Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Uru Ọ Bara Igosi Ndị Ọzọ na Anyị Hụrụ Ha n’Anya

Uru Ọ Bara Igosi Ndị Ọzọ na Anyị Hụrụ Ha n’Anya

Uru Ọ Bara Igosi Ndị Ọzọ na Anyị Hụrụ Ha n’Anya

MGBE otu nwaanyị nke mụrụ ejima n’ime mbụ ya jụrụ otu prọfesọ n’ihe banyere ilekọta ụmụaka otú ka mma ọ ga-esi na-elekọta ụmụ ahụ, ihe prọfesọ ahụ gwara ya bụ: “Na-amakụ ha mgbe niile!” Prọfesọ ahụ kwukwara, sị: “E nwere ọtụtụ ụzọ i kwesịrị isi gosi ha na ị hụrụ ha n’anya. Ụfọdụ n’ime ha bụ ịmakụ ha, isusu ha ọnụ, ịgwa ha na ị hụrụ ha n’anya, igosi ha na ị na-aghọta otú obi dị ha, ime ha obi ụtọ, inye ha ihe, ịgbaghara ha, nakwa ịbara ha mba mgbe ọ dị mkpa. Anyị ekwesịghị iche na ụmụ anyị maara na anyị hụrụ ha n’anya.”

Tifani Fild, onyeisi ụlọ akwụkwọ a kpọrọ Touch Research Institute, nke dị na Mahadum Miami, Flọrịda, U.S.A. kwuru ihe gosiri na o kwetara n’ihe ahụ prọfesọ ahụ kwuru. Ọ sịrị: “Otú ahụ iri nri na imega ahụ́ si dị mkpa, otú ahụkwa ka imetụ ụmụaka aka si dị ezigbo mkpa iji nyere ha aka ka ha too nakwa ka ahụ́ dị ha mma.”

Oleekwanụ maka ndị torola eto? Ọ̀ dị mma ịmakụ ha ma ọ bụ metụ ha aka iji gosi ha na a hụrụ ha n’anya? Ee. Ná nnyocha Klọd Staịna, bụ́ ọkà n’akparamàgwà mmadụ, mere, ọ chọpụtara na afọ ole ọ sọkwara mmadụ dịrị, ịgwa onye ahụ na a hụrụ ya n’anya na imetụ ya aka ma ọ bụ ịmakụ ya dị mkpa. Lọra, bụ́ onye nọọsụ na-elekọta ọtụtụ ndị agadi, kwuru, sị: “Achọpụtala m na igosi ndị agadi na a hụrụ ha n’anya na-enyere ha aka ka ahụ́ dị ha mma karịa. Ọ bụrụ na i gosi ndị agadi obiọma ma na-ejide ha aka, ha ga-abịa tụkwasị gị obi, jirikwa obi ha na-eme ihe ọ bụla ị gwara ha mee. Ihe ọzọkwa bụ na imere ha ihe ndị ahụ ga-egosi na ị na-akwanyere ha ùgwù.”

Onye na-egosi ndị ọzọ na ya hụrụ ha n’anya na-eritekwa uru otú ahụ ndị ọ na-egosi ịhụnanya na-erite. Dị nnọọ ka Jizọs Kraịst kwuru, “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ndị nọ ná nchegbu, ndị dara mbà n’obi ma ọ bụ ndị obi na-erughị ala na-akacha erite uru ma e gosi ha na a hụrụ ha n’anya. Na Baịbụl, a kọrọ otú e si gosi ọtụtụ ndị na a hụrụ ha n’anya.

Chegodị otú obi ga-adị otu “nwoke nke ekpenta zuru ahụ́,” bụ́ onye a na-asọ asọ n’obodo, mgbe onye dị ka Jizọs Kraịst matịrị aka metụ ya!—Luk 5:12, 13; Matiu 8:1-3.

Chegodị otú obi si sikwuo Daniel onye amụma, onye merela agadi, ike mgbe mmụọ ozi Chineke gwara ya okwu kasiri ya obi ma metụ ya aka ugboro atọ. Aka ahụ e metụrụ Daniel na okwu agbamume ndị ahụ a gwara ya bụ nnọọ ihe ọ chọrọ n’oge ahụ iji nwetakwuo ike.—Daniel 10:9-11, 15, 16, 18, 19.

E nwere oge ndị enyi Pọl onyeozi si Efesọs gaa ije ihe dị ka iri kilomita ise iji bịaruo Maịlitọs hụ ya. Mgbe ha rutere, Pọl gwara ha na o nwere ike ha agaghị ahụ ya ọzọ. Cheekwa otú obi ga-adị Pọl mgbe ezigbo ndị enyi ya ndị a ‘makụrụ ya, susuokwa ya ọnụ’!—Ọrụ 20:36, 37, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

N’ihi ya, ma Baịbụl ma sayensị gosichara na ọ dị mkpa ka anyị na-egosi ibe anyị na anyị hụrụ ha n’anya. Imere ndị ọzọ ihe a dị ha mkpa na-eme ka ahụ́ dị ha mma, meekwa ka obi na-eru ha ala. O doro anya na ọ bụghị naanị ụmụaka ka ọ dị mma ka e gosi ha na a hụrụ ha n’anya.