Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Imerụ Onwe Ya Ahụ́ Ọ̀ Ga-eme Ka Ya na Chineke Dịkwuo ná Mma?

Mmadụ Imerụ Onwe Ya Ahụ́ Ọ̀ Ga-eme Ka Ya na Chineke Dịkwuo ná Mma?

Echiche Baịbụl

Mmadụ Imerụ Onwe Ya Ahụ́ Ọ̀ Ga-eme Ka Ya na Chineke Dịkwuo ná Mma?

ỌTỤTỤ ndị anaghị achọ imerụ onwe ha ahụ́. Ma e nwere ndị weere na okpukpe ndị na-eti onwe ha ihe, ndị na-ebu ọnụ mgbe niile ma ọ bụ ndị na-eyi uwe e tinyere ihe ga na-adụ ha adụ n’ahụ́, bụ ndị na-atụ egwu Chineke. Ihe ndị a a kpọrọ aha abụghị ihe e mere naanị n’oge ochie. Akụkọ ndị e nwetara na nso nso a na-ekwu na ndị isi okpukpe, bụ́ ndị a na-anụ aha ha n’oge a, na-atadị onwe ha ahụhụ, na-ewere ya na ọ bụ ụzọ e si efe Chineke.

Gịnị na-eme ka ndị mmadụ si otú ahụ na-efe Chineke? Otu ọnụ na-ekwuchitere otu òtù sị na ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi kwuru na “mmadụ ịta onwe ya ahụhụ bụ ụzọ onye ahụ na Jizọs Kraịst si adịkwu ná mma, ebe ọ bụ na Kraịst n’onwe ya kwetara taa ahụhụ iji gbapụta anyị ná mmehie.” N’agbanyeghị ihe ndị ndú okpukpe na-ekwu, gịnị ka Baịbụl kwuru n’okwu a?

Na-elekọta Ahụ́ Gị

Baịbụl ekwughị na mmadụ imerụ onwe ya ahụ́ bụ ụzọ e si efe Chineke, ọ kwadoghịkwa ime ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl kwuru ya ugboro ugboro na ndị na-efe Chineke kwesịrị ilekọta onwe ha. Legodị ihe Baịbụl kwuru banyere otú di na nwunye kwesịrị isi na-ahụ ibe ha n’anya. O ji ya tụnyere otú mmadụ na-esi elekọta onwe ya ma kwuo, sị: “Ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha . . . Ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị; kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya, dị ka Kraịst na-emekwara ọgbakọ ya.”—Ndị Efesọs 5:28, 29.

Ò nwere uru ọ bara na Baịbụl gwara ndị di ka ha hụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ ha ma ọ bụrụ na Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya na-emerụ onwe ha ahụ́ mgbe ha na-efe ya? O doro anya na Chineke chọrọ ka ndị ji Okwu ya kpọrọ ihe na-elekọta ahụ́ ha ma hụdị onwe ha n’anya otú kwesịrị ekwesị, ọ bụkwa otú ahụ ka ndị nwere di ma ọ bụ nwunye kwesịrị isi hụ nwunye ha ma ọ bụ di ha n’anya.

Ọ dị mma ịma na Baịbụl nyere ndụmọdụ ndị ga-enyere ndị na-agụ ya aka ka ha na-elekọta ahụ́ ha. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na imega ahụ́ bara uru. (1 Timoti 4:8) O kwuru na ịṅụ ntakịrị mmanya nwere ike ịgwọ mmadụ ọrịa, kwuokwa na iri oké nri ma ọ bụ ịṅụ oké mmanya ga-akpatara mmadụ nsogbu. (Ilu 23:20, 21; 1 Timoti 5:23) Baịbụl gbara ụmụ mmadụ ume ka ha na-elekọta onwe ha, n’ihi na ọ ga-eme ka ha nwee ike ime ihe ndị dịịrị ha. (Ekliziastis 9:4) Ọ bụrụ na Chineke chọrọ ka ndị na-agụ Baịbụl na-elekọta ahụ́ ha anya otú a, oleezi otú ọ ga-esi chọọ ka ha na-emerụ onwe ha ahụ́?—2 Ndị Kọrịnt 7:1.

Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịta Onwe Ha Ụdị Ahụhụ ahụ Jizọs Tara?

N’agbanyeghị ihe ndị a Baịbụl kwuru, ụfọdụ okpukpe ka na-ekwu na ebe ọ bụ na Jizọs na ndị mbụ soro ụzọ ya tara ahụhụ, ndị na-efe Chineke taa kwesịrị ịna-ata onwe ha ahụhụ. Ma ahụhụ Baịbụl kwuru na ndị ohu Chineke tara abụghị ahụhụ ha ji aka ha taa onwe ha. Mgbe Ndị Kraịst, ndị so dee Baịbụl, kwuru okwu gbasara ahụhụ Kraịst tara, ha ji ya na-agba Ndị Kraịst ume ka ha na-edi mkpagbu ndị na-abịara ha, ọ bụghị ka ha tawa onwe ha ahụhụ. N’ihi ya, ndị na-ata onwe ha ahụhụ anaghị eme ihe Jizọs Kraịst mere.

Ka e were ya na ị hụrụ ebe ìgwè mmadụ iwe ji na-akparị otu enyi gị ị hụrụ n’anya ma na-eti ya ihe. Ka ị na-ele ihe na-emenụ, gị ahụ na enyi gị ahụ na-edi ihe ha na-eme ya, ọ naghịkwa emegwara. Ọ bụrụ na ị chọrọ ime ka enyi gị ahụ, ị̀ ga-akparịwa onwe gị ma tiwe onwe gị ihe? Mbanụ! I mee otú ahụ, ọ pụtara na ị na-eme ka ndị ahụ iwe ji. Otú ị ga-esi eme ka enyi gị bụ ịgbalị ka ị ghara imegwara ma ọ bụrụ na e mee gị ụdị ihe ahụ.

N’ihi ya, o doro anya na Ndị Kraịst ekwesịghị ịta onwe ha ahụhụ, n’ihi na ha mee ya, ha na-eme ka ìgwè mmadụ iwe ji, bụ́ ndị tara Jizọs ahụhụ ma chọọ igbu ya. (Jọn 5:18; 7:1, 25; 8:40; 11:53) Kama, ọ bụrụ na a na-ata ha ahụhụ, ha kwesịrị ịgbachi nkịtị ma die ya otú ahụ Jizọs mere.—Jọn 15:20.

O Sighị n’Akwụkwọ Nsọ

Tupu Kraịst abịadị n’ụwa, Chineke nyere ndị Juu iwu ka ha ghara ịkpachara anya merụọ onwe ha ahụ́. Dị ka ihe atụ, Chineke nyere ndị Juu iwu ka ha ghara ibekasị onwe ha ahụ́, bụ́kwanụ ihe ndị na-abụghị ndị Juu na-eme n’oge ahụ. (Levitikọs 19:28; Diuterọnọmi 14:1) Ebe ọ bụ na Chineke achọghị ka anyị na-ebekasị onwe anyị ahụ́, ọ gaghịkwa achọ ka anyị merụọ onwe anyị ahụ́. Ihe Baịbụl kwuru n’okwu a doro anya—Chineke achọghị ka anyị kpachara anya na-emerụ onwe anyị ahụ́.

Jehova Chineke, bụ́ Onye kere anyị, chọrọ ka anyị na-akwanyere ahụ́ anyị o kere eke ùgwù otú ahụ onye na-akpụ ihe ga-achọ ka a na-akwanyere ihe ọ kpụrụ ùgwù. (Abụ Ọma 139:14-16) N’eziokwu, mmadụ imerụ onwe ya ahụ́ anaghị eme ka onye ahụ na Chineke dịkwuo ná mma. Kama, ọ na-eme ka onye ahụ na Chineke ghara ịdị ná mma, na-egosikwa na onye ahụ ghọtahiere ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere Jizọs.

Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee gbasara ụdị ozizi ahụ ụmụ mmadụ ji aka ha chepụta, bụ́kwa nke na-akpatara ha nsogbu. O dere, sị: “A na-egosipụta ihe ndị ahụ n’ụdị ofufe nke mmadụ na-amanye onwe ya ịgbaso, n’ịdị umeala n’obi ụgha, nakwa n’ịta onwe onye ahụhụ. N’ezie, e nwere ihe yiri amamihe na ha, ma ọ dịghị uru ha bara n’ịlụso ọchịchọ anụ ahụ́ ọgụ.” (Ndị Kọlọsi 2:20-23) N’eziokwu, mmadụ ịna-emerụ onwe ya ahụ́ chee na ọ ga-eme ka ya na Chineke dịkwuo ná mma enweghị uru ọ bara. Kama nke ahụ, ihe Chineke chọrọ n’aka ndị na-efe ya ezi ofufe adịghị egbu mgbu, ọ dị mfe omume, na-emekwa ka ha nweta ume.—Matiu 11:28-30.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Olee otú Chineke si were ahụ́ mmadụ?—Abụ Ọma 139:13-16.

● Imerụ onwe gị ahụ́ ọ̀ ga-enyere gị aka ịlụso ọchịchọ anụ ahụ́ ọgụ?—Ndị Kọlọsi 2:20-23.

● Chineke ọ̀ chọrọ ka ife ya ofufe bụrụ ibu arọ ma ọ bụ ihe ga-emerụ mmadụ ahụ́?—Matiu 11:28-30.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 17]

Ihe Baịbụl kwuru n’okwu a doro anya—Chineke achọghị ka anyị kpachara anya na-emerụ onwe anyị ahụ́

[Foto dị na peeji nke 16]

Ebe nwoke ji ikpere na-arịgo steepụ chọọchị

[Ebe E Si Nweta Foto]

© 2010 photolibrary.com