Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inwe Mmekọahụ Ọ̀ Ga-eme Ka Anyị Dịkwuo Ná Mma?

Inwe Mmekọahụ Ọ̀ Ga-eme Ka Anyị Dịkwuo Ná Mma?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Inwe Mmekọahụ Ọ̀ Ga-eme Ka Anyị Dịkwuo Ná Mma?

Mgbe Sera na Devid kpara naanị ọnwa abụọ, ọ dị Sera ka ò ruola ọtụtụ afọ ha kpawara. Ha na-eji ekwe ntị ha ezigara ibe ha ozi ọtụtụ ugboro, ha na-anọkwa ọtụtụ awa ma ha kwurịtawa okwu n’ekwe ntị. Otu onye kwuwe okwu, onye nke ọzọ na-amadị ihe ọ chọrọ ikwu! Ma n’otu abalị ha nọ n’ụgbọala a dọwara n’otu ebe, ihe Devid chọrọ abụghị naanị ịkparịta ụka.

N’ime ọnwa abụọ a Devid na Sera kpawara, naanị ihe ha na-eme bụ ijide ibe ha aka na isusutụ ọnụ. Sera achọghị ka ọ gafee otú ahụ. Ma ọ chọghị ihe ga-eme ka ya na Devid gbasaa. E nweghị nwa okorobịa ọzọ na-eme ya obi ụtọ otú Devid si eme ya. Ihe Sera gwaziri onwe ya bụ: ‘A sịdị ka e kwuwe, Devid hụrụ m n’anya, mụnwa ahụkwa ya n’anya.’

ONWERE ike obi gị agwala gị ihe ga-emecha mee n’akụkọ a. Ma o nwere ike obi gị agaghị agwa gị ụdị nsogbu Devid na Sera ga-enwe ma ọ bụrụ na ha enwee mmekọahụ. Chegodị ihe a:

Ọ bụrụ na mmadụ emebie iwu na-achị ihe e kere eke, dị ka iwu ike ndọda, onye ahụ ga-ata ahụhụ ya. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ga-eme ma mmadụ mebie iwu Chineke nyere banyere omume, dị ka iwu ahụ sịrị: “Zere ịkwa iko.” * (1 Ndị Tesalonaịka 4:3) Gịnị ga-eme onye dara iwu ahụ? Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.” (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? N’okpuru ebe a, lee ma ị̀ ga-edetuli nsogbu atọ nwoke na nwaanyị nwere ike inwe ma ha nwee mmekọahụ tupu ha alụọ.

1. ․․․․․

2. ․․․․․

3. ․․․․․

Leruo anya n’ihe ahụ i dere. Ì dere ihe ndị dị ka ọrịa a na-ebute ná mmekọahụ, ime mkpuke ma ọ bụ ịkpasu Chineke iwe? Ihe ndị ahụ so ná nnukwu nsogbu mmadụ nwere ike inwe ma onye ahụ mebie iwu Chineke nyere gbasara ịkwa iko.

Ma ị ka nwere ike iche sị, ‘O nweghị ihe ga-eme m.’ Ọ̀ bụ na mmadụ niile anaghị enwe mmekọahụ? Ụmụ akwụkwọ ibe gị na-ejikarịkwa inwe mmekọahụ etu ọnụ, o yikwara ka o nweghị ihe na-eme ha. O nwekwara ike ị na-eche na inwe mmekọahụ ga-eme ka gị na onye gị na ya na-akpa dịkwuo ná mma otú ahụ Sera, onye anyị kọrọ akụkọ ya ná mmalite, chere. A sịdị ka e kwuwe, ò nwere onye chọrọ ka a na-akọ ya ọnụ na ọ ka bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwa okorobịa na-amaghị nwaanyị? Ọ́ kaghị mma inwe mmekọahụ?

Ejila ọsọ ekpebi ya otú ahụ! Nke mbụ, ọ bụghị mmadụ niile na-eme ya. N’eziokwu, o nwere ike e nweela akwụkwọ ị gụrụ kwuru na ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwe mmekọahụ. Dị ka ihe atụ, otu nnyocha e ji ndị na-eto eto nọ ná mba Amerịka mee gosiri na n’ime ndị na-eto eto atọ ọ bụla, abụọ enwewela mmekọahụ tupu ha e si n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị pụta. Nke ahụ pụtakwara na otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla anaghị eme ya—nke gosikwara na e nwere ọtụtụ ndị na-anaghị eme ya. Oleekwanụ maka ndị ahụ na-eme ya? Ndị na-eme nnyocha achọpụtala na ọtụtụ ndị na-eto eto nwerela mmekọahụ na-emecha nwee otu n’ime nsogbu ndị a na-esonụ ma ọ bụ karịa.

Nsogbu nke Mbụ: OBI ERUGHỊ ALA. Ọtụtụ ndị na-eto eto, ndị nwere mmekọahụ, kwuru na ha kwara mmakwaara mgbe ha mechara ya.

Nsogbu nke Abụọ: INYO IBE HA ENYO. Nwoke na nwaanyị na-akpanụ nwehaala mmekọahụ, ihe onye ọ bụla n’ime ha ga-echewe bụ, ‘Ònye makwanụ onye ọzọ ya na ya nwerela mmekọahụ?’

Nsogbu nke Atọ: HA ABỤỌ ITISA. Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị na-akpa, ha nwee mmekọahụ, nke nwoke na-ahapụkarị nke nwaanyị chọrọ nwa agbọghọ ọzọ.

Nsogbu nke Anọ: ỊKWA MMAKWAARA. Obi anaghị adị nwa agbọghọ mma ma ya na enyi ya nwoke nwee mmekọahụ, n’ihi na ọ na-amasị nwa agbọghọ ọ bụla ka nwa okorobịa ya na ya na-akpa bụrụ onye ga-elekọta ya, ọ bụghị onye ga-emebi ya.

E wezụga ihe ndị a anyị kwurula, chebagodịrị ihe a echiche: Ọtụtụ ụmụ okorobịa ekwuola na o nweghị ihe ga-eme ka ha lụọ nwa agbọghọ ha na ya nwetụrụla mmekọahụ. Gịnị mere ha ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ kaara ha mma ịlụ onye bụ a kwaa a kwụrụ!

Ihe a ha kwuru ò juru gị anya ma ọ bụdị wee gị iwe? Ya bụrụ otú ahụ, ma ị̀ bụ nwa agbọghọ ma ọ bụ nwa okorobịa, buru nke a n’obi: Ihe ndị na-eme ma nwa okorobịa na nwa agbọghọ nwee mmekọahụ mgbe ha na-alụbeghị dị nnọọ iche n’ihe a na-egosi na fim nakwa na tiivi. Ụlọ ọrụ ndị na-emepụta fim na-eme ka ndị na-eto eto chee na mmadụ inwe mmekọahụ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye bụ ezigbo ihe, nakwa na ọ bụ otú e si egosi mmadụ ezigbo ịhụnanya. Ma ekwela ka a ghọgbuo gị! Ndị ga-achọ ịrata gị ka i nwee mmekọahụ na-achọ naanị ọdịmma nke ha. (1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5) A sị ka e kwuwe, onye hụrụ gị n’anya n’eziokwu ọ̀ ga-achọ ka ị banye n’ụdị nsogbu ọ bụla? (Ilu 5:3, 4) Onye bu ọdịmma gị n’obi n’eziokwu ọ̀ ga-achọ ịnwa gị ọnwụnwa ka i mebie adịm ná mma gị na Chineke?—Ndị Hibru 13:4.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na i kweta nwee mmekọahụ mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ị kparịala onwe gị n’ihi na ị tufuola otu ihe dị oké ọnụ ahịa i nwere. (Ndị Rom 1:24) Ka a sịkwa ihe mere obi ji ajọ ọtụtụ ndị na-eto eto nwetụrụla mmekọahụ njọ ma ha mechaa ya, ya adị ha ka hà leziri anya tufuo otu ihe dị oké ọnụ ahịa ha nwere! Ekwela ka ụdị ihe ahụ mee gị. Ọ bụrụ na mmadụ achọọ ịrafu gị ka i nwee mmekọahụ ma sị gị, “Ọ bụrụ na ị hụrụ m n’anya, ị ga-ekwe ka anyị mee ya,” ọnụ sie gị ike ịgwa ya, sị, “Ọ bụrụ na ị hụrụ m n’anya, ị gaghị agwa m ụdị ihe a!”

Buru n’obi na ahụ́ gị dị oké ọnụ ahịa nke na i kwesịghị ikwe ka onye ọ bụla mebie ya. Gosi na i kpebisiri ike irube isi n’iwu ahụ Chineke nyere ka anyị zere ịkwa iko. Ọ bụrụ na i mechaa lụọ di ma ọ bụ nwunye, ị ga-enwezi ike inwe mmekọahụ. Ị ga-enwekwa obi ụtọ ime ya mgbe ahụ n’ihi na ị gaghị na-echegbu onwe gị, na-akwa mmakwaara, ma ọ bụ nwee nsogbu ndị ọzọ ndị ọgbọ gị na-enwekarị maka na ha nwere mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye.—Ilu 7:22, 23; 1 Ndị Kọrịnt 7:3.

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Na Baịbụl, “ịkwa iko” abụghị naanị mgbe mmadụ abụọ na-alụbeghị di na nwunye nwere mmekọahụ, kama, a na-ewere na mmadụ abụọ na-akwa iko ma ọ bụrụ na ha na-amị ma ọ bụ na-emetụ akụkụ ahụ́ ibe ha ji enwe mmekọahụ aka ma ọ bụkwanụ na-esi n’otule enwe mmekọahụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere isiokwu a, gụọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, peeji nke 42-47.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

● Ọ bụ eziokwu na inwe mmekọahụ tupu ị lụọ di ma ọ bụ nwunye nwere ike ịgụ gị, gịnị mere i kwesịghị ime ya?

● Gịnị ka ị ga-eme ma mmadụ gwa gị ka i nwee mmekọahụ?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 13]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Naanị ịsị onye ahụ na ị chọghị agaghị eme ka ọ ghara ịbịa ọzọ. Ọ bụ otú i si gwa ya na ị chọghị. Ọ bụrụ na i mewe ọnụ mmiri mmiri, ọ ga-ama na ọ na-eme gị obi abụọ. Ọnụ kwesịrị isi gị ike!”

“Ọ bụghị onye ọ bụla ị gwara na ị chọghị ga-ahapụ gị aka. O nwedịrị ndị ị ga-agwa na Chineke kpọrọ ụdị omume ahụ asị, ha aka na-enye gị nsogbu. Anụla m ebe ụfọdụ ndị na-etu ọnụ otú ha si ‘gbatuo’ Onye Kraịst. Mgbe ụfọdụ, ọ ga-adị mkpa na ị ga-esi ebe onye ahụ nọ pụọ. O siri ike ime ya, ma i mee ya, ọ na-aba uru.”

“Ebe ị bụ Onye Kraịst, àgwà ọma ndị i nwere ga-eme ka ihe gị na-amasị ọtụtụ ndị ọzọ. N’ihi ya, ọ dị mkpa na ị ga-elezi anya ma gbaara onye ọ bụla chọrọ ịrata gị ka i mee omume rụrụ arụ ọsọ. Jiri àgwà ọma ndị ahụ i nwere kpọrọ ihe. Ekwela ka ha laa n’iyi!”

[Foto]

Diana

James

Joshua

[Igbe dị na peeji nke 14]

MEE KA O JIRI GỊ KPỌRỌ IHE!

Ọ bụrụ na e nwere nwa agbọghọ gị na ya na-akpa, ị̀ hụrụ ya n’anya n’eziokwu? Ya bụrụ na ị hụrụ ya n’anya, gosi ya na . . .

i kpebisiri ike na ị gaghị emebi iwu Chineke

i nwere amamihe, bụ́ nke ga-eme ka unu gbaara ihe ọ bụla ga-etinye unu n’ọnwụnwa ọsọ

ị hụrụ ya n’anya, nke na ị ga-eme ihe ọ bụla ga-abara ya uru

I mee otú ahụ, obi nwere ike ịdị nwa agbọghọ ahụ otú ọ dị nwa agbọghọ Shulem, bụ́ onye sịrị: “Onye m hụrụ n’anya bụ nke m, abụkwa m nke ya.” (Abụ Sọlọmọn 2:16) N’eziokwu, ọ ga-eji gị kpọrọ ihe!

Gụọ Ilu 22:3; 1 Ndị Kọrịnt 6:18; 13:4-8.

[Igbe dị na peeji nke 14]

ARO

Mgbe ọ bụla a bịara n’otú gị na onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị si akpa, otu ihe dị mkpa ka i buru n’uche bụ: Ọ bụrụ na e nwere ihe ị na-agaghị achọ ka ndị mụrụ gị hụ ka unu na-eme ya, i kwesịghị ime ya.

[Foto dị na peeji nke 14]

Mmadụ inwe mmekọahụ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye bụ iji onyinye Chineke nyere ya egwu egwu. Ọ dị ka ebe mmadụ ji foto mara mma e nyere ya mere ihe e ji ehicha ụkwụ tupu a banye n’ime ụlọ