Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Njọ Ma Ị Gbanwee Okpukpe Gị?

Ọ̀ Dị Njọ Ma Ị Gbanwee Okpukpe Gị?

Echiche Baịbụl

Ọ̀ Dị Njọ Ma Ị Gbanwee Okpukpe Gị?

Mgbe Avtar malitere ịmụ Baịbụl, iwe wewere ndị ezinụlọ ya bụ́ ndị na-ekpe okpukpe a na-akpọ Sikh. Avtar sịrị: “N’obodo anyị, ị gbanwee okpukpe gị, obodo niile ana-asọzi gị asọ. A na-agụdị anyị aha na-egosi ihe ndị anyị kweere. A na-ewere na onye gbanwere okpukpe ya ajụla ndị ezinụlọ ya ma wetara ha nkọcha.”

AVTAR mechara ghọọ otu onye n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ̀ dị njọ na ọ gbanwere okpukpe ya? Ikekwe, i weere na ihe o mere dị njọ otú ahụ ndị ezinụlọ ya si were ya. I nwere ike iwere na okpukpe unu na-ekpe bụzi ihe e ji mara ndị ezinụlọ unu kemgbe ụwa nakwa na unu ekwesịghị ịgbanwe ya.

Mmadụ ịkwanyere ndị ezinụlọ ya ùgwù dị mkpa. Baịbụl sịrị: “Gee nna nke mụrụ gị ntị.” (Ilu 23:22) Ma ihe ka mkpa bụ ịgbalị ịmata eziokwu banyere Onye kere anyị na ihe ndị bụ́ nzube ya. (Aịzaya 55:6) Ma, ọ̀ ga-ekwe omume ịmata eziokwu banyere Onye kere anyị? Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, olee otú ịchọta ya si dịruo gị mkpa?

Ịchọta Okpukpe nke Na-akụzi Eziokwu

Ihe okpukpe ndị dị n’ụwa na-akụzi dịgasị iche. Ọ dịghịkwanụ otú ihe ha niile na-akụzi ga-esi bụrụ eziokwu. N’ihi ya, a ga-enwerịrị ọtụtụ ndị mmadụ, bụ́ ndị Baịbụl kwuru na ha, “na-anụ ọkụ n’obi n’ijere Chineke ozi; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.” (Ndị Rom 10:2) Ma, dị ka e dekọrọ na 1 Timoti 2:4, Pọl onyeozi kwuru na ọ bụ uche Chineke ka ‘ụdị mmadụ niile, nweta ezi ihe ọmụma nke eziokwu.’ Olee otú ha ga-esi chọta ezi ihe ọmụma dị otú ahụ?

Ka anyị tụlee ihe ndị mere o ji dị mkpa inyocha Baịbụl. Pọl, onye so ná ndị ji ike mmụọ nsọ dee Baịbụl kwuru, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe.” (2 Timoti 3:16) Dị ka otu ụzọ i si na-achọ eziokwu, gbalịa mee nnyocha iji chọpụta ma ihe ahụ e kwuru na Baịbụl ọ̀ bụkwa eziokwu. Jiri aka gị chọpụta amamihe na-enweghị atụ dị na ya, otú o si kọọ akụkọ ndị mere eme na amụma ndị mezuru emezu e buru na ya.

Kama ikwu na Chineke na-anabata okpukpe niile, Baịbụl na-agwa ndị na-agụ ya ka ha ghara ikwere ihe niile ha nụrụ, kama ka ha ‘nwalee okwu si n’aka mmụọ, ka ha wee chọpụta ma ò si n’aka Chineke.’ (1 Jọn 4:1) Dị ka ihe atụ, ozizi ọ bụla si n’aka Chineke n’ezie kwesịrị ikwekọ n’àgwà ndị e ji mara Chineke, nke ịhụnanya bụ nke kachanụ.—1 Jọn 4:8.

Baịbụl na-agwa anyị na Chineke chọrọ ka anyị “chọta ya n’ezie.” (Ọrụ 17:26, 27) Ebe ọ bụ na Onye kere anyị chọrọ ka anyị chọta eziokwu ahụ, ọ gaghị adị njọ ma anyị mee ihe kwekọrọ n’ihe ahụ anyị chọtara—ọ sọgodị ya ya bụrụ na nke a ga-eme ka anyị gbanwee okpukpe anyị. Ma, oleekwanụ maka nsogbu ndị nke a nwere ike ịkpata?

Irubere Ndị Ezinụlọ Gị Isi na Irubere Chineke Isi

Ọ bụrụ na mmadụ ekpebie ịgbanwe okpukpe ya, o nwere ike ikpebi na ya agaghị na-esozi na-eme omenala ma ọ bụ ememme okpukpe ụfọdụ ọ na-esobu eme. O kwere nghọta na nke a nwere ike ịkpasu ụfọdụ ndị n’ezinụlọ onye ahụ iwe. Jizọs matara na nke a nwere ike ime. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “M bịara ịkpata nkewa, nwoke megide nna ya, na nwa nwaanyị megide nne ya, nakwa nwaanyị a lụrụ ọhụrụ megide nne di ya.” (Matiu 10:35) Ihe ahụ Jizọs kwuru ọ̀ pụtara na ihe Baịbụl na-akụzi ga-akpatarịrị esemokwu. Mba. Naanị ihe o mere bụ ikwu ihe nwere ike ime mgbe ndị ezinụlọ mmadụ megidewere onye ahụ n’ihi na o kweere ihe dị iche n’ihe ha kweere.

Mmadụ ò kwesịrị ịhụ na ọ dịghị ihe ọ bụla ga-akpatara ya na ndị ezinụlọ ya esemokwu, ihe ọ sọkwara ya ya bụrụ? Baịbụl kwuru na ụmụaka kwesịrị irubere ndị mụrụ ha isi nakwa na ndị nwunye kwesịrị ido onwe ha n’okpuru di ha. (Ndị Efesọs 5:22; 6:1) Ma, ọ gwakwara ndị hụrụ Chineke n’anya ka ha ‘rubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.’ (Ọrụ 5:29) N’ihi ya, n’oge ụfọdụ, iji rubere Chineke isi, o nwere ike ịdị mkpa ka i mee mkpebi dị iche na nke ụfọdụ ndị ezinụlọ unu mere.

Ọ bụ eziokwu na Baịbụl mere ka ihe bụ́ eziokwu na ozizi ụgha doo anya, Chineke na-enye onye ọ bụla ohere ka ọ họrọ ma ọ̀ ga-anabata eziokwu ahụ ka ọ̀ bụ ụgha. (Diuterọnọmi 30:19, 20) E kwesịghị ịmanye onye ọ bụla ka o fee Chineke otú na-adịghị ya mma n’obi ma ọ bụ gwa onye ahụ na ọ ga-ahọrọ ma ọ̀ ga-efe Chineke otú ọ chọrọ ka ọ̀ ga-achọ ka ya na ndị ezinụlọ ya dịrị ná mma. Mmadụ ịmụ Baịbụl ọ̀ na-ekewa ezinụlọ? Mba. Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl na-agba di na nwunye na-anaghị ekpe otu okpukpe ume ka ha ghara ịgbasa.—1 Ndị Kọrịnt 7:12, 13.

Imeri Ụjọ

I nwere ike na-atụ ụjọ otú ndị obodo gị ga-esi were gị ma gị na Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl. Mariamma sịrị: “Ihe bụ́ ụjọ ndị ezinụlọ anyị bụ na agaghị m achọta ezigbo di ga-elekọta m anya nke ọma. Nke a mere ka ha megidewe m mgbe m malitere ịmụ Baịbụl.” Mariamma tụkwasịrị Jehova Chineke obi ma nọgide na-amụ Baịbụl. (Abụ Ọma 37:3, 4) I nwekwara ike ime otu ihe ahụ. Kama ịtụwa ụjọ ihe a ga-eme gị, cheta uru ndị i ga-erite. Baịbụl na-agbanwe omume na ndụ ndị mmadụ ma mee ka ọ ka mma. Ndị mmadụ na-amụta ịhụ ndị ezinụlọ ha n’anya, na-achọwaghị ọdịmma onwe ha. O nwere ike inyere mmadụ aka ka ọ kwụsị àgwà ọjọọ ndị dị ka ikwu okwu ọjọọ, ịlụ ọgụ, ịṅụbiga mmanya ókè na ịṅụ ọgwụ ike. (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Baịbụl na-enyere mmadụ aka ịmụta àgwà ndị dị ka nrubeisi, ịkwụwa aka ọtọ na ịrụsi ọrụ ike. (Ilu 31:10-31; Ndị Efesọs 4:24, 28) Ọ́ gaghị adị mma ma ị mụọ Baịbụl ma hụ uru ime ihe ndị e kwuru n’ime ya ga-abara gị ná ndụ?

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Gịnị mere o ji dị mma ilebara ihe okpukpe gị na-akụzi anya?—Ilu 23:23; 1 Timoti 2:3, 4.

▪ Olee otú i nwere ike isi mata ozizi nke bụ́ eziokwu?—2 Timoti 3:16; 1 Jọn 4:1.

▪ Ì kwesịrị ịkwụsị ịmụ Baịbụl n’ihi na ndị ezinụlọ gị na-emegide gị?—Ọrụ 5:29.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]

Baịbụl na-agbanwe omume na ndụ ndị mmadụ ma mee ka ọ ka mma

[Foto dị na peeji nke 15]

Mariamma na di ya