Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nne na Nna Na-ekwesị Ntụkwasị Obi ma Na-arụkọ Ọrụ Ọnụ

Ndị Nne na Nna Na-ekwesị Ntụkwasị Obi ma Na-arụkọ Ọrụ Ọnụ

Ndị Nne na Nna Na-ekwesị Ntụkwasị Obi ma Na-arụkọ Ọrụ Ọnụ

▪ Ụdị oyi na-atụ n’otu obodo dị na South Africa enweghị atụ. Mgbe ọ bụla m si n’ọfịs m na-ekpo ọkụ lepụ anya, ana m enwe mmasị ile otú oké ifufe oyi si na-ebugharị otu osisi na-enweghị akwụkwọ. N’otu ebe osisi ahụ wara ngalaba, ahụrụ m nduru kpuchitere ụmụ ya abụọ ka ahụ́ kporo ha ọkụ. A mụrụ ụmụ nduru ahụ n’ụbọchị atọ gara aga.

Tupu ya eyie àkwá mbụ ya, nduru ahụ na nke oké ya so kpaa akwụ́ ya. Nke oké na-aga eweta ahịhịa ndị e ji arụ ya, ebe nke nne na-akpa akwụ́ ahụ. Akwụ́ ha kpara siri ezigbo ike n’ihi na oké ifufe oyi na-efenụ emebilighị ya, ọ bụkwa n’akwụ́ ahụ ka nke nne yiri àkwá abụọ. Nke oké na-ekpu àkwá ndị ahụ n’ụtụtụ na n’ehihie, ebe nke nne na-ekpu ha n’abalị. Mgbe ihe dị ka izu abụọ gachara, ọ bụrụ àkwá ndị ahụ. Mgbe ọ na-erula izu abụọ ọzọ ma ọ bụ karịa, ụmụ ya ahụ ga-ebu ibu, gbasiekwa ike ifegharị efegharị.

Gee ntị! Ị̀ na-anụ ọmarịcha ube na-ada ka ebe mmadụ na-achị ọchị obere obere? Ọ bụ nke nne bere ube ahụ iji mee ka nke oké mara na ya abatala, ka o nwee ike pụọ n’akwụ́ ahụ. O bu nri ọ chọrọ inye ụmụ ya n’akpa nri na-adị ya n’akpịrị fekwasị n’alaka osisi dị nso. Ụmụ ha mechagodị mụta ifegharị, nke oké na nke nne ka ga na-achọtara ha nri ruo mgbe ha mụtara ịkpara onwe ha nri.

Ọ na-atụkarị m n’anya otú ụmụ nnụnụ ndị a si arụkọ ọrụ ọnụ na otú ha si elekọta ụmụ ha. Ụmụ nduru ọ bụla a mụrụ too, ha emewe otú ahụ ndị mụrụ ha si eme. Ihe ndị a na-echetara anyị ihe e kwuru n’Abụ Ọma 86:8, sị: “Ọ dịghị onye dị ka gị . . . , Jehova, ọ dịghịkwa ọrụ yiri ọrụ gị.”

N’Okwu Chineke e dere ede bụ́ Baịbụl Nsọ, Jehova Chineke nyere ndị nne na nna ntụziaka ndị ga-enyere ha aka ịzụ ụmụ ha otú ahụ o si nye nduru amamihe o ji azụ ụmụ ya. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara ndị nne ka ha “hụ ụmụ ha n’anya.” (Taịtọs 2:4) Ọ gwakwara ndị nna, sị: “Unu emela ụmụ unu ihe iwe, kama na-azụlitenụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4; 1 Timoti 5:8) O doro anya na Chineke ji ndị nne na nna na-eme otú ahụ kpọrọ oké ihe.