Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Ịtụgharị Ntì nke Ọzọ Pụtara?

Gịnị Ka Ịtụgharị Ntì nke Ọzọ Pụtara?

Echiche Baịbụl

Gịnị Ka Ịtụgharị Ntì nke Ọzọ Pụtara?

N’OZIZI Elu Ugwu a ma ama Jizọs Kraịst ziri, Jizọs sịrị: “Emegwarala onye bụ́ ajọ mmadụ ihe o mere gị; kama onye ọ bụla nke mara gị ụra na ntì aka nri, tụgharịkwaara ya nke ọzọ.”—Matiu 5:39.

Gịnị ka ihe ahụ o kwuru pụtara? Ọ̀ na-agwa Ndị Kraịst ka ha nọrọ na-ele anya shii ma mmadụ chọọ imerụ ha ahụ́ ma ọ bụdị chọọ igbu ha? Ndị Kraịst hà kwesịrị ịgba nnọọ nkịtị mgbe a na-emegbu ha ma hapụ ịga kpesara ndị uwe ojii ma ọ bụ ndị ụlọ ikpe?

Ihe Ihe ahụ Jizọs Kwuru Pụtara

Ka anyị nwee ike ịghọta ihe ihe ahụ Jizọs kwuru pụtara, anyị kwesịrị ibu ụzọ mata ihe ndị ọzọ o kwuru tupu ya ekwuo ihe ahụ, matakwa ndị ọ na-agwa okwu. Jizọs bu ụzọ kwuo ihe ndị na-ege ya ntị gụrụla n’Akwụkwọ Nsọ tupu ya ekwuo ihe ahụ dị na Matiu 5:39. Ọ sịrị: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Anya laara anya, ezé laakwara ezé.’”—Matiu 5:38.

Ihe a Jizọs kwuru na Matiu 5:38 bụ ihe e kwuru n’Ọpụpụ 21:24 nakwa na Levitikọs 24:20. Ọ dị mma ịmara na tupu “anya alaara anya” otú ahụ Iwu Chineke kwuru ka e mee, a na-ebu ụzọ akpọga onye mere ihe ahụ n’ihu ndị nchụàjà na ndị ikpe ka ha kpee onye ahụ ikpe ma chọpụta ihe ndị mere mgbe ihe ahụ mere nakwa ma onye ahụ ọ̀ kpachaara anya mee ya.—Diuterọnọmi 19:15-21.

Ka oge na-aga, ndị Juu bịara na-eji iwu a arụ arụrụla. N’otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl, nke Adam Clarke dere na narị afọ nke iri na itoolu, ọ sịrị: “O yiri ka ndị Juu hà ji iwu a [ya bụ, anya laara anya, ezé laara ezé] mere ihe ndị mmadụ na-agbakwasị ụkwụ eburu ibe ha iwe n’obi, nakwa ihe ha na-agbakwasị ụkwụ eji obi ọjọọ emegwara ihe e mere ha. Onye chọọ imegwara ibe ya ihe o mere ya, ya emefee ya ókè nke na ihe ọ ga-eme onye ahụ ga-akazi nke e mere ya njọ.” Ma, Akwụkwọ Nsọ akwadoghị e mee e megwara.

Ihe ahụ Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu banyere ‘ịtụgharị ntì nke ọzọ’ mere ka a ghọta ihe mere Chineke ji nye ụmụ Izrel Iwu ahụ. Ihe ahụ Jizọs kwuru apụtaghị na a maa ndị na-eso ụzọ ya ụra na ntì aka nri, ihe ha ga-eme bụ ịtụgharị ntì nke ọzọ ka onye ahụ maakwa ha ụra. N’oge e dere Baịbụl, dịkwa ka ọ na-adịkarị taa, onye mara mmadụ ụra anaghị ebu n’obi imerụ onye ahụ ahụ́, kama ọ bụ ịkpasu ya iwe ka ya na ya lụwa ọgụ.

N’ihi ya, o doro anya na ihe Jizọs bu n’obi bụ na ọ bụrụ na a gwa mmadụ okwu ọjọọ ma ọ bụ maa ya ụra iji kpasuo ya iwe ka ọ lụwa ọgụ, onye ahụ a mara ụra ekwesịghị imegwara. Kama imegwara, o kwesịrị ịgbalị ijide onwe ya ka ọ ghara iji ihe ọjọọ kwụghachi ihe ọjọọ.—Ndị Rom 12:17.

Ihe ahụ Jizọs kwuru yiri nnọọ ihe Eze Sọlọmọn kwuru. Sọlọmọn sịrị: “Asịla: ‘Dị nnọọ ka o mere m, otú ahụ ka m ga-eme ya. M ga-akwụ onye ọ bụla ụgwọ dị ka ihe ọ na-eme si dị.’” (Ilu 24:29) Onye Kraịst ga-atụgharị ntì nke ọzọ n’ụdị na ọ gaghị ekwe ka ndị ọzọ rata ya ka ọ ‘lụwa ọgụ.’—2 Timoti 2:24.

Oleekwanụ Maka Mmadụ Ichebe Onwe Ya?

Onye Kraịst ịtụgharị ntì nke ọzọ apụtaghị na ọ gaghị echebe onwe ya ma e nwee onye chọrọ imerụ ya ahụ́. Jizọs anaghị ekwu na anyị ekwesịtụghị ime ihe ọ bụla iji chebe onwe anyị, kama, ihe ọ na-ekwu bụ na anyị ekwesịtụghị ibu ụzọ kụọ mmadụ ihe, nakwa na anyị ekwesịghị ikwe ka iwe a kpasuru anyị mee ka anyị megwara mmadụ ihe o mere anyị. Ọ bụ eziokwu na ọ dị mma isi n’ebe onye na-achọ anyị okwu nọ pụọ, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ka anyị na ya ghara ịlụ ọgụ, ọ dịkwa mma ime ihe ụfọdụ iji chebe onwe anyị nakwa ịga kpesara ndị uwe ojii ma ọ bụrụ na e nweela ihe onye ahụ mere anyị.

Ọ bụ ụdị ihe ahụ ka ndị mbụ soro ụzọ Jizọs mere mgbe a na-ekweghị ha kwusaa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi ji iwu obodo mee ka a ghara ịnapụ ya ikike ikwusa ozi ọma, bụ́ ọrụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ịrụ. (Matiu 28:19, 20) Mgbe Pọl na Saịlas, bụ́ onye ya na ya so ekwusa ozi ọma, nọ na-ekwusa ozi ọma n’obodo Filipaị, ndị ọchịchị jidere ha ma kwuo na ha dara iwu obodo.

A pịaziri ha abụọ ụtarị n’ihu ọha, tụbakwa ha n’ụlọ mkpọrọ n’ekweghịdị ha kwuo ọnụ ha. Mgbe ohere dapụtara ka Pọl kwuo okwu, o kwuru na ya bụ nwa amaala Rom. Mgbe ndị ahụ tụrụ Pọl mkpọrọ nụrụ na ọ bụ nwa amaala Rom, ụjọ jidere ha n’ihi na ha ghọtara ihe nwere ike ime, ha rịọziri Pọl na Saịlas ka ha jiri nwayọọ pụọ n’obodo ahụ. Pọl si otú a gosi anyị na e nwere ike ‘ịkwado ozi ọma na iji iwu mee ka o guzosie ike.’—Ọrụ 16:19-24, 35-40; Ndị Filipaị 1:7.

N’ihi nsogbu a na-enye Ndịàmà Jehova, ha agaala ụlọikpe ugboro ugboro, otú Pọl gara, ka e nwee ike kwe ka ha nọgide na-ekwusa ozi ọma. Ha agaadịla ụlọ ikpe iji nweta ikike a ma ná mba ndị iwu ha kwuru na ụmụ amaala ha niile nweere onwe ha ikpe okpukpe masịrị ha. A bịakwa n’okwu banyere ịnara Ndịàmà Jehova ihe ha ma ọ bụ imerụ ha ahụ́, e kwesịghị ịtụ anya ka ha tụgharịa ntì nke ọzọ, ya bụ, ikwere ka e mee ha ihe ọjọọ ma ghara ichebe onwe ha. Ha na-ekpesara ndị uwe ojii ma ọ bụ ndị ụlọ ikpe.

Ebe ọ bụ na Ndịàmà Jehova bụ Ndị Kraịst, ha na-eme ihe ọ bụla ha kwesịrị ime iji nweta ihe ndị ruuru ha, n’agbanyeghị na ha ma na ọ bụghị mgbe niile ka ịga ụlọ ikpe na-eme ka ha nweta ihe ha chọrọ. N’ihi ya, ha na-eme ka Jizọs, hapụ okwu niile n’aka Chineke, obi esiekwa ha ike na Chineke maara ihe niile na-emenụ nakwa na ọ ga-eme ihe banyere ya ma kwụọ onye ọ bụla ụgwọ ọrụ kwesịịrị ya. (Matiu 26:51-53; Jud 9) Ezigbo Ndị Kraịst na-echeta na ọ bụ Jehova nwe ịbọ ọbọ.—Ndị Rom 12:17-19.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Olee ihe Ndị Kraịst na-ekwesịghị ime?—Ndị Rom 12:17.

● Baịbụl ọ̀ machibidoro mmadụ iwu ịga kpesara ndị uwe ojii ma ọ bụ ịga ụlọ ikpe iji chebe onwe ya?—Ndị Filipaị 1:7.

● Olee ihe obi siri Jizọs ike na Nna ya ga-eme?—Matiu 26:51-53.