Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Akasiela M Obi ná Nsogbu M Niile

Chineke Akasiela M Obi ná Nsogbu M Niile

Chineke Akasiela M Obi ná Nsogbu M Niile

Dị ka Victoria Colloy si kọọ

Otu dọkịta gwara mama m, sị: “O nweghịzi ihe ọzọ anyị ga-emere nwa gị nwaanyị. Ọ ga-enwe ihe ọ ga-eji na-ekegide ụkwụ ya ná ndụ ya niile, ọ ga na-ejikwa osisi ndị gbajiri ụkwụ ji aga ije na-aga ije.” Ihe a dọkịta ahụ kwuru mere ka ike ụwa gwụ m! Ò nwere ihe m ga-emeli ná ndụ ma ọ bụrụ na anaghị m aga ije?

A MỤRỤ m na Nọvemba 17, 1949, n’obodo Tapachula, Chiapas, dị na mba Meksiko. Agbasiri m ike mgbe a mụrụ m ọhụrụ, m na-achịkarịkwa ọchị. Abụ m nwa mbụ n’ime ụmụ anọ ndị mụrụ m mụrụ. Ma mgbe m dị ọnwa isii, akwụsịrị m igbe igbe, anaghịkwa m emegharị ụkwụ m otú kwesịrịnụ. Ka ọnwa abụọ gafere, ụkwụ m kwụsịchara imegharị. Ọrịa a gbagwojuru ndị dọkịta nọ n’obodo anyị bụ́ Tapachula anya, n’ihi na e nwere ụmụ ọhụrụ ndị ọzọ na-arịakwa ụdị ọrịa a. N’ihi ya, e si Meksiko Siti kpọta otu dọkịta na-ahụ maka ọkpụkpụ ka ọ bịa lebara anyị anya. O kwuru na ihe na-arịa anyị bụ ọrịa polio.

Mgbe m dị afọ atọ, a wara m ahụ́ n’úkwù, n’ikpere, nakwa na nkwonkwo ụkwụ. Ọrịa ahụ mechara ruo n’ubu m. Mgbe m dị afọ isii, a kpọgara m n’otu ụlọ ọgwụ dị na Meksiko Siti, ebe a na-agwọ ụmụaka. Mama m na-arụ ọrụ n’ebe a na-akọ ugbo ma na-akpa anụ n’obodo Chiapas, ebe mụ na nne nne m bi na Meksiko Siti. Ma, ọ bụ n’ụlọ ọgwụ ka m na-anọkarị.

Mgbe m dị ihe dị ka afọ asatọ, agatụwara m ije. Ma nsogbu ahụ mechara ka njọ, ejikwa m nwayọọ nwayọọ kwụsịchaa ịga ije. Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị dọkịta kwuru na m ga-enwe ihe m ga-eji na-ekegide ụkwụ m ná ndụ m niile, nakwa na m ga na-eji osisi ndị gbajiri ụkwụ ji aga ije na-aga ije.

Tupu m ruo afọ iri na ise, a waala m ahụ́ ugboro iri abụọ na ise. Ebe ndị a wara m ahụ́ bụ n’ọkpụkpụ azụ, n’ụkwụ, n’ikpere, na nkwonkwo ụkwụ, nakwa ná mkpịsị ụkwụ m. Mgbe ọ bụla a wachara m ahụ́, a na-akụziri m otú m ga-esi na-emega ahụ́. N’otu oge a wachara m ahụ́, e kere m bandeeji n’ụkwụ abụọ. Mgbe e wepụrụ ya, a gwara m ka m na-emegharị ụkwụ m. Imekwa ya na-afụ ezigbo ụfụ.

Ihe Nyere M Ezigbo Nkasi Obi

Mgbe m dị afọ iri na otu, mama m bịara leta m n’otu oge a wachara m ahụ́. Ọ mụtara na Jizọs gwọrọ ndị ọrịa, meedị ka onye na-anaghị aga ije gaa ije. Ọ mụtara ihe ndị a na magazin Ụlọ Nche, nke bụ́ magazin Ndịàmà Jehova na-ebipụta, o nyekwara m magazin ahụ. Ezoro m ya n’okpuru ihe m ji ehiwe isi, ma otu ụbọchị, achọrọ m ya, ahụghịzi m ya. Ndị nọọsụ ahụla magazin ahụ ma were ya. Ha baara m mba na m gụrụ magazin ahụ.

Ka ihe dị ka otu afọ gara, mama m si Chiapas bịakwa ịhụ m. N’oge a, ya na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. O wetaara m akwụkwọ bụ́ Site Na Paradais Etufuru Rue Paradais Enweghachiri. * Mama m sịrị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ibi n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere nkwa ya, bụ́ ebe Jizọs ga-eme ka ahụ́ dị gị mma, i kwesịrị ịmụ Baịbụl.” N’ihi ya, n’agbanyeghị na nne nne m achọghị ka m mụwa Baịbụl, mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl mgbe m dị afọ iri na anọ. N’afọ na-esonụ, a gwara m pụọ n’ụlọ ọgwụ ahụ n’ihi na ụlọ ọgwụ ahụ bụ naanị maka ụmụaka.

Otú M Si Merie Ihe Isi Ike Ndị M Nwere

E nwere mgbe obi bịara jọwa m ezigbo njọ. N’ihi otú nne nne m si emegide m, alaghachiri m obodo Chiapas ebe ndị mụrụ m bi. Ma, e nwere ọtụtụ nsogbu n’ezinụlọ anyị n’ihi na papa m bụ onye aṅụrụma. E nwere oge ike ụwa bịara gwụ m. Echewedịrị m echiche igbu onwe m. Ma ka m nọgidere na-amụ Baịbụl, akwụsịrị m iche echiche igbu onwe m. Nkwa Chineke kwere na Baịbụl, na ụwa ga-aghọ paradaịs, mere ka obi na-adị m ụtọ.

Amalitere m ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị magburu onwe ha Baịbụl kwuru na Chineke ga-eme. (Aịzaya 2:4; 9:6, 7; 11:6-9; Mkpughe 21:3, 4) N’ikpeazụ, na Mee 8, 1968, mgbe m dị afọ iri na asatọ, e mere m baptizim iji gosi na aghọọla m Onyeàmà Jehova. Kemgbe afọ 1974, n’ọnwa ọ bụla, ana m eji ihe karịrị awa iri asaa akọrọ ndị mmadụ nkwa ndị Baịbụl kwere bụ́ nke nyeere m aka ịkwụsị iche echiche igbu onwe m.

Ejirila M Ndụ M Mee Ihe Bara Uru

Ka oge na-aga, mụ na mama m kwagara obodo Tijuana, nke dị nso n’agbata mba Meksiko na mba Amerịka. Mụ na mama m bi n’ụlọ e meziri otú ọ ga-adịrị anyị mfe obibi. Ana m eyi ihe ahụ m na-eji ekegide ụkwụ m, na-ejikwa osisi ndị gbajiri ụkwụ ji aga ije agagharị n’ime ụlọ, ana m anọkwa n’ígwè ndị ngwọrọ esi nri, sụọ ákwà ma dee ya. M gawa ozi ọma, m na-eji otu obere ụgbọala e ji eletrik anya, bụ́ nke a rụrụ maka m.

E wezụga ịga n’okporo ámá ma ọ bụ n’ụlọ ndị mmadụ ezi ha ozi ọma, ana m agakarịkwa n’otu ụlọ ọgwụ dị nso ebe anyị bi na-ezi ndị bịara ịhụ dọkịta ozi ọma. Mụ na ha kwuchaa, m na-anyara obere ụgbọala m gaa n’ahịa zụrụ ihe ndị dị anyị mkpa, mgbe ahụzi, m na-alaghachi n’ụlọ gaa nyere mama m aka sie nri ma rụọ ọrụ ụlọ ndị ọzọ.

Ana m ere ákwà ọkịrịka ka m nwee ike na-enweta ego anyị ji egbo mkpa anyị. Mama m dị afọ iri asaa na asatọ ugbu a, ọ naghịkwa emeli ọtụtụ ihe n’ihi na obi nkụchi akpaala ya aka ọjọọ ugboro atọ. N’ihi ya, ọ bụ m na-elekọta ya, na-enye ya ọgwụ na nri. N’agbanyeghị na ahụ́ esighị anyị abụọ ike, anyị na-agbalị aga ọmụmụ ihe. Ihe karịrị mmadụ iri atọ mụ na ha mụrụ Baịbụl na-esozi ekwusa ozi ọma ugbu a.

Obi siri m ike na ihe a Baịbụl kwuru ga-emecha mezuo, nke bụ́: “Mgbe ahụ [ya bụ, n’ụwa ọhụrụ Chineke] ka onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele.” Ka ọ dịgodị, o nwere ihe Chineke kwuru na-akasi m obi. Ọ sịrị: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka. M ga-eji aka nri m nke ezi omume jidesie gị ike.”—Aịzaya 35:6; 41:10. *

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ a n’afọ 1958, ma a kwụsịla ibipụta ya.

^ par. 18 Victoria Colloy nwụrụ na Nọvemba 30, 2009, mgbe ọ dị afọ iri isii. Mama ya nwụrụ na Julaị 5, 2009.

[Foto dị na peeji nke 12]

Mgbe m dị m afọ asaa, eyi m ihe e ji ekegide ụkwụ

[Foto dị na peeji nke 13]

M gawa ozi ọma, m na-anya obere ụgbọala e ji eletrik anya, bụ́ nke a rụrụ maka m