nna obi ụtọ karịa ịhụ ka ụmụ ha ghọrọ ndị toro eto na-akpa ezi àgwà nakwa ndị a na-akwanyere ùgwù?