Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Akwụsị Iwe Iwe Ọkụ?

Olee Otú M Ga-esi Akwụsị Iwe Iwe Ọkụ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Olee Otú M Ga-esi Akwụsị Iwe Iwe Ọkụ?

Ugboro ole ka ị na-ewe iwe ọkụ?

□ O nwetụbeghị

□ Kwa ọnwa

□ Kwa izu

□ Kwa ụbọchị

Ònye ga-akacha eme gị ka i wee iwe ọkụ?

□ O nweghị

□ Ụmụ akwụkwọ ibe m

□ Ndị mụrụ m

□ Ụmụnne m

□ Ndị ọzọ

N’okpuru ebe a, kọwaa otu ihe na-emekarị gị ka i wee iwe ọkụ.

□ ․․․․․

Ọ BỤRỤ na ị kanyere ✔ na “O nwetụbeghị” nakwa “O nweghị” ma ghara ide ihe ọ bụla na nke ikpeazụ, jide ka i ji—ị bụghị onye iwe ọkụ!

Ma, ihe otu onye na-eme ma e mejọọ ya dị iche n’ihe ibe ya na-eme, onye ọ bụla nwekwara ebe ọ na-adịghị emetecha. Jems, onye so dee Baịbụl, sịrị: “Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) N’eziokwu, otú i si ewe iwe nwere ike ịdị ka otú Nneka, onye dị afọ iri na asaa, si ewe iwe. * Ọ sịrị: “Iwe na-ejukarị m obi, e nwehaala onye kpasuru m iwe, ọ bụzi onye ahụ ka m ga-awụsa ya n’ahụ́. O nwere ike bụrụ mama m, papa m, nwanne m nwaanyị, ma ọ bụdị nkịta m!”

Ịmara nke Bụ́ Eziokwu na nke Bụ́ Ụgha

Ọ̀ na-esiri gị ike ijide onwe gị ma a kpasuo gị iwe? Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike, e nwere ihe ga-enyere gị aka. Ma, ka anyị bugodị ụzọ leba anya n’ihe ụfọdụ na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu.

Ụgha: “Agaghị m akwụsịli iwe iwe ọkụ n’ihi na ezinụlọ anyị bụ ndị iwe ọkụ!”

Eziokwu: I nwere ike bụrụ onye “na-ewekarị oké iwe”—ikekwe ị mụtara ya n’aka ndị ezinụlọ unu, ndị agbata obi unu, ma ọ bụkwanụ enwee ihe ọzọ kpatara ya. Ma ihe ị ga-eme oké iwe ahụ dị gị n’aka. (Ilu 29:22) Ajụjụ dị mkpa ka ị jụọ onwe gị bụ, Olee nke m ga-achọ ka o mee mgbe iwe jidere m? Ọ̀ bụ ikwe ka iwe ahụ chịwa m ka ọ̀ bụ ka m chịwa ya? O nweela ndị mụtara ijide onwe ha mgbe a kpasuru ha iwe, gịnwa ga-emelikwa ya!—Ndị Kọlọsi 3:8-10.

Ihe Baịbụl Kwuru: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.”—Ndị Efesọs 4:31.

Ụgha: “Ọ bụrụ na iwe ejide m, ọ ka mma iwe ya ka ọ pụọ m n’obi karịa iburu ya n’obi.”

Eziokwu: Ma ibu iwe n’obi ma iwewe iwe ọkụ enweghị nke ga-adị gị mma n’ahụ́. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere oge maka ‘ikwupụta’ nchegbu gị. (Job 10:1) Ma nke ahụ apụtaghị na ị ga-adị ka bolombolo a fụjuru afuju, nke na-achọ ihe ga-emetụ ya ka ọ gbawaa. I nwere ike ịmụta ikwu otú ihe si wuteruo gị n’ekwughị ya n’iwe.

Ihe Baịbụl kwuru: “Ohu nke Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị ịbụ onye na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ, . . . onye na-ejide onwe ya mgbe ọnọdụ dị njọ.”—2 Timoti 2:24.

Ụgha: “Ọ bụrụ na m ‘na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ,’ ndị mmadụ ga na-afanye m n’akpa.”

Eziokwu: Ndị mmadụ maara na mmadụ ijide onwe ya ka ọ ghara igosi na iwe ji ya adịghị mfe, ha ga-akwanyekwara gị ùgwù ma ọ bụrụ na ị na-ejide onwe gị.

Ihe Baịbụl kwuru: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.”—Ndị Rom 12:18.

Mụta Ijide Onwe Gị

Ọ bụrụ na obere ihe na-akpasu gị iwe, o nwere ike ihe ị na-ekwukarị bụ na ọ bụ ndị ọzọ na-eme ka i wewe iwe ọkụ. Dị ka ihe atụ, ọ̀ dịtụla mgbe ị sịrị, “Nwaanyị ahụ kpasuru m iwe” ma ọ bụ “Nwoke ahụ mere ezigbo iwe ji bịa m”? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe ndị a ị na-ekwu gosiri na ọ bụ ndị ọzọ na-atụrụ gị ihe ị na-eme. Olee otú ị ga-esi nwee ike mụta ijide onwe gị? Gbalịa mee ihe ndị a na-esonụ.

Kweta na o si gị n’aka. Ebe ị ga-ebidogodị bụ ikweta na ọ bụ gị—naanị gị—nwere ike “ime” ka iwe wee gị. N’ihi ya, kwụsị ịchọ onye ị ga-asị na ọ bụ ya mere i ji ewe iwe ọkụ. Kama ịsị, “Nwaanyị ahụ kpasuru m iwe,” gwa onwe gị, sị, ‘Ọ bụ m kwetara ka iwe bịa m.’ Kama ịsị, “Nwoke ahụ mere ezigbo iwe ji bịa m,” gwa onwe gị, sị, ‘Ọ bụ m họọrọ iwefe iwe ókè.’ Ozugbo i kwetawara na iwe ọkụ ị na-ewe si gị n’aka, ọ ga-adịrị gị mfe ịgbanwe.—Ndị Galeshia 6:5.

Chọpụta ihe nwere ike ịkpasu gị iwe. Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.” (Ilu 22:3) Ihe ga-enyere gị aka bụ ịchọpụta ihe ndị nwere ike ịkpasu gị iwe. Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee mgbe m na-aka ewe iwe ọkụ?’ Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Megan, kwuru, sị: “M na-arụ ọrụ abalị, mgbe ọ bụla m gbasakwara ọrụ, ezigbo ike na-agwụ m. Ọ bụ mgbe ahụ ka obere ihe ọ bụla nwere ike ịkpasu m iwe.”

Ajụjụ: Olee oge ndị ọ na-adịkarịrị gị mfe iwe iwe ọkụ?

․․․․․

Kwadebe otú ka mma ị ga-esi gwa mmadụ na o mere gị ihe iwe. Ọ bụrụ na mmadụ emee ihe were gị iwe, kutuo ume, wetuo olu gị ma jiri nwayọọ kwuo okwu. Kama ịkpọwa onye ahụ iyi, (“Onye ohi! I weere uwe oyi m n’agwaghị m agwa!”) gbalịa kọwaara onye ahụ otú ihe ahụ o mere si wute gị. (“O were m iwe mgbe m chọrọ iyi uwe oyi m ma chọpụta na i yiiri ya pụọ n’agwaghị m agwa.”)

Mee ihe a: Chetagodi otu ihe mere na nso nso a nke mere ka i wee iwe ọkụ.

1. Gịnị kpasuru gị iwe?

․․․․․

2. Gịnị ka i mere? (Gịnị ka i kwuru?)

․․․․․

3. Olee ihe i chere gaara aka mma ime?

․․․․․

Chebara ihe iwe ọkụ nwere ike ịkpata echiche. E nwere ọtụtụ ihe ndị e kwuru na Baịbụl nwere ike inyere gị aka ime nke a. Dị ka ihe atụ:

Ilu 12:18: “E nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ.” Okwu ọnụ nwere ike ịfụ ụfụ n’ahụ́, ọ bụrụ na i kwuo okwu mgbe ezigbo iwe ji gị, o doro anya na ị ga-ekwu ihe ị ga-emecha kwaa mmakwaara.

Ilu 29:11: “Onye nzuzu adịghị ejide mmụọ ya ma ọlị, ma onye maara ihe na-ejideru ya n’isi.” I kwuchaa okwu n’iwe, ọ ga-abịa dị gị ka ị̀ dara iberibe.

Ilu 14:30: “Obi dị jụụ bụ ndụ anụ ahụ́, ma ekworo bụ ure ọkpụkpụ.” Iwe ọkụ nwere nnọọ ike ịkpatara gị ọrịa! Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Anita sịrị: “Ọtụtụ ndị n’ezinụlọ anyị na-arịa ọbara mgbali elu, ebe ọ bụkwa na obi na-amapụkarị m, m na-agbalị ka m ghara ịna-ewekarị iwe.”

Gịnị ka nke a na-akụziri gị? Chegodị echiche nsogbu okwu ọnụ gị na ihe ndị i mere nwere ike ịkpata. Ifeọma, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ, sịrị: “Ihe m na-ajụ onwe m bụ, ‘Ọ bụrụ na m kwe ka onye a kpasuo m iwe, olee otú ọ ga-esi na-ele m anya? Ànyị ka ga-adịkwa ná mma? Olee otú ọ ga-adị m ma mmadụ mee m otú ahụ?’” I nwekwara ike ịjụ onwe gị ụdị ajụjụ ndị a tupu ị gwa mmadụ okwu ọjọọ ma ọ bụ zigara ya ozi—ma ọ̀ bụ n’akwụkwọ ozi, n’ekwe ntị ma ọ̀ bụ n’ozi e-mail.

Ajụjụ: Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na mmadụ akpasuo gị iwe, gị ezigara ya ozi gosiri na iwe ji gị?

․․․․․

Chọọ enyemaka. Ilu 27:17 na-ekwu, sị: “Mkparịta ụka enyi na enyi na-akpali mmụta, dị ka e si nwee ike jiri otu igwe kụpịa igwe ọzọ.” (Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ọ ga-adị mma ma ị jụọ mama gị ma ọ bụ papa gị ma ọ bụkwanụ otu enyi gị toro eto otú o si ejide onwe ya ma a kpasuo ya iwe.

Na-atụle ọganihu ị na-enwe. Nwee otu akwụkwọ ebe ị na-edetu oge ndị i were iwe ọkụ na oge ndị i jidere onwe gị. Mgbe ọ bụla i were iwe ọkụ, detuo (1) ihe merenụ, (2) ihe i mere oge ahụ, na (3) ihe gaara aka mma ime. Ka oge na-aga, ị ga-achọpụta na ihe ahụ gaara aka mma ime ga-abụzi ihe mbụ ị na-eme ma a kpasuo gị iwe!

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

Mgbe ụfọdụ, ndị anyị chere na ha agaghị ewetụdị iwe ọkụ enweela mgbe ha were iwe ọkụ. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ ndị a?

▪ Mozis.—Ọnụ Ọgụgụ 20:1-12; Abụ Ọma 106:32, 33.

▪ Pọl na Banabas.—Ọrụ 15:36-40.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 20]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Idetu ihe niile na-ewe m iwe n’akwụkwọ—ma ọ bụ ịkọrọ ya mama m—na-enyere m aka ijide onwe m.”—Alexis, o si mba United States.

“Ọ bụrụ na iwe eju m obi, ana m apụ, gagharịa ka isi jụọ m oyi nakwa ka obi m dajụọ.”—Elizabeth, o si mba Ireland.

“O nwee ihe kpasuru m iwe, ihe m na-adị eche n’obi m bụ, ‘M bido bawa mba ugbu a, gịnị emee?’ M na-achọpụtakarị na ịbawa mba enweghị uru ọ na-aba!”—Graeme, o si mba Australia.

[Foto dị na peeji nke 20]

Ị̀ MAARA?

Chineke n’onwe ya na-ewe iwe mgbe ụfọdụ. Ma iwe ya na-enwerịrị ezigbo ihe kpatara ya, ọ na-ejidekwa onwe ya mgbe niile. O mekataghị wefee iwe ókè!—Gụọ Ọpụpụ 34:6; Diuterọnọmi 32:4; na Aịzaya 48:9.

[Foto dị na peeji nke 21]

Ọ bụ gị ga-ekpebi ma iwe gị ọ̀ ga-agbọnyụ ọkụ